-
Na-akụghasị Echiche Na-ezighị Ezi nke Na-emegide Ihe Ọmụma ChinekeỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Jun
-
-
1. Olee ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst e tere mmanụ?
E NWERE ihe Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha ‘kwụsị.’ Olee ihe ọ bụ? Ọ sịrị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.” (Rom 12:2) Ọ bụ ndị Kraịst n’oge ndịozi ka Pọl gwara ihe ahụ. Gịnị mere o ji gwa Ndị Kraịst ndị ahụ nyeferela Chineke onwe ha, e jirikwa mmụọ nsọ tee ha mmanụ, okwu ahụ?—Rom 1:7.
2-3. Olee otú Setan si agbalị ime ka anyị kwụsị ife Jehova, oleekwa otú anyị nwere ike isi wepụ ihe ndị “gbanyesịrị mgbọrọgwụ ike” n’uche anyị?
2 Ihe na-echu Pọl ụra bụ na echiche ndị na-adịghị mma nke ụwa Setan akpawala ụfọdụ Ndị Kraịst aka ọjọọ. (Efe. 4:17-19) Ụdị ihe a nwekwara ike ime onye ọ bụla n’ime anyị. Setan, bụ́ chi nke usoro ihe a fooro ntụtụ taa na ya ga-eme ka anyị kwụsị ife Jehova. Ọ bụ ya mere o ji eji ụzọ dị iche iche achọ ka ọ rata anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ndị a ma ama ma ọ bụ ndị a na-akwanyere ùgwù, o nwere ike ịchọ iji ya mee ka anyị kwụsị ịna-efe Jehova. O nwekwara ike iji ihe ndị anyị mụtara n’ụlọ anyị, n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’aka ndị anyị na ha na-emekọrịta ihe, mee ka anyị na-eche echiche otú ọ chọrọ.
-
-
Na-akụghasị Echiche Na-ezighị Ezi nke Na-emegide Ihe Ọmụma ChinekeỤlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2019 | Jun
-
-
‘IME KA UCHE GỊ DỊ ỌHỤRỤ’
4. Olee mgbanwe ọtụtụ n’ime anyị mere mgbe anyị mụtara ihe Baịbụl na-akụzi?
4 Chegodị banyere mgbanwe ndị i kwesịrị ime mgbe ahụ ị mụtara ihe Baịbụl na-akụzi ma kpebie ife Jehova. Ka anyị nwee ike ife Jehova, ọtụtụ n’ime anyị kwụsịrị àgwà ọjọọ anyị na-akpa. (1 Kọr. 6:9-11) Obi dị anyị ụtọ na Jehova nyeere anyị aka ịkwụsị ihe ndị ahụ na-adịghị mma anyị na-eme.
5. Olee ihe abụọ Ndị Rom 12:2 kwuru ka anyị na-eme?
5 Ma anyị ekwesịghị iche na okwu agwụla. N’agbanyeghị na anyị akwụsịla ime mmehie ndị dị oké njọ anyị na-eme tupu e mee anyị baptizim, anyị ga na-agbasi mbọ ike ka anyị zere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị mee ihe ndị ahụ ọzọ. Olee otú anyị nwere ike isi eme ya? Pọl kwuru, sị: “Kwụsịkwanụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị, kama gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.” (Rom 12:2) N’ihi ya, e nwere ihe abụọ anyị ga-eme. Nke mbụ bụ na anyị kwesịrị ‘ịkwụsị ịbụ ndị na-eme omume’ otú ụwa a si eme. Nke abụọ abụrụ na anyị kwesịrị ‘ịgbanwe’ site n’ime ka uche anyị dị ọhụrụ.
6. Olee ihe ndị anyị na-amụta n’ihe Jizọs kwuru na Matiu 12:43-45?
6 Mgbanwe ahụ Pọl kwuru banyere ya abụghị naanị ịgbanwe otú anyị dị n’anya. Ọ gbasara ndụ anyị niile. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ànyị Agbanweela Kpamkpam Ka Ò Yiri Ka Anyị Agbanweela?”) Ọ pụtara na anyị ga-agbanwe otú anyị si eche echiche, àgwà anyị na ihe ndị na-agụ anyị agụụ. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Mgbanwe ndị m na-eme iji bụrụ Onye Kraịst, ọ̀ bụ naanị n’anya ndị ọzọ, ka m na-aghọ Onye Kraịst n’eziokwu n’obi m na n’uche m?’ Jizọs kwuru ihe anyị kwesịrị ime na Matiu 12:43-45. (Gụọ ya.) Ihe ahụ Jizọs kwuru na-akụziri anyị otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ. Ọ na-akụziri anyị na iwepụ ihe ọjọọ n’obi anyị abụghị ebe okwu biri. Anyị kwesịrị iji ihe ndị dị Chineke mma dochie ya.
-