Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lff isi 7
  • Olee Ụdị Onye Jehova Bụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Ụdị Onye Jehova Bụ?
  • Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MỤTAKWUO IHE
  • NCHỊKỌTA
  • IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
  • Olee Ụdị Onye Jizọs Bụ?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Eyipụla “Àgwà Ọhụrụ” Mgbe I Mechara Baptizim
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Onyinye Mmụọ Nsọ nke Jehova Na-enye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ikwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
lff isi 7
Isi nke 7. Ebe otu nwoke guzo n’okwute dị n’akụkụ oké osimiri ná mgbede na-ele anya.

ISI NKE 07

Olee Ụdị Onye Jehova Bụ?

Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi
Nke E Biri Ebi

Olee ụdị onye i chere na Jehova Chineke bụ? Ì chere na ọ dị ebube, dịkwa egwu nke na anyị enweghị ike ịbịaru ya nso otú ahụ anyị na-enweghị ike iru kpakpando nso? Ì chere na ọ bụghị onye dị adị, ma ọ na-akpa ike ka égbè eluigwe? Oleezi otú Jehova dị? Jehova gwara anyị ụdị onye ọ bụ n’Okwu ya bụ́ Baịbụl. O kwukwara na ọ na-eche gbasara gị.

1. Gịnị mere na anyị anaghị ahụ Chineke anya?

“Chineke bụ Mmụọ.” (Jọn 4:24) Jehova enweghị ụdị ahụ́ anyị nwere. Ọ bụ mmụọ. O bikwa n’eluigwe ebe anya anyị na-anaghị eru.

2. Olee ụfọdụ àgwà Jehova nwere?

Anyị anaghị ahụ Jehova anya. Ma, ọ bụrụ na anyị amata onye ọ bụ, anyị ga-ahụ ya n’anya maka na ọ bụ Onye dị adị nke nwere àgwà ndị magburu onwe ha. Baịbụl kwuru na “ikpe ziri ezi na-amasị Jehova, ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-erubere ya isi.” (Abụ Ọma 37:28) ‘Ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ ya n’obi, ọ na-emekwara ndị ọzọ ebere,’ karịchaa ndị na-ata ahụhụ. (Jems 5:11) “Jehova nọ ndị obi gbawara nso. Ọ na-azọpụta ndị ike ụwa gwụrụ.” (Abụ Ọma 34:18) Ị̀ makwa na anyị nwere ike ịkpasu Jehova iwe ma ọ bụkwanụ mee ya obi ụtọ? Onye na-eme ihe ọjọọ na-agharịpụ ya, ụdị ihe a na-ewutekwa ya. (Abụ Ọma 78:40, 41) Ma, onye na-eme ihe dị mma na-eme ya obi ụtọ.—Gụọ Ilu 27:11.

3. Olee otú Jehova si egosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

N’ime àgwà niile Jehova nwere, ọ bụ ịhụnanya kacha pụọ iche. N’eziokwu, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Jehova si na Baịbụl nakwa n’ihe ndị o kere eke mee ka anyị mara na ọ hụrụ anyị n’anya. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 14:17.) Dị ka ihe atụ, chegodị otú o si kee anyị. O kere anyị ka anyị nwee ike ịna-ahụ ụcha dị iche iche mara mma, ịna-anụ egwú ndị dị ụtọ, na ịna-anụ ụtọ ụdị nri dị iche iche. Ọ chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ ná ndụ.

MỤTAKWUO IHE

Chọpụta otú Jehova si arụ ihe ndị dị ebube ọ na-arụ. Chọpụtakwa otú o si eme ka anyị mara àgwà ndị magburu onwe ha o nwere.

4. Mmụọ nsọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ

Foto dị iche iche na-egosi ihe ndị Chineke ji mmụọ nsọ mee. 1. Planet dị iche iche na eluigwe na ụwa. 2. Ebe otu onye so dee Baịbụl na-ede ihe Chineke gwara ya n’akwụkwọ mpịakọta.

Jehova na-eji mmụọ nsọ arụ ọrụ otú ahụ anyị na-eji aka anyị arụ ọrụ. Baịbụl mere ka anyị mara na mmụọ nsọ abụghị Chineke, kama ọ bụ ike Chineke ji arụ ihe ndị ọ na-arụ. Gụọnụ Luk 11:13 na Ọrụ Ndịozi 2:17. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Chineke “ga-awụkwasị” ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ ya mmụọ nsọ. N’ihi ya, ì chere na mmụọ nsọ bụ Chineke, ka ì chere na ọ bụ ike Chineke ji arụ ọrụ? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

Jehova na-eji mmụọ nsọ arụ ihe ndị dị ebube. Gụọnụ Abụ Ọma 33:6 na 2 Pita 1:20, 21. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

  • Olee ihe ụfọdụ Jehova jirila mmụọ nsọ ya rụọ?

Foto dị iche iche na-egosi ihe ndị Chineke ji mmụọ nsọ mee. 1. Planet dị iche iche na eluigwe na ụwa.

5. Jehova nwere àgwà ndị magburu onwe ha

Mosis nọ na-efesi Chineke ike, mana ọ chọrọ ịmatakwu onye kere ya. Ọ bụ ya mere o ji sị Chineke: “Mee ka m mara ụzọ gị, ka m wee mara gị.” (Ọpụpụ 33:13) Jehova gwaziri ya ụfọdụ n’ime àgwà ndị o nwere. Gụọnụ Ọpụpụ 34:4-6. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

  • Olee ụfọdụ n’ime àgwà Jehova ndị ọ gwara Mosis gbasara ha?

  • Olee àgwà Jehova kacha amasị gị?

6. Ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ Jehova n’obi

Ebe otu nwaanyị na-ekpe ekpere.

E nwere mgbe ndị Hibru, bụ́ ndị Chineke, nọ na-agbara ndị Ijipt ohu. Olee otú ahụhụ ha nọ na-ata dị Jehova n’obi? Kpọnyenụ ihe a A NA-EGERE EGERE. Na-egenụ ya ka ọ na-akpọ ma ọ bụkwanụ unu agụọ Ọpụpụ 3:1-10. Unu mechaa, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

IHE A NA-EGERE EGERE: Ahụhụ Ha Na-ata Metụrụ Jehova n’Obi (2:45)

  • Olee ihe akụkọ a na-akụziri gị gbasara otú ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-adị Jehova n’obi?—Leruonụ anya n’amaokwu nke 7 na nke 8.

  • Ì chere na ọ na-agụ Jehova agụụ inyere ndị mmadụ aka nakwa na ọ ga-enyeliri ha aka? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?

7. Ihe ndị e kere eke na-egosi ụdị onye Jehova bụ

Foto dị iche iche: Azụ̀ weel na nwa ya, okooko osisi, na otu obere nnụnụ.

Jehova na-esi n’ihe ndị o kere akụziri anyị ụdị onye ọ bụ. Kpọnyenụ VIDIO a. Gụọkwanụ Ndị Rom 1:20. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

VIDIO: Ihe Ndị Jehova Kere Na-egosi na Ọ Hụrụ Anyị n’Anya—Ahụ́ Mmadụ (1:57)

  • Gịnị ka ihe ndị Jehova kere na-akụziri gị gbasara ụdị onye ọ bụ?

ỤFỌDỤ NA-ASỊ na Chineke nọ ebe niile nakwa na anyị agaghị amatali onye ọ bụ.

  • Gịnị ka i chere?

  • Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

NCHỊKỌTA

Jehova bụ mmụọ. Anyị anaghị ahụ ya anya, ma, o nwere ọtụtụ àgwà ndị magburu onwe ha, nke ka nke, ịhụnanya.

Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

  • Gịnị mere na anyị anaghị ahụ Jehova anya?

  • Gịnị bụ mmụọ nsọ?

  • Olee ụfọdụ n’ime àgwà Jehova nwere?

Ihe ị ga-agba mbọ mee

IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

Mụọ gbasara ụzọ ihe anọ gbara ọkpụrụkpụ e ji mara Jehova. Ọ ga-enyere gị aka ịghọtakwu onye ọ bụ.

“Olee Ụdị Onye Chineke Bụ?” (Ụlọ Nche Nke 1 2019)

Chọpụta ihe na-egosi na Jehova anọghị ebe niile.

“Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

Chọpụta ihe mere Baịbụl ji kwuo na mmụọ nsọ bụ aka Chineke.

“Gịnị Bụ Mmụọ Nsọ?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)

E nwere otu onye ìsì o siiri ike ikwere na ihe gbasara ya na-emetụ Chineke n’obi. Chọpụta ihe mere o ji mechaa gbanwee obi ya.

“Ama M Ugbu A na M Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka” (Ụlọ Nche, Ọktoba 1, 2015)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya