Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Idebe Ụbọchị Izu Ike?
OKÉ mmiri ezowo na June. N’ihi nke a, e mebiri otu omenala ụwa meworo ochie n’oge egwuregwu ịpịa tenis nke Wimbledon afọ 1991. Na nke mbụ ya n’akụkọ ihe mere eme, e nwere nsọrịta mpi n’ụbọchị Sunday iji mejuo oge e gbuworo. E wezụga imebi ụkpụrụ ndị ahụ site n’oge ruo n’oge dị ka nke a, Sunday ka bụkwa ụbọchị dị nsọ nke izu ike n’England, tinyekwara n’ọtụtụ mba ndị ọzọ.
Ndị ụfọdụ na-edebe ụbọchị izu ike dị iche. Ndị Juu n’ụwa nile na-edebe Sabat n’ụzọ chiri anya malite n’ọdịda anyanwụ na Friday ruo n’ọdịda anyanwụ na Saturday. N’oge Sabat, ụgbọ elu nke ụlọ ọrụ ụgbọ elu mba Israel adịghị efe, ná nnukwu obodo ụfọdụkwa, ụgbọ ndị na-ebu ndị njem adịghị arụ ọrụ. Na Jerusalem ndị okpukpe omenala na-emechi okporo ụzọ ụfọdụ iji gbochie ngagharị nile ha lere anya dị ka ndị megidere iwu.
Eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ okpukpe ka na-edebe ụbọchị izu ike ma ọ bụ sabat kwa izu na-ewelite ọtụtụ ajụjụ. Idebe Sabat ọ̀ bụ maka nanị ndị Juu? N’ihi gịnị ka ihe ka ọtụtụ n’ime okpukpe ndị nọ na Krisendọm ji nakwere ụbọchị izu ike dị iche? Idebe ụbọchị izu ike kwa izu ọ̀ ka bụ ihe Bible chọrọ mmadụ n’aka n’oge a?
Sabat Ọ̀ Nọwo Na-adị Adị?
Anyị na-achọta nhota mbụ Akwụkwọ Nsọ hotara sabat n’akwụkwọ Ọpụpụ. Ka ndị Israel nọ n’ọzara, ha natara manna, bụ́ nri ọrụ ebube, sitere n’aka Jehova. Kwa ụbọchị nke isii n’ime izu, ha ga-achịkọta okpukpu abụọ n’ihi na ụbọchị nke asaa gaje ịbụ ‘ụbọchị izu ike nye Jehova,’ bụ́ oge a machibidoro ịrụ ọrụ nile.—Ọpụpụ 16:4, 5, 22-25.
Ọzọkwa, e nyere ndị Israel Sabat iji chetara ha na ha abụwo ndị ohu n’ala Ijipt. Ihe ncheta nke a gaara apụta ihe dị nta ma ọ bụrụ na ha gbasoro iwu dị otú ahụ na mbụ. Ya mere, e nyere nanị Israel ụkpụrụ ndị na-achịkwa Sabat.—Deuterọnọmi 5:2, 3, 12-15.
Ihe Omume Ndị Chọrọ Nlezianya ma Dị Arọ
N’ihi na Iwu Mosis akọwachaghị ihe nile metụtara Sabat, eri ọtụtụ narị afọ ndị rabaị mepụtara ọtụtụ iwu mgbochi, na-amachibido n’ụzọ bụ isi ụdị nile nke ịrụ ọrụ na Sabat. Dị ka Mishnah si kwuo, e kewara ọrụ ndị ahụ a machibidoro n’iwu gaa n’akụkụ 39 bụ isi, dị ka ịkwa ákwà, ide ihe, na ọrụ ugbo. Ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a adabereghị na Bible. N’ịkpọtụ uche n’ihe dị na Mishnah, akwụkwọ bụ́ Encyclopædia Judaica kwetara na ha dị ka “ugwu ndị guzo ná ntutu, n’ihi na e nwere nanị ihe ọmụma dị nta n’isiokwu ahụ n’ime Akwụkwọ Nsọ ma ụkpụrụ ndị ahụ dị ọtụtụ.”
Iji tinye iwu ahụ n’ọrụ nke bụ na mmadụ ekwesịghị “isi n’ebe ọ nọ pụọ n’ụbọchị nke asaa,” e kpebiri ebe a pụrụ ijedebe, a kpọkwara nke a “ebe njedebe Sabat.” Dị ka akwụkwọ ụfọdụ si kwuo, ọ hà ka puku cubit abụọ, ma ọ bụ ihe dị ka 900 mita. (Ọpụpụ 16:29, King James Version) Otú ọ dị, a pụrụ iji ụzọ akọ mebie ụkpụrụ nke a: N’uhuruchi nke bu ụzọ, a pụrụ ịdọta nri Sabat n’ebe dịpụrụ adịpụ dị puku cubit abụọ site n’ụlọ. Mgbe ahụ a pụrụ ile ebe a anya dị ka ngalaba nke ebe obibi ezinụlọ ahụ, a pụkwara ịgụ puku cubit abụọ ọzọ site n’ebe ahụ.
Ọtụtụ n’ime mgbochi ndị a mmadụ mere dị irè n’ụbọchị Jisọs. Otú a, ndị ndú okpukpe kọchara ndị na-eso ụzọ ya maka ịghọrọ oko ọka wee na-ata ka ha na-agafe n’ubi ọka. E boro ha ebubo nke imebi Sabat—e lere ịghọrọ ọka anya dị ka iwe ihe ubi, e lekwara iji aka gbachaa ya dị ka ịzọcha ma ọ bụ igweri ya. Jisọs katọrọ ụzọ gabigara ókè ha si ele ihe anya n’ọtụtụ oge, n’ihi na ha kọwahiere mmụọ nke iwu Jehova.—Matiu 12:1-8; Luk 13:10-17; 14:1-6; Jọn 5:1-16; 9:1-16.
Malite na Sabat Ụbọchị Saturday ruo na nke Sunday
“A ga-edebe Sunday nile maka iji fee Chineke ofufe.” Nke ahụ bụ Iwu nke Anọ na Sabat dị ka Chọọchị Katọlik si kwupụta ya. Akwụkwọ ndị France e bipụtara n’oge na-adịbeghị anya bụ́ Catéchisme pour adultes na-akọwa, sị: “A na-echeta Sunday ndị Kraịst n’ụbọchị na-esote Sabat ahụ: n’ụbọchị nke asatọ, ya bụ, n’ụbọchị nke mbụ nke okike ọhụrụ. Ọ na-ewere oyiyi nile dị mkpa nke Sabat ma o lekwasịrị anya n’Ememe Ngabiga nke Kraịst.” Olee ụzọ mgbanwe nke a nke sabat ụbọchị Saturday ruo na nke Sunday si malite?
Ọ bụ ezie na Sunday bụ ụbọchị e mere ka Jisọs si n’ọnwụ bilie, nye ndị Kraịst oge mbụ ọ bụ ụbọchị ọrụ dị ka nke ọ bụla ọzọ. Ma otu mkpebi nke nzukọ chọọchị dị na Leọdisia (etiti ngwụsị narị afọ nke anọ O.A.) na-ekpughe na mgbe oge na-agabiga, e ji sabat “ndị Kraịst” nke Sunday dochie anya Sabat ndị Juu nke Saturday. Ụkpụrụ iwu nke a “machibidoro onye Kraịst ime dị ka ndị Juu na ịnọ nkịtị n’ụbọchị Sabat [ndị Juu], na a gajekwa ịsọpụrụ ụbọchị Onyenwe anyị [ụbọchị ahụ n’izu mgbe e mere ka o si n’ọnwụ bilie] n’ụzọ ndị Kraịst.” Malite mgbe ahụ gaa n’ihu ndị nọ na Krisendọm na-arụ ọrụ na Saturday nile ma na-ahapụ ịrụ ọrụ na Sunday nile. E mesịa, a chọrọ ha n’aka ịga Mas na Sunday.
Site ná nkwado nke ndị isi ọchịchị, n’oge na-adịghị anya a machibidoro ịrụ ọrụ na Sunday n’ala nile nke Krisendọm. Malite na narị afọ nke isii gaa n’ihu, e riri ndị mebiri iwu ahụ nhá ma ọ bụ pịa ha ihe, a pụkwara ịnakọrọ ha ịnyịnya ha. N’oge ụfọdụ, ndị mmehie na-enweghị nchegharị pụrụ ịbụ ndị e wedara ala ịbụ ndị ohu.
N’echiche ụfọdụ, iwu ndị metụtara ọrụ a pụrụ ịrụ na Sunday dị mgbagwoju anya dị ka omenala ndị na-achịkwa Sabat ndị Juu si dị. Akwụkwọ bụ́ Dictionnaire de théologie catholique na-enye nkọwa toro ogologo banyere mmalite chọọchị malitere iji ụkpụrụ dị iche iche dozie okwu nakwa, n’ime ihe ndị a machibidoro, ọ na-ehota ọrụ ibu ohu, ọrụ ugbo, okwu ikpe, ịzụ ahịa, na ịchụ nta.
N’ụzọ dị mgbagwoju anya, e zoro aka n’ebe Sabat ndị Juu dị dị ka ihe mgbakwasị ụkwụ maka mmachibido ndị a. Akwụkwọ New Catholic Encyclopedia hotara iwu nke Onye Ọchịchị Alaeze Ukwu bụ́ Charlemagne banyere ụbọchị Sunday, sị: “Echiche nke Sabat, bụ́ nke St. Jerome jụrụ kpam kpam na nke Nzukọ nke Orléans katọrọ n’afọ 538 dị ka nke ndị Juu na nke na-abụghị nke ndị Kraịst, bụ nke e kwupụtara nke ọma n’iwu Charlemagne nke afọ 789, bụ́ nke machibidoro ịrụ ọrụ na Sunday dị ka imebi [Iwu Iri ahụ].” Otú a, ọ bụ ezie na ọ na-enye chọọchị ahụ obi ụtọ ịhụ ka ndị isi ọchịchị tiri iwu izu ike n’ụbọchị Sunday, o kwere ka ndị isi ọchịchị a were mgbochi ndị a dị ka ndị ziri ezi n’ihi ntọala iwu nke ọ jụrụ ịnakwere, ya bụ, iwu Mosis banyere Sabat.
Nguzo Na-adabereghị n’Akwụkwọ Nsọ
N’ọtụtụ narị afọ ndị bu ụzọ, ọtụtụ Ndị Nna Chọọchị, na karịsịa Augustine, kwupụtara n’ụzọ ziri ezi na Sabat bụ ndokwa nwa oge e mere maka ndị Juu. Site n’ime otú ahụ, Ndị Nna Chọọchị ahụ nabatara nnọọ ihe Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kọwara, ya bụ, na Sabat bụ akụkụ dị mkpa nke Iwu ọgbụgba ndụ nke a kachapụrụ site n’àjà Jisọs.—Ndị Rom 6:14; 7:6; 10:4; Ndị Galetia 3:10-14, 24, 25.
N’ime akwụkwọ a na-ebi n’oge ahụ bụ́ Vocabulaire biblique, e hotara onye ọkà mmụta okpukpe Protestant bụ́ Oscar Cullmann ka o kwetara na “n’ihi na Jisọs bịara, nwụọ, ma si n’ọnwụ bilie, ememe ndị dị n’A[gba] O[chie] abụwo ndị e mezuru ugbu a, ịnọkwa na-eji ha eme ihe ‘pụtara ichigharịkwuru ọgbụgba ndụ ochie ahụ, dị ka à ga-asị na Kraịst abịaghị ma ọlị.’” Ebe anyị tụleworo isi ihe a gbara ọkpụrụkpụ, ọ̀ ga-ekwe mee inwe ihe mgbakwasị ụkwụ maka idebe Sabat nke bụ iwu?
Taa, ndị Katọlik na-ede akwụkwọ n’ozuzu ha na-achọ nkwado n’Ọrụ Ndị Ozi 20:7, bụ́ nke na-ekwu okwu banyere ‘ụbọchị mbụ n’izu’ (Sunday), mgbe Pọl zutere ndị enyi ya isoro ha rikọọ nri. Otú ọ dị, nke a bụ nnọọ otu isi ihe dị n’akụkọ. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ nke a ma ọ bụ n’amaokwu ndị ọzọ nke Bible na-egosi na e bu n’uche ka ihe ndekọ nke a bụrụ ihe atụ nke ndị Kraịst ga-agbaso, n’ezie ọ bụghị ihe a chọrọ mmadụ n’aka. Ee, idebe Sunday dị ka sabat enweghị nkwado Akwụkwọ Nsọ.
Izu Ike Dị Aṅaa Ka E Nwere Maka Ndị Kraịst?
Ọ bụ ezie na ndị Kraịst anọghị n’iwu idebe otu ụbọchị izu ike n’ime izu, otú o sina dị, a kpọrọ ha òkù idebe izu ike dị n’ụdị ọzọ. Pọl kọwaara ndị Juu bụ́ ndị Kraịst ibe ya nke a, na-asị: “Ya mere idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke. . . . Ya mere ka anyị na-anụ ọkụ n’obi ịba n’izu ike ahụ.” (Ndị Hibru 4:4-11) Ndị Juu ndị a, tupu ha ghọọ ndị Kraịst, agbasowo Iwu Mosis na mbụ n’ụzọ ruru ala dị ka ha pụrụ. Ugbu a Pọl adịghịkwa agba ha ume ịchọ nzọpụta site n’ọrụ kama nke ahụ ka ha ‘zuru ike’ n’ebe ọrụ ha ndị nwụrụ anwụ dị. Malite mgbe ahụ, ha gaje inwe okwukwe n’àjà Jisọs, nke bụ nanị ụzọ ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi bụrụ ndị ezi omume n’anya Chineke.
Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi otu ụdị nchebara echiche ahụ taa maka ụzọ Chineke si ele ihe anya? Dị ka ndị mmadụ ibe ha, Ndịàmà Jehova, dị ka ụmụ mmadụ nwere uche, na-aghọta mkpa ọ dị inwe ụbọchị izu ike kwa izu n’ebe ọrụ ụwa dị, bụ́ nke dị irè n’ọtụtụ mba. Nke a na-enye ha ohere inwe mkpakọrịta na ntụrụndụ ezinụlọ. Ma karịsịa, ọ ghọwo oge maka nchụso ndị ọzọ nke ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 5:15, 16) Ndị a gụnyere nzukọ na ikere òkè n’ije ozi ihu ọha, na-eleta ndị agbata obi ha ikerịta ihe ọmụma Bible banyere oge ahụ nke na-abịanụ mgbe ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe ga-enwe udo zuru ụwa ọnụ. Ọ bụrụ na ị ga-enwe mmasị ịmara banyere nke a, Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka, ma nke ahụ ọ̀ bụ na Saturday, Sunday, ma ọ bụ ụbọchị ọ bụla ọzọ n’izu.
[Foto dị na peeji nke 28]
Jisọs debere iwu Sabat n’ụzọ zuru okè, kama idebe omenala ndị Juu
[Foto dị na peeji nke 29]
Ihe nchụso ndị Kraịst na-eweta ntụrụndụ n’ụbọchị izu ike n’ebe ọrụ ụwa dị