-
“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Julaị
-
-
14. Olee otú anyị ga-esi mata ihe na-akasi obi anyị ga-agwa ndị mmadụ nwụnahụrụ?
14 O doro anya na ọ naghị adị mfe ịma ihe ị ga-agwa onye na-eru uju. Ma, Baịbụl kwuru na “ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 12:18) Ọtụtụ ndị ahụla ihe na-akasi obi ha ga-agwa ndị ọzọ na broshọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ.c Ma, ọtụtụ mgbe, ihe na-akacha aba uru ị ga-eme bụ ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.’ (Rom 12:15) Otu nwanna nwaanyị di ya nwụrụ, aha ya bụ Gaby, sịrị: “Ọ na-abụ, o ju m obi, naanị ihe na-eme ka obi dị m mma bụ ibe ákwá. Ọ bụ ya mere obi ji adịtụ m mma ma ndị enyi m soro m bee ákwá. N’oge ahụ, ọ naghịzi adị m ka ọ̀ bụ naanị m na-eru uju a.”
-
-
“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2017 | Julaị
-
-
20. Gịnị mere nkwa ndị Jehova kwere ji akasi anyị ezigbo obi?
20 Obi dị anyị ụtọ na Jehova Chineke, bụ́ Onye na-akasi anyị obi, ga-ewepụ iru uju niile ma kasie ndị mmadụ obi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-eme ka ‘ndị niile nọ n’ili ncheta nụ olu Jizọs wee pụta.’ (Jọn 5:28, 29) Chineke kwere nkwa na “ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” (Aịza. 25:8) N’oge ahụ, kama ‘iso ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá,’ ndị niile bi n’ụwa ‘ga-eso ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ.’—Rom 12:15.
-