Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 14 p. 130-139
  • Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ỊBỤISI KASỊ ELU
  • “NDỊ NA-ACHỊ ISI”
  • ỊBỤISI N’IME EZINỤLỌ
  • ỊBỤISI N’IME ỌGBAKỌ
  • NAKWERE ỤZỌ JEHOVA SI ELE ỊBỤISI ANYA
  • Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Ịbụ Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ịkwanyere Ịbụisi Ùgwù—N’ihi Gịnị Ka O Ji Dị Oké Mkpa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ụzọ Onye Kraịst si Ele Ndị Na-achị Isi Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịsọpụrụ Ndị Isi?
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 14 p. 130-139

Isi nke 14

Ịbụisi Ònye Ka I Kwesịrị Ịnakwere?

1, 2. Ọ̀ bụ ụdị nile nke ịbụisi na-emejọ emejọ? Kọwaa.

“ỊBỤISI” bụ okwu na-elu ilu nye ọtụtụ ndị. Nke a kwere nghọta, n’ihi na ọtụtụ mgbe e jiwo ịbụisi mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi​—⁠n’ebe ọrụ, n’ezinụlọ, na site n’aka ndị ọchịchị. Bible kwuru n’ụzọ ezi uche dị na ya sị: “Mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ee, ọtụtụ enwewo ike n’ahụ ndị ọzọ site n’ime ihe n’ụzọ mmekpọ ọnụ na imezu ọchịchọ onwe onye.

2 Ma ọ bụghị ịbụisi nile na-emejọ emejọ. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ikwu na ahụ anyị na-egosipụta ịbụisi n’ebe anyị nọ. Ọ “na-amanye” anyị iku ume, iri nri, ịṅụ ihe ọṅụṅụ, na ihi ụra. Nke a ọ̀ bụ ihe mmegbu? Ee e. Ime ihe kwekọrọ n’ọchịchọ ndị a bụ maka ọdịmma anyị. Ọ bụ ezie na ido onwe anyị n’okpuru mkpa nile nke ahụ anyị pụrụ ịbụ nke na-ekwekọghị n’ọchịchọ anyị, e nwere ụdị ndị ọzọ nke ịbụisi nke na-achọ iji ọchịchọ obi nọọ n’okpuru. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.

ỊBỤISI KASỊ ELU

3. N’ihi gịnị ka e ji kpọọ Jehova n’izi ezi “Eze Onyenwe anyị”?

3 Ihe karịrị 300 ugboro n’ime Bible, a kpọrọ Jehova “Eze Onyenwe anyị.” Eze bụ onye nwere ịbụisi kasị elu. Gịnị na-enye Jehova ikike nke ọkwá nke a? Mkpughe 4:11 na-aza, sị: “Gị, Onyenwe anyị na Chineke anyị, I kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile: n’ihi na Gị onwe gị kere ihe nile, ọ bụkwa n’ihi ọchịchọ Gị ka ha dịrị, ka e kekwara ha eke.”

4. Olee otú Jehova si ahọrọ igosipụta ịbụisi ya?

4 Dị ka Onye Okike anyị, Jehova nwere ikike igosipụta ịbụisi ya dị ka ọ chọrọ. Nke a pụrụ iyi ihe na-atụ egwu, karịsịa mgbe anyị chetara na Chineke nwere ‘ịba ụba nke ike.’ A kpọrọ ya “Chineke Nke pụrụ ime ihe nile”​—⁠okwu nke na-enye echiche nke ume karịrị ihe nile n’asụsụ Hibru. (Aịsaịa 40:26; Jenesis 17:1) Ma, Jehova na-egosipụta ume ya n’ụzọ na-aba uru, n’ihi na àgwà ya bụ́ isi bụ ịhụnanya.​—⁠1 Jọn 4:16.

5. N’ihi gịnị ka ọ na-esighị ike ido onwe onye n’okpuru ịbụisi Jehova?

5 Ọ bụ ezie na Jehova dọrọ aka ná ntị na ya ga-ewetara ndị mmehie na-echegharịghị ntaramahụhụ, Mosis maara ya karịsịa dị ka “Chineke ahụ Nke kwesịrị ntụkwasị obi, na-edebere ndị hụrụ Ya n’anya, ndị na-edebekwa ihe nile O nyere n’iwu, ọgbụgba ndụ Ya na ebere Ya.” (Deuterọnọmi 7:9) Leedị nke ahụ! Onyeisi Kasị Elu nke eluigwe na ala adịghị amanye anyị ijere ya ozi. Kama nke ahụ, a na-adọta anyị n’ebe ọ nọ n’ihi ịhụnanya ya. (Ndị Rom 2:4; 5:8) Ido onwe anyị n’okpuru ịbụisi Jehova bụ ọbụna ihe obi ụtọ, n’ihi na iwu ya nile na-arụ ọrụ mgbe nile maka abamuru anyị kasịnụ.​—⁠Abụ Ọma 19:​7, 8.

6. Olee otú ihe iseokwu nke ịbụisi si bilite n’ogige Iden, gịnịkwa ka ọ rụpụtara?

6 Nne na nna anyị mbụ jụrụ ọkaaka Chineke. Ha chọrọ ikpebiri onwe ha ihe bụ ihe ọma na ihe bụ ihe ọjọọ. (Jenesis 3:​4-⁠6) N’ihi ya, a chụpụrụ ha na Paradaịs ebe ha bi. Jehova mesịrị kwere ka ụmụ mmadụ guzobe usoro ịbụisi nke ga-eme ka ha nwee ike ibi ndụ n’ọha mmadụ dị n’usoro, ọ bụ ezie na ọ bụ nke na-ezughị okè. Olee ụfọdụ n’ịbụisi ndị a, ruokwa ókè hà aṅaa ka Chineke na-atụ anya ka anyị doo onwe anyị n’okpuru ha?

“NDỊ NA-ACHỊ ISI”

7. Olee ndị bụ “ndị na-achị isi,” oleekwa otú ọnọdụ ha si metụta ịbụisi Chineke?

7 Pọl onyeozi dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.” Olee ndị bụ “ndị na-achị isi”? Okwu Pọl n’amaokwu ndị na-esochi gosiri na ha bụ ndị isi ọchịchị ụmụ mmadụ. (Ndị Rom 13:​1-⁠7; Taịtọs 3:1) Jehova amaliteghị ịbụisi ọchịchị mmadụ, kama ha dịrị site n’ohere o nyere. Ya mere Pọl pụrụ ide, sị: “Ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.” Gịnị ka nke a na-egosi banyere ịbụisi elu ụwa dị otú ahụ? Na ọ dị n’okpuru, ma ọ bụ dị ala, n’ebe ịbụisi Chineke dị. (Jọn 19:​10, 11) Ya mere, mgbe iwu mmadụ na iwu Chineke sọkọtara isi, ndị Kraịst aghaghị ịbụ ndị akọ na uche ha e ji Bible zụọ duziri. Ha “aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”​—⁠Ọrụ 5:29.

8. Olee otú i si erite uru site n’aka ndị na-achị isi, oleekwa ụzọ ị pụrụ isi gosi ịnọ n’okpuru gị n’ebe ha nọ?

8 Otú ọ dị, ọtụtụ oge karị, ndị ọchịchị na-achị isi na-arụ ọrụ dị ka ‘onye na-ejere Chineke ozi iwetara anyị ezi ihe.’ (Ndị Rom 13:4) N’ụzọ ndị dị aṅaa? Ọ dị mma, chee echiche banyere ọtụtụ ozi ndị na-achị isi na-eje, dị ka ikesa ozi, nchebe ndị uwe ojii na ọkụ ọgbụgba, idebe ihe ọcha, na agụmakwụkwọ. “N’ihi nke a ka unu na-atụkwa ụtụ,” ka Pọl dere, “n’ihi na ha bụ ndị na-efe Chineke ofufe, na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ime otú ihe a.” (Ndị Rom 13:6) Banyere ịtụ ụtụ ma ọ bụ ibu ọrụ ọ bụla ọzọ iwu kwadoro, anyị kwesịrị “ibi obi nke ọma.”​—⁠Ndị Hibru 13:18.

