Okwu Jehova Na-Enwe Mmeri!
“Okwu [Jehova, NW] weere ike na-aga n’ihu n’ihu na-adịkwa irè.”—ỌRỤ 19-20.
1. Gịnị ka a ga-atụlezu n’ihe ọmụmụ nke a nke dabeere n’akwụkwọ Bible bụ Ọrụ Ndị Ozi?
JEHỌVA na-emeghe ụzọ nke na-eduba n’ịrụ ọrụ. Karịsịa, Pọl, bụ́ “onyeozi nke ndị mba ọzọ,” gaje ibute ụzọ n’ọrụ ahụ. (Ndị Rom 11:13) N’eziokwu, ọmụmụ ihe anyị nke na-aga n’ihu n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi na-amalite mgbe ọ nọ na njem ozi ala ọzọ ndị na-akpali akpali.—Ọrụ 16: 6-19:41.
2. (a) Olee ụzọ Pọl onyeozi si jee ozi dị ka onye mmụọ Chineke kpaliri ide ihe site n’ihe dị ka 50 ruo 56 O.A.? (b) Gịnị mere ka Chineke na-agọzi ije ozi nke Pọl na nke ndị ọzọ?
2 Pọl bụkwa onye mmụọ Chineke kpaliri ide ihe. Malite n’ihe dị ka 50 O.A. ruo 56 O.A., ọ nọrọ na Kọrint dee 1 na 2 Ndị Tesalọnaịka, nọrọkwa n’obodo ahụ dee akwụkwọ Ndị Galetia ma ọ̀ bụkwanụ na ọ nọ n’Antiọk nke ndị Siria dee ya, nọrọ n’Efesọs dee 1 Ndị Kọrint, nọrọ na Masedọnia dee 2 Ndị Kọrint, nọrọkwa na Kọrint dee Ndị Rom. Ka Chineke nọkwa na-agọzi ije ozi Pọl na nke ndị ọzọ, “okwu [Jehova, NW] weere ike na-aga n’ihu n’ihu na-adịkwa irè.”—Ọrụ 19:20.
Site Esia Gaa Europe
3. Olee otú Pọl na ndị ya na ha so si setịpụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere nduzi si n’aka mmụọ nsọ?
3 Pọl na ndị ya na ha so setịpụrụ ezi ihe nlereanya n’ịnara nduzi sitere n’aka mmụọ nsọ. (16:6-10) Ma eleghị anya site ná mkpughe ndị e nwetara site n’olu ndị a nụrụ anụ, nrọ, ma ọ bụ ọhụụ dị iche iche, mmụọ nsọ ahụ gbochiri ha ikwusa ozi ọma n’Esia nakwa n’ógbè Bitinia, bụ́ ndị e mesịrị were ozi ọma ahụ jeruo na ha. (Ọrụ 18:18-21; 1 Pita 1:1, 2) N’ihi gịnị ka mmụọ nsọ jiri gbochie ha ịbanye n’ebe ahụ na mbụ? E nwere ndị ọrụ ole na ole, mmụọ nsọ na-eduzikwa ha gaa n’ubi ndị a ga-arụpụta ihe ka ukwu na ha n’ime Europe. Ya mere taa, ọ bụrụ na e mechie ụzọ ịbanye n’otu ókèala, Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ebe ọzọ, na-ejide n’aka na mmụọ Chineke ga-eduru ha jekwuru ndị yiri atụrụ.
4. Nzaghachi dị aṅaa ka e nyere ọhụụ Pọl banyere nwoke onye Masedọnia nke na-arịọ enyemaka?
4 Mgbe ahụ, Pọl na ndị ya na ha so ‘gabigara n’akụkụ’ Misia, bụ́ otu ógbè dị n’Asia Minor, dị ka ubi nke ije ozi ala ọzọ. Otú ọ dị, n’otu ọhụụ, Pọl hụrụ otu nwoke onye Masedọnia ka ọ na-arịọ enyemaka ha. Ya mere, ndị ozi ala ọzọ ahụ mere ngwa wee jee Masedọnia, bụ́ otu ókèala nke dị na Balkan Peninsula. N’otu aka ahụ, mmụọ nsọ na-eduzi ọtụtụ Ndịàmà ka ha na-eje ozi ugbu a n’ebe e nwere mkpa dị ukwu maka ndị nkwusa Alaeze.
5. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji sị na okwu Jehova nwere mmeri na Filipaị? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ọtụtụ Ndịàmà nke oge a si yie Lidia?
5 Okwu Jehova nwere mmeri na Masedọnia. (16:11-15) Filipaị, bụ́ otu ógbè nke ihe ka ọtụtụ ná ndị bi na ya bụ ụmụ amaala Rom, yiri ka o nwere nanị ndị Juu ole na ole, o nweghịkwa ụlọ nzukọ ọ bụla. Ya mere, ụmụnna ahụ jere ‘n’ebe ekpere’ nke dị n’ụsọ otu osimiri ná mpụga mpụga nke obodo ahụ. Otu n’ime ndị ha zutere n’ebe ahụ bụ Lidia, nke pụrụ ịbụworị onye na-eso ụzọ ndị Juu si Taịataịra, bụ́ obodo dị n’Asia Minor nke a ma ama n’ihi ọrụ isiji ákwà a na-arụ n’ebe ahụ. Nwanyị ahụ na-ere ihe e ji esiji ákwà odo odo ma ọ bụ ákwà ndị e ji ya sijie. Mgbe e mesịrị Lidia na ezinụlọ ya baptism, o ji ịnụ ọkụ n’obi dịrị njikere ile ọbịa nke ọma nke na Luk dere, sị: “O wee rụgide anyị.” Anyị nwere ekele maka ụmụnna nwanyị ndị dị otú ahụ taa.
Onyenche Ụlọ Mkpọrọ Aghọọ Onye Kwere Ekwe
6. Olee ụzọ ihe omume ndị mmụọ ọjọọ si duje n’ịtụ Pọl na Saịlas mkpọrọ na Filipaị?
6 Ọ ghaghị ịbụ na ọganihu ime mmụọ a na-enwe na Filipaị akpasuwo Setan oké iwe, n’ihi na ọrụ ndị mmụọ ọjọọ rụrụ n’ebe ahụ dujere n’ịtụ Pọl na Saịlas mkpọrọ. (16:16-24) Ruo ọtụtụ ụbọchị, otu nwa agbọghọ sogharịrị ha, bụ́ onye nwere ‘mmụọ nke ịgba afa’ (n’ụzọ nkịtị, “mmụọ a na-akpọ paịtọn”). Ọ pụrụ ịbụ na mmụọ ọjọọ ahụ weghaara ọdịdị Pythian Apollo, bụ́ chi nke a sịrị na o gburu otu agwọ aha ya bụ py’tkon. Nwa agbọghọ ahụ na-ewetara ndị nwe ya uru ego dị ukwu site n’ọrụ nke ịgba afa. Ee, ọ pụrụ ịgwaworị ndị ọrụ ubi mgbe ha kwesịrị ịkụ ihe, gwa ụmụ agbọghọ mgbe ha kwesịrị ịlụ di, gwakwa ndị na-egwupụta akụ dị n’ime ala ebe ha ga-eje chọọ ọlaedo! Ọ nọgidere na-esogharị ụmụnna ahụ, na-eti mkpu, sị: “Mmadụ ndị a bụ ndị ohu Chineke Onye kachasị ihe nile elu, ndị na-ekwusara unu ụzọ nzọpụta.” Ọ pụrụ ịbụ na mmụọ ọjọọ ahụ mere ka o kwuo nke a iji mee ka à ga-asị na amụma ndị ọ na-ebu sitere n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị ihe dịịrị ndị mmụọ ọjọọ ime mkpọsa ọ bụla banyere Jehova na onyinye nzọpụta ọ na-enye. Mgbe mgbakasị ahụ nke a gabigara ókè, Pọl chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ n’aha Jisọs. Ebe e mebiworo ihe ha ji akpata ego, ndị nwe nwa agbọghọ ahụ dọkpụụrụ Pọl na Saịlás banye n’ọma ahịa, bụ́ ebe a pịara ha ụtarị. (2 Ndị Kọrint 11:25) E wee tụọ ha mkpọrọ, tinyekwa ụkwụ ha n’ọtọsị. A pụrụ idozigharị ọtọsị ahụ iji wee kpọsapụ ụkwụ mmadụ n’ike, na-akpatara ya oké ihe mgbu.
7. Ọ̀ bụ nye òle ndị ka mkpọrọ ahụ a tụrụ Pọl na Saịlas na Filipaị wetaara ngọzi, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
7 Ịtụ mkpọrọ nke a dujere n’onyenche ụlọ mkpọrọ ahụ na ezinụlọ ya inweta ngọzi. (16: 25-40) N’ihe dị ka etiti abalị, Pọl na Saịlas nọ na-ekpe ekpere, na-abụkukwa Chineke abụ otuto, na-ejide n’aka na ọ dịnyeere ha. (Abụ Ọma 42:8) Na mberede, otu ala ọma jijiji kwaghesịrị ọnụ ụzọ nile wee tọpụsịakwa agbụ ha nile mgbe ihe ndị ahụ e ji kpọchisịa ha fopụsịrị site n’ide ndị ahụ ma ọ bụ site n’ahụ ájá. Onyenche ụlọ mkpọrọ ahụ tụrụ egwu na a gaje igbu ya n’ihi na ndị mkpọrọ ọ na-eche nche agbafusịwo. Ọ na-akwadozi igbu onwe ya mgbe Pọl tiri mkpu, sị: “Emerụla onwe gị ahụ: n’ihi na anyị nile nọ n’ebe a.” N’ịkpọpụta Pọl na Saịlas n’èzí, onyenche ụlọ mkpọrọ ahụ jụrụ ha otú a ga-esi wee zọpụta ya. Nzaghachi ha bụ, “Kwere n’Onyenwe anyị Jisọs.” Mgbe ọ nụsịrị okwu Jehova, “ngwa ngwa e wee mee ya baptism, ya onwe ya na ndị ya nile.” Leekwa aha ọṅụ nke a wetaara ha!
8. Gịnị ka ndị ikpe obodo Filipaị mere, gịnịkwa ka a pụrụ ịrụpụta ma ọ bụrụ na ha anakwere mmehie ha n’ihu ọha?
8 N’echi ya, ndị ikpe zitere ozi ka a tọhapụ Pọl na Saịlas. Ma Pọl sịrị: ‘Ha pịara anyị ihe n’amaghị anyị ikpe, ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Rom, wee tụba anyị n’ụlọ mkpọrọ. Hà na-achụpụkwa anyị ugbu a na nzuzo? Ka ha bịa n’onwe ha wee dupụta anyị.’ Ọ bụrụ na ndị ikpe ahụ anakwere mmejọ ha n’ihu ọha, ma eleghị anya ha agaghị adịcha njikere ịpịa ndị Kraịst ndị ọzọ ihe wee tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. Ebe ha na-enweghị ike ịchụpụ ndị bụ ndị Rom, ndị ikpe ahụ bịara wee rịọ ụmụnna ahụ ka ha laa, ma ndị a lara nanị mgbe ha gbasịrị ndị kwere ekwe ibe ha ume. Mmasị dị otú ahụ n’oge a na-akpali ndị so n’Òtù Na-achị Isi na ndị nnọchianya ha ndị ọzọ bụ́ ndị na-ejegharị ejegharị ije leta ma gbaa ndị Chineke ume gburugburu ụwa.
Okwu Jehova Enwee Mmeri na Tesalọnaịka na Beria
9. Usoro ihe omume dị aṅaa, nke Ndịàmà Jehova ka ji na-eme ihe ugbu a, ka Pọl ji ‘kọwaa, nwapụtakwa’ na Mesaịa ahụ aghaghị ịhụ ahụhụ, sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie?
9 Ebe ọzọ okwu Chineke nwere mmeri bụ na Tesalọnaịka, bụ́ isi obodo na ọdụ ụgbọ mmiri bụ isi nke Masedọnia (17:1-9) N’ebe ahụ, Pọl sooro ndị Juu tụgharịta uche, ‘na-akọwa, na-anwapụtakwa’ na Mesaịa ahụ aghaghị ịhụ ahụhụ, sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie. (Pọl mere nke a site n’iji amụma dị iche iche tụnyere ihe omume ndị mezuru ha, dị ka Ndịàmà Jehova na-eme.) Otú a, ụfọdụ ndị Juu, ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, na ndị ọzọ, ghọrọ ndị kwere ekwe. Mgbe ụfọdụ ndị Juu na-ekwo ekworo chịkọtara ndị mmadụ iji mejupụta ìgwè ndị na-eme ihe ike ma ha enweghị ike ịchọta Pọl na Saịlas, ha dọkpụụrụ Jeson na ụmụnna ndị ọzọ gaa n’ihu ndị isi obodo wee boo ha ebubo ịkpali nnupụisi, bú ebubo ụgha nke a ka na-ebokwa ndị Jehova. Otú ọ dị, a tọhapụrụ ụmụnna ahụ mgbe ‘e mesịrị ka ha nọrọ n’aka mbé.’
10. N’echiche dị aṅaa ka ndị Juu nọ na Beria si ‘nyochaa nke ọma’ ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ?
10 Ebe ọzọ Pọl na Saịlas jere bụ n’obodo Beria. (17:10-15) N’ebe ahụ, ndị Juu na-eji nlezianya ‘na-enyocha ihe nile’ e deworo n’Akwụkwọ nsọ, dị ka Ndịàmà Jehova na-agba ụmụ mmadụ ume ime taa. Ndị Beria ndị ahụ arụghị Pọl ụka kama ha mere nnyocha iji nwapụta na Jisọs bụ Mesaịa ahụ n’ezie. Gịnị si na nke a pụta? Ọtụtụ ndị Juu na ụfọdụ ndị Grik (ma eleghị anya ndị na-eso ụzọ ndị Juu) ghọrọ ndị kwere ekwe. Ma mgbe ndị Juu nọ na Tesalọnaịka bịara kpalie ìgwè mmadụ, ụmụnna nọ n’ebe ahụ duuru Pọl jee n’ụsọ oké
osimiri, ebe ọ pụrụ ịbụ na ụfọdụ ndị so ya na-eje banyere ụgbọ mmiri nke na-eje Paịriọs (bụ́ Piraiévs nke oge a), nke bụ obodo ọdụ ụgbọ mmiri nke Atens.
Okwu Jehova Enwee Mmeri n’Atens
11. (a) Olee ụzọ Pọl si gbaa àmà n’atụghị egwu n’Atens, ma olee ndị sooro ya rụrịta ụka? (b) Gịnị ka ụfọdụ ndị bu n’uche mgbe ha kwuru okwu banyere Pọl dị ka “onye ekwukwu”?
11 E ji anya ike gbaa àmà n’Atens. (17:16-21) N’ihi okwu Pọl kwuru banyere Jisọs na mbilite n’ọnwụ ahụ, ndị ọkà ihe ọmụma sooro ya rụrịta ụka. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị Epikurean, bụ́ ndị ihe ka ha mkpa bụ ịchọ ihe ụtọ. Ndị ọzọ bụ ndị Stọik, bụ́ ndị na-emesi ike mkpa ọ dị mmadụ inye onwe ya ọzụzụ. Ụfọdụ ndị jụrụ, sị, ‘Gịnị ka onye ekwukwu a ga-achọ ikwu?’ “Onye ekwukwu” (nke pụtara n’ụzọ nkịtị, “onye na-atụtụ mkpụrụ”) pụtara na Pọl yiri nnụnụ nke na-atụtụ mkpụrụ ma na-ewepụta ihe ọmụma dị nta, ma ghara inwe amamihe. Ndị ọzọ sịrị: “Ọ dị ka onye na-ekwusa ndị mmụọ nke ala ọzọ.” Nke a bụ ihe siri ike, n’ihi na e gburu Socrates n’ihi ebubo dị otú ahụ. N’oge na-adịghị anya, e kuuru Pọl jee n’Areọpagọs (Ugwu Mars), nke pụrụ ịbụworị ebe nnukwu òtù ikpe ahụ nke na-ezukọ n’èzí na-anọkọ, nke dị nso n’Acropolis ahụ.
12. (a) Akụkụ dịgasị aṅaa nke ezi ọkà ikwu okwu pụtara ìhè n’okwu ahụ Pọl kwuru n’Areọpagọs? (b) Isi ihe dịgasị aṅaa ka Pọl mere ka ha pụta ìhè banyere Chineke, gịnịkwa ka nke a rụpụtara?
12 Okwu Pọl kwuru n’Areọpagọs ahụ bụ ihe nlereanya na-enweghị atụ nke mmadụ inwe okwu mmeghe dị irè, mwulite nke ezi echiche dị na ya, na arụmụka nke na-eme ka ihe doo anya —dị ka a na-akuzi n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke Ndịàmà Jehova. (17:22-34) O kwuru na ndị Atens bụ ndị ji okpukpe kpọrọ ihe karịa ndị ọzọ. Ee, ọbụna na ha nwere ebe ịchụàjà “E Nyere Chi nke A Na-amaghị Ama,” ma eleghị anya iji zere ịkparị chi nke ọ bụla! Pọl kwuru okwu banyere Onye Okike ahụ, bụ́ onye ‘sitere n’otu onye kee mba nile n’otu n’otu nke mmadụ,’ onye ‘debewokwara oge ha a kara aka na ókè nile nke ebe obibi ha,’ dị ka mgbe o bibiri ndị Kenean. (Jenesis 15:13-21; Daniel 2:21; 7:12) Pọl kwuru na a pụrụ ịchọta Chineke nke a achọta, “n’ihi na anyị bụkwa ndị Ọ mụrụ,” na-ezo aka n’okike Jehova kere mmadụ, na-ehotakwa okwu site n’ihe odide nke ndị odeabụ ha bụ Aratus na Cleanthes. Dị ka ndị Chineke mụrụ, anyị ekwesịghị iche na Onye Okike ahụ zuru okè yiri arụsị nke mmadụ na-ezughị okè mere. Chineke lefuuru amaghị ihe dị otú ahụ anya ma ugbu a ọ na-agwa ihe nile a kpọrọ mmadụ ka ha chegharịa, n’ihi na o debewo otu ụbọchị ọ ga-ekpe ikpe site n’aka Onye ọ họpụtara. Ebe ọ bụ na Pọl anọwo “na-ezisa ozi ọma nke Jisọs,” ndị na-ege ya ntị maara na Kraịst ga-abụ Onyeikpe ahụ. (Ọrụ 17:18; Jọn 5:22, 30) Okwu banyere nchegharị kpasuru ndị Epikurean ahụ iwe, ndị ọkà ihe ọmụma Grik pụkwara ịnakwere okwu banyere anwụghị anwụ, kama ọ bụghị banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ. N’ụzọ doro anya, dị ka ọtụtụ ndị na-adịghị eji ozi ọma ahụ akpọrọ ihe dị oké mkpa taa, ụfọdụ ndị sịrị: ‘Anyị ga-anụkwa olu gị mgbe ọzọ.’ Ma onyeikpe ahụ bụ Daiọnisiọs na ndị ọzọ ghọrọ ndị kwere ekwe.
Okwu Chineke Enwee Mmeri na Kọrint
13. Olee ụzọ Pọl si kwadoo onwe ya n’ije ozi ahụ, gịnịkwa ka anyị na-ahụta yiri nke a n’oge a?
13 Pọl jere Kọrint, bụ́ isi obodo nke ógbè Akaia. (18:1-11) N’ebe ahụ, o zutere Akwila na Prisila, bụ́ ndị kwatara n’ebe ahụ mgbe Klọdiọs Siza “ nyererịị iwu ka ndị Juu nile na-abụghị ndị Rom hapụ Rom. Iji wee kwadoo onwe ya n’ozi ahụ, Pọl sooro di na nwunye nke a bụ ndị Kraịst na-akpa ákwà ụlọ ikwu. (1 Ndị Kọrint 16:19; 2 Ndị Kọrint 11:9) Ịchabi ma na-adụkọta ákwà e jiri ajị́ ewu siri ike mee bụ ọrụ siri nnọọ ike. N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova na-elekọta mkpa ihe onwunwe ha site n’ịrụ ọrụ ego, ma ọrụ bụ isi ha nwere bụ ije ozi ahụ.
14. (a) Mgbe mmegide ndị Juu nọgidere na-eche ya ihu na Kọrint, gịnị ka Pọl mere? (b) È si aṅaa mesie Pọl obi ike na o kwesịrị ịnọgide na Kọrint, ma olee ụzọ e si eduzi ndị Jehova taa?
14 Ndị Juu bi na Kọrint nọgidere na-ekwulu Pọl mgbe ọ nọ na-ekwusa banyere ọbụbụ Jisọs bụ Mesaịa ahụ. Ya mere o fechara uwe ya iji gosi na aka ya apụọla n’isi ha wee malite inwe nzukọ dị iche iche n’ụlọ Titius Jọstọs, nke yiri ka ọ̀ bụ onye Rom. Ọtụtụ ndị (gụnyere onye bụbu onyeisi ụlọ nzukọ bụ Krispọs na ezinụlọ ya) ghọrọ ndị kwere ekwe e mere baptism. Ọ bụrụ na mmegide ndị Juu mere ka Pọl nwee obi abụọ ma yà kwesịrị ịnọgide na Kọrint, ọ kwụsịrị inwe obi abụọ mgbe Onyenwe anyị gwara ya n’ọhụụ, sị: ‘Atụla egwu, nọgide na-ekwu, n’ihi na mụ onwe m nọnyeere gị, ọ dịghịkwa onye ga-emerụ gị ahụ. Enwere m ọtụtụ mmadụ n’obodo a.’ Ya mere Pọl nọgidere na-akuzi okwu Chineke n’ebe ahụ ruo ngụkọta nke otu afọ na ọnwa isii. Ọ bụ ezie na ndị Jehova adịghị ahụ ọhụụ n’oge a, ma ekpere ma nduzi sitere n’aka mmụọ nsọ na-enyere ha aka iji amamihe mee mkpebi n’ụzọ dị otú ahụ banyere ọdịmma Alaeze.
15. Gịnị mere mgbe a kpọpụrụ Pọl n’ihu Onyeisi bụ Galio?
15 Ndị Juu duuru Pọl gaa n’ihu Onyeisi bụ Juniọs Galio. (18:12-17) Ha kwuru na Pọl na-eme ndị na-eso ụzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị—bụ́ ebubo ụgha ndị ndú okpukpe bụ ndị Grik ka nọ na-ebo Ndịàmà Jehova n’oge a. Galio maara na ikpe omume jọgburu onwe ya amaghị Pọl, na ọ dịghịkwa oké nchegbu ndị Juu nwere n’ezie banyere ọdịmma Rom na iwu ya, ya mere ọ chụpụrụ ha. Mgbe ndị ahụ na-ekiri ihe na-emenụ malitere iti Sostenis ihe, bụ́ onyeisi ọhụrụ nke ụlọ nzukọ ahụ, ọ dịghị ihe ọ bụla Galio mere, ma eleghị anya na-eche na onye ahụ ọ pụtara ìhè na ọ bụ ya na-edu ìgwè ndị ahụ na-eme ihe ike megide Pọl na-enweta ụgwọ ọrụ kwesịịrị ya.
16. Gịnị mere o ji bụrụ ihe kwesịrị ekwesị ka Pọl kpachasịa agịrị isi ya n’ihe metụtara nkwa nke o kwere?
16 Pọl banyere ụgbọ mmiri n’ọdụ ụgbọ mmiri dị n’obodo Senkrei nke dị n’ụsọ oké osimiri Aegean ahụ wee gaa Efesọs, bụ́ obodo dị n’Asia Minor. (18:18-22) Tupu ọ gaa njem ahụ, ‘ọ kpachasịrị agịrị isi ya n’ihi na o kwererịị otu nkwa.’ E kwughị ma Pọl ò kwere nkwa ahụ tupu ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Jisọs, e gosighịkwa ma nke a ọ̀ bụ mmalite ma ọ bụ ọgwụgwụ nke oge nkwa ahụ. Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, ma ọ bụ Chineke nyere ya, ọ bụkwa ihe dị nsọ, ọ dịghịkwa mmehie ọ bụla dị n’ikwe nkwa dị otú ahụ. (Ndị Rom 6:14; 7:6, 12; Ndị Galetia 5:18) N’Efesọs, Pọl sooro ndị Juu tụgharịta uche, na-ekwe nkwa ịlọghachi ma ọ bụrụ na Chineke ekwere. (E mesịrị mezuo nkwa ahụ.) Nlaghachi ya n’Antiọk nke Siria bụ ngwụsị nke njem ozi ala ọzọ ya nke abụọ.
Okwu Jehova Enwee Mmeri n’Efesọs
17. N’ihe banyere baptism, nduzi dị aṅaa ka ọ dị mkpa inye Apọlọs na ụfọdụ ndị ọzọ?
17 N’oge na-adịghị anya, Pọl malitere njem ozi ala ọzọ ya nke atọ. (n’ihe dị ka 52-56 O.A.) (18:23-19:7) Tupu mgbe ahụ n’Efesọs, Apọlọs na-ezi ihe banyere Jisọs, ma ọ maara nanị ihe banyere baptism nke Jọn dị ka ihe àmà nke nchegharị site ná mmehie ndị e mere megide ọgbụgba ndụ Iwu ahụ. Prisila na Akwila “kọọrọ ya ụzọ Chineke nke ọma karị,” ma eleghị anya na-akọwara ya na ịbụ onye e mere baptism dị ka e mere Jisọs gụnyere mmadụ ịbụ onye e mikpuru ná mmiri na ịnata mmụọ nsọ ahụ nke a wụpụworo. Mgbe e jisịrị mmụọ nsọ mee ndị mmadụ baptism na Pentikọst nke 33 O.A., onye ọ bụla e mere baptism nke Jọn dị mkpa ka e megharịa ya baptism n’aha Jisọs. (Matiu 3:11, 16; Ọrụ 2:38) Mgbe oge ụfọdụ gasịrị n’Efesọs, ihe dị ka ndị ikom iri na abụọ bụ ndị Juu, bụ́ ndị meworo baptism nke Jọn bụ ndị ‘e mere baptism baa n’aha nke Onyenwe anyị Jisọs,’ nke bụ nanị otu mmegharị baptism e nwere ihe ndekọ ya n’Akwụkwọ nsọ. Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka n’isi, ha natara mmụọ nsọ na ihe ngosi ọrụ ebube abụọ nke ịbụ ndị eluigwe nakwereworo—ịsụ asụsụ dị iche iche na ibu amụma.
18. Olee ebe Pọl gbara àmà mgbe ọ nọ n’Efesọs, gịnịkwa si na nke a pụta?
18 O doro anya na Pọl nọgidere n’ọrụ n’Efesọs, bụ́ obodo nke nwere ihe dị ka 300,000 ndị bi n’ime ya. (19:8-10) Ụlọ nsọ ya nke chi nwanyị bụ Artemis bụ otu n’ime ihe ebube ndị e nwere n’ụwa oge ochie, ụlọ ihe nkiri ya ga-abatakwa 25,000 mmadụ. N’ụlọ nzukọ ndị Juu dị n’ebe ahụ, Pọl ‘ji ụzọ ime ka mmadụ kwere n’ihe mee ihe’ site n’iwepụta arụmụka ndị doro anya, ma o si n’ebe ha nọ pụọ mgbe ụfọdụ ndị kwuru okwu ọjọọ banyere Ụzọ Ahụ, ma ọ bụ ụzọ ndụ nke dabeere n’okwukwe n’ebe Kraịst nọ. Ruo afọ abụọ, Pọl kwuru okwu kwa ụbọchị n’ụlọ nzukọ dị n’ụlọ akwụkwọ Tiranọs, “okwu” ahụ gbasazukwara n’Esia nile.
19. Gịnị mere n’Efesọs nke mere ka ‘okwu Jehova nọgide na-aga n’ihu, na-adịkwa irè’ n’ebe ahụ?
19 Chineke gosiri nkwado ya n’ebe ọrụ Pọl dị site n’inye ya ike ịgwọ ndị ọrịa na ịchụpụ ndị mmụọ ọjọọ. (19:11-20) Ma ụmụ ndị ikom asaa nke onyeisi nchụaja bụ Skiva enweghị ike ịchụpụ otu mmụọ ọjọọ site n’iji aha Jisọs mee ihe n’ihi na ha adịghị anọchite anya Chineke na Kraịst. Ọbụna na nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-akpa ike n’ime ya merụrụ ha ahụ! Nke a mere ka ndị mmadụ tụọ egwu, “e mekwara aha Onyenwe anyị Jisọs ka ọ dị ukwu.” Ndị ahụ ghọrọ ndị kwere ekwe jụrụ ma kwụsị ọrụ ime mgbaasị ha, suokwa akwụkwọ ha nile ọkụ n’ihu ọha, bụ́ ndị ga-enweworị okwu na usoro dị iche iche e ji eme mgbaasị n’ime ha. Luk dere, sị, “Otú a ka okwu [Jehova, NW] weere ike na-aga n’ihu n’ihu na-adịkwa irè.” Taa, ndị ohu Chineke na-enyekwa aka n’ime ka ndị mmadụ nwere onwe ha site n’ofufe ndị mmụọ ọjọọ.—Deuterọnọmi 18:10-12.
Ndị Okpukpe Ekweghị Ibe Ha Nọrọ Adịghị Enwe Ihe Ịga Nke Ọma
20. N’ihi gịnị ka ndị ụzụ ọlaọcha nọ n’Efesọs ji kpalite ọgba aghara, oleekwa ụzọ e si mechie nke a?
20 Ọtụtụ mgbe, Ndịàmà Jehova echewo ìgwè ndị na-eme ihe ike ihu, otú ahụkwa ka ndị Kraịst nọ n’Efesọs mere. (19:21-41) Ka ọnụ ọgụgụ ndị kwere ekwe na-amụbawanye, ego Dimitriọs na ndị ụzụ ọlaọcha ndị ọzọ na-enweta dalatara n’ihi na ọ bụzi nanị mmadụ ole na ole na-azụrụ ụlọ nsọ nta ndị e ji ọlaọcha mee, nke chi ọmụmụ nwa ahụ nwere ọtụtụ ara bụ Daiana (Artemis). Mgbe Dimitriọs kpaliri ha, otu ìgwè ndị na-eme ihe ike kpụụrụ ndị ha na Pọl so bịa, bụ́ Gaiọs na Aristakọs banye n’ime ọgbọ ihe nkiri ahụ, ma ndị
na-eso ụzọ ekweghị ka Pọl banye n’ebe ahụ. Ọbụna ụfọdụ ná ndị isi ememe na egwuregwu dị iche iche rịọrọ ya ka ọ ghara itinye onwe ya n’ihe ize ndụ ahụ. Ruo awa abụọ, ìgwè mmadụ ahụ tiri mkpu, sị: “Daịana nke ndị Efesọs dị ukwu.” N’ikpeazụ, onye odeakwụkwọ obodo ahụ (bụ́ onyeisi nke ndị na-achị obodo ahụ) kwuru na ndị ọkà ahụ pụrụ iwepụta ebubo ha na-ebo ndị ahụ n’ihu onyeisi, bụ́ onye nwere ike ikpebi ikpe, ma ọ̀ bụkwa na a pụrụ ikpebi ikpe ahụ ‘ná nzukọ nke ziri ezi n’iwu’ nke ndị obodo ahụ na-enwe. Ma ọ bụghị otú ahụ, ọchịchị Rom pụrụ ịma ndị a gbakọtara ná nzukọ a nke iwu na-akwadoghị ikpe ịkpata ọgba aghara. Mgbe o kwusịrị okwu ndị ahụ, ọ chụsasịrị ha.
21. N’ụzọ dị aṅaa ka Chineke si gọzie ọrụ Pọl, oleekwa ụzọ o si na-agọzi ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ taa?
21 Chineke nyeere Pọl aka ịnagide ọnwụnwa dị iche iche, gọziekwa mgbalị ya nile inyere ndị mmadụ aka ịjụ ozizi ụgha nke okpukpe ma nakwere eziokwu ahụ. (Tụlee Jeremaịa 1:9, 10.) Lee ka anyị si nwee ekele na Nna anyị nke eluigwe na-agọzi ọrụ anyị na-arụ n’ụzọ dị otú ahụ! Ya mere, ugbu a, dịkwa ka ọ dị n’ime narị afọ mbụ ahụ, ‘okwu Jehova na-aga n’ihu n’ihu, na-adịkwa irè.’
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl setịpụrụ n’ihe banyere ịnara nduzi nke mmụọ nsọ?
◻ Usoro ime ihe dị aṅaa, nke ndị ohu Jehova ka ji na-eme ihe taa, ka Pọl ji ‘kọwaa, nwapụtakwa’ ihe dị iche iche?
◻ Myirita dị aṅaa dị n’etiti nzaghachi ụmụ mmadụ n’ebe okwu Pọl kwuru n’Areọpagọs ahụ dị na nkwusa nke Ndịàmà Jehova?
◻ Olee ụzọ Pọl si kwadoo onwe ya n’ije ozi ahụ, gịnịkwa ka e nwere n’oge a nke yiri ya?
◻ Dị ka o mere n’ihe banyere ọrụ Pọl, olee ụzọ Chineke siworo gọzie ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ taa?
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Okwu Jehova nwere mmeri n’obodo
1. Filipaị
2. na 3. Atens
4. na 6. Efesọs
5. Rom
[Ebe E Si Nweta Foto]
Photo No. 4: Manley Studios