Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w96 9/15 p. 26-28
  • Lidia—Onye Na-atụ Egwu Chineke Nke Na-ele Ọbịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Lidia—Onye Na-atụ Egwu Chineke Nke Na-ele Ọbịa
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Na-ere Ihe E Ji Esiji Ákwà Odo Odo”
  • Ime Nkwusa nke Pọl na Filipaị
  • “Onye Na-atụ Egwu Chineke”
  • “Ọ Rụgidere Anyị”
  • Ụmụnna Nọ na Filipaị
  • Onye M Ga-eṅomi—Lidia
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • “Bịa na Masedonia Nyere Anyị Aka”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Ụzọ Isi Nwee Obi Ụtọ
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
  • “Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
w96 9/15 p. 26-28

Lidia—Onye Na-atụ Egwu Chineke Nke Na-ele Ọbịa

SITE n’oge ochie, ndị na-ejere ezi Chineke ahụ ozi emewo ka e jiri ile ọbịa ha mara ha. (Jenesis 18:1-8; 19:1-3) N’ịbụ nke a kọwara dị ka “ịhụnanya nke, mmasị maka, ma ọ bụ obiọma nye ndị ọbịa,” omume ile ọbịa nke na-esite n’ezi obi bụ ọbụna taa ihe àmà nke ezi Iso Ụzọ Kraịst. N’ezie, ọ bụ ihe a chọrọ site n’aka ndị nile ga-efe Chineke ofufe n’ụzọ ọ na-anara.—Ndị Hibru 13:2; 1 Pita 4:9.

Otu onye nke gosipụtara omume ile ọbịa n’ụzọ kwesịrị nṅomi bụ Lidia. Ọ “rụgidere” ndị Kraịst bụ́ ndị ozi ala ọzọ na-eleta Filipaị ịnọdụ n’ụlọ ya. (Ọrụ 16:15) Ọ bụ ezie na e hotara Lidia nanị ná mkpirikpi n’ime Akwụkwọ Nsọ, ntakịrị ihe e kwuru banyere ya pụrụ ịbụ ihe agbamume nye anyị. N’ụzọ dị aṅaa? Ònye bụ Lidia? Gịnị ka anyị maara banyere ya?

“Onye Na-ere Ihe E Ji Esiji Ákwà Odo Odo”

Lidia biri na Filipaị, obodo ukwu bụ́ isi na Masedọnia. Otú ọ dị, o si obodo Taịataịra, bụ́ obodo ukwu dị n’ógbè Lidia, n’akụkụ ọdịda anyanwụ Asia Minor. N’ihi nke a ụfọdụ na-atụ aro na “Lidia” bụ utu aha e nyere ya na Filipaị. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ “onye Lidia,” dịkwa nnọọ ka a pụrụ isi kpọọ nwanyị ahụ Jisọs Kraịst gbaara àmà “nwanyị Sameria.” (John 4:9) Lidia rere “odo odo” ma ọ bụ ihe ndị e ji ihe a e ji esiji ákwà sijie. (Ọrụ 16:12, 14) Ịdị adị nke ndị na-emepụta ihe e ji esiji ákwà ma na Taịataịra ma na Filipaị bụ nke a nwapụtara ịbụ eziokwu site n’ihe odide ndị ọkà n’ihe ndị e gwupụtara n’ala gwupụtara. Ọ pụrụ ịbụ na Lidia akwapụwo n’ihi ọrụ ya, iji rụwa nke onwe ya ma ọ bụ dị ka onye nnọchiteanya nke ụlọ ọrụ ndị Taịataịra na-esiji ákwà.

A pụrụ isite n’ọtụtụ ihe nweta odo odo e ji esiji ákwà. A na-esite n’ụdị ejula mmiri ụfọdụ ewepụta ndị kasị ada ọnụ. Dị ka onye Rom narị afọ mbụ na-ede uri bụ́ Martial si kwuo, uwe e ji odo odo kasị mma nke Taịa (ebe ọzọ a na-emepụta ihe a) mee pụrụ ịdaru sesterce 10,000, ma ọ bụ denarius 2,500 n’ọnụ, ihe a na-akwụ onye ọrụ maka ụbọchị 2,500. N’ụzọ doro anya, ụdị uwe ndị ahụ bụ ihe okomoko nke ọ bụ nanị mmadụ ole na ole ga-azụtali. Ya mere Lidia pụrụ ịbụworị aka ji akụ. Ka o sina dị, o nwere ike ile Pọl onyeozi na ndị ibe ya—Luk, Saịlas, Timoti, na ndị ọzọkwa ma eleghị anya—ọbịa.

