Ì Kwesịrị Ịtụ Ụtụ Isi?
“Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru.”—Ndị Rom 13:7, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
EBE ọ bụ na ụtụ isi anọgidewo na-arị elu, ndụmọdụ ahụ dị n’elu pụrụ isi ike nnakwere. Otú ọ dị, ọ bụ Pọl onyeozi kwuru ya, e dekọkwara ha n’ime Bible. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị na-akwanyere Bible ùgwù. Ma ị pụrụ iche, sị, ‘Ọ̀ bụ iwu na Ndị Kraịst ga-atụrịrị ụtụ isi nile—gụnyere ndị ụfọdụ mmadụ pụrụ ile anya dị ka ndị ezi uche na-adịghị na ha ma ọ bụ ndị a na-ana n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị?’
Chegodị echiche banyere ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya. Ọ maara na ndị obodo ya bụ́ ndị Juu anabatatụghị ụtụ isi ndị Rom kwuru ka ha na-atụ. N’agbanyeghị nke a, Jizọs gbara ha ume, sị: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza, ma kwụghachinụ Chineke ihe nke Chineke.” (Mak 12:17) N’ụzọ na-akpali mmasị, Jizọs kwadoro ịtụ ụtụ isi nye kpọmkwem ọchịchị ahụ nke ga-egbu ya n’oge na-adịghị anya.
Afọ ole na ole mgbe e mesịrị, Pọl nyere ndụmọdụ ahụ e hotara ná mmalite. Ọ gbara ume ka a na-atụ ụtụ isi, n’agbanyeghị na a na-eji ihe ka ukwuu n’ego ụtụ isi akwado usuu ndị agha Rom nakwa ụdị ndụ rụrụ arụ na nke imebiga ihe ókè bụ́ nke ndị eze ukwu Rom na-ebi. N’ihi gịnị ka Pọl ji nwee echiche dị otú ahụ bụ́ nke ga-eme ka ndị mmadụ lewe ya anya ọjọọ?
Ikike Ndị Ka Elu
Tụlee ihe gbara okwu Pọl gburugburu. Ná Ndị Rom 13:1, o dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ikike ndị ka elu, n’ihi na ikike ọ bụla adịghị ma ọ́ bụghị site na Chineke; Chineke debere ikike ndị dị adị n’ọkwá ha ndị ka ala.” Mgbe mba Izrel nwere ndị eze na-atụ egwu Chineke, ọ dịịrị ha mfe ile ịkwado mba ha anya n’ụzọ ego dị ka ọrụ dịịrị nwa amaala nakwa dị ka ihe okpukpe ha chọrọ ha n’aka. Ma, Ndị Kraịst hà nwere ibu ọrụ dị otú ahụ mgbe ndị na-achị ha bụ ndị na-ekweghị ekwe na-ekpere arụsị? Ee, ha nwere! Okwu Pọl gosiri na Chineke nyere ndị ọchịchị “ikike” ịchị achị.
Gọọmenti na-arụ ọrụ dị ukwuu iji hụ na aghara adịghị. Nke a na-eme ka Ndị Kraịst gaa n’ihu n’ịrụ ọrụ ime mmụọ ha dị iche iche. (Matiu 24:14; Ndị Hibru 10:24, 25) N’ihi ya, Pọl kwuru banyere ndị ọchịchị, sị: “Ọ bụụrụ gị onye na-ejere Chineke ozi maka ọdịmma gị.” (Ndị Rom 13:4) Pọl n’onwe ya ritere uru ná ndokwa ndị ọchịchị Rom mere maka nchebe. Dị ka ihe atụ, mgbe ìgwè na-eme ihe ike kpaara ya aka, ndị agha Rom napụtara ya. E mesịa, ọ rịọrọ ka ụlọikpe Rom kpegharịa ikpe ya ka o wee nwee ike ịnọgide na-eje ozi dị ka onye ozi ala ọzọ.—Ọrụ 22:22-29; 25:11, 12.
Ya mere, Pọl kwuru ụzọ ihe atọ mere a ga-eji na-atụ ụtụ isi. Nke mbụ, o kwuru banyere “ọnụma” ndị ọchịchị na-enwe n’ịta ndị nupụrụ isi n’iwu ahụ ahụhụ. Nke abụọ, ọ kọwara na akọ na uche onye na-asọpụrụ Chineke ga-ama ya ikpe nke ukwuu ma ọ ghọọ aghụghọ n’ịtụ ụtụ isi. N’ikpeazụ, o gosiri na ịtụ ụtụ isi bụ nanị ihe e ji eti gọọmenti aka n’obi maka ozi dị iche iche ha na-eje dị ka ‘ndị ozi na-ejere ọha mmadụ ozi.’—Ndị Rom 13:1-6.
Ndị Kraịst ibe Pọl hà rubere isi n’ihe o kwuru? Ihe àmà na-egosi na ha rubere, n’ihi na onye edemede nke bụ́ Onye Kraịst n’ọnụ na narị afọ nke abụọ, bụ́ Justin Martyr (ihe dị ka 110 ruo 165 O.A.) kwuru na Ndị Kraịst tụrụ ụtụ isi ha “ngwa ngwa karịa ndị ọzọ nile.” Taa, mgbe ndị ọchịchị chọrọ ka ha wepụta oge ha ma ọ bụ kwụọ ụgwọ ụfọdụ, Ndị Kraịst na-anọgide na-erube isi.—Matiu 5:41.a
N’ezie, Ndị Kraịst nweere onwe ha irite uru ná nsepụ ego ọ bụla iwu kwadoro. N’ọnọdụ ụfọdụ, ha pụrụ iso ná ndị ga-erite uru ná nsepụ ego ma ọ bụ ngụpụ ụtụ isi ndị a na-esepụrụ ma ọ bụ na-agụpụrụ ndị na-enye onyinye maka òtù okpukpe. Ka o sina dị, n’irube isi n’Okwu Chineke, ezi Ndị Kraịst adịghị ezere ịtụ ụtụ isi. Ha na-atụ ụtụ isi ha, na-ahapụrụ ndị ọchịchị ibu ọrụ nke ikpebi ihe ha ga-eji ego ahụ mee.
Ịna ụtụ isi gabigara ókè bụ nanị otu n’ime ụzọ “mmadụ [nweworo] ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.” (Eklisiastis 8:9) Ndịàmà Jehova na-enweta nkasi obi ná nkwa Bible bụ́ na n’isi nso, ikpe ziri ezi ga-ejupụta ebe nile n’okpuru ọchịchị Chineke—ọchịchị nke na-agaghị eji ụtụ isi ndị na-ezighị ezi ebogbu ndị mmadụ.—Abụ Ọma 72:12, 13; Aịsaịa 9:7.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ndụmọdụ Jizọs bụ́ ka a kwụọ “Siza ihe nke Siza” ejedebeghị n’ịtụ ụtụ isi. (Matiu 22:21) Akwụkwọ bụ́ Critical and Exegetical Hand-Book to the Gospel of Matthew, nke Heinrich Meyer dere, na-akọwa, sị: “Mgbe e kwuru banyere [ihe Siza] . . . anyị agaghị aghọta ya nanị dị ka ịtụ ụtụ isi dịịrị nwa amaala, kama dị ka ihe ọ bụla ruuru Siza n’ihi ịchịisi iwu kwadoro nke ọ na-achị.”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
Ndị Kraịst oge mbụ tụrụ ụtụ isi ha “ngwa ngwa karịa ndị ọzọ nile”—JUSTIN MARTYR
[Foto dị na peeji nke 10]
Ezi Ndị Kraịst na-erube isi n’iwu ụtụ isi
[Foto dị na peeji nke 11]
Jizọs kwuru, sị: “Kwụghachinụ Siza ihe nke Siza”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 10]
© European Monetary Institute