-
Na-akwụwa Aka Ọtọ n’Ihe NiileNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
2. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị?
Jehova chọrọ ka anyị ‘na-agwa ibe anyị eziokwu.’ (Zekaraya 8:16, 17) Gịnị ka ịgwa ibe anyị eziokwu pụtara? Ma ànyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị ma ọ bụ ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anọchite anya ndị ọchịchị, anyị ekwesịghị ịghara ha ụgha ma ọ bụkwanụ gwa ha ihe na-abụchaghị eziokwu. Ndị na-akwụwa aka ọtọ anaghị ezu ohi, ha anaghịkwa egwu ndị ọzọ wayo. (Gụọ Ilu 24:28 na Ndị Efesọs 4:28.) Ha na-atụkwa ụtụ isi niile ha kwesịrị ịtụ. (Ndị Rom 13:5-7) Ihe a bụ ole na ole n’ime ụzọ dị iche iche anyị si egosi na anyị na-akwụwa “aka ọtọ n’ihe niile.”—Ndị Hibru 13:18.
-
-
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa PụtaraNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 45
Ihe Ịdị Iche n’Ụwa Pụtara
Jizọs sịrị na ndị na-eso ụzọ ya “abụghị nke ụwa.” (Jọn 15:19) Otu n’ime ihe ọ pụtara bụ na ha ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa ma ọ bụ n’agha. N’eziokwu, ime ihe a anaghị adịcha mfe mgbe niile. O nwere ike ime ka ndị mmadụ jiri anyị na-eme ihe ọchị. Olee otú anyị ga-esi rubere Jehova Chineke isi ma gosi na anyị dị iche n’ụwa?
1. Olee otú ezigbo Ndị Kraịst si ele ndị ọchịchị anya?
Ndị Kraịst na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. Anyị na-eme ihe Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “Kwụọnụ Siza ihe Siza.” Ọ pụtara na anyị ga na-erubere iwu obodo anyị isi, dị ka iwu nke kwuru ka anyị na-atụ ụtụ isi anyị. (Mak 12:17) Baịbụl kwuru na ihe mere ụmụ mmadụ ji na-achị bụ maka na Jehova hapụrụ ha. (Ndị Rom 13:1) Ihe a na-egosi na o nwere ebe ike ndị ọchịchị ruru kwụsị, ya bụ, ọ bụghị ihe niile ka ha nwere ike ime. Anyị na-atụ anya na oge na-abịa mgbe Chineke anyị ga-eji Alaeze ya dị n’eluigwe kwụsị nsogbu niile na-echi ụmụ mmadụ ọnụ n’ala.
2. Olee otú anyị ga-esi na-egosi na anyị dị iche n’ụwa?
Dị ka Jizọs, anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Mgbe ndị mmadụ chọrọ ime Jizọs eze ha n’ihi ọrụ ebube ha hụrụ ọ rụrụ, o kweghị. (Jọn 6:15) Maka gịnị? Ọ bụ maka ihe o mechara kwuo. Ọ sịrị: “Alaeze m abụghị nke ụwa a.” (Jọn 18:36) E nwere ụzọ dị iche iche anyị bụ́ ndị na-eso ụzọ Jizọs si egosi na anyị dị iche n’ụwa. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị aga agha. (Gụọ Maịka 4:3.) Anyị na-akwanyere ihe ndị na-anọchi anya obodo, dị ka ọkọlọtọ, ùgwù, mana anyị anaghị efe ha ofufe. (1 Jọn 5:21) E nweghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị anyị na-akwado, e nweghịkwa onye na-azọ ọkwá anyị na-akwado. Ụzọ ndị a bụ ụfọdụ n’ime ụzọ anyị si egosi na ọ bụ naanị ọchịchị Chineke, ya bụ, Alaeze Chineke, ka anyị na-akwado.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta oge ụfọdụ ime ihe ga-egosi na anyị dị iche n’ụwa nwere ike isiri anyị ike. Chọpụtakwa ihe ị ga-eme ga-eme Jehova obi ụtọ.
3. Ezigbo Ndị Kraịst dị iche n’ụwa
Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya gosiri anyị ihe anyị kwesịrị ime. Gụọnụ Ndị Rom 13:1, 5-7 na 1 Pita 2:13, 14. Unu gụchaa ha, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù?
Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi gosi na anyị na-erubere ha isi?
Obodo abụọ lụwa agha, ụfọdụ mba nwere ike ịna-ekwu na o nweghị ndị nke ha na-adụnyere úkwù, ma ha na-akwadocha obodo abụọ ahụ. Oleezi ihe ịdị iche pụtara n’eziokwu? Gụọnụ Jọn 17:16. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka ịdị iche n’ụwa pụtara?
Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị agwa anyị mee ihe iwu Chineke sịrị anyị emela? Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 5:28, 29. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Ọ bụrụ na ndị ọchịchị enye iwu dị iche n’iwu Chineke nyere, olee iwu nke anyị kwesịrị idebe?
Ì nwere ike icheta otu ihe Ndị Kraịst na-agaghị ekwe eme ma ndị ọchịchị gwa ha mee ya?
4. Ka ihe ị na-eche na omume gị gosi na ị dị iche n’ụwa
Gụọnụ 1 Jọn 5:21. Unu gụchaa ya, unu akpọnye VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Na vidio a anyị lere, gịnị mere Ayenge ekweghị abanye n’òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ soro na-eme ememme e ji eto mba, dị ka igbuchapụrụ ọkọlọtọ?
Ì chere na ihe a o mere dị mma?
Olee ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka ịdị iche n’ụwa siere anyị ike? Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị iche n’ụwa ma a bịa n’ihe gbasara asọmpi egwuregwu ndị si ebe dị iche iche n’ụwa na-eme?
Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị iche n’ụwa ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị mere ihe baara anyị uru ma ọ bụ ihe kpataara anyị nsogbu?
Olee otú ụdị akụkọ ụwa anyị na-ege ma ọ bụ ndị anyị na ha na-akpa nwere ike isi mee ka o siere anyị ike ịna-adị iche n’ụwa?
Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị Onye Kraịst ga-esi n’ihe ọ na-eche na n’omume ya gosi na aka ya adịghị na ha?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ihe mere ị naghị egbuchapụrụ ọkọlọtọ ma ọ bụ ihe mere ị naghị ekwe ukwe e ji eto mba.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Ndị Kraịst na-agbasi mbọ ike ka ha ghara itinye aka n’ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma n’echiche ha ma n’okwu ha ma n’omume ha.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Olee ụgwọ anyị ji ndị ọchịchị?
Gịnị mere anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị?
Olee ihe ndị nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị iche n’ụwa?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Olee ihe ụfọdụ anyị ga-agba mbọ hapụ ka anyị nwee ike ịdị iche n’ụwa?
Gịnị ka ezinụlọ dị iche iche nwere ike ime iji jikere maka oge ndị o nwere ike isiri ha ike igosi na ha dị iche n’ụwa?
Gịnị mere na mmadụ ịlụrụ obodo ya agha abụghị ihe kacha eme ka a na-akwanyere mmadụ ùgwù?
Mgbe anyị na-ekpebi ụdị ọrụ anyị ga-arụ, chọpụta otú anyị ga-esi egosi na anyị dị iche n’ụwa.
-