Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/15 p. 3-4
  • Chineke Ò Guzobeworị Akara Aka Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Chineke Ò Guzobeworị Akara Aka Anyị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akara Aka—Ihe Okwu ahụ Pụtara
  • Augustine, Nna nke Akara Aka
  • Ndị Nketa Augustine
  • Akara Aka Ka Ọ Bụ Nnwere Onwe Ime Nhọrọ?
  • À Pụrụ Ime Ka Akara Aka na Ịhụnanya Chineke Kwekọọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • À Na-ebu Ụzọ Edetu Ọdịnihu Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ihe Ndị Na-eme ná Ndụ Gị Hà Si n’Akara Aka?
    Teta!—2007
  • Narị Afọ Ise Okpukpe Calvin Malitere Olee Ihe Ọ Rụpụtarala?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/15 p. 3-4

Chineke Ò Guzobeworị Akara Aka Anyị?

“AGA-EZERE ọtụtụ nsogbu a na-eche n’echiche ma ọ bụrụ na a dịghị eji okwu ahụ a na-aghọtahiekarị bụ́ akara aka eme ihe ma ọlị.” Ị pụrụ ịjụ ihe kpatara ya, ma ọ bụrụ na i jiwo okwu ahụ bụ́ “akara aka” mee ihe ma ọ bụ nụ ka e ji ya mee ihe.

Dị ka akwụkwọ ọhụrụ nke nkà ihe ọmụma ndị Katọlik n’asụsụ French bụ́ Théo na-ekwu, anyị ga-eme nke ọma ịhapụ iji okwu ahụ bụ́ “akara aka” mee ihe. Akwụkwọ ọzọ na-asị: “Taa, akara aka abụkwaghị isi ihe nke arụmụka nkà mmụta okpukpe, ọbụna nye ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị Protestant, dị ka o yiri.”

Ka o sina dị, isiokwu nke akara aka enyewo ọtụtụ ndị nsogbu n’akụkọ ihe mere eme dum. Ọ bụ isi ihe nke esemokwu wetara Ndozigharị ahụ, ọbụnakwa n’ime Chọọchị Katọlik, ọ bụ isiokwu nke nkwurịta okwu kpụ ọkụ n’ọnụ ruo ọtụtụ narị afọ. Ọ bụ ezie na a dịghị arụkarị ụka banyere ya taa, ọ ka bụkwa nsogbu. Olee onye na-agaghị achọ ịmata ma e buwo ụzọ kpebie akara aka ya?

Akara Aka—Ihe Okwu ahụ Pụtara

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “akara aka” pụtara na chọọchị dị iche iche? Akwụkwọ bụ́ Dictionnaire de théologie catholique na-ele ya anya ịbụ “ebumnuche Chineke iweta mmadụ ụfọdụ, ndị a kpọrọ aha, ná ndụ ebighị ebi.” N’ozuzu a na-eche na ndị a họpụtara ahọpụta, “ndị a kpọrọ aha,” bụ ndị Pọl onyeozi zoro aka n’ebe ha nọ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Rom, n’okwu ndị na-esonụ: “Chineke na-arụpụtara ndị hụrụ ya n’anya ihe ọma, bụ́ ndị a kpọrọ dị ka nzube ya si dị. N’ihi na ndị o bu ụzọ mata ka o nyekwara akara aka ime ka ha kwekọọ n’onyinyo Ọkpara ya . . . Ndị o nyekwara akara aka ka ọ kpọkwara; ndị ọ kpọkwara ka ọ nwapụtara; ndị ọ nwapụtara ka o nyekwara otuto.”—Ndị Rom 8:28-30, Revised Standard Version.

Ọbụna tupu ọmụmụ ha, ụfọdụ ndị bụ ndị e chere na Chineke ahọrọworị ha maka iso keta ebube Kraịst n’eluigwe. Nke a na-eduga n’ajụjụ ahụ a rụworo ụka banyere ya ruo ogologo oge: Chineke ọ̀ na-ahọrọ n’aka ike ndị ọ chọrọ ịzọpụta, ka ụmụ mmadụ hà nwere nnwere onwe ime nhọrọ na òkè ha na-ekere n’inweta na ijigide ihu ọma Chineke?

Augustine, Nna nke Akara Aka

Ọ bụ ezie na Ndị Nna Chọọchị ndị ọzọ edewo ihe na mbụ banyere akara aka, ọha mmadụ na-ewerekarị na Augustine (354-430 O.A.) tọrọ ntọala ozizi ahụ maka ma chọọchị ndị Katọlik ma ndị Protestant. Dị ka Augustine kwuru, Chineke esiwo na mgbe ebighị ebi nye ndị ezi omume akara aka ịnata ngọzi ebighị ebi. N’aka nke ọzọ, ndị ajọ omume, ọ bụ ezie na Chineke enyeghị ha akara aka n’ụzọ bụ nnọọ isi nke ihe okwu ahụ pụtara, gaje ịnata ntaramahụhụ kwesịrị ekwesị maka mmehie ha, amamikpe. Nkọwa Augustine nyere ohere dị nta maka nnwere onwe ime nhọrọ, si otú ahụ na-emeghepụ ụzọ maka oké nrụrịta ụka.

Ndị Nketa Augustine

Arụmụka banyere akara aka na nnwere onwe ime nhọrọ bilitere mgbe mgbe n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, o kpokwara ọkụ n’oge Ndozigharị ahụ. Luther lere akara aka onwe onye anya dị ka nhọrọ Chineke nweere onwe ya ime, n’ebughị ụzọ hụta ihe ndị a họọrọ ga-eru eru inweta n’ọdịnihu ma ọ bụ ọrụ ọma ha dị iche iche. Calvin bịara ná nkwubi okwu dịwaga iche karị ná nchepụta ya nke akara aka gbara mkpị abụọ: E nyere ụfọdụ akara aka inweta nzọpụta ebighị ebi, na ndị ọzọ inweta amamikpe ebighị ebi. Otú ọ dị, Calvin kwa lere nhọrọ Chineke anya dị ka nke aka ike, ọbụna nke a na-apụghị ịghọta aghọta.

Ihe iseokwu nke akara aka na ajụjụ e jikọrọ ya na ya n’ụzọ chiri anya banyere “amara”—okwu chọọchị dị iche iche na-eji eme ihe ịkọwa ọrụ nke Chineke ji azọpụta ma na-agụ ụmụ mmadụ ná ndị ezi omume—ghọrọ nnọọ oké ihe nke na na 1611, Ụlọ Ọrụ Popu nke Ndị Katọlik machibidoro ibipụta ihe ọ bụla n’isiokwu ahụ iwu n’anataghị ya ikike. N’ime Chọọchị Katọlik, nkụzi dị iche iche nke Augustine nwere nkwado siri ike site n’aka ndị òtù Jansen bụ́ ndị France na narị afọ nke 17 na 18. Ha kwalitere ụdị Iso Ụzọ Kraịst nke siri oké ike ma dịwaga iche, ọbụna nwee ndị na-agbaso ya n’etiti ndị ọnụ na-eru n’okwu. Ma, esemokwu banyere okwu ahụ ebelataghị. Eze Louis nke Iri na Anọ nyere iwu ka e bibie ebe ọzụzụ ndị ụkọ nke Port-Royal, ebe bụ́ isi nke echiche ndị òtù Jansen.

N’ime chọọchị dị iche iche nke Ndozigharị Protestant, mkparịta ụka ahụ eruwebeghị ọgwụgwụ ya. Tinyere ndị ọzọ, Ndị Òtù Oké Nguzogide, ndị gbasoro Jacobus Arminius, kwenyere na mmadụ nwere òkè ọ ga-ekere ná nzọpụta nke ya. Ezumezu Okpukpe Ndị Protestant nke Dordrecht (1618-1619) doziri okwu ahụ ruo nwa oge mgbe ọ nakweere ụdị siri ike nke ozizi Calvin nke a nakweere. Dị ka akwụkwọ bụ́ L’Aventure de la Réforme—Le monde de Jean Calvin kwuru, na Germany esemokwu a banyere akara aka na nnwere onwe ime nhọrọ mụpụtara oge dị ogologo nke “mgbalị ndị na-agaghị nke ọma maka ime ka udo dị, nakwa mkparị, ịtụ mkpọrọ, na nchụlaga nke ndị ọkà mmụta okpukpe gaa n’ala ọzọ.”

Akara Aka Ka Ọ Bụ Nnwere Onwe Ime Nhọrọ?

Site ná mmalite, echiche abụọ a na-emegide onwe ha n’akụkụ nile, akara aka na nnwere onwe ime nhọrọ, kpalitere ọtụtụ esemokwu kporo ọkụ. Augustine n’akụkụ nke ya enwebeghị ike ịkọwa ekwekọghị ekwekọ nke a. Calvin kwa hụrụ ya dị ka ngosipụta nke uche kasị elu nke Chineke, n’ihi ya a pụghịkwa ịghọta ya.

Ma mkpughe Bible nke àgwà dị iche iche nke Chineke na ụdị onye ọ bụ ọ̀ na-enyere anyị aka ịghọta ajụjụ ndị a nke ọma karị? Isiokwu na-esonụ ga-enyocha isi ihe ndị a n’ụzọ sara mbara.

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Calvin

Luther

Jansen

[Ebe E Si Nweta Foto]

Foto nile: Bibliothèque Nationale, Paris

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya