Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 1/1 p. 10-15
  • ‘Ndị Ihere Ozi Ọma Ahụ Na-adịghị Eme’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Ndị Ihere Ozi Ọma Ahụ Na-adịghị Eme’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • E Kwusara Ozi Ọma ahụ n’Ụwa Nile
  • Ozi Kachasị Mma A Pụrụ Ịkpọsa
  • Ndị Ihere Jisọs Kraịst na Jehova Na-adịghị Eme
  • Ndị Ihere Na-adịghị Eme Ịtụ Egwu Chineke na Inye Ya Otuto
  • ‘Ihere Ozi Ọma Anaghị Eme Anyị’
    2024-2025 Usoro Ihe Omume Mgbakọ Sekit nke Onye Na-anọchite Anya Alaka Ụlọ Ọrụ
  • E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • A Ghaghịkwa Ibu Ụzọ Kwusaa Ozi Ọma nke A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • “Na-ezisa Ozi Ọma nke Ezi Ihe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 1/1 p. 10-15

‘Ndị Ihere Ozi Ọma Ahụ Na-adịghị Eme’

“Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m: n’ihi na ọ bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta nye onye ọ bụla nke kwere.”—NDỊ ROM 1:16.

1. Olee ụzọ a na-esikarị anara ozi dị mma, ma olee ụzọ ndị na-enweghị okwukwe bi n’ụwa si na-ele ozi ọma nke Alaeze Chineke anya?

Ọ PỤRỤ ịbụ na ihe bụụrụ otu onye ozi ọma agaghị abụ ozi ọma nye onye ọzọ. N’ụzọ nkịtị, a na-enye onye wetara ozi ọma ezi nnabata, a ga-ejikwa ịnụ ọkụ n’obi chee ntị n’ebe ọ nọ ịnụrụ ozi ahụ. Otú ọ dị, Bible buru amụma na ndị ụwa na-enweghị okwukwe agaghị ele ozi ọma ahụ nke Alaeze Chineke na ozi ya nke nzọpụta anya dị ka ihe na-enye obi ụtọ.—Tụlee 2 Ndị Kọrịnt 2:15, 16.

2. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru banyere ozi ọma ahụ nke ọ na-ekwusa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ozi ahụ o kwusara ka ji bụrụ ozi ọma taa?

2 E zipụrụ Pọl onyeozi ikwusara ọha mmadụ ozi ọma. Gịnị ka o chere banyere ọrụ ahụ e nyere ya? Ọ sịrị: “Ọ dị m ọkụ n’obi izikwa unu ndị bi na Rom ozi ọma. N’ihi na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m.” (Ndị Rom 1:15, 16) Ka ozi wee bụrụ ihe ka dịkwa mma taa, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ kemgbe Pọl degasịịrị ndị Kraịst bi na Rom akwụkwọ ahụ, ọ ghaghị ịbụ nnọọ ozi ọma na-adịgide adịgide. N’ezie, ọ bụ “ozi ọma ebighị ebi.”—Mkpughe 14:6.

3, 4. Gịnị mere Pọl onyeozi ji sị na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme ya?

3 N’ihi gịnị ka Pọl onyeozi ji kwuo na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme ya? N’ihi gịnị ka ihere ya pụrụ ijiworị mee ya? N’ihi na ọ bụghị ozi dị ọha mma, n’ihi na o metụtara otu nwoke onye a kpọgburu n’elu osisi ịta ahụhụ dị ka à ga-asị na ọ bụ ajọ onye omempụ, na-eme ka o yie nnọọ onye ọjọọ n’ụzọ nile e si ele ya anya. Ruo afọ atọ na ọkara, nwoke ahụ ji ozi ọma ahụ gaa n’ugwu na ndịda Palestine, o zutekwara mmegide siri ike site n’aka ndị Juu, karịsịa site n’aka ndị ndú okpukpe. Ugbu a kwa, Pọl, onye a kpọkwasịrị aha nwoke ahụ a kwara emo, na-echekwa ịkpọasị dị otú ahụ ihu. —Matiu 9:35; Jọn 11:46-48, 53; Ọrụ 9:15, 20, 23.

4 N’ihi mmegide dị otú ahụ, a pụrụ ileworị Pọl na ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst ibe ya anya dị ka ndị nwere ihe na-eweta ihere. N’ezie, ugbu a Pọl na-ejigidesi ike ihe ya onwe ya leburu anya dị ka ihe ihere. Ọ na-ekerebu òkè n’onwe ya n’ikwutọ ndị na-eso Jisọs Kraịst n’ụzọ dị ukwuu. (Ọrụ 26:9-11) Ma ọ dịghị agbasokwa ụzọ ihe omume ahụ. N’ihi nke a, ya na ndị ọzọ ghọrọ ndị Kraịst nwetara mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ.—Ọrụ 11:26.

5. Olee ụzọ Pọl si kọwaa okwu ya nke metụtara ịbụ onye ihere ozi ọma ahụ na-adịghị eme?

5 Ọ bụrụ na mmadụ ekwee ka ihere mee ya n’ihi ịbụ onye na-eso ụzọ Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ na ọ na-ele ihe anya dị ka mmadụ si ele ya. Pọl onyeozi adịghị otú ahụ. Kama nke ahụ, n’ịkọwa ihe mere na ihere adịghị eme ya n’ihi ozi ọma ahụ nke ọ na-ekwusa, ọ sịrị: “Ọ bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta nye onye ọ bụla nke kwere.” (Ndị Rom 1:16) Ike Chineke abụghị ihe na-eweta ihere ma ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ site n’otu onye na-eso ụzọ Jisọs maka mmezu nke nzube kwesịrị otuto nke Chineke ahụ dị ebube, onye Jisọs n’onwe ya bụkwa onye na-efe ya, na-enyekwa ya otuto.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 1:18; 9:22, 23.

E Kwusara Ozi Ọma ahụ n’Ụwa Nile

6, 7. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa banyere ozi ọma ahụ ka Ndịàmà Jehova na-agbalị ime ihe kwekọrọ na ya, gịnịkwa si na nke ahụ na-apụta? (b) Ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe anyị na-achọ ikwe ka egwu mee ka anyị gbara ịgba àmà, gịnị pụrụ ịdị mkpa ka e mee mgbe ụfọdụ? (Lee nkọwa ala ala peji.)

6 Dị ka Pọl, Ndịàmà Jehova nke oge a bụ ndị na-eso ụzọ Ọkpara ya e meworo ka ọ dị ebube, bụ́ Jisọs Kraịst. Jehova ejiriwo ntụkwasị obi tinye ‘ozi ọma ahụ dị ebube’ n’aka Ndịàmà ya ndị a idebe. (1 Timoti 1:11) Ndịàmà Jehova adabeghị mbà n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ibu ọrụ nke a dị arọ, a na-agbakwa ha ume ka ihere ya ghara ime ha. (2 Timoti 1:8) Ọ dị oké mkpa ịghara ikwe ka egwu ma ọ bụ ime ihere mee ka anyị laa azụ site n’ịgba àmà na ime ka a mara anyị dị ka Ndịàmà Jehova.a

7 Iji anya ike na atụghị egwu na-agba àmà n’ụzọ dị otú ahụ emewo ka aha nke Chineke Onye Kasị Elu bụrụ nke a kpọsara n’elu ụwa dum, ka ozi ọma nke Alaeze ya bụrụkwa nke e kwusara n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Okpara Chineke sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa,” a pụghịkwa ikwe ka amụma ya bụrụ ihe dara ada. (Matiu 24:14) A na-ekwusa ozi ọma ahụ ugbu a n’ihe karịrị 210 ala, e rubeghịkwa ọgwụgwụ nke ọrụ nkwusa nke a. N’ịbụ ndị ihere ozi ọma ahụ na-adịghị eme, ndị jikwa obi ike na-eche ihu n’ọdịnihu, anyị na-ekpe ekpere dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst n’oge mbụ kpere, sị: “Ugbu a, [Jehova, NW] . . . nyekwa ndị ohu gị ike ka ha were nkwuwa okwu nile kwuo okwu gị.”—Ọrụ 4:29.

8. N’ihi gịnị ka mkpagbu a na-enye Ndịàmà Jehova ná mba nile nke ụwa na-ekwesịghị ịkụda ha aka?

8 Ọ bụ ezie na a kpọrọ Ndịàmà Jehova asị, na-emegidekwa ha ná mba nile nke ụwa, nke a bụ ná mmezu nke ihe e buru n’amụma dị ka ihe e ji amara ndị na-efe otu ezi Chineke ahụ dị ndụ ezi ofufe. (Jọn 15:20, 21; 2 Timoti 3:12) Ya mere, kama ịbụ ndị a kụdara aka, ndị e mekwara ka obi ha daa mbà n’ihi nke a, a na-emesi ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma obi ike na ha nwere nkwado Chineke, na ha nọkwa n’ezi nzukọ ahụ nke Eze Eluigwe na Ala bụ́ Jehova.

9. N’ihi gịnị ka ọ na-adịghị ihe o mere na ụwa nile na-emegide anyị?

9 Echefukwala: Anyị nwere nkwado nke Chineke Onye Kasị Elu nke eluigwe na ala. Ya mere, gịnị ka o mere ma ọ bụrụ na ụwa na òtù okpukpe na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya nile na-emegide anyị? Ụwa nile megidere Ọkpara Chineke mụrụ nanị ya, ihere adịghị emekwa anyị ịbụ ndị a chọtara n’otu ọnọdụ ahụ. Dị ka ọ gwara ndị ozi ya: “Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, unu mara na ọ kpọwo mụ onwe m asị mgbe ọ ka-akpọghị unu asị. Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”—Jọn 15:18, 19.

10. N’ole ebe ka akụkụ dị ukwuu nke mkpagbu a na-enye Ndịàmà ahụ si na-abịa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihere ya na-adịghị eme ha?

10 N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova enwewo ntachi obi ná mkpagbu gburugburu ụwa, ma karịsịa n’ime mba ndị ahụ mejupụtara ihe ahụ a kpọrọ Krisendọm. Mkpagbu dị otú ahụ site n’aka Krisendọm adịghị egosipụta na Ndịàmà ahụ abụghị ndị Kraịst. Kama nke ahụ, ọ na-akwado ihe ha na-ekwu na ha bụ ezi ndị Kraịst, bụ́ Ndịàmà nke Chineke na Nna nke Jisọs Kraịst, onye aha ya bụ Jehova. N’ihi na ha bụ Ndịàmà Chineke, ihere adịghị eme ha mgbe ha na-ata ahụhụ mkpagbu n’ihi okwu ndị dị otú ahụ metụtara okpukpe. N’ihi nke a, ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ka ha ghara ịbụ ndị ihere na-eme kwesịrị nnọọ ekwesị nye Ndịàmà Jehova ugbu a.—Lee Ndị Filipaị 1:27-29.

Ozi Kachasị Mma A Pụrụ Ịkpọsa

11. Site n’ịnara aha ahụ bụ Ndịàmà Jehova, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ na anyị akwụsịbeghị ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst?

11 Ndịàmà Jehova ejiriwo obi ike nakwere aha ha n’imezu nkwa Jehova kwere ndị ahụ ya na ha nọ n’ọgbụgba ndụ n’Aịsaịa 43:10. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ha adịghị esokwa Jisọs Kraịst. Jisọs bụ Onyendú ha, onye ha na-agbaso ihe nlereanya ya. Ya onwe ya bụkwa otu n’ime ndịàmà Jehova. N’eziokwu, ọ bụ Onyeàmà Jehova nke bụ isi.—1 Timoti 6:13; Mkpughe 1:5.

12. Ụdị ozi dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa gburugburu ụwa, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Ozi nke Ndịàmà ndị a nke Jehova na-ekwusa n’ụwa nile bụ ozi kachasị mma a pụrụ ịkpọsa mgbe ọ bụla. Ọ dịghị ọchịchị pụrụ ịdị mma nye ihe a kpọrọ mmadụ karịa Alaeze Mesaịa ahụ nke Jehova guzobeworo ịchị elu ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ nke o ji n’ihi ya zite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya ịgbapụta ha. (Aịsaịa 9:6, 7) Ndị bi n’elu ala, bụ́ ndị a na-ekwusara ozi ọma Alaeze ahụ bụ ndị a na-enye ohere ịnakwere ya iji gosi na ha ruru eru ịnata onyinye nke ndụ ebighị ebi n’izu okè mmadụ n’elu ala bụ́ paradaịs.

13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ọchịchị Alaeze Mesaịa ga-abụ ọchịchị kachasị mma, aro dịkwa aṅaa ka Ndịàmà ahụ na-atụrụ ụmụ mmadụ n’emeghị ihere?

13 N’ezie, ọ bụrụ na Jisọs dị njikere ịnwụ ọnwụ obi ọjọọ ka o wee nwee ike ịnapụta ndị ahụ gaje ịbụ ndị ọ na-achị, ọ bụ ihe e ji n’aka na ọ gaje inye ha ọchịchị nke kachasị ọchịchị nile mma. Anyị na-atụrụ mmadụ ọ bụla e kere eke nke bi n’elu ala aro, sị: Ghọọ onye kwesịrị ntụkwasị obi nke na-erube isi, onye nọ n’okpuru ọchịchị ahụ. Ihere ọchịchị ahụ nke anyị na-atụrụ ihe nile a kpọrọ mmadụ aro ịnakwere adịghị eme anyị. Anyị adịghị ala azụ n’ikwusa Alaeze ahụ, o bụ ezie na ime nke a pụrụ iwetara anyị mkpagbu. Dị ka Pọl onyeozi, onye ọ bụla n’ime anyị na-asị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m.”

14. Dị ka Jisọs kwuru, olee otú mkpọsa Alaeze ahụ ga-agbasaru n’oge anyị a?

14 Jisọs buru amụma na nkwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ ga-abụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ, amụma nke a sara mbara nke jikọtara ihe nile kwesịkwara nnọọ ekwesị maka ozi dị otú ahụ. (Mak 13:10) Ọ laghị azụ n’ibu amụma banyere nkwusa nke Alaeze Jehova ruo n’ebe ndị kasị dị anya—ee, ruo ná nsọtụ nile nke ụwa. (Ọrụ 1:8) Jisọs maara na n’ebe ọ bụla a pụrụ ịchọta ndị mmadụ, ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ga-eme ezi mgbalị iji ozi ọma Alaeze ahụ rute ha.

15, 16. (a) Olee ndị kwesịrị ka e jiri ozi ọma ahụ rute ha? (b) N’ihi gịnị ka a ga-eji rụzuo ọrụ nkwusa ahụ n’agbanyeghị mmegide sitere ná nzukọ Ekwensu?

15 Ọnụ ọgụgụ ndị bi n’elu ala taa ruru ọtụtụ ijeri mmadụ, ha gbasakwara na kọntinenti nile na agwaetiti ndị bụ isi ndị dị n’oké osimiri nile. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị akụkụ ọ bụla nke elu ụwa mmadụ bi n’ime ya nke dịworo anya nke ukwuu nke na Ndịàmà Jehova apụghị ime mgbalị iji ozi ọma ahụ rute ya. Elu ụwa dum mmadụ bi bụ ihe mgbakwasị ụkwụ ihe atụ nke Jehova Chineke. (Aịsaịa 66:1) Ụmụ mmadụ e kere eke ndị na-ebi n’akụkụ ọ bụla nke ihe mgbakwasị ụkwụ ya kwesịrị ịbụ ndị e ji ozi nzọpụta nke a rute.

16 Ozi ọma ahụ taa bụ ozi na-enye obi ụtọ nke ọchịchị eze nke e guzobewororịị n’aka Mesaịa ahụ. Jisọs maara na n’agbanyeghị mkpagbu kasị sie ike site n’aka nzukọ Ekwensu, mmụọ Chineke ga-akpali ezi ndị na-eso ụzọ Mesaịa ahụ ime ihe nile ha nwere ike ime ka e wee nwee ike ‘ikwusa ozi ọma nke alaeze ahụ n’elu ụwa dum mmadụ bi’ dị ka eziokwu nke guzosiri ike.—Matiu 24:14.

Ndị Ihere Jisọs Kraịst na Jehova Na-adịghị Eme

17. (a) Gịnị ka ihere ya na-adịghị eme ndị na-efe ezi ofufe? (b) Ụkpụrụ dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ na Mak 8:38, oleekwa otú o si dịrị mkpa?

17 Chineke Onye Kasị Elu alaghị azụ n’inye onwe ya aha, bụ́ Jehova; ihere aha ahụ ekwesịghịkwa ime ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe. Ndị na-efe ezi ofufe nwere obi ụtọ ịbụ ndị a maara, ndị ihe e jikwa amata ha bụ ịbụ ndị na-enye ya ofufe na nrubeisi a na-ekewaghị ekewa. N’ihe banyere onwe ya, Jisọs setịpụrụ ihe bụ iwu ma ọ bụ ụkpụrụ a ga-agbaso, na Mak 8:38, sị: “Onye ọ bụla ihere mụ onwe m na okwu m nile ga-eme n’ọgbọ a nke na-akwa iko, nke na-emehiekwa, ihere onye ahụ ga-emekwa Nwa nke mmadụ, mgbe ọ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya dị nsọ.” N’otu aka ahụ, onye ọ bụla nke ga-eme ihere n’ihi Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-ezi nnọọ ezi Jehova imekwa ihere banyere onye dị otú ahụ. Ihe ọ bụla e kere eke, nke ihere mere Jehova n’ihi ụzọ ekwesịghị ntụkwasị obi ọ na-agbaso, agaghị ekwesị nnọọ ekwesị ịdị ndụ n’akụkụ ọ bụla nke ebe Chineke na-achị n’eluigwe ma ọ bụ n’elu ala.—Luk 9:26.

18. (a) N’ihi gịnị ka okwu Jisọs nke dị na Matiu 10:32, 33 kwesịrị iji gbanyesie mkpọrọgwu ike n’ime obi na n’uche anyị? (b) Gịnị na-eme ndị ahụ na-agọnarị Jisọs na Jehova n’ihi egwu mmadụ? (Nye ihe atụ ndị dabeere ná nkọwa ala ala peji.)

18 Ka okwu ndị a na-esonụ nke Jisọs Kraịst gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’ime obi anyị na n’uche anyị: “Ya mere, onye ọ bụla nke ga-ekwupụta m n’ihu mmadụ, ya ka mụ onwe m ga-ekwupụtakwa n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe. Ma onye ọ bụla nke ga-anọnarị m n’ihu mmadụ, ya ka mụ onwe m ga-agọnarịkwa n’ihu Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 10:32, 33; Luk 12:8, 9) N’otu ihe ndabere ahụ, onye ọ bụla nke ga-agọnarị Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka Ya onwe ya ga-agọnarịkwa. A g-ghị agụ ya n’onye ruru eru iso n’ezinụlọ ahụ nke Jisọs Kraịst bụ Ọkpara na ya. Ya mere, a ghaghị ibibi onye ahụ n’oge Chineke kara aka.b

19, 20. (a) N’ihi gịnị ka ndị ahụ kpeworo ekpere ka e doo aha Jehova nsọ na-agaghị enwe ihe ọ bụla mere ihere ga-eji mee ha? (b) Gịnị ka ndị nkwusa Alaeze ahụ egwu na-adịghị atụ rụzuworo, ọ̀ bụkwa site ná nkwado dị aṅaa?

19 A ga-aza ekpere nlereanya ahụ Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) Mgbe nke ahụ mere, ndị na-eso ụzọ Jisọs ahụ na-ahụ n’anya agaghị enwe ihe ọ bụla ihere ga-eme ha n’ihi ya. A ga-enye aha Jehova nsọpụrụ, doo ya nsọ, ọ bụghị nanị site n’aka ọtụtụ nde mmadụ ndị dị ndụ ugbu a, ndị ọ na-agaghị adị mkpa ma ọlị ka ha nwụọ anwụ, kama sitekwa n’aka ọtụtụ ijeri mmadụ ndị ọ ga-akpọghachi site n’ili ha dị iche iche n’ime ọchịchị puku afọ nke Alaeze ahụ. Ha ga-enwe ohere nke ibi n’elu ala bụ paradaịs ruo mgbe ebighị ebi.

20 N’emeghị ihere, ndị a egwu na-adịghị atụ, ndị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ahụ enwewo ike ịgba àmà zuru ụwa ọnụ n’agbanyeghị mmegide ha na-enweta n’ụwa nile n’ihi na ha nwere ike karịrị nke mmadụ nke na-akwado ha—nkwado nke ndị mmụọ ozi bi n’eluigwe. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova ‘na-atụ egwu Chineke, na-enyekwa ya otuto.’—Mkpughe 14:6, 7.

Ndị Ihere Na-adịghị Eme Ịtụ Egwu Chineke na Inye Ya Otuto

21. Gịnị ka ihere na-emebeghị Ndịàmà Jehova ime, gịnị sikwa na ya pụta?

21 Ndịàmà Jehova egosipụtawo onwe ha ịbụ ndị ihere na-adịghị eme ịtụ egwu Chineke na inye ya otuto, ọbụna na-eji aha ahụ o nwere n’onwe ya, bụ́ Jehova, na-eme ihe. Nke a arụpụtaworo ha ngọzi ndị a na-apụghị iji ọnụ akọ. Ngọzi ndị a abịawo site ná mmezu nke na-egosi ikwesị ntụkwasị obi nke nkwa ndị ahụ Chineke Onye Kasị Elu kwere. Lee nnọọ ka nke a siworo bụrụ ihe na-anwapụta ya dị ka nanị otu ezi Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Eze Onyenwe eluigwe na ala!

22. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ga-eji chee mkpagbu dị oké njọ ihu, ma ọṅụ dị aṅaa ga-abụ nke ha?

22 N’ọdịnihu nke na-abịa ọsọ ọsọ, ọchịchị ụwa dị iche iche ga-echigharị imegide ịchịisi ndị okpukpe, kpochapụkwa ha nile—gụnyere Krisendọm. (Mkpughe 17:16, 17) N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova gaje iche ihu oge mkpagbu dị oké njọ site n’aka ndị ụwa. Ha agaghị enwe ike inwe ntachi obi ma gabiga ya ma ọ bụrụ na Chineke ahụ na-adịru ebighị ebi anọnyereghị ha. Ma ọ nọnyeere ha, ya mere ha ga-enwekwa ọṅụ nke ịhụ ka e kpochapụrụ ndị iro nile dị otú ahụ na-emegide ndị Kraịst, ndị na-emegide Jehova, site n’aka Chineke ahụ onye Ndịàmà ahụ na-efe ofufe n’esepụghị aka. Ha agaghị enwe ihe ihere nke ịbụ ndị e kpughere, bibiekwa ha dị ka ndị iro nke ezi ọchịchị Chineke, kama ha ga-enwe ọṅụ ahụ a na-apụghị iji ọnụ akọ n’ịbụku Jehova abụ, sị: “Ọbụna site na mgbe ebighị ebi ruo na mgbe ebighị ebi, gị onwe gị bụ Chineke.”—Abụ Ọma 90:2.

23. N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova na-enweghị ihe ọ bụla mere ihere ga-eji mee ha, gịnị ga-esikwa na ya pụta?

23 Ha ga-enwe ebube n’ebe Chineke nọ, bụ́ Nna nke Jisọs Kraịst, onye e sitere n’aka ya gbapụta ezinụlọ nke ihe a kpọrọ mmadụ inweta ndụ ebighị ebi n’izu okè mmadụ na obi ụtọ n’elu ala nke bụ paradaịs. Lee ka Jehova siworo gosi onwe ya ịbụ Chineke siri ike site n’aka Kraịst Jisọs! Lee nnọọ ụzọ mara mma Jehova siworo gosi onwe ya ịbụ onye na-eji ike ya nke pụrụ ime ihe nile na-eme ihe n’ụzọ amamihe, ọ bụghị iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi! N’ihi nke a, ọ dịghị ihe ọ bụla mere ihere ga-eji mee anyị n’ihe banyere ya ma ọ hụ n’ihe banyere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Ihere adịghị eme anyị ịbụ ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ dị ebube nke na-egosipụta ike Jehova Chineke nwere imeri ihe nile site n’aka Kraịst Jisọs, onye kwuru n’oge ndụ elu ala ya na-agwụsị, si: “Nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.” (Jọn 16:33) N’ịgbaso ụzọ nke a, ka anyị nọgide na-agbaso ihe nlereanya nke Pọl onyeozi, onye ọ na-adịghị mgbe ọ bụla ihere ozi ọma ahụ mere ya. Ọ bụrụ na anyị emee nke ahụ, ihere anyị agaghị eme Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na anyị achọghị ka ihere mee anyị ikwupụta eziokwu ahụ nke bụ na anyị bụ Ndịàmà, e nwere oge mgbe ndị anyị na-aghaghị ịbụ “ndị nwere uche dị ka agwọ.” (Matiu 10:16) Ndịàmà nọ na Nazi Germany maara na e nwere oge ha kwesịrị ime ka a mara ndị ha bụ, nweekwa mgbe ha na-agaghị eme otú ahụ.—Tụlee Ọrụ 9:23-25.

b Mgbe mgbe, ndị gọnarịworo Jisọs na Jehova n’ihi egwu ụmụ mmadụ anatabeghị ihu ọma site n’ụwa. Dị ka ihe atụ, lee Ụlọ Nche nke May 1, 1989, peji 12; 1982 Yearbook, peji 168; 1977 Yearbook, peji 174-176; 1974 Yearbook, peji 149, 150, 177, 178. N’aka nke ọzọ, ọbụna ndị kpebisiri ike imegide ozi ọma ahụ na-atụ anya na Ndịàmà ahụ agajeghị ịgọnarị Jisọs na Jehova. (1989 Yearbook, peji 116-118) Leekwa Matiu 10:39 na Luk 12:4.

Ajụjụ Nchịkọta

◻ Dị ka Pọl onyeozi, omume dị aṅaa ka anyị kwesịrị inwe n’ihe banyere ikwusa ozi ọma ahụ, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

◻ N’ihi gịnị ka ozi ahụ Ndịàmà Jehova na-akpọsa ji bụrụ ozi kachasị mma e nwetụrụla?

◻ Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere onye ọ bụla nke ihere ya ga-eme mgbe ọ bịara n’ebube nke Alaeze?

◻ Gịnị ga-eme ndị ahụ na-agọnarị Jisọs na Jehova?

◻ Gịnị ka ndị ahụ na-ekwusa ozi ọma nweworo ike ịrụzu n’emeghị ihere, ọ bụkwa n’ihi gịnị?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya