-
Olee Ụdị Onye Jizọs Bụ?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
6. Jizọs na-emesapụ aka
Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ na-emesapụ aka n’agbanyeghị na o nweghị oké ihe. Ọ gwakwara anyị ka anyị na-eme otú ahụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 20:35. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị ka Jizọs kwuru ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ?
Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-enye onyinye, ọ bụrụgodị na o nweghi oké ihe anyị nwere?
-
-
Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Ọrụ na EgoNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
3. Olee otú anyị ga-esi na-eji ego anyị eme ihe bara uru?
Jehova bụ Chineke na-emesapụ aka. Anyị na-eme ka ya ma ọ bụrụ na anyị “na-emesapụ aka, na-enyekwa ndị ọzọ ihe.” (1 Timoti 6:18) Anyị na-eji ego anyị eme ihe bara uru ma ọ bụrụ na anyị ejiri ya na-enye aka n’ọgbakọ, jirikwa ya na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, karịchaa ụmụnna anyị. Ihe na-atọ Jehova ụtọ bụ ihe anyị bu n’obi nye onyinye, ọ bụghị otú ihe anyị nyere hà. Anyị si n’ala ala obi anyị na-enye ndị ọzọ ihe, anyị ga na-enwe obi ụtọ, ihe anyị ga-adịkwa Jehova mma.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 20:35.
-