Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịgbasi Mgba Ike Iji Zie Ozi Ọma na Tesalonaịka
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • Mgbe ọ bụla Pọl gara ikwusa ozi ọma n’obodo ọ na-agabeghị mbụ, ọ na-ebukarị ụzọ agakwuru ndị Juu ibe ya n’ihi na ha ma Okwu Chineke, ọ dịkwaara ya mfe ịgwa ha okwu ma nyere ha aka ka ha ghọta ozi ọma ọ na-ekwusa. Otu ọkà mmụta kwuru na ihe mere Pọl ji na-eme otú ahụ bụ na ọ hụrụ ndị Juu ibe ya n’anya. Ụfọdụ chekwara na ihe kpatara ya bụ na ọ na-achọ iji ndị Juu na ndị ọzọ na-atụ egwu Chineke bidogodị ozi ọma ọ na-ekwusara ndị mba ọzọ.—Ọrụ 17:2-4.

      N’ihi ya, mgbe Pọl rutere Tesalonaịka, o bu ụzọ banye n’ụlọ nzukọ ndị Juu, bụ́ ebe “ya na [ndị Juu] nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ . . . , na-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ, ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie, na-asị: ‘Ọ bụ onye a bụ Kraịst, ya bụ, Jizọs a, onye m na-ekwusara unu.’”—Ọrụ 17:2, 3, 10.

      Ọtụtụ ndị Juu achọghị iji ntị anụ ihe ahụ Pọl gwara ha, ya bụ, na onye bụ́ Mesaya ahụ tara ahụhụ ma nwụọ. Ebe ọ bụ na ndị Juu na-ele anya na Mesaya ga-anapụta ha n’aka ndị Rom, ọ na-ewe ha iwe ịnụ na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Pọl mere ka ndị Juu ‘tụgharịa uche’ n’Akwụkwọ Nsọ, ‘kọwaakwa’ ihe ọ na-ekwu ma ‘jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ’ gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ihe mere o ji mee ihe ndị a bụ ka ha kweta ihe ọ na-agwa ha. Nke a gosiri na ọ bụ ezigbo onye nkụzi.a Ma gịnị ka ndị ahụ Pọl na-agwa okwu mere mgbe ọ na-akụziri ha ihe ọma niile ahụ?

  • Ịgbasi Mgba Ike Iji Zie Ozi Ọma na Tesalonaịka
    Ụlọ Nche—2012 | Jun 1
    • a O nwere ike ịbụ na Pọl ji ihe ndị e dere n’Abụ Ọma 22:7; 69:21; Aịzaya 50:6; 53:2-7; na Daniel 9:26 gosi ha na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya