Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ndụ Chineke Nyere Gị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 3. Na-elekọta onwe gị

      Ndị Kraịst nyefere Jehova onwe ha na-eji ndụ ha niile ejere ya ozi. Ọ dị ka à ga-asị na ha ji ahụ́ ha chụọrọ Chineke àjà. Gụọnụ Ndị Rom 12:1, 2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Gịnị mere i kwesịrị iji na-elekọta onwe gị?

      • Olee ụfọdụ n’ime ụzọ i nwere ike isi na-elekọta onwe gị?

      Ebe otu nwaanyị dị ime na dọkịta na-ekwurịta okwu.
  • Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 47. Ebe otu onye Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl na-eche ma ọ̀ ga-eme baptizim mgbe ọ hụrụ ka onye ọzọ na-eme baptizim n’otu mgbakọ.

      ISI NKE 47

      Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?

      Ị marala ọtụtụ ihe gbasara Jehova kemgbe ị malitere ịmụ Baịbụl. O nwekwara ike ịbụ na ị gbanweela ihe ụfọdụ ná ndụ gị ka ị na-agba mbọ ime ihe ị na-amụta. Ma, ọ ga-abụ na e nwere ihe na-egbochi gị inyefe Jehova onwe gị na ime baptizim. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ụfọdụ na-egbochi ndị mmadụ ime baptizim nakwa ihe ị ga-eme ka ha ghara igbochi gị ime baptizim.

      1. Olee ihe ndị i kwesịrị ima tupu i mee baptizim?

      Tupu gị emee baptizim, i kwesịrị ịma ‘eziokwu dị na Baịbụl nke ọma.’ (1 Timoti 2:4) Ọ pụtaghị na ị ga-ama azịza ajụjụ niile gbasara Baịbụl. Ndị Kraịst medịrị baptizim kemgbe ọtụtụ afọ amaghị ihe niile dị na Baịbụl. (Ndị Kọlọsi 1:9, 10) Ma, i kwesịrị ịma isi ihe Baịbụl na-akụzi. Ndị okenye ọgbakọ ga-enyere gị aka ịchọpụta ma ị̀ marala ihe ndị i kwesịrị ị mara.

      2. Olee ihe ndị i kwesịrị ime tupu gị emee baptizim?

      Tupu gị emee baptizim, i kwesịrị ‘ichegharị, lọghachikwutekwa Jehova.’ (Gụọ Ọrụ Ndịozi 3:19.) Ọ pụtara na ihe ọjọọ ndị i mere n’oge gara aga ga-ewuteru gị n’ọkpụkpụ, gị arịọ Jehova ka ọ gbaghara gị. Ị ga-ekpebisikwa ike na ị gaghịzi eme ihe ọjọọ nakwa na ị ga na-ebi ndụ otú Chineke si chọọ. Ihe ọzọ bụ na ị ga na-eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, ya bụ, ị ga na-aga ọmụmụ ihe, na-esokwa ụmụnna ndị ọzọ aga ozi ọma.

      3. Gịnị mere na i kwesịghị ikwe ka ụjọ mee ka ị ghara ime baptizim?

      Ụfọdụ ndị na-atụ ụjọ na ha agaghị emezuli nkwa ha kwere Jehova. N’ikwu eziokwu, ị ga-emehie ihe mgbe ụfọdụ, otú ahụ ndị fere Jehova, ndị Baịbụl kwuru gbasara ha mehiere ihe. Ma, Jehova anaghị atụ anya na o nweghị mgbe ndị na-efe ya ga-emehie ihe. (Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14.) Obi ga-adị ya ụtọ ma ị na-eme ike gị. Ọ ga-enyere gị aka. O medịrị ka obi sie anyị ike na o nweghị ihe ga-eme “ka [ọ] kwụsị ịhụ anyị n’anya.”​—Gụọ Ndị Rom 8:38, 39.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta otú ịmata Jehova nke ọma na ịnabata aka ọ na-enyere gị nwere ike isi mee ka ihe ọ bụla ghara igbochi gị ime baptizim.

      Foto ise na-egosi otú otu nwa agbọghọ si agba mbọ ka nsogbu dị iche iche ghara igbochi ya ime baptizim. E kwuru ihe ndị ọ na-eme na foto ise dị n’isiokwu a.

      4. Mata Jehova nke ọma

      Ebe nwa agbọghọ ahụ na otu Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl.

      Olee otú ị ga-amaru Jehova tupu gị emee baptizim? I kwesịrị ịma ya nke ọma otú ga-eme ka ị hụ ya n’anya, chọọkwa ịna-erubere ya isi. Kpọnyenụ VIDIO a ka unu hụ otú ụfọdụ ndị Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl n’ebe dị iche iche n’ụwa si mee ihe a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      VIDIO: Ihe Mmadụ Ga Na-eme Ka O Nwee Ike Ruo Eru Ime Baptizim (3:56)

      • Na vidio a anyị lere, olee ihe nyeere ụfọdụ ndị aka ijikere maka baptizim?

      Gụọnụ Ndị Rom 12:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ò nwere ihe Baịbụl kwuru na-eme gị obi abụọ? Ị̀ na-enwe obi abụọ ma ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ọ̀ bụ eziokwu?

      • Ọ bụrụ na ihe ndị a na-eme gị obi abụọ, gịnị ka i nwere ike ime?

      5. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị ime baptizim

      Ebe nwa agbọghọ ahụ na-etinye Baịbụl na-akpa ka mama ya na-abara ya mba.

      Otu nsogbu ma ọ bụ ọzọ na-abịara onye ọ bụla n’ime anyị ma anyị kpebie inyefe Jehova onwe anyị na ime baptizim. Unu chọọ ịhụ otu onye ụdị ihe a mere, kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Ịhụ Jehova n’Anya Na-emeri Ihe Isi Ike Ọ Bụla (5:22)

      • Na vidio a anyị lere, olee nsogbu ndị mere ka ime ihe Jehova chọrọ siere Narangerel ike?

      • Olee otú otú ọ hụruru Jehova n’anya si mee ka nsogbu ndị ahụ ghara igbochi ya ịna-efe Jehova?

      Gụọnụ Ilu 29:25 na 2 Timoti 1:7. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị mere obi ji sie anyị ike na e nweghị nsogbu ga-egbochili anyị ife Jehova?

      6. Nabata aka Jehova na-enyere anyị

      Ebe nwa agbọghọ ahụ na-ezi otu agadi nwaanyị ozi ọma. Ya na onye ya na ya na-amụ Baịbụl so.

      Jehova ga-enyere gị aka ịna-eme ihe dị ya mma. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Jehova Chineke Ga-enyere Gị Aka (2:50)

      • Na vidio a anyị lere, gịnị mere na onye ahụ Ndịàmà Jehova na-amụrụ Baịbụl emeghị baptizim ozugbo?

      • Olee ihe ọ mụtara nke nyeere ya aka ịnabata aka Jehova na-enyere ya?

      Gụọnụ Aịzaya 41:10, 13. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ị ga-emezuli nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị?

      7. Na-ekele Jehova maka otú o si hụ anyị n’anya

      Ebe nwa agbọghọ ahụ na-ekpe ekpere mgbe naanị nọ.

      Ị na-echebara otú Jehova si hụ anyị n’anya echiche, ị ga na-ekele ya maka ya, ị ga-achọkwa ịna-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. Gụọnụ Abụ Ọma 40:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ihe ọma ndị Jehova na-emere anyị ndị kacha amasị gị?

      Jeremaya onye amụma hụrụ Jehova n’anya, jirikwa okwu ya kpọrọ ihe. Obi dị ya ezigbo ụtọ na Jehova meere ya ihe ọma kwe ka ọ na-aza aha ya. Ọ sịrị: “Jehova Chineke . . . Okwu gị meziri ka m na-aṅụrị ọṅụ, obi ana-atọkwa m ụtọ, n’ihi na m na-aza aha gị.” (Jeremaya 15:16) Zaa ajụjụ ndị a:

      • Gịnị mere o ji bụrụ na ọ bụ ezigbo ihe ọma meere onye bụ́ Onyeàmà Jehova?

      • Ị̀ chọrọ ime baptizim ka ị bụrụ Onyeàmà Jehova?

      • È nwere ihe na-egbochi gị ime baptizim?

      • Gịnị ka i chere i kwesịrị ime ka i nwee ike mee baptizim?

      Ebe nwa agbọghọ ahụ na-eme baptizim.

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha echeghị na ha ga-emeli ihe ya na baptizim so aga.

      • Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị?

      NCHỊKỌTA

      Jehova nwere ike inyere gị aka ka ihe ọ bụla ghara igbochi gị ime baptizim.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Olee ebe ị ga-amaru ihe dị na Baịbụl tupu i mee baptizim?

      • Olee ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe ná ndụ gị tupu i mee baptizim?

      • Gịnị mere na i kwesịghị ikwe ka ụjọ mee ka ị ghara ime baptizim?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta ihe mere i kwesịrị iji mee baptizim.

      “Ị̀ Dịla Njikere Ime Baptizim?” (Ụlọ Nche, Mach 2020)

      Chọpụta otú ị ga-esi lụso nsogbu ụfọdụ ọgụ ka ha ghara igbochi gị ime baptizim.

      “Gịnị Na-egbochi Ime M Baptizim?” (Ụlọ Nche, Mach 2019)

      Chọpụta ihe otu nwoke mere ka nsogbu ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ghara igbochi ya ime baptizim.

      ‘Gịnị Na-adọla Gị Azụ Ime Baptizim?’ (1:10)

      Otu nwoke aha ya bụ Ataa nọ na-egbu oge ime baptizim. Chọpụta ihe mere o ji mechaa kpebie ime baptizim.

      Onye Dị Ka M Ò Ruru Eru Inweta Ngọzi Ndị A Niile? (7:21)

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya