Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 12/1 p. 30
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịlụ Ọgụ Megide Aka Mmehie Ji Anụ Ahụ Dara Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Tụkwasị Uche ná Mmụọ Nsọ Ma Dị Ndụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Na-eje Ije Dị Ka Mmụọ Nsọ Si Chọọ Ka I wee Nweta Ndụ Na udo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Anyị Kwesịrị Ịna-ejide Onwe Anyị
    Bụkuo Jehova Abụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 12/1 p. 30

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

◼ Ná Ndị Rom 8:27, New World Translation sụgharịrị okwu Grik bụ phroʹne·ma ịbụ “pụtara,” ma Rom 8 n’amaokwu 6 na 7, ihe a sụgharịrị ya bụ “ichela echiche.” N’ihi gịnị ka e ji sụgharịa otu okwu Grik ahụ n’ụzọ dị iche iche?

Ihe ndị gbara ya gburugburu kpebiri okwu abụọ ahụ a họọrọ.

Okwu Mmeghe nke New World Translation of the Christian Greek Scriptures (1950) kwuru, sị: “Maka okwu ọ bụla bụ isi anyị ekenyewo ya otu ihe ọ pụtara, anyị ejigidewokwa ihe ahụ ọ pụtara ruo otú o kwere mee dị ka okwu ndị gbara ya gburugburu nyere ohere ya.” Ụfọdụ agaghị ele phroʹne·ma anya dị ka okwu bụ isi, ebe ọ pụtara nanị ugbo anọ. Otú ọ dị, o metụtara okwu ndị e jiri mee ihe Ọtụtụ ugbo karị. Otu bụ phro·neʹo, nke pụtara “iche echiche, ichela echiche n’otu ụzọ kpọmkwem.” (Matiu 16:23; Mak 8:33; Ndị Rom 8:5; 12:3; 15:5) Okwu Grik ndị ọzọ na-enye echiche nke iji amamihe bara uru, ezi echiche, ma ọ bụ nghọta mee ihe.—Luk 1:17; 12:42; 16:8, Ndị Rom 11:25; Ndị Efesọs 1:8.

The Kingdom Interlinear Translation of the Greek Scriptures na-egosi na phroʹne·ma pụtara ugbo anọ ná Ndị Rom 8:6, 7, 27 nakwa na ihe ọ pụtara n’ụzọ nkịtị na-abụ mgbe nile “ichela echiche.” Ndị mmụta Grik bụ Bauer, Arndt, na Gingrich kọwara phroʹne·ma dị ka: ‘ụzọ iche echiche, (ịtụkwasị) uche, ilekwasị anya, ihe a na-achọ inweta, mgbalịsi ike.’—A Greek-English Lexicon of the New Testament and Other Early Christian Literature.

Ná Ndị Rom isi 8, Pọl onyeozi nyere ndị Kraịst okwu ndụmọdụ ka ha ghara ịgagharị dị ka anụ ahụ mmadụ na-ezughị okè si dị. Iji nwee ihe ịga nke ọma na nke a, ha kwesịrị iche nche megide ọchịchọ nile ma ọ bụ mkpali nile nke anụ ahụ, tinyekwara nchepụta nile nke obi na-ezughị okè. ‘Ịtụkwasị uche ha’ n’ihe ndị kwekọrọ ná mmụọ nsọ Chineke ga-enyere ha aka na nke a.—Ndị Rom 8:1-5.

Pọl gosipụtara ọdịiche nke a: “N’ihi na ichela echiche n’anụ ahụ pụtara ọnwụ; ma ichela echiche ná mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo; n’ihi na ichela echiche n’anụ ahụ pụtara ya na Chineke ịdị n’iro, n’ihi na e doghị ya n’okpuru iwu Chineke.” (Ndị Rom 8: 6, 7) Ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu okwu ha n’amaokwu abụọ ndị a. Ndị mmadụ, karịsịa ndị Kraịst, ekwesịghị ịtụkwasị uche ha, ma ọ bụ “ichela echiche,” n’ihe ndị nke anụ ahụ na-emehie emehie. Kama nke ahụ, ha kwesịrị ịtụkwasị uche ha, ma ọ bụ ‘na-echela echiche’ n’ihe ndị kwekọrọ ná mmụọ ahụ na ndị mmụọ ahụ na-akpali.

N’ụzọ dị iche, Rom 8 amaokwu 27 na-ekwu banyere Chineke n’onwe ya. Anyi na-agụ, si: “Ma onye ahu [Jehova] nke na-enyocha obi matara ihe mmụọ ahụ pụtara, n’ihi na ọ na-arịọrọ ndị nsọ arịrịọ n’ụzọ kwekọrọ n’uche Chineke.” Ee, “onye ahụ” n’ebe a bụ Jehova, bụ́ Onye Na-anụ ekpere.

A gaara asụgharị okwu ahụ bụ phroʹne·ma Rom 8 n’amaokwu 27 ịbụ ichela echiche.” Ma mmụọ nsọ abụghị onye nke na-eche echiche n’ezie ma ọ bụ nwee echiche nke onwe ya. Mmụọ ahụ bụ ike ọrụ nke Chineke, bụ́ onye maara otú mmụọ nso ya si arụ ọrụ n’imezu uche ya. Ọzọ, ihe amaokwu nke a na-ekwu dị iche n’ihe e kwuru ná Ndị Rom 8:6, 7. Amaokwu ndị ahụ bu ụzọ gosipụtara mkpa ọ dị ụmụ mmadụ ịchịkwa echiche na omume ha. Ma ọ dịghị mkpa na Jehova ga-arụ ọrụ, ma ọ bụ gbaa mgba, iji chịkwaa onwe ya. Ọ maara ihe e dekọrọ n’ime Bible n’okpuru mmụọ nsọ, dị ka okwu Bible ndị ahụ gosipụtara uche ya maka ndị ozi ya nọ n’elu ala. Dr. Heinrich Meyer kwuru okwu banyere Ndị Rom 8:27, sị: “N’ọnọdụ nile Chineke ga-ama nzube nke Mmụọ ahụ.”

N’ihi nke a, nsụgharị bụ́ “pụtara” kwekọrọ n’ihe Ndị Rom 8:27 na-ekwu ma ọ bụ echiche o depụtara, asụsụ Grik nabatakwara ya. The Translator’s New Testament dere ya otú a: “Onye ahụ na-enyocha obi nile maara ihe Mmụọ ahụ pụtara.”

◼ N’ihi gịnị ka New World Translation na-eji asụgharị okwu Grik ahụ bụ pi·steuʹo ịbụ “kwere” (dị ka ọtụtụ nsụgharị ndị ọzọ) n’ebe ụfọdụ, ma na-asụgharị ya n’ebe ndị ọzọ dị ka “tinye [ma ọ bụ nwee] okwukwe n’ime”?

A na-eme nke a iji gosipụta akụkụ dị iche iche nke ihe okwu Grik ahụ bụ pi·steuʹo pụtara.

Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ A Grammar of New Testament Greek, nke James Moulton dere, hotara na o doro ndị Kraịst oge mbụ anya nke ọma, bụ́ “ịdị mkpa nke ọdịiche dị n’etiti nkwere nkịtị . . . na ịtụkwasị ihe obi n’onwe onye.” A pụrụ igosipụtacha echiche abụọ ndị a site n’okwu Grik bụ pi·steuʹo.

Ọtụtụ mgbe, a ghaghị isite n’okwu ndị gbara ya gburugburu mara kpọmkwem ihe okwu ahụ bụ pi·steuʹo pụtara. Ma mgbe ụfọdụ, ụzọ dị iche iche e si hazie ụtọ asụsụ na-enyere anyị aka ịmara ihe onye dere ya bụ n’uche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ọ bụ okwu mkpọaha efu nke e dere n’ọnọdụ nke na-egosi na ọ bụghị ya kpọmkwem ka e mere ihe banyere ya na-esochi pi·steuʹo, New World Translation na-asụgharịkarị ya n’ụzọ dị mfe ịbụ “kwere”—ọ gwụlakwa ma okwu gbara ya gburugburu ò gosiri ihe dị iche. (Matiu 21: 25, 32, ma lee Ndị Rom 4:3.) Ọ bụrụ na okwu ahụ bụ e·piʹ, “na” esochie pi·steuʹo, a na-asụgharịkarị ya ịbụ “kwere na.” (Matiu 27:42; Ọrụ 16:31) Ọ bụrụ na eis esochie ya, nke bụ “n’ime,” a na-asụgharịkarị ya ịbụ “tinye okwukwe n’ime.”—Jọn 12:36; 14:1.

Nsụgharị nke ikpeazụ nke a (nke na-echetara anyị na e nwere njikọ dị n’etiti okwu Grik ahụ bụ piʹstis, “okwukwe” na pi·steuʹo) kwekọrọ n’otu okwu dị n’akwụkwọ bụ An Introductory Grammar of New Testament Greek, nke Paul Kaufman dere. Akwụkwọ nke a na-asị: “Ụzọ ide ihe ọzọ nke a na-ahụkarị n’ime Agba Ọhụrụ (karịsịa n’Oziọma Jọn) bụ πιστεύω [pi·steuʹo] nke e dekọtara ya na εἰς [eis] na ọnọdụ okwu nke na-egosi na ọ bụ ya kpọmkwem ka e mere ihe banyere ya . A ghaghị ịsụgharị ụzọ dum ahụ e si hazie εἰς tinyere ọnọdụ okwu ahụ nke na-egosi na ọ bụ ya kpọmkwem ka e mere ihe banyere ya kama ịnwa ịsụgharị okwu ahụ nke na-egosi ebe ihe dị, bụ εἰς dị ka okwu nọpụụrụ onwe ya iche. A na-ele okwukwe anya dị ka ihe omume, dị ka ihe ụmụ mmadụ na-eme, ya bụ, itinye okwukwe n’ime otu onye.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya