Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 10/08 p. 14-15
  • Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?
  • Teta!—2008
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịsọpụrụ Mmadụ Apụtaghị Ịnabata Ihe Ọ Na-eme
  • Pọl Turu Ndị Mmadụ Aha
  • Nsọpụrụ A Kpaara Ókè
  • “Achọrọ M Ka Siza Kpee Ikpe A”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Pọl Ejiri Obi Ike Gbaa Àmà n’Ihu Ndị Oké Ozu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Nyere Ndị Ọzọ Aka Ịnabata Ozi Alaeze Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Sọpụrụ Ụdị Mmadụ Nile
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2008
g 10/08 p. 14-15

Echiche Baịbụl

Ọ̀ Dị Mma Itu Mmadụ Aha?

KA Ndị Kraịst narị afọ mbụ na-eme ihe ndị dịịrị ha kwa ụbọchị ma na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, ha zutere ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti—ma ndị nọ n’ọkwá dị ala ma ndị nọ n’ọkwá dị elu. Ụmụazụ Jizọs etughị ibe ha aha ọ bụla iji gosi ọkwá onye nke ọ bụla n’ime ha. Ma n’oge ahụ, a na-etukarị ndị na-achị achị aha. A na-etu eze ukwu Rom “Onye Ukwu.”—Ọrụ 25:21.

Ya mere, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs gara n’ihu ndị ọrụ gọọmenti, hà turu ha aha? Ànyị kwesịrị ịdị na-etu ndị ọchịchị aha n’ihi ọkwá ha?

Ịsọpụrụ Mmadụ Apụtaghị Ịnabata Ihe Ọ Na-eme

Pọl onyeozi dụrụ ndị kwere ekwe ibe ya ọdụ ka ha ‘na-enye mmadụ niile ihe ruuru ha, onye e kwesịrị ịsọpụrụ, a sọpụrụ ya.’ (Ndị Rom 13:7) Nke a gụnyere ịdị na-etu ndị ọrụ gọọmenti aha e nyere ha n’ihi ọkwá ha. Taa, utu aha ndị dị ka Onyeisi Ala na Gọvanọ socha n’utu aha ndị a na-akpọ ndị ji ọkwá dị elu. Ma, ụfọdụ nwere ike ịjụ, sị, ‘Olee otú m ga-esi tuo mmadụ ụdị aha a ebe m ka na-enyo àgwà ya enyo?’

Ọtụtụ ndị ọrụ gọọmenti na-arụ ọrụ ha nke ọma, ma ọ bụghị ha niile ka e nwere ike ịtụkwasị obi. N’agbanyeghị nke ahụ, Baịbụl na-agba anyị ume ka anyị doo onwe anyị n’okpuru ndị eze na ndị gọvanọ “n’ihi Onyenwe anyị.” (1 Pita 2:13, 14) N’ihi ya, ịmata na ọ bụ Chineke kwere ka onye ọchịchị ahụ nọrọ n’ọkwá ahụ ọ nọ na ya ga-akpali anyị inye ya nsọpụrụ ruuru ya.—Ndị Rom 13:1.

Ọ bụghị àgwà onye ọrụ gọọmenti ahụ ka anyị na-ekwu okwu ya ebe a. Ihe mere anyị ga-eji nye ya nsọpụrụ abụghị maka àgwà ya. Itu onye ọrụ gọọmenti aha e ji akwanyere ya ùgwù apụtaghị na anyị na-akwado omume ya. Ihe mere ná ndụ Pọl onyeozi gosiri na nke a bụ eziokwu.

Pọl Turu Ndị Mmadụ Aha

A nwụdere Pọl onyeozi na Jeruselem n’ihi ebubo ụgha ndị e boro ya ma kpụrụ ya gaa n’ihu Filiks, bụ́ gọvanọ ndị Judia. Filiks abụtụghị ezigbo onye ọchịchị. Tacitus, bụ́ onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme, dere na Filiks “chere na ya nwere ike ime ihe ọjọọ ọ bụla sọrọ ya n’enwetaghị ntaramahụhụ.” Ihe ka ya mkpa bụ ego aka azụ ọ ga-enweta, ọ bụghị ikpe ikpe ziri ezi. N’agbanyeghị nke ahụ, n’afọ abụọ Pọl nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ sọpụụrụ gọvanọ ahụ, ha abụọ na-akparịtakwa nkata mgbe mgbe—Filiks nọ na-atụ anya inweta ego aka azụ, ma o nwetaghị ya, kama Pọl ji ohere ahụ gbaara ya àmà.—Ọrụ 24:26.

Mgbe gọvanọ ọhụrụ bụ́ Festọs nọchiri Filiks, ọ nụrụ banyere okwu Pọl na Sesaria. Iji nweta ihu ọma ndị ndú ndị Juu, Festọs kwuru ka e kpee Pọl ikpe na Jeruselem. Ma, Pọl maara na e nwere ike ghara ikpe ya ikpe ziri ezi n’ebe ahụ, ya mere, ebe ọ bụ nwa amaala Rom, o kwuru, sị: “Ana m akpọku Siza!”—Ọrụ 25:11.

Festọs amaghị otú ọ ga-esi akọwara Siza ebubo ndị e boro Pọl, ma obi ruru Festọs ala mgbe Eze Agrịpa nke Abụọ bịara leta ya, ma gosi na ya nwere mmasị n’okwu ahụ. N’echi ya, ndị ọchịagha na ndị ikom a ma ama n’obodo ahụ meere nnọọ okomoko soro eze banye n’ụlọ ịnụrụ okwu ahụ.—Ọrụ 25:13-23.

Mgbe a kpọrọ Pọl ka o kwuo okwu, o ji utu aha bụ́ “Eze” malite okwu ya, kwuokwa na ya maara Agrịpa dị ka ọkachamara n’omenala niile nakwa n’arụmụka ndị dị n’etiti ndị Juu. (Ọrụ 26:2, 3) N’oge ahụ, mmadụ niile maara na Agrịpa na nwanne ya nwaanyị na-enwe mmekọahụ jọgburu onwe ya. O dokwara anya na Pọl maara na Agrịpa na-ebi ndụ rụrụ arụ. Ma, Pọl nyekwara ya nsọpụrụ kwesịịrị onye eze.

Mgbe Pọl na-azara ọnụ ya, Festọs kwuru n’oké olu, sị: “Ara na-agba gị, Pọl!” Kama Pọl iwe iwe, ọ zaghachiri ya n’olu ọma, ọbụna kpọọ gọvanọ ahụ “Onye Ukwu.” (Ọrụ 26:24, 25) Pọl nyere ya nsọpụrụ kwesịịrị ọkwá ya. Ma, ihe atụ ndị a na-akpalite ajụjụ bụ́, Ò nwere ókè e kwesịrị inyeru ndị ọchịchị nsọpụrụ?

Nsọpụrụ A Kpaara Ókè

A kpaara ikike ndị ọchịchị nwere ókè dị ka e gosiri ná Ndị Rom 13:1, bụ́ nke kwuru, sị: “Ọ bụ Chineke debere ọchịchị ndị dị adị n’ọnọdụ ha nọ n’okpuru ya.” N’ihi ya, a kpakwaara nsọpụrụ a na-enye ndị gọọmenti ókè. Jizọs gosiri ókè e kwesịrị inyeru ndị ọzọ nsọpụrụ mgbe ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu Rabaị, n’ihi na otu onye bụ onye ozizi unu, ma unu niile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa, n’ihi na otu onye bụ Nna unu, ya bụ, Onye nke eluigwe. Ka a gharakwa ịkpọ unu ‘ndị ndú,’ n’ihi na Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.”—Matiu 23:8-10.

N’ihi ya, ihe ga-ekpebi ma ànyị ga na-etu mmadụ aha a na-etu ya bụ ma utu aha ahụ ọ̀ bụ nke ọchịchị nyere ya ka ọ̀ bụ nke okpukpe nyere ya. Ọ bụrụ na ndị ọrụ gọọmenti enwee utu aha okpukpe nyere ha, ndụmọdụ Pọl nyere anyị ịdị na-asọpụrụ ha erughị n’itu ha aha ahụ okpukpe nyere ha. Onye ọ bụla na-agbaso ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ ga-enye onye ọrụ gọọmenti ahụ nsọpụrụ kwesịrị ya. Ma, akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ ga-eme ka ọ ghara ịkpọ onye ọ bụla utu aha okpukpe ya, n’ihi na iwu ji ya ‘ịkwụ Chineke ihe Chineke.’—Matiu 22:21.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

◼ Olee otú ụmụazụ Jizọs si lee ndị ọchịchị anya?—Ndị Rom 13:7.

◼ Pọl onyeozi ọ̀ kpọrọ ndị ọrụ gọọmenti utu aha e ji asọpụrụ ha?—Ọrụ 25:11; 26:2, 25.

◼ Olee ụdị utu aha ndị Jizọs katọrọ?—Matiu 23:8-10.

[Foto dị na peeji nke 14 na 15]

Gịnị ka Pọl kpọrọ Agripa?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya