Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g20 nke 3 p. 6-7
  • Na-enwe Ọmịiko

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-enwe Ọmịiko
  • Teta!—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Enweghị Ọmịiko Nwere Ike Ịkpata
  • Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka
  • Otú Inwere Ndị Ọzọ Ọmịiko Si Enye Aka
  • Ihe I Nwere Ike Ime
  • Mmetụta Ọmịiko—Mkpịsị Ugodi nke Obiọma na Ọmịiko
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Na-eme Ebere
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2021
  • Chineke Ọ̀ Na-emetere Anyị Ebere?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Ezinụlọ na Ndị Enyi
    Teta!—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2020
g20 nke 3 p. 6-7
Ebe ụmụ nwoke abụọ na-esighị n’otu agbụrụ nọ n’ụgbọelu. Ha abụọ ji obi ụtọ na-ekwurịta okwu.

Na-enwe Ọmịiko

Nsogbu Enweghị Ọmịiko Nwere Ike Ịkpata

Ọ bụrụ na anyị ana-eche naanị otú agbụrụ anyị si dị iche n’agbụrụ ndị ọzọ, o nwere ike ime ka anyị chewe na otú ha dị ma ọ bụ otú ha si eme ihe adịghị mma. O nwekwara ike ime ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma. Ozugbo anyị malitere iche na anyị ka ndị ọzọ mma, ọ ga-eme ka o siere anyị ike ịna-enwere ha ọmịiko. Ọ bụrụ na anyị anaghị enwere ndị ọzọ ọmịiko, o nwere ike igosi na anyị kpọrọ ha asị.

Amaokwu Baịbụl Ga-enyere Gị Aka

“Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.”—NDỊ ROM 12:15.

Olee ihe amaokwu a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị ka anyị na-enwere ndị ọzọ ọmịiko. Onye na-enwere ndị ọzọ ọmịiko na-agbalị ịghọta otú ihe dịịrị ndị ahụ ma were ya na ọ bụ yanwa ka ihe ahụ na-eme.

Otú Inwere Ndị Ọzọ Ọmịiko Si Enye Aka

Ọ bụrụ na ị na-enwere mmadụ ọmịiko, ọ ga-eme ka ị mata na o nwechaghị ihe dị iche na gị na onye ahụ. Anyị nwere ike ịchọpụta na ha na-eche echiche ka anyị, na-emekwa ihe ka anyị. Inwere ndị ọzọ ọmịiko ga-eme ka anyị chọpụta na mmadụ niile si n’otu mmadụ pụta n’agbanyeghị agbụrụ ha si. Ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị anya n’otú anyị na ndị ọzọ si yie, o nwere ike anyị agaghịzi na-ele ha anya ọjọọ.

Inwere ndị ọzọ ọmịiko ga-emekwa ka anyị na-akwanyere ha ùgwù. O nwere otu nwaanyị bụ́ onye Senigal aha ya bụ Anne-Marie. O nwere mgbe ọ na-enweghị ihe o ji otu agbụrụ ọtụtụ ndị na-eleda anya kpọrọ. O kwuru otú inwere ndị ọzọ ọmịiko si nyere ya aka. Ọ sịrị: “Mgbe m hụrụ ụdị ahụhụ ndị si n’agbụrụ ahụ na-ata, m jụrụ onwe m otú ọ ga-adị m ma ọ bụrụ m na-ata ụdị ahụhụ ahụ. N’ihi ya, m chọpụtara na akaghị m ndị agbụrụ ahụ mma. O nweghị ihe ọ bụla m mere m ga-eji kara ha mma.” Ọ bụrụ na anyị agbalịa ghọta nsogbu ndị ọzọ nwere, anyị ga na-enwere ha ọmịiko kama ịna-akatọ ha.

Ihe I Nwere Ike Ime

Ọ bụrụ na e nwere agbụrụ ihe ha na-anaghị amasị gị, gbalịa chọpụta otú gị na ha si yie kama ịna-elekwasị anya n’ebe gị na ha dị iche. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara otú obi na-adị ha ma

Inwere ndị ọzọ ọmịiko ga-eme ka anyị na-ahụ ha ka ndị anyị na ha si n’otu ezinụlọ

  • ha na ndị ezinụlọ ha na-erikọ nri

  • ha rụchaa ọrụ n’ụbọchị, ike agwụ ha

  • ha na ndị enyi ha nọrọ

  • ha na-egere egwú na-amasị ha

Ihe ọzọ ị ga-eme bụ iche otú obi ga-adị gị ma a sị na ị bụ ha. Jụọ onwe gị, sị:

  • ‘Gịnị ka m ga-eme ma mmadụ mee m ka onye na-abaghị uru?’

  • ‘Olee otú obi ga-adị m ma ndị ọzọ lewe m anya ọjọọ n’ebughị ụzọ mata ụdị onye m bụ?’

  • ‘Ọ bụrụ na m si n’agbụrụ ha, olee otú m ga-achọ ka ndị ọzọ si meso m?’

Ebe ụmụ nwoke abụọ ahụ na-egosi ibe ha foto gbasara ihe ndị na-amasị ha, dị ka mgbe ha na ezinụlọ ha nọ, mgbe ha na-egwuri egwu, na mgbe ha na-arụ ọrụ.

Akụkọ Mere Eme: Robert (Sịngapọ)

“N’oge gara aga, m na-ele ndị ogbi anya ka ndị àgwà ha nwere ka ọ̀ dị, ndị ụbụrụ na-anaghị aghọcha nkọ, na ndị na-ewekarị iwe ọkụ. Ihe a mere ka m na-eze ha eze. Ma, o nweghị mgbe m lere ihe a anya ka ịkpọ ha asị ebe ọ bụ na o nweghị ihe ọjọọ m na-eme ha.

“Inwere ndị ogbi ọmịiko nyeere m aka ịkwụsị ịkpọ ha asị. Dị ka ihe atụ, m na-elebu ha anya ka ndị ụbụrụ na-anaghị aghọcha nkọ n’ihi na m na-agwa ha okwu, ha ana-ele m ka ndị na-anaghị aghọta ihe m na-ekwu. N’ihi ya, m malitere iche otú ọ ga-adị m ma onye ọzọ na-ekwu okwu, anaghị m anụ ihe ọ na-ekwu. O doro anya na m ga na-elekwa ya ka onye na-anaghị aghọta ihe ọ na-ekwu. Ọ bụrụgodị na m kwụnyere ihe ga-enyere m aka ịna-anụ ihe, ihu m ka nwekwara ike ịna-egosi na ‘ọ na-esiri m ike ịghọta ihe ọ na-ekwu’ ebe ọ bụkwanụ na ọ na-esiri m ike ịnụ ihe ọ na-ekwu.

“Mgbe m gbalịrị ghọta otú ihe si dịrị ndị ogbi, m kwụsịrị ịkpọ ha asị.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya