-
2 | Emegwarala Ihe E Mere GịỤlọ Nche (Nke Ọhaneze)—2022 | No. 1
-
-
Ihe Baịbụl Kwuru:
“Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụkwa unu ka ọ dị n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. . . . Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘“Ọ bụ m ga-abọ ọbọ. M ga-akwụ ụgwọ.” Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’”—NDỊ ROM 12:17-19.
Ihe Ọ Pụtara:
Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-ewute anyị ma mmadụ mejọọ anyị. Ma, Chineke achọghị ka anyị na-emegwara ndị ọzọ ihe ha mere anyị. Kama, ọ chọrọ ka anyị nwee ndidi n’ihi na o kwere anyị nkwa na ọ ga-eme ka ihe niile dị mma n’oge na-adịghị anya.—Abụ Ọma 37:7, 10.
-