Ntụkwasị Obi n’Ụwa Na-ezughị Okè
“EZI ihe nke m na-achọ ka m na-emeghị: kama ihe ọjọọ nke m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme.” Ị̀ na-ahụ na nke a bụ eziokwu n’ọnọdụ gị? Bụrụ onye a gbara ume n’ịmara na Pọl onyeozi nwere otu nsogbu ahụ; ma ọ bụ nwoke pụtara ìhè n’iguzosi ike n’ezi ihe ndị Kraịst. Nke a ọ́ bụghị ihe na-ekwekọghị ekwekọ? N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kraịst na Rom, Pọl tụlere nsogbu ahụ: “Ma ọ bụrụ na ihe m na-achọghị, ihe ahụ ka m na-eme, ọ bụghị mụ onwe m na-arụtakwa ya ọzọ, kama ọ bụ ihe ahụ nke na-ebi n’ime m, bụ́ mmehie.” Olee mmehie nke ọ na-ezo aka na ya, ò sikwa aṅaa merie ya iji bụrụ nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe?—Ndị Rom 7:19, 20.
Tupu nke a n’akwụkwọ ozi ya, Pọl dere: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” “Otu mmadụ” ahụ bụ Adam. (Ndị Rom 5:12, 14) Mmehie Adam—mmehie nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam—bụ ihe kpatara ezughị okè gbasiri mkpọrọgwụ ike nke agbụrụ mmadụ nakwa ihe gbara ọkpụrụkpụ mere iguzosi ike n’ezi ihe ji bụrụ oké ihe ịma aka.
Taa ọha mmadụ adịghị anakwere echiche Pọl banyere “mmehie mbụ,” dị ka a na-akpọbu ya, n’ihi na ndị ọkà mmụta okpukpe ajụwo ihe ndekọ Bible banyere okike wee nakwere ozizi nile nke evolushọn. “Ndị ọkà mmụta ewezụgawo akụkụ okwu a dum n’ụsọ” bụ otú otu akwụkwọ nkọwa ọgbara ọhụrụ banyere Ndị Rom 5:12-14 si tinye ya. Ma otu narị afọ gara aga, akwụkwọ nkọwa dị iche iche nke Bible na-akọwa mgbe nile na “mgbe Adam mehiere . . . o ji mmehie ahụ na ihe nile si na ya pụta tetọọ ụmụ ya nile.”a
Mfu Mbụ nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
Dị nnọọ ka ọtụtụ ndị taa na-ajụ ịdị adị nke Adam, bụ́ nwoke mbụ, otú ahụkwa ka a na-ewezụga Setan, bụ́ Ekwensu, n’ụsọ dị ka ihe dị n’akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme.b Ma ọ bụ Jisọs Kraịst na-abụghị onye nkịtị ma ọlị na-agwa anyị na onye a ‘eguzoghị n’eziokwu,’ n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, o kwesịghị ntụkwasị obi. (Jọn 8:44) Ọ bụkwa ná mkpali Setan ka Adam na nwunye ya, Iv, nupụụrụ Jehova isi ma mebie nguzosi ike n’ezi ihe ha n’okpuru ule.—Jenesis 3:1-19.
N’ihi na anyị nile sitere n’Adam, anyị nile ketara ọchịchọ ime mmehie. Nwoke amamihe bụ́ Solomọn kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ezi omume n’ụwa, nke na-eme ezi ihe, na-adịghị emehiekwa.” (Eklisiastis 7:20) Ka o sina dị, mmadụ ọ bụla pụrụ ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi. Nke a ò si aṅaa kwe omume? N’ihi na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-ezu okè iji na-eguzosi ike n’ezi ihe.
Ihe Ndabere nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
Eze Devid nke Israel hiere ụzọ ọtụtụ ugbo, gụnyere iko ọ kwasoro Bat-sheba bụ́ nke e mere nnọọ ndekọ ya. (2 Samuel 11:1-27) Ọtụtụ ọdịda Devid dara mere ka ọ pụta ìhè na o zughị okè ma ọlị. Ma, gịnị ka Jehova hụrụ n’ime nwoke ahụ? N’ịgwa nwa Devid, bụ́ Solomọn, okwu, Jehova sịrị: “Jegharịa n’ihu m, dị ka Devid, bụ́ nna gị, jegharịrị, [n’iguzosi ike n’ezi ihe nke obi, NW] na n’izi ezi.” (1 Ndị Eze 9:4) N’agbanyeghị ọtụtụ ihie ụzọ ya, Jehova matara ikwesị ntụkwasị obi bụ isi nke obi Devid. N’ihi gịnị?
Devid nyere azịza ya mgbe ọ gwara Solomọn, sị: “Mkpụrụ obi nile ka Jehova na-enyocha, Ọ na-aghọtakwa nchepụta nile ọ bụla nke echiche.” (1 Ihe Emere 28:9) Devid hiere ụzọ, ma ọ dị obi umeala, ọ chọkwara ime ezi ihe. Mgbe nile ọ nakweere ịdọ aka ná ntị na mgbazi olu—n’ezie, ọ rịọrọ maka ya. “Nwaa m, Jehova, nwapụtakwa m; nụchaa akụrụ m abụọ na obi m” bụ arịrịọ ya. (Abụ Ọma 26:2) A nụchakwara Devid. Mmechuihu sitere ná mmehie ya na Bat-sheba, dị ka ihe atụ, dịgidere ruo ọgwụgwụ ndụ ya. Ka o sina dị, ọ dịghị mgbe Devid nwara ịgọpụrụ mmejọ ya. (2 Samuel 12:1-12) Nke ka mkpa, ọ dịghị mgbe o si n’ezi ofufe kpapụ. N’ihi nke a, nakwa n’ihi ezi mwute na nchegharị sitere n’obi nke Devid, Jehova dị njikere ịgbaghara mmehie ya dum ma nakwere ya dị ka nwoke nke na-eguzosi ike n’ezi ihe.—Leekwa Abụ Ọma 51.
Ikwesị Ntụkwasị Obi n’Okpuru Ule
Setan Ekwensu nwara Jisọs ná mgbalị imebi nguzosi ike n’ezi ihe ya. Ọ dị mkpa na o guzosiri ike n’ezi ihe gabiga ihe isi ike na ahụhụ, n’adịghị ka Adam, onye a nwara nrubeisi ya dị ka nwoke zuru okè nanị site n’ịgwa ya ka o debe otu iwu Chineke. Tụkwasị na nke a, Jisọs nwere nrụgide nke ịmara na mgbapụta nke ezinụlọ mmadụ dabeere n’iguzosi ike n’ezi ihe ya.—Ndị Hibru 5:8, 9.
Setan, n’ikpebisi ike imebi nguzosi ike n’ezi ihe Jisọs, jekwuuru ya n’oge Jisọs kasị ghara ịdị ike—mgbe ọ nọworo ụbọchị 40 na-atụgharị uche ma na-ebu ọnụ n’ọzara. Ugboro atọ ọ nwara Jisọs ọnwụnwa—ime ka nkume ghọọ achịcha; isi n’elu akụkụ ụlọ nsọ ahụ wụpụ, na-eburu n’uche na ntinye aka ndị mmụọ ozi ga-azọ ya, wee si otú ahụ nye ihe àmà ọrụ ebube iji nwapụta ịbụ Mesaịa ya; na ịnakwere ịchịisi nke alaeze nile nke ụwa ná mgbanwere maka nanị otu ugbo ‘ịda n’ala kpọọ isiala’ nye Setan. Ma Jisọs jụrụ ọnwụnwa nke ọ bụla, na-anọgide ná nguzosi ike n’ezi ihe ya nye Jehova.—Matiu 4:1-11; Luk 4:1-13.
Iguzosi Ike n’Ezi Ihe nke Job
A maara nguzo Job, ịnọgide ná nguzosi ike n’ezi ihe ya n’okpuru ule, nke ọma. Ọ dị mma ịmara na Job aghọtaghị ihe mere ọdachi jiri bịakwasị ya. Ọ maghị na Setan azọrọwo na o nwere ebumnobi na-ezighị ezi, na-ekwu na Job na-efe Chineke n’ihi ọchịchọ onwe onye nanị, na-azọrọkwa na iji gbara isi onwe ya, Job ga-adị njikere imebi nguzosi ike n’ezi ihe ya. Chineke kwere ka Job nweta ahụmahụ ndị dị oké ike iji gosi na Setan ezighị ezi.—Job 1:6-12; 2:1-8.
Ndị enyi ụgha atọ batara n’okwu ahụ. Ha ma ụma kpọọ ụkpụrụ na nzube Chineke isi n’ala. Ọbụna nwunye Job, n’enweghịkwa ike ịhụ ihe iseokwu ahụ, agbaghị di ya ume n’oge ya nke oké mkpa. (Job 2:9-13) Ma Job guzosiri ike. “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga [iguzosi ike n’ezi ihe, NW] m. Ezi omume m ka m jideworo, m gaghị ahakwa ya aka: obi m adịghị ata m ụta banyere otu n’ụbọchị m nile.”—Job 27:5, 6.
Ihe atụ magburu onwe ya nke Job, tinyere nguzosi ike n’ezi ihe nke ọtụtụ ndị ikom na ndị inyom ndị ọzọ na-ekwesị ntụkwasị obi, dị ka e dekọrọ n’ime Bible, nwapụtara Setan ịbụ onye ụgha.
Nguzosi Ike n’Ezi Ihe na Ozi Ndị Kraịst
Nguzosi ike n’ezi ihe ọ̀ bụ àgwà Jehova ji kpọrọ mkpa nanị maka afọ ojuju nke ya? Ee e. Nguzosi ike n’ezi ihe nwere abamuru na-eso ya nye anyị bụ́ ụmụ mmadụ. Ọ bụ maka abamuru anyị ka Jisọs nyere anyị okwu ịdọ aka ná ntị ‘iwere obi anyị dum, werekwa mkpụrụ obi anyị dum, werekwa uche anyị dum, hụ Jehova, Chineke anyị, n’anya.’ N’ezie, nke a bụ “ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu,” ọ bụkwa nwoke, nwanyị, na nwatakịrị na-eguzosi ike n’ezi ihe na-edebe ya. (Matiu 22:36-38) Gịnị ka ọ gụnyere, oleekwa ihe ndị bụ ụgwọ ọrụ ya?
A pụrụ ịtụkwasị onye na-eguzosi ike n’ezi ihe obi, ọ bụghị nanị site n’aka mmadụ ibe ya kamakwa, nke ka mkpa, site n’aka Chineke. A na-ahụta ịdị ọcha nke obi ya n’omume ya; ihu abụọ adịghị n’ime ya. Ọ dịghị aghọ aghụghọ ma ọ bụ rụọ arụ. Pọl onyeozi tinyere ya otú a: “Anyị jụrụ ihe nzuzo nile nke na-eweta ihere, anyị adịghị ejegharị n’aghụghọ, anyị adịghị emesokwa okwu Chineke n’ụzọ ịtụ ntụ; kama anyị ji ngosi nke eziokwu na-eme ka akọ na uche nke mmadụ nile n’otu n’otu mara anyị n’ihu Chineke.”—2 Ndị Kọrint 4:2.
Rịba ama na Pọl kpọtụrụ uche n’àgwà ndị metụtara ozi ndị Kraịst. Olee otú onye Kraịst na-eje ozi pụrụ isi jeere ndị ọzọ ozi ma ọ bụrụ na aka ya adịghị ọcha, ma ọ bụrụ na ọ bụghị nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe? Onye isi nke otu òtù okpukpe na Ireland bụ́ onye gbara arụkwaghịm n’isi nso a na-enye ezi ihe atụ nke isi ihe ahụ. O kwetara na ya “kwere ka otu ụkọchukwu na-edina ụmụaka nọgide na-arụrụ ụmụaka ọrụ ogologo oge ka a matasịrị banyere ya idina ụmụaka,” dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent na-akọ. Ihe ndekọ ahụ kọwara na ndina ahụ mere ihe karịrị afọ 24. A tụrụ ụkọchukwu ahụ mkpọrọ afọ anọ, ma chee banyere nhụjuanya e bokwasịrị ụmụaka o dinara n’ime afọ ndị ahụ n’ihi na onye nlekọta ya enweghị nguzosi ike n’ezi ihe nke omume iji mee ihe!
Nguzosi Ike n’Ezi Ihe —Ụgwọ Ọrụ Ya
Jọn onyeozi bụ nwoke na-adịghị atụ egwu. N’ihi oké ịnụ ọkụ n’obi ha, Jisọs kpọrọ ya na nwanne ya bụ́ Jemes “Ụmụ égbè eluigwe.” (Mak 3:17) Nwoke pụtara ìhè n’iguzosi ike n’ezi ihe, bụ́ Jọn, tinyere Pita, kọwaara ndị ọchịchị ndị Juu na ya ‘apụghị ịkwụsị ikwu’ banyere ihe ndị ọ hụrụ ma nụ mgbe ya na Jisọs nọ. Jọn bụkwa otu n’ime ndị ozi ahụ kwuru, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 4:19, 20; 5:27-32.
O yiri ka mgbe Jọn gamiworo n’afọ ndị 90 ya, a chụlagara ya n’Àgwàetiti Patmọs “n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) N’afọ ndụ ya, ọ pụrụ ichewo na ozi ya agwụsịwo. Ma ọ bụ nanị nwoke na-eguzosi ike n’ezi ihe ka ya ka a pụrụ inye ọrụ nke idetu ọhụụ na-akpali akpali nke Mkpughe n’aka. Na nke a, Jọn kwesịrị ntụkwasị obi. Lee ihe ùgwù nke ahụ bụụrụ ya! Ihe kanụ na-abịakwa. E mesịa, ma eleghị anya n’ógbè Efesọs, o dere ihe ndekọ Oziọma ya na akwụkwọ ozi atọ. Ihe ùgwù dị ebube dịgasị otú ahụ iji weta ná njedebe ozi afọ 70 n’ikwesị ntụkwasị obi!
Ịbụ onye na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ozuzu ya na-enye afọ ojuju miri emi. Ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi n’anya Chineke na-eweta ụgwọ ọrụ ndị na-adịru ebighị ebi. Taa, a na-akwadebe “oké ìgwè mmadụ” nke ndị na-efe ezi ofufe ịbanye n’ụwa ọhụrụ nke udo na ịdị n’otu, na-enwe atụmanya nke ndụ ebighị ebi. (Mkpughe 7:9) A ghaghị ijigide nguzosi ike n’ezi ihe n’okwu ndị dị mkpa nke omume na ofufe, n’agbanyeghị ule nile nke usoro ihe a na ọtụtụ ihe ịma aka Setan pụrụ iwelite. Jide n’aka na n’ike Jehova na-enye, ị pụrụ inwe ihe ịga nke ọma!—Ndị Filipaị 4:13.
N’ikwu banyere ma ugbu a ma ọdịnihu, ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid na-emesi anyị nile obi ike mgbe ọ na-asị, n’otu ekpere ekele nye Jehova: “Ma mụ onwe m, [n’iguzosi ike n’ezi ihe m, NW] ka I jideworo m, wee mee ka m guzosie ike n’ihu Gị ruo mgbe ebighị ebi. Onye a gọziri agọzi ka Jehova . . . bụ, . . . Amen, na Amen.”—Abụ Ọma 41:12, 13.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Okwu dị n’akwụkwọ The New Testament of Our Lord and Saviour Jesus Christ, according to the Authorised Version, with a brief commentary by various authors.
b Aha ahụ bụ Setan pụtara “Onye Nguzogide.” “Ekwensu” pụtara “Onye Nkwutọ.”
[Foto dị na peeji nke 4]
N’agbanyeghị ihie ụzọ ya nile, Devid gosiri na a pụrụ ịtụkwasị ya obi
[Foto dị na peeji nke 5]
Jisọs hapụụrụ anyị ihe atụ kasị mma nke ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ịbụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi na-eweta afọ ojuju dị ukwuu