Ime Nkwusa nke Pọl na Filipaị

Ihe dị ka n’afọ 50 O.A., Pọl zọrọ ụkwụ mbụ na Europe wee malite ime nkwusa na Filipaị.a Mgbe ọ bịarutere n’obodo ọhụrụ, ọ bụ omenala Pọl ije n’ụlọ nzukọ iji buru ụzọ meere ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu zukọrọ n’ebe ahụ nkwusa. (Tụlee Ọrụ 13:4, 5, 13, 14; 14:1.) Otú ọ dị, dị ka ụfọdụ ndị si kwuo, iwu ndị Rom machibidoro ndị Juu ikpe okpukpe ha “gburugburu ebe dị nsọ” nke Filipaị. Ya mere, mgbe ọ nọsịrị “ụbọchị ụfọdụ” n’ebe ahụ, n’Ụbọchị Izu Ike, ndị ozi ala ọzọ ahụ hụrụ otu ebe dị n’ụsọ otu osimiri n’èzí obodo ukwu ahụ ebe ‘ha chere na ebe ekpere dị.’ (Ọrụ 16:12, 13) O doro anya na nke a bụ Osimiri Gangites. N’ebe ahụ ndị ozi ala ọzọ ahụ hụrụ nanị ndị inyom, nke otu onye n’ime ha bụ Lidia.

“Onye Na-atụ Egwu Chineke”

Lidia bụ “onye na-atụ egwu Chineke,” ma ikekwe ọ bụ onye na-eso ụzọ ndị Juu nke na-achọgharị eziokwu okpukpe. Ọ bụ ezie na o nwere ezigbo ọrụ, Lidia ahụghị ihe onwunwe n’anya. Kama nke ahụ, o debere oge maka ihe ime mmụọ. “Onyenwe anyị wee meghee obi ya, ịṅa ntị n’ihe nile Pọl na-ekwu,” Lidia nakwerekwaara eziokwu ahụ. N’ezie, “e mere ya na ezinụlọ ya baptism.”—Ọrụ 16:14, 15.

Bible ekwughị kpọmkwem ndị bụ ndị nke ọzọ so n’ezinụlọ Lidia. Ebe a na-ehotaghị banyere di, ọ pụrụ ịbụworị onye na-enweghị di ma ọ bụ onye di ya nwụworo. Ikekwe ihe mejupụtara “ezinụlọ ya” bụ ndị ikwu, ma okwu ahụ pụkwara ịgụnye ndị ohu ma ọ bụ ndị odibo. Ka o sina dị, Lidia ji ịnụ ọkụ n’obi soro ndị so ya biri kerịta ihe ndị ọ mụtaworo. Leekwa ọṅụ ọ na-aghaghị inweworị mgbe ha kwenyere ma nakwere ezi okpukpe ahụ!

“Ọ Rụgidere Anyị”

Tupu ha ezute Lidia, ikekwe ndị ozi ala ọzọ ahụ aghaghị inwe afọ ojuju n’ebe obibi ndị ha nwetara ná mmefu nke ha. Ma obi dị ya ụtọ inwe ike inye ha ebe obibi na nlekọta ọzọ. Otú ọ dị, eziokwu ahụ bụ na ọ ghaghị isi ọnwụ na-egosi na Pọl na ndị ibe ya jụtụrụ. N’ihi gịnị? Pọl chọrọ ‘ime ka ozi ọma ahụ bụrụ ihe ego na-adịghị n’ime ya, ka ọ ghara ijizu ike nke ya ịnara ihe n’ozi ọma ahụ’ wee ghara ịbụrụ onye ọ bụla ibu arọ. (1 Ndị Kọrint 9:18; 2 Ndị Kọrint 12:14) Ma Luk na-atụkwasị: “Mgbe e mere ya na ezinụlọ ya baptism, ọ rịọ anyị, sị, Ọ bụrụ na unu atụlewo na abụ m onye kwere n’Onyenwe anyị, batanụ n’ụlọ m, nọgide n’ebe ahụ. Ọ rụgidere anyị.” (Ọrụ 16:15) Lidia nwere nchegbu karịsịa banyere ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova, ile ọbịa bụkwa n’ụzọ doro anya ihe àmà nke okwukwe ya. (Tụlee 1 Pita 4:9.) Lee ihe nlereanya magburu onwe ya! Anyị onwe anyị kwa ànyị na-eji ihe ndị anyị nwere na-akwalite ọdịmma nke ozi ọma ahụ?

Ụmụnna Nọ na Filipaị

Mgbe a tọhapụrụ Pọl na Saịlas n’ụlọ mkpọrọ mgbe ihe ahụ metụtara nwa agbọghọ ahụ mmụọ ọjọọ ji aka gasịrị, ha laghachiri n’ụlọ Lidia, bụ́ ebe ha hụrụ ụmụnna ụfọdụ. (Ọrụ 16:40) Ndị kwere ekwe nọ n’ọgbakọ Filipaị ahụ e guzobere ọhụrụ pụrụ ịbụ na ha jirịị ụlọ Lidia mee ihe dị ka ebe ha na-ezukọ mgbe nile. Ọ bụ ihe ezi izu dị na ya iche na ụlọ ya nọgidere bụrụ ebe bụ́ isi maka ọrụ ọchịchị Chineke n’obodo ahụ.

Ile ọbịa mbụ ahụ na-ekpo ọkụ nke Lidia gosiri ghọrọ ihe e ji mara ọgbakọ ahụ dum. N’agbanyeghị ịda ogbenye ha, ọtụtụ mgbe ndị Filipaị zigaara Pọl ihe ndị dị ya mkpa, onyeozi ahụ nwekwara ekele.—2 Ndị Kọrint 8:1, 2; 11:9; Ndị Filipaị 4:10, 15, 16.

A kpọtụghị Lidia aha n’akwụkwọ ozi Pọl zigaara ndị Filipaị n’ihe dị ka na 60-61 O.A. Akwụkwọ Nsọ ekpugheghị ihe mere ya mgbe ihe ndị ahụ a kọrọ n’Ọrụ isi nke 16 gasịrị. Ka o sina dị, nhota dị mkpirikpi e hotara nwanyị a siri ike na-eme ka anyị chọọ ‘ịgbaso ọrụ ile ndị ọbịa anya nke ọma.’ (Ndị Rom 12:13) Lee ka anyị si nwee ekele inwe ndị Kraịst dị ka Lidia n’etiti anyị! Mmụọ ha na-eme ihe dị ukwuu iji mee ka ọgbakọ dị iche iche na-ekpo ọkụ ma nwee omume enyi, maka otuto nke Jehova Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a N’ịbụ otu n’ime obodo ukwu ndị kasị mkpa na Masedọnia, Filipaị bụ ógbè ndị agha nke na-emetụ nke ọma bụ́ nke e ji jus italicum na-achị (Iwu Ndị Itali). Iwu a mere ka ndị Filipaị nwee ikike ụfọdụ ndị ha na nke ụmụ amaala Rom hà nhata.—Ọrụ 16:9, 12, 21.

[Igbe dị na peeji nke 28]

Ndụ Ndị Juu na Filipaị

Ibi ndụ na Filipaị agaghị adịworị mfe nye ndị Juu na ndị ọhụrụ na-eso ụzọ ndị Juu. A pụrụ inweworị echiche ụfọdụ megide ndị Juu, n’ihi na ntakịrị oge tupu Pọl abịa, Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu Claudius achụpụworị ndị Juu pụọ na Rom.—Tụlee Ọrụ 18:2.

N’ụzọ dị ịrịba ama, a kpụgara Pọl na Saịlas n’ihu ndị majie mgbe ha gwọsịrị nwa agbọghọ ahụ nwere mmụọ Paịtọn. Ndị nwe ya, n’ịbụ ndị a napụrụ ụzọ ha si enweta ego buru ibu, jiri mbunobi nke ndị amaala ibe ha mee ihe site n’ikwu, sị: “Ndị ikom ndị a, ebe ha bụ ndị Juu, ha na-eme ka obi lọọ ndị obodo anyị mmiri nke ukwuu, ha na-ekwusakwa omenala nke na-ezighị ezi n’iwu ka anyị nara, ma ọ bụ ime, ebe anyị bụ ndị Rom.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi ya, a pịara Pọl na Saịlas ụtarị ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ. (Ọrụ 16:16-24) N’ọnọdụ dị otú ahụ, ife Jehova, bụ́ Chineke ndị Juu, n’ihu ọha chọrọ obi ike. Ma ihe àmà gosiri na o wuteghị Lidia ịdị iche.

[Foto ndị dị na peeji nke 27]

Mkpọmkpọ ebe dị na Filipaị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya