Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya ya
    Ụlọ Nche—2011 | Jun 15
    • 7, 8. Olee otú ụdị ndụ ndị ikom abụọ zuru okè biri si rụpụta ihe dị iche?

      7 N’ihi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ, o mere ihe ga-eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha pụọ ná mmehie ha ketara eketa. Pọl kọwara na onye e si n’aka ya mee ka nke a nwee isi bụ nwoke ọzọ, onye zukwara okè ka Adam, bụ́ onye e nwere ike ịkpọ Adam nke abụọ. (1 Kọr. 15:45) Ma ụdị ndụ onye nke ọ bụla n’ime ndị ikom abụọ a biri rụpụtara ihe dị iche. Olee otú o si bụrụ eziokwu?—Gụọ Ndị Rom 5:15, 16.

      8 Pọl dere, sị: “Ọ bụghị otú onyinye ahụ dị ka njehie ahụ dị.” Ọ bụ Adam bụ onye jehierenụ, a makwara ya ikpe kwesịịrị ya, ọ nwụrụ. Ma, ọ bụghị naanị ya ga-anwụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ mmadụ nwụrụ site ná njehie nke otu onye [ahụ].” Ikpe a mara Adam, bụ́ nke kwesịịrị ya, ka e kwesịkwara ịma ụmụ ya niile na-ezughị okè, ma anyịnwa. N’agbanyeghị nke ahụ, ịmata na Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, nwere ike imere anyị ihe dị iche, ga-emeli ka obi rutụ anyị ala. Olee ihe dị iche ọ ga-eme? Pọl zara ya mgbe o kwuru okwu banyere ‘ịkpọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume ka ha wee nweta ndụ.’—Rom 5:18.

      9. Ndị Rom 5:16, 18 kwuru na Chineke kpọrọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume. Gịnị ka ọ pụtara?

      9 Gịnị ka okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ịkpọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume” nakwa ‘ịkpọ ụdị mmadụ niile ndị ezi omume’ pụtara? Otu onye na-asụgharị Baịbụl dere banyere nke a, sị: “E nwere ihe ya na ya yiri n’okwu ikpe. Ọ na-akọwa mgbanwe e nwere n’otú Chineke si na-ele mmadụ anya, ọ bụghị mgbanwe onye ahụ mere ná ndụ ya . . . Ọ dị ka iji Chineke tụnyere onyeikpe nke kpelaara onye a kpọtara n’ụlọikpe ya nke e boro ebubo na ọ bụ onye ajọ omume. Ma Chineke ekpebie ka a hapụ ya.”

  • Chineke Mere Ka Anyị Mata Ịhụnanya ya
    Ụlọ Nche—2011 | Jun 15
    • 14, 15. Olee ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ndị Chineke kpọrọ ndị ezi omume, ma olee ihe ha ka kwesịrị ime?

      14 N’eziokwu, ọ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na-agbaghara mmadụ mmehie o ketara eketa na mmehie ndị onye ahụ mere. Ị gaghị agụtali mmehie ole ndị mmadụ mere tupu ha aghọọ Ndị Kraịst, ma, Chineke nwere ike ịgbaghara ha n’ihi àjà mgbapụta ahụ. Pọl dere, sị: “Ọ bụ ọtụtụ njehie wetara onyinye ahụ nke rụpụtara ịkpọ ụmụ mmadụ ndị ezi omume.” (Rom 5:16) Ndịozi na ndị ọzọ e nyere onyinye a (ya bụ, ịbụ ndị a kpọrọ ndị ezi omume) ga-ejirịrị okwukwe na-efe ezi Chineke. Olee ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ha n’ọdịnihu? “Ndị na-anata obiọma dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ na onyinye ezi omume dị ukwuu nke e nyere n’efu ga-adị ndụ wee chịa . . . dị ka ndị eze site n’aka otu onye ahụ, ya bụ, Jizọs Kraịst.” N’ezie, onyinye ezi omume na-eme ihe dị iche n’ihe mmehie Adam mere. Onyinye ahụ na-eme ka e nweta ndụ.—Rom 5:17; gụọ Luk 22:28-30.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya