Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Gịnị bụ “ezi ihe” Pọl onyeozi na-apụghị ime, dị ka o kwuru ná Ndị Rom 7:19?
N’ụzọ bụ isi, Pọl na-ezo aka n’adịghị ike ya imezu ezi ihe ndị ahụ e depụtara n’Iwu Mosis. Nke ahụ bụ ihe na-ekweghị mee nye Pọl na ndị ọzọ, gụnyere anyị, n’ihi ezughị okè na mmehie. Ma e nweghị ihe mere a ga-eji nwee nkụda mmụọ. Àjà Kraịst meghere ụzọ maka inweta mgbaghara Chineke na ezi nguzo n’ihu Ya.
Ndị Rom 7:19 na-agụ, sị: “N’ihi na ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” Ihe ndị e kwuru na gburugburu ebe ahụ na-egosi na Pọl na-ekwu n’ụzọ bụ isi banyere “ezi ihe” n’echiche nke ihe Iwu ahụ chọrọ. N’amaokwu nke 7 o kwuru, sị: “Iwu ahụ ọ̀ bụ mmehie? Chineke ekwela. Kama, m gaghị amaworị mmehie, ma ọ bụrụ na esiteghị m n’aka Iwu mara ya: n’ihi na m gaghị amataworị agụụ ihe ọjọọ, ma ọ bụrụ na Iwu ahụ asịghị, Agụụ ihe ọjọọ agụla gị.” Ee, Iwu ahụ mere ka o doo anya na ebe ha na-apụghị idebe ya kpam kpam, mmadụ nile bụ ndị mmehie.
Pọl gara n’ihu ikwu na ya “na-adị ndụ n’otu mgbe n’oge Iwu na-adịghị.” Olee mgbe nke ahụ bụ? Ọ bụ mgbe ọ ka nọ n’úkwù Abraham tupu Jehova enye Iwu ahụ. (Ndị Rom 7:9; tụlee Ndị Hibru 7:9, 10.) Ọ bụ ezie na Abraham ezughị okè, e nyebeghị Iwu ahụ, ya mere e chetereghị ya ịbụ onye mmehie ọ bụ site n’ọdịda ọ dara n’idebe ọtụtụ ihe ndị ahụ e nyere n’iwu. Nke ahụ ọ̀ pụtara na ozugbo e nyere Iwu ahụ ma gosipụta ezughị okè mmadụ, ọ rụpụtara ihe ndị dị njọ? Ọ dịghị ma ọlị. Pọl gara n’ihu, sị: “Ya mere Iwu ahụ dị nsọ n’ezie, ihe e nyere n’iwu dịkwa nsọ, ziekwa ezi, bụrụkwa ezi ihe.”—Ndị Rom 7:12.
Rịba ama na Pọl kọwara Iwu ahụ dị ka nke “dị nsọ” “ziekwa ezi.” N’amaokwu ndị na-eso, ọ kọwara na “ezi ihe ahụ”—bụ́ Iwu ahụ—mere ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye mmehie, mmehie nke a mekwara ka ọ bụrụ onye kwesịrị ịnwụ anwụ. Pọl dere, sị: “Ezi ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme. Ma ọ bụrụ na ihe m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme, ọ bụghị mụ onwe m na-arụtakwa ya ọzọ, kama ọ bụ ihe ahụ nke na-ebi n’ime m, bụ́ mmehie.”—Ndị Rom 7:13-20.
Ya mere n’ihe e dere na gburugburu ebe a, Pọl adịghị ekwu banyere ezi ihe ná nghọta ya nile, ma ọ bụ nanị ime omume obi ọma. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 9:36; Ndị Rom 13:3.) Ọ na-ezo aka kpọmkwem gaa n’ime (ma ọ bụ n’emeghị) ihe ndị kwekọrọ n’ezi Iwu nke Chineke. Na mbụ, o jiriwo ịnụ ọkụ n’obi gbasoo okpukpe ndị Juu, ma—e jiri ya tụnyere ndị ọzọ—bụrụ ‘onye a na-adịghị ata ụta.’ Otú o sina dị, n’agbanyeghị na n’uche ya ọ bụbu onye ji ezi nlezianya na-abụ ohu nye Iwu ahụ, o debezughị ya. (Ndị Filipaị 3:4-6) Iwu ahụ gosipụtara ụkpụrụ Chineke ndị zuru okè, na-egosi onyeozi ahụ na n’anụ ahụ ya, ọ ka bụ ohu nye iwu nke mmehie ma si otú a bụrụ onye ikpe ọnwụ mara. Otú ọ dị, Pọl kwesịrị inwe ekele na site n’àjà Kraịst a gụrụ ya n’onye ezi omume—bụrụ onye a napụtara site n’iwu mmehie na ihe kwesịrị ekwesị ọ na-arụpụta, bụ́ ikpe ọmụma nke ọnwụ.—Ndị Rom 7:25.
Ndị Kraịst taa anọghị n’okpuru Iwu Mosis, n’ihi na a kpọgidewo ya n’elu osisi ịta ahụhụ. (Ndị Rom 7:4-6; Ndị Kọlọsi 2:14) Ma anyị kwesịrị ime nke ọma ịmata na ọ bụghị ụkpụrụ iwu dị arọ nke na anyị pụrụ nnọọ ichefu ya. Ee e, n’ụzọ bụ isi Iwu ahụ ziri ezi. Ya mere anyị nwere ihe mere anyị ga-eji na-agụ akwụkwọ Bible ndị nwere Iwu ahụ ma mụta ihe ndị ọ chọrọ n’aka ndị Israel. Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa ga-amalite ime nke ahụ n’oge na-adịghị anya, site n’ọgụgụ Bible kwa izu ha.
Ka anyị na-agụ Iwu ahụ, ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche n’ụkpụrụ ndị na-eduzi iwu ya dị iche iche na uru ndị Chineke ritere ka ha na-agbalị ịgbaso iwu ọma ndị ahụ. Anyị kwesịkwara ịghọta na anyị bụ ndị na-ezughị okè ma si otú a bụrụ ndị na-apụghị ịgbaso ezi ihe anyị na-amụta n’Okwu Chineke kpam kpam. Ma ka anyị na-ebu agha megide iwu nke mmehie, anyị pụrụ ịṅụrị ọṅụ n’olileanya nke ịbụ ndị a napụtara site n’iji àjà Kraịst mee ihe n’ebe anyị nọ.