9, 10. (a) Olee otú ndị na-achị isi si kwekọọ n’iwu Chineke nyere? (b) N’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị njọ iguzogide ndị na-achị isi?

9 Mgbe ụfọdụ, ndị na-achị isi na-eji ike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Nke a ọ̀ na-anapụ anyị ibu ọrụ anyị nke ịnọgide n’okpuru ha? Ee e, ọ dịghị eme otú ahụ. Jehova na-ahụ mmejọ nile nke ndị a na-achị isi. (Ilu 15:3) Ya ikwere ka ịchịisi mmadụ dịgide apụtaghị na ọ na-agbachi ịrụ arụ ya nkịtị; ọ dịghịkwa atụ anya ka anyị mee otú ahụ. N’ezie, n’isi nso Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa,” jiri ọchịchị ezi omume nke ya dochie ha. (Daniel 2:44) Ma ruo mgbe nke a ga-eme, ndị na-achị isi na-eje ozi bara uru.

10 Pọl kọwara: “Onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere.” (Ndị Rom 13:2) Ndị na-achị isi bụ “iwu Chineke nyere” n’echiche nke na ha na-eme ka e nwee ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ịdị n’usoro nke ma ọ́ bụghị ya ọgba aghara na mkpaghasị ga-eju ebe nile. Imegide ha ga-abụ imegide Akwụkwọ Nsọ na ime ihe nzuzu. Iji maa atụ: Ka e were ya na a wara gị ahụ, e jikwa eriri na-ejikọta ọnyà ahụ. Ọ bụ ezie na eriri ndị ahụ abụghị akụkụ ahụ gị, ha na-eje ozi dị mkpa ruo oge ụfọdụ. Iwepụ ha tupu oge eruo pụrụ ịbụ ihe mmerụ ahụ. N’otu aka ahụ, ịbụisi ọchịchị mmadụ abụghị akụkụ nzube Chineke ná mmalite. Otú ọ dị, ruo mgbe Alaeze ya ga na-achị ụwa n’ụzọ zuru ezu, ọchịchị mmadụ na-ejikọta ọha mmadụ ọnụ, na-eje ozi nke kwekọrọ n’uche Chineke maka oge dị ugbu a. N’ihi ya anyị kwesịrị ịnọgide n’okpuru ndị na-achị isi, ka anyị na-ebute iwu na ịbụisi Chineke ụzọ.

ỊBỤISI N’IME EZINỤLỌ

11. Olee otú ị ga-esi kọwaa ụkpụrụ nke ịbụisi?

11 Ezinụlọ bụ njikọ bụ́ isi nke ọha mmadụ. N’ime ya di na nwunye pụrụ inweta mkpakọrịta na-enye ụgwọ ọrụ, a pụkwara ichebe ụmụaka ma zụọ ha maka oge itoru ogo mmadụ. (Ilu 5:​15-⁠21; Ndị Efesọs 6:​1-⁠4) Ndokwa nke a magburu onwe ya chọrọ ka a hazie ya n’ụzọ ga-eme ka ndị òtù ezinụlọ nwee ike ibi ndụ n’udo na nkwekọ. Ụzọ Jehova si emezu nke a bụ site n’ụkpụrụ ịbụisi, nke a chịkọtara n’okwu ndị a, bụ́ ndị a na-achọta ná 1 Ndị Kọrint 11:3; “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”

12, 13. Ònye bụ isi ezinụlọ, gịnịkwa ka a pụrụ ịmụta site n’ụzọ Jisọs si abụ isi?

12 Di bụ isi nke ezinụlọ. Ma, e nwere onye bụ isi n’elu ya​—⁠Jisọs Kraịst. Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ di, hụnụ nwunye unu n’anya, dị ka Kraịst anyị hụkwara nzukọ Ya n’anya, rarakwa Onwe ya nye n’ihi ya.” (Ndị Efesọs 5:25) Di na-egosipụta ya ịnọ n’okpuru Kraịst mgbe ọ na-emeso nwunye ya n’ụzọ Jisọs siworo mesoo ọgbakọ ya mgbe nile. (1 Jọn 2:6) E nyewo Jisọs ike dị ukwuu, ma ọ na-eji ya eme ihe n’ịdị nro, ịhụnanya, na ezi uche kasị ukwuu. (Matiu 20:​25-⁠28) Dị ka nwoke, ọ dịghị mgbe Jisọs jiri ọkwá ịbụisi ya mee ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ọ bụ “Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi,” ọ kpọkwara ụmụazụ ya “ndị enyi” kama ịkpọ ha “ndị ohu.” “Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike,” ka o kwere ha nkwa ya, nke ahụ bụkwa ihe o mere.​—⁠Matiu 11:​28, 29; Jọn 15:15.

13 Ihe nlereanya Jisọs na-akụziri ndị bụ́ di na ịbụisi onye Kraịst abụghị ọkwá nke ọchịchị aka ike. Kama nke ahụ, ọ bụ nke nkwanye ùgwù na ịhụnanya iji onwe onye achụ àjà. Nke a ga-akachapụ kpam kpam imeso nwunye n’ụzọ ọjọọ n’ụzọ nkịtị ma ọ bụ n’okwu ọnụ. (Ndị Efesọs 4:29, 31, 32; 5:28, 29; Ndị Kọlọsi 3:19) Ọ bụrụ na nwoke bụ́ onye Kraịst emesoo nwunye ya n’ụzọ ọjọọ otú a, ọrụ ọma ndị ọzọ nile ọ na-arụ agaghị enwe isi, a ga-egbochikwa ekpere ya.​—⁠1 Ndị Kọrint 13:1-⁠3; 1 Pita 3:7.

14, 15. Olee otú ihe ọmụma Chineke si enyere nwunye aka ido onwe ya n’okpuru di ya?

14 Mgbe di na-eṅomi ihe nlereanya Kraịst, ọ na-akara nwunye ya mfe ikwekọ n’okwu Ndị Efesọs 5:​22, 23: “Ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bụkwa isi nzukọ Ya.” Dị nnọọ ka di ga-edo onwe ya n’okpuru Kraịst, nwunye aghaghị ịnọ n’okpuru di ya. Bible na-emekwa ka o doo anya na ndị nwunye na-ejide onwe ha ruru eru inweta nsọpụrụ na otuto maka amamihe Chineke na ịrụsi ọrụ ike ha.​—⁠Ilu 31:​10-⁠31.

15 Ọnụnọ nwunye bụ́ onye Kraịst n’okpuru di ya bụ nke a kpaara ókè. Nke a pụtara na a ghaghị irubere Chineke isi karịa mmadụ ma ọ bụrụ na ido onwe onye n’okpuru n’okwu ụfọdụ ga-arụpụta imebi iwu Chineke. Ọbụna mgbe ahụ, nguzo siri ike nke nwunye kwesịrị ịbụ nke a gwara “mmụọ dị nwayọọ dịkwa udo.” O kwesịrị ịpụta ìhè na ihe ọmụma Chineke emewo ya nwunye ka mma. (1 Pita 3:​1-⁠4) Otu ihe ahụ ga-abụkwa eziokwu banyere nwoke bụ́ onye Kraịst nke nwunye ya bụ onye na-ekweghị ekwe. Nkwekọ ya n’ụkpụrụ nile nke Bible kwesịrị ime ya di ka mma.

16. Olee otú ụmụaka pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jisọs setịpụrụ mgbe ọ bụ ntorobịa?

16 Ndị Efesọs 6:1 na-edepụta òkè nke ụmụaka, na-ekwu, sị: “Na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi.” Ụmụaka bụ́ ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya Jisọs, onye nọgidere na-edo onwe ya n’okpuru ndị mụrụ ya ka ọ na-etolite. Dị ka nwa okoro na-erube isi, ọ “na-aga n’ihu n’amamihe na ogologo, naagakwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ.”​—⁠Luk 2:​51, 52.

17. Ụzọ ndị nne na nna si abụ isi pụrụ inwe mmetụta dị aṅaa n’ahụ ụmụ ha?

17 Ụzọ ndị nne na nna si hụ maka ibu ọrụ ha pụrụ inwe mmetụta n’ihe banyere ma ụmụ ha hà ga-akwanyere ịbụisi ùgwù ma ọ bụ nupụ isi megide ya. (Ilu 22:6) Ya mere ndị nne na nna pụrụ ime nke ọma ịjụ onwe ha sị, ‘M̀ na-eji ike m eme ihe n’ụzọ ịhụnanya ka ọ bụ n’aka ike? M̀ na-anabata ihe ọjọọ?’ A na-atụ anya ka nne ma ọ bụ nna na-asọpụrụ Chineke na-ahụ n’anya ma na-echebara ndị ọzọ echiche, ma na-eguzosi ike n’ijigide ụkpụrụ nile nke Chineke. N’ụzọ kwesịrị ekwesị, Pọl dere, sị: “Ndị bụ́ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe [n’ụzọ nkịtị, ‘ịkpali ha inwe ọnụma’]: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.”​—⁠Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21.

18. Olee otú e kwesịrị isi nye ịdọ aka ná ntị nne na nna?

18 Ndị nne na nna kwesịrị inyochasi ike ụzọ nile ha si enye ọzụzụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ụmụ ha na-erube isi wee si otú ahụ wetara ha ọṅụ. (Ilu 23:​24, 25) N’ime Bible, ịdọ aka ná ntị bụ ụdị bụ́ isi nke ntụziaka. (Ilu 4:1; 8:33) E jikọtara ya na ịhụnanya na ịdị nro, ọ bụghị ya na iwe na obi ọjọọ. N’ihi ya, ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst nwere mkpa ime ihe n’amamihe ma jide onwe ha aka mgbe ha na-enye ụmụ ha ịdọ aka ná ntị.​—⁠Ilu 1:7.

ỊBỤISI N’IME ỌGBAKỌ

19. Olee otú Chineke siworo mee ka e nwee usoro dị mma n’ọgbakọ ndị Kraịst?

19 Ebe Jehova bụ Chineke nke udo, ezi uche dị ya na ọ ga-enye ndị ya idu ndú nke nwere ikike na nke a haziri nke ọma. N’ihi ya, ọ họpụtawo Jisọs dị ka Isi nke ọgbakọ ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 14:​33, 40; Ndị Efesọs 1:​20-⁠23) N’okpuru idu ndú a na-adịghị ahụ anya nke Kraịst, Chineke enyewo ike maka ndokwa nke ndị okenye a họpụtara ahọpụta n’ime ọgbakọ nke ọ bụla na-anọ n’ime ya azụ ìgwè atụrụ ahụ site n’ịnụ ọkụ n’obi, n’ọchịchọ obi, na n’ịhụnanya. (1 Pita 5:​2, 3) Ndị ohu na-eje ozi na-enyere ha aka n’ụzọ dị iche iche ma na-eje ozi ndị bara uru n’ime ọgbakọ.​—⁠Ndị Filipaị 1:1.

20. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji doo onwe anyị n’okpuru ndị okenye bụ́ ndị Kraịst a họpụtara ahọpụta, n’ihi gịnịkwa ka nke a ji na-aba uru?

20 Banyere ndị okenye bụ́ ndị Kraịst, Pọl dere, sị: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghị unu uru.” (Ndị Hibru 13:17) N’amamihe, Chineke enyefewo ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst ibu ọrụ nke ilekọta mkpa ime mmụọ nke ndị nọ n’ime ọgbakọ. Ndị okenye a adịghị aghọ òtù ndị ụkọchukwu. Ha bụ ndị na-eje ozi na ndị ohu nke Chineke, na-eje ozi maka mkpa nke ndị ofufe ibe ha, dị nnọọ ka Onyenwe ha, Jisọs Kraịst, mere. (Jọn 10:​14, 15) Ịmara na ndị ikom ruru eru n’ụzọ Akwụkwọ Nsọ na-enwe mmasị n’ọganihu na uto ime mmụọ anyị na-agba anyị ume ikwenyere ha na ido onwe anyị n’okpuru.​—⁠1 Ndị Kọrint 16:16.

21. Olee otú ndị okenye a họpụtara ahọpụta si achọ inyere ndị Kraịst ibe ha aka n’ụzọ ime mmụọ?

21 Mgbe ụfọdụ, atụrụ nwere ike ịkpafu ma ọ bụ bụrụ nke ihe dị iche iche na-emerụ ahụ n’ụwa tinyere n’ihe ize ndụ. N’okpuru idu ndú Onye Isi Ọzụzụ Atụrụ ahụ, ndị okenye dị ka ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru na-amụ anya ịhụ mkpa nke ndị ha na-elekọta ma jiri ịdị uchu na-elebara ha anya n’otu n’otu. (1 Pita 5:4) Ha na-eleta ndị òtù ọgbakọ ma na-ekwu okwu agbamume. N’ịmara na Ekwensu na-achọ ịkpaghasị udo nke ndị Chineke, ndị okenye na-eji amamihe sitere n’elu eme ihe n’ịhụ maka nsogbu ọ bụla. (Jemes 3:​17, 18) Ha na-arụsi ọrụ ike iji jigide ịdị n’otu nke okwukwe, ihe nke Jisọs n’onwe ya kpere ekpere ya.​—⁠Jọn 17:20-⁠22; 1 Ndị Kọrint 1:10.

22. Olee enyemaka ndị okenye na-enye n’ọnọdụ nke ime mmehie?

22 Gịnị ma ọ bụrụ na onye Kraịst ataa ahụhụ ihe ọjọọ ma ọ bụ nwee nkụda obi n’ihi ime mmehie? Ndụmọdụ Bible nke na-agụgụ obi na ekpere ndị sitere n’obi nke ndị okenye n’isi ya pụrụ inye aka iweghachi ya n’ahụ ike ime mmụọ. (Jemes 5:​13-⁠15) Ndị ikom a, bụ́ ndị mmụọ nsọ họpụtara, nwekwara ikike inye ịdọ aka ná ntị na ịbara onye ọ bụla gbasoro ụzọ mmehie ma ọ bụ na-aghọ ihe ize ndụ nye ịdị ọcha ime mmụọ na omume nke ọgbakọ mba. (Ọrụ 20:28; Taịtọs 1:9; 2:15) Iji debe ọgbakọ ọcha, ọ pụrụ ịdị mkpa ka ndị mmadụ mee mkpesa nke mmehie dị oké njọ. (Levitikọs 5:1) Ọ bụrụ na onye Kraịst nke meworo ajọ mmehie anakwere ịdọ aka ná ntị na ịba mba nke Akwụkwọ Nsọ ma nye ihe àmà nke ezigbo nchegharị, a ga-enyere ya aka. Otú ọ dị, a na-achụpụ ndị siri ọnwụ na-emebi iwu Chineke ma hapụ ichegharị.​—⁠1 Ndị Kọrint 5:​9-⁠13.

23. Gịnị ka ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst na-enye maka ọdịmma nke ọgbakọ?

23 Bible buru amụma na n’okpuru Jisọs Kraịst dị ka Eze, a ga-ahọpụta ndị ikom tozuru etozu n’ụzọ ime mmụọ inye ndị Chineke nkasi obi, nchebe, na izu ike. (Aịsaịa 32:​1, 2) Ha ga-ebute ụzọ dị ka ndị na-ezisa ozi ọma, ndị ọzụzụ atụrụ, na ndị nkụzi iji kwalite uto ime mmụọ. (Ndị Efesọs 4:​11, 12, 16) Ọ bụ ezie na ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst pụrụ mgbe ụfọdụ ịba mba, ịtụ mmehie n’anya, na ịgba ndị kwere ekwe ibe ha ume, ntinye nke ozizi na-enye ezi ndụ nke ndị okenye na-enye, bụ́ nke dabeere n’Okwu Chineke, n’ọrụ na-enye aka idebe mmadụ nile n’ụzọ nke na-eduba ná ndụ.​—⁠Ilu 3:11, 12; 6:23; Taịtọs 2:1.

NAKWERE ỤZỌ JEHOVA SI ELE ỊBỤISI ANYA

24. Banyere ihe iseokwu dị aṅaa ka a na-ele anyị ule kwa ụbọchị?

24 E lere nwoke na nwanyị mbụ ule n’okwu ịnọ n’okpuru ịbụisi. Ọ bụghị ihe ijuanya na ule yiri nke ahụ na-eche anyị ihu kwa ụbọchị. Setan Ekwensu akwalitewo mmụọ nke nnupụisi n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Efesọs 2:2) A na-eme n’ụzọ na-adọrọ adọrọ ka ụzọ nke nnwere onwe yie ihe ka ịnọ n’okpuru mma.

25. Olee uru ndị dị n’ịjụ mmụọ nnupụisi nke ụwa na n’ido onwe onye n’okpuru ịbụisi nke Chineke na-egosipụta ma ọ bụ na-ekwe ka ọ dịrị?

25 Ma, anyị aghaghị ịjụ mmụọ nnupụisi nke ụwa. N’ime otú ahụ, anyị ga-ahụ na ịnọ n’okpuru n’ụzọ Chineke na-eweta ụgwọ ọrụ bara ụba. Dị ka ihe atụ, anyị ga-ezere nchekasị na obi nkoropụ nile e ji mara ndị na-akpatara onwe ha nsogbu ndị isi ọchịchị. Anyị ga-ebelata adịghị n’udo nke jupụtara n’ọtụtụ ezinụlọ. Anyị ga-anụkwa ụtọ uru nile nke mkpakọrịta na-ekpo ọkụ, nke ịhụnanya, nke anyị na ndị ofufe ibe anyị bụ́ ndị Kraịst. Nke kasịnụ, ịnọ n’okpuru anyị n’ụzọ Chineke ga-arụpụta mmekọrịta dị mma nke anyị na Jehova, bụ́ Onye Isi Kasị Elu.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Olee otú Jehova si egosipụta ịbụisi ya?

Olee ndị bụ “ndị na-achị isi,” oleekwa ụzọ anyị si anọgide n’okpuru ha?

Ibu ọrụ dị aṅaa ka ụkpụrụ ịbụisi na-atụkwasị onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ?

Olee otú anyị pụrụ isi doo onwe anyị n’okpuru n’ime ọgbakọ ndị Kraịst?

Igbe dị na peeji nke 134]

IDO N’OKPURU, Ọ BỤGHỊ ỊGBA MGBA OKPURU

Site n’ọrụ nkwusa ihu ọha ha, Ndịàmà Jehova na-atụ aka n’Alaeze Chineke dị ka olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere nanị ya maka ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ma ndị mkpọsa ndị a na-anụ ọkụ n’obi nke Alaeze Chineke abụghị ma ọlị ndị na-agba ọchịchị ndị ha bi n’okpuru ha mgba okpuru. N’ụzọ megidere nke ahụ, Ndịàmà so n’ụmụ amaala kasị na-akwanye ùgwù ma na-edebe iwu. “Ọ bụrụ na òtù okpukpe nile dị ka Ndịàmà Jehova,” ka otu onye isi ọchịchị n’otu mba Africa kwuru, “anyị agaghị enwe igbu mmadụ, mwaba n’ụlọ mmadụ, ekwekọghị n’ụkpụrụ, ndị mkpọrọ na bọmbụ atọm. A gaghị na-akpọchi ụzọ ụbọchị dum.”

N’ihi ịmara nke a, ndị isi ọchịchị n’ọtụtụ ala ekwerewo ka ọrụ nkwusa Ndịàmà na-aga n’ihu n’enweghị mgbochi. N’ala ndị ọzọ, e wepụwo mmachibido iwu na ịkpa ókè mgbe ndị isi ghọtara na Ndịàmà Jehova na-akwalite ime ihe ọma. Ọ bụ dị ka Pọl onyeozi dere banyere irubere ndị na-achị isi: “Na-eme ezi ihe, ị ga-enwekwa otuto site n’aka ya.”​—⁠Ndị Rom 13:​1, 3.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya