Ha Mere Uche Jehova
Nwanyị Nwere Ezi Uche Egbochie Ọdachi
NWANYỊ maara ihe nke nwoke jọgburu onwe ya lụrụ—nke ahụ bụ ọnọdụ Abigail na Nebal. Abigail “nwere ezi uche, maakwa mma n’ahụ.” N’ụzọ megidere nke ahụ, Nebal “siri ike n’obi, jọọkwa njọ n’omume nile.” (1 Samuel 25:3) Ihe omume ndị weere ọnọdụ na-emetụta di na nwunye a na-ekwekọghị ekwekọ mere ka e debanye aha ha n’ụzọ na-agaghị apụ apụ n’akụkọ ihe mere eme Bible. Ka anyị hụ ụzọ o si dị otú ahụ.
Ihu Ọma A Na-ejighị Kpọrọ Ihe
Ọ bụ narị afọ nke 11 T.O.A. E tewo Devid mmanụ dị ka eze ga-achị Israel n’ọdịnihu, ma kama ịnọ na-achị ọ nọ na-agba ọsọ. Eze na-achị achị bụ́ Sọl, kpebisiri ike igbu ya. N’ihi ya, a manyere Devid ibi ndụ dị ka onye ọsọ ndụ. Ya na ihe dị ka ndị agha 600 mesịrị chọta ebe mgbaba n’ọzara Peran, ebe ndịda Juda na n’akụkụ ọzara Saịnaị.—1 Samuel 23:13; 25:1.
Ka ha nọ n’ebe ahụ, ha zutere ndị ọzụzụ atụrụ otu nwoke aha ya bụ Nebal were n’ọrụ. Aka ji akụ̀ a sitere n’usoro ọmụmụ Keleb nwere atụrụ 3,000 na ewu 1,000, ọ na-akpachakwa ájị́ atụrụ ya na Kamel, otu obodo dị ná ndịda Hebrọn, ma eleghịkwa anya nke dị nanị kilomita 40 site na Peran.a Devid na ndị ikom ya nyeere ndị ọzụzụ atụrụ Nebal aka chebe ìgwè atụrụ ha pụọ n’aka ndị ohi bụ́ ndị na-awagharị n’ọzara ahụ.—1 Samuel 25:14-16.
Ka ọ dị na mgbe ahụ, ịkpacha ájị́ atụrụ ebidowo na Kamel. Nke a bụ oge ememe, nke yiri oge owuwe ihe ubi nye onye ọrụ ubi. Ọ bụkwa oge oké mmesapụ aka, mgbe ndị nwe atụrụ ji akwụghachi ndị rụwooro ha ọrụ ụgwọ. Ya mere Devid adịghị mpako mgbe o zijere ndị ikom iri n’obodo Kamel ịrịọ Nebal maka nri ná nkwụghachi ụgwọ maka ọrụ ha rụworo maka ọdịmma ìgwè atụrụ ya.—1 Samuel 25:4-9.
Nzaghachi Nebal egositụdịghị afọ ọma. “Ònye bụ Devid?” ka o kwuru n’ịkwa emo. Mgbe ahụ, n’igosi na Devid na ndị ikom ya bụ nanị ndị ohu gbapụrụ agbapụ, o kwuru, sị: “M̀ ga-ewerekwa achịcha m na mmiri m na anụ m e gburu egbu nke m gbuworo banyere ndị m na-akpacha ájị́ anụ, nye ndị ikom ndị m na-amaghị ebe ha si bịa?” Mgbe Devid nụrụ nke a, ọ gwara ndị ikom ya, sị: “Keenụ, nwoke ọ bụla mma agha ya n’úkwù ya.” Ihe dị ka ndị ikom 400 kwadebere onwe ha maka ọgụ.—1 Samuel 25:10-13.
Ezi Uche Abigail
Okwu ọjọọ ndị Nebal kwuru ruru nwunye ya, bụ́ Abigail ntị. Ikekwe nke a abụghị nke mbụ ọ na-aghaghị ịrịọchitere Nebal na imere ya ihe dị ka ome udo. Otú o sina dị, Abigail mere ihe ozugbo. N’agwaghị Nebal, ọ chịkọtara ihe dị iche iche—gụnyere atụrụ ise na ụba ihe oriri—wee pụọ izute Devid n’ọzara.—1 Samuel 25:18-20.
Mgbe Abigail ji anya gwuru Devid, ozugbo ahụ ọ daa kpuo ihu ya n’ala n’ihu ya. “Ka onyenwe m ghara ịtụkwasị obi ya n’ahụ nwoke a jọgburu onwe ya, bụ́ Nebal,” ka ọ rịọrọ ya. “Ngọzi a nke nwanyị na-ejere gị ozi wetawooro onyenwe m, ka e nye ya ụmụ okorobịa ndị na-eso onyenwe m n’ụkwụ n’ụkwụ jegharịa.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Nke a [ọnọdụ metụtara Nebal] agaghị abụrụ gị ihe nṅagharị, ọ gaghị abụrụkwa onyenwe m ihe ịsụ ngọngọ obi.” Okwu Hibru a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “nṅagharị” na-enye echiche ihe mgbu nke akọ na uche. Ya mere Abigail dọrọ Devid aka ná ntị megide iji ngwa ngwa mee ihe ọ ga-emesị kwaara ụta.—1 Samuel 25:23-31.
Devid gere Abigail ntị. “Ihe a gọziri agọzi ka ezi uche gị bụkwa, onye a gọziri agọzi ka ị bukwa, onye gbochiworo m taa ka m ghara ịba n’ikpe ọmụma ọbara,” ka ọ gwara ya. “N’ezie ọ bụrụ na i meghị ngwa bịa izute m, a gaghị eme ka nwoke fọdụrụ Nebal ma ọlị ruo ìhè ụtụtụ.”—1 Samuel 25:32-34.
Ihe Mmụta Maka Anyị
Ihe ndekọ Bible a na-egosi na ọ dịghị njọ ma ọlị ka nwanyị na-asọpụrụ Chineke bute ụzọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Abigail mere ihe megidere ọchịchọ di ya, bụ́ Nebal, ma Bible akatọghị ya maka nke a. N’ụzọ megidere nke ahụ, ọ jara ya mma dị ka nwanyị nwere ezi uche, nke maara ihe. Site n’ibute ụzọ n’ọnọdụ ọgba aghara a, Abigail zọpụtara ọtụtụ ndụ.
Ọ bụ ezie na n’ozuzu ya nwunye kwesịrị igosipụta mmụọ ịnọ n’okpuru n’ụzọ nsọpụrụ Chineke, ọ pụrụ ịghara ikwenyere di ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ụkpụrụ ziri ezi bụ ihe iseokwu. N’ezie, o kwesịrị ịgba mbọ ịnọgide na-enwe “mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo,” o kwesịghịkwa ime ihe ná ndabere nke onwe ya n’ihi iwe, nganga, ma ọ bụ nnupụisi. (1 Pita 3:4) Otú ọ dị, nwanyị nwere nsọpụrụ Chineke ekwesịghị inwe mmetụta ịbụ onye a rụgidere ime ihe ọ bụla nke ọ maara na amamihe adịghị nnọọ na ya ma ọ bụ nke na-emebi ụkpụrụ Bible. N’eziokwu, ihe ndekọ banyere Abigail na-enye arụmụka siri ike megide ndị ahụ na-esi ọnwụ na Bible na-egosi ndị inyom dị ka ndị ohu nkịtị.
Ihe ndekọ a na-akụzikwara anyị banyere njide onwe onye. Mgbe ụfọdu, Devid gosipụtara àgwà a n’ụzọ zuru ezu. Dị ka ihe atụ, ọ jụrụ igbu Eze Sọl na-abọ ọ́bọ̀, ọ bụ ezie na o nwere ohere zuru ezu ime otú ahụ, ọnwụ Sọl kwa gaara ewetara Devid udo. (1 Samuel 24:2-7) N’ụzọ dị iche, mgbe Nebal kparịrị ya, e nwetara Devid n’ọnọdụ mberede, o wee ṅụọ iyi ịbọ ọ́bọ̀. Nke a bụ ịdọ aka ná ntị doro anya nye ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agba mbọ ‘ịghara inyeghachi onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ.’ N’ọnọdụ nile, ha kwesịrị ịgbaso ndụmọdụ Pọl: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọlara onwe unu ọ́bọ̀, kama chaaranụ iwe ahụ ụzọ.”—Ndị Rom 12:17-19.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A ghọtara ọzara Peran dị ka nke gbatịpụrụrị n’ebe ugwu ruo Bịa-sheba. Ibé ala a gụnyere ebe ịta nri buru ibu.
[Foto dị na peeji nke 15]
Abigail ewetara Devid onyinye