-
“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 15
-
-
9. Gịnị mere Pọl ji jiri Ndị Kraịst a mụrụ site na mmụọ nsọ tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche?
9 Gụọ Ndị Rom 12:4, 5, 9, 10. Pọl ji Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eje ozi n’okpuru Onyeisi ha bụ́ Kraịst, tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche. (Kọl. 1:18) O chetaara Ndị Kraịst e tere mmanụ na ahụ́ nwere ọtụtụ akụkụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nakwa na ha niile “bụ otu ahụ́ n’ime Kraịst, ọ bụ ezie na [ha] dị ọtụtụ.” Pọl gbakwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’Efesọs ume, sị: “Ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst. Ọ bụ site n’aka ya ka ahụ́ dum, site n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa, dị ka ịrụ ọrụ nke akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu si dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.”—Efe. 4:15, 16.
-
-
“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”Ụlọ Nche—2009 | Ọktoba 15
-
-
11. Na gịnị ka ịdị n’otu anyị hiwere isi, oleekwa ndụmọdụ ọzọ Pọl nyere anyị?
11 Ọ bụ ịhụnanya, bụ́ “nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu,” mere ka Ndị Kraịst dịrị n’otu. (Kọl. 3:14) Pọl mere ka nke a pụta ìhè ná Ndị Rom isi iri na abụọ, bụ́ ebe o kwuru na ịhụnanya anyị ekwesịghị “ịbụ nke ihu abụọ” nakwa na anyị kwesịrị inwe ‘obi ọmịiko n’ebe ibe anyị nọ’ “n’ịhụnanya ụmụnna.” Nke a na-eme ka anyị na-akwanyere ibe anyị ùgwù. Onyeozi ahụ sịrị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” Ma, ịhụnanya anyị ekwesịghị ịgabiga ókè. Anyị kwesịrị ime ike anyị niile iji dewe ọgbakọ ọcha. Mgbe Pọl nyere ndụmọdụ banyere ịhụnanya, ọ sịrị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.”
-