N’ihi Gịnị Ka O Jiworo Wee Ogologo Oge Idozi Ihe Iseokwu Ahụ?
N’IHE dị ka 6,000 afọ gara aga, ịbụ ọkaaka nke Chineke abụghị ihe iseokwu. Mgbe ọ rụzuru ọrụ ya dị ebube nke okike ihe, “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla o mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Mgbe ahụ, ọ banyere otu ogologo oge nke ‘izu ike’; otú ọ dị, ọ bụghị na ike gwụrụ ya n’ụzọ nkịtị. Kama nke ahụ, o zuuru ike n’echiche nke bụ na ọ kwụsịrị ọrụ okike ihe ya n’elu ala, na-enwe obi ike na ezi nzube ya banyere ihe ndị a ga-enwezu ihe ịga nke ọma.—Jenesis 2:1-3; Aịsaịa 55:11.
Gịnị bụ nzube ahụ? Jehova debere mmadụ abụọ mbụ ahụ n’ebe a kpọrọ ogige Iden. Ibu ọrụ mbụ ha bụ ilekọta ebe obibi ha nke bụ paradaịs, gụnyere ụdị anụmanụ dị iche iche dị na ya. Ha gajekwa ịmụta ma zụlite ụmụ. Mgbe oge na-aga, ka ezinụlọ ha na-amụbakwa, ha gaje ime ka Paradaịs gbasaa ruo nsọtụ nile nke ụwa n’irube isi n’iwu Chineke nke bụ ka ha ‘buda ụwa n’okpuru onwe ha.’ Otú a, ụwa ga-emesịa bụrụ ebe obibi mara oké mma, nke e ji ezinụlọ obi ụtọ, nke dịkwa n’otu mejupụta, bụ́ ndị na-ejere Nna ha nke eluigwe ozi. Nke ahụ bụ nzube mbụ nke Chineke.—Jenesis 1:27, 28; 2:8, 15, 20-22.
Adam na Iv hà ga-ekere òkè n’imezu nzube nke a dị ebube ruo ná ngwụsị? Nke ahụ dabeere na ha ịnọgide na-akwado ya site n’irubere Onye Okike ha isi. Nrubeisi ha agajeghị ịbụ nke e mere n’echeghị echiche. E nyere ha ohere ime nhọrọ, n’ihi na Chineke chọrọ ka ha jeere ya ozi site n’obi nke nwere ekele. Dị ka ihe ncheta a na-ahụ anya nke ịbụ ọkaaka ya nke ruuru ya, o nyere ha otu ule dị mfe. Ha pụrụ iri ihe ọ bụla dị n’ubi ahụ ma e wezụgakwa otu. Ọ dị otu osisi na-amị mkpụrụ nke Chineke kwuru banyere ya, sị: “N’ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.”—Jenesis 2:16, 17.
Okwu ndị a na-eme ka anyị mara na e keghị Adam na Iv ka ha kaa nká ma nwụọ. Ọnwụ ga-abịa nanị ma ọ bụrụ na ha enupụ isi n’iwu nke a dị mfe. A sị na Adam na Iv nọgidere na-erubere Chineke isi, ha ka gaara adị ndụ n’elu ala taa dị ka nne na nna nke ezinụlọ zuru ụwa ọnụ nke ụmụ ndị zuru okè.—Lee ụkpụrụ ahụ nke e setịpụrụ n’Abụ Ọma 37:29.
Otú ọ dị, otu n’ime ndị mmụọ ozi Chineke kere eke, nke a na-akpọ Setan ugbu a, malitere ịkatọ ụzọ Chineke si na-achị. Ọ gbara Iv ume ka o rie mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro iwu, jiri ụzọ aghụghọ na-atụ aro na ọ bụrụ na o nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ọkaaka nke Chineke, na ọnọdụ ya ga-aka mma. Ma, ihe bụ nzube Setan n’ezie bụ ọchịchọ ịbụ chi nke ezinụlọ ihe a kpọrọ mmadụ ahụ a gaje inwe.—Jenesis 3:1-5; Matiu 4:8, 9; Jọn 8:44.
Ebe ọ bụ na Jehova enyewo mmadụ abụọ mbụ ahụ ihe nile dị ha mkpa, Iv gaara akwadoworị ịbụ ọkaaka ya ma jụ aro ụgha ahụ Setan tụrụ. N’ụzọ kpatara ọdachi, ọ gara n’ihu ma mebie iwu Chineke. Mgbe e mesịrị, Adam họọrọ isonyere nwunye ya n’omume ya nke amamihe na-adịghị na ya. Otú a, di na nwunye ahụ nke na-agbaso echiche onwe ha, tinyekwara Setan, nupụrụ isi megide Chineke, e wee welite ihe iseokwu ahụ nke ịbụ ọkaaka Chineke.—Jenesis 3:6.
Oge Dị Mkpa Iji Dozie Ihe Iseokwu Ndị Dị Oké Mkpa
Jehova pụrụ ibibiworị ndị nnupụisi atọ ahụ ozugbo ahụ. Ma nke ahụ agaraghị azaworị kpam kpam ajụjụ ndị ahụ nke nnupụisi ha welitere. Mmadụ ọ̀ pụrụ ịchị onwe ya nke ọma n’adabereghị na Chineke? Ọ̀ bụ ikpe ziri ezi n’akụkụ nke Chineke ikwu ka mmadụ doo onwe ya n’okpuru ịbụ ọkaaka ya? Ọzọkwa, n’iburu àgwà nke mmadụ abụọ mbụ ahụ n’uche, ọ̀ dị mmadụ ọ bụla ga-eji afọ ofufo wepụta onwe ya ife Chineke n’achọghị ọdịmma onwe onye nanị—ọbụna mgbe Setan tinyere ha n’ule? (Job 1:7-11; 2:4) Ọ ga-ewe oge iji zaa ajụjụ ndị a. Ọ ga-ewekwa oge iji merie mmetụta nile nke nnupụisi mbụ ahụ ma mezuo nzube Chineke nke ime ka ala ghọọ paradaịs nke e ji agbụrụ mmadụ na-adịghị emehie emehie mejupụta. Anyị ka nọ na-echere ndozi ikpeazụ nke ihe iseokwu ndị a.
N’ime ihe kwekọrọ n’iwu ya, Chineke napụrụ Adam na Iv ihe ùgwù nke ịdị ndụ ebighị ebi. Ha erukwaghị eru ikere òkè n’imezu oké nzube ya. Otú ọ dị, tupu ha anwụọ, e kwere ka ha mụta ụmụ ma zụlite ha. N’eziokwu, Adam na Iv enwekwaghị ike ibufere ụmụ ha ndụ gbasiri ike, nke na-enweghị mmehie. (Ndị Rom 5:12) Ma, ọ bụ ezie na a mụrụ ọgbọ ndị sochirinụ n’ezughị okè, bụrụkwa ndị a maworo ikpe ịnwụ anwụ, ọtụtụ mmadụ n’otu n’otu nwere ohere nke igosipụta ebe ha guzo n’ihe banyere oké ihe iseokwu ahụ nke ịbụ ọkaaka.
Idozi Ihe Iseokwu ahụ
Olee ụzọ Chineke ga-esi dozie ihe iseokwu ndị a metụtara ịbụ ọkaaka ya? N’otu ụzọ, a zawo ajụjụ ndị e welitere laa azụ n’ebe ahụ n’Iden. Ọtụtụ puku afọ nke akụkọ ihe mere eme mmadụ emewo ka o doo anya n’ụzọ na-akpata ihe mgbu na nzọrọ ahụ Setan mere nke bụ na ọnọdụ Iv ga-aka mma ma ọ bụrụ na o nwere onwe ya pụọ n’ebe Chineke nọ bụ ụgha. Ọchịchị mmadụ nke na-elefuru Chineke anya anọgidewo na-abụ ihe dara ada. Dị ka Bible na-asị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.
N’aka nke ọzọ, e mewo ndekọ nke ọtụtụ ezi ihe n’ime ogologo afọ ndị ahụ kemgbe Adam na Iv mehiere. Ọtụtụ ndị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ egosipụtawo nkwado a na-apụghị imebi emebi n’ịbụ ọkaaka Jehova, ihe nlereanya kasị pụta ìhè bụkwa “Nwa nke mmadụ,” bụ́ Jisọs Kraịst n’onwe ya. (Matiu 20:18; Ndị Hibru 11:1–12:3) Ndị ahụ gbasoworo iwu Chineke, nakwerekwa ịbụ ọkaaka ya achọpụtawo na nke a bụ ụzọ kasị mma n’ezie. Ha ahụtawo ịbụ eziokwu nke ilu ahụ bụ: “Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.” (Ilu 10:22) Ọzọkwa, n’ihi ndokwa nke mbilite n’ọnwụ, ha ga-emesịa kere òkè n’imezu nzube dị ebube nke Chineke.—Jọn 5:28, 29.
Jehova echefubeghị nzube mbụ ya. A gajeghị ikwe ka ndị ahụ na-ajụ ịbụ ọkaaka ya nọgide na-achị achị n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi, Bible na-adọkwa aka ná ntị na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ihe megide ha. Anyị na-agụ, sị: “E si n’eluigwe kpughee iwe Chineke imegide asọpụrụghị Chineke.” (Ndị Rom 1:18) Ngosipụta nke a na-abịanụ nke iwe Chineke, nke Bible kpọrọ Amagedọn ga-egosipụta n’ụzọ ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị ya na ọ dị adị n’ezie. Nanị ndị ahụ nakweere ịbụ ọkaaka ya ga-alanarị ihe omume ahụ. “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.
Oké Ihe Iseokwu ahụ na Gị
N’iburu eziokwu ndị a n’uche, onye ọ bụla n’ime anyị—dị ka Adam na Iv—aghaghị ime nhọrọ. Ànyị ga-anwa ịdị ndụ n’adabereghị na Chineke? Ka ànyị ga-edo onwe anyị n’okpuru ịbụ ọkaaka ya? Cheta na nke a bụ ihe iseokwu kasị mkpa nke na-eche gị ihu taa. Ihe iseokwu ndị ọzọ, n’agbanyeghị otú ha dịruru ná mkpa, metụtara ndụ ị na-adị ugbu a. Nke a metụtara ndụ ebighị ebi. Mkpebi nke i mere ga-emetụta ọdịnihu ebighị ebi gị.
Olee ụzọ ị pụrụ isi gosi na ị nakweere ịbụ ọkaaka nke Chineke? Site n’ịmụsi Okwu ya, bụ́ Bible, ike, na-achọkwa irubere ọchịchọ ya isi n’isoro ezi ndị Kraịst ndị ọzọ. (Zefanaịa 2:2, 3) Ọ bụrụ na i mee otú a, ị ga-enwe olileanya obi ụtọ nke ịhụ mmezu nke nzube dị ebube nke Chineke. Ị ga-ahụ mmezu nke nkwa nke a dị ebube: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Lee nnọọ ihe obi ụtọ na-abịara ndị nile na-edo onwe ha n’okpuru ịbụ ọkaaka nke Chineke! Lee nnọọ ihe siri ike ọ bụ nke mere a ga-eji mee mkpebi n’ụzọ amamihe n’okwu nke a dị mkpa!