Isi 12
Ịsọpụrụ Ndị Na-achị Isi Dị Mkpa maka Ịdị Ndụ Udo
1-3. (a) Gịnị buteworo oké nleda anya nke ịchịisi n’oge anyị? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka e si egosipụta omume nke a? (ch) Olee ebe ka a na-enweta mmetụta ya nile?
MMỤỌ nke inwere onwe erikpuwo ụwa nke oge a. Ọha mmadụ enweghịkwa ntụkwasị obi n’ebe ndị na-achị isi nọ, karịsịa n’etiti ndị a mụrụ kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ. N’ihi gịnị? Otu ihe bụ na ndị mụrụ ha ahụwo mmekpo ọnụ n’ókè a na-ahụbeghị na mbụ ma ọlị, nakwa mmegbu na omume rụrụ arụ nke ndị ji ike ọchịchị. Ha zụlitere ụzọ ile ihe anya dị njọ banyere ịchịisi. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha, mgbe ha ghọrọ ndị mụrụ ụmụ, akụnyeghị n’ime ụmụ ha nsọpụrụ maka ndị na-achị isi. Ikpe na-ezighị ezi nke ndị ji ike ọchịchị nke ụmụ ndị a hụtara enyeghịkwa aka n’okwu a. Dị ka ihe si na ya pụta, enweghị nsọpụrụ maka ndị na-achị achị agbasawo.
2 A na-egosipụta enweghị nsọpụrụ a n’ụzọ dị iche iche. N’oge ụfọdụ ọ bụ site n’iyi ụdị uwe ma ọ bụ iji ejiji na-egosi anakwereghị ụkpụrụ a na-anabata. Ọ pụrụ ịgụnye mmegide ọha mmadụ na-emegide ndị uwe ojii, ma ọ bụ ọbụna ime ihe ike na mwụfu ọbara. Ma ọ kwụsịghị ná ndị a. Ọbụna n’etiti ndị na-adịghị egosipụta onwe ha n’ụzọ ndị a pụtara ìhè, ọtụtụ na-eleghara ma ọ bụ na-akpachara anya na-ada iwu ma ọ bụrụ na ha ekwenyeghị n’iwu ndị dị otú ahụ ma ọ bụ lee ha anya dị ka ihe na-enye ha mmekpa ahụ.
3 Ọnọdụ nke a emetụtawo n’ụzọ dị ukwuu ọnọdụ dị n’ebe obibi, ụlọ akwụkwọ, ebe e were mmadụ n’ọrụ, na ná mmekọrịta mmadụ na ndị ọrụ gọọmenti. Ndị mmadụ n’ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba achọghị ka onye ọzọ ọ bụla na-agwa ha ihe ha ga-eme. Ha na-achụso ihe ha kwere bụ inwere onwe ka ukwuu. Gịnị ka ị ga-eme mgbe ọnọdụ a chere gị ihu?
4. Site n’ihe anyị mere n’okwu a, ànyị na-egosi omume anyị banyere ihe iseokwu dị aṅaa?
4 Ụzọ ị gbasoro ga-egosi ebe i guzo n’ihe iseokwu nke ọkaaka eluigwe na ala nke Jehova. Ị̀ na-asọpụrụ Jehova n’ezie dị ka Isi Iyi nke ezi udo na ntụkwasị obi? Ị̀ ga-achọ ma tinye ná ndụ gị ihe Okwu ya na-eduzi? Ka ị̀ ga-eso ndị ahụ na-eme mkpebi nke ihe ọma na ihe ọjọọ n’ụzọ o si masị ha?—Jenesis 3:1-5; Mkpughe 12:9.
5. (a) Gịnị na-apụtakarị site n’ịgbaso idu ndú nke ụmụ mmadụ ndị na-ekwe nkwa nke ‘inwere onwe’? (b) Onye na-eme ihe Chineke na-achọ ò si aṅaa nwere onwe ya?
5 Ezi ihe ọmụma nke Bible pụrụ ichebe gị megide ịbụ onye ndị ahụ, mgbe ha ‘na-ekwe nkwa inwere onwe, ha onwe ha na-abụ ohu nke mmebi’ duhiere. Ịgbaso idu ndú nke ụdị mmadụ ndị ahụ ga-etinye gị n’otu ọnọdụ ahụ nke ịbụ ohu ahụ. (2 Pita 2:18, 19) A pụrụ inweta ezi inwere onwe nanị site n’ịmụ na ime uche Chineke. Iwu ya dị nsọ bụ “iwu zuru okè, bụ́ iwu nke inwe onwe.” (Jemes 1:25) A pụrụ ikwu nke a n’ihi na Jehova anaghị akpara anyị ókè n’ụzọ na-enweghị isi, na-eji ụkpụrụ ndị na-enweghị nzube na-egechibido anyị. Kama, iwu ya na-enye ụdị nduzi na-eweta inwe onwe, udo, na ịnọ ná ntụkwasị obi nke dabeere n’ezi mmekọrịta anyị na Chineke nakwa mmadụ ibe anyị.
6, 7. (a) Ònye nọ n’ọnọdụ kachasị mma ime ihe banyere iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi? (b) Jisọs si aṅaa gosi ihe ga-eme mmadụ ndị mere ihe n’enweghị ndidi?
6 Karịsịa onye ọ bụla ọzọ, Chineke maara ókè nke mmerụ na iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi nke mmadụ. O nyewokwa okwu ya na n’agbanyeghị ịdị elu nke ndị ahụ na-emekpa ndị ọzọ ahụ, ha ga-aza ajụjụ banyere ya. (Ndị Rom 14:12) N’oge Chineke kara aka, “ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.” (Ilu 2:22) Ma ọ dịghị ezi ihe na-adịgide adịgide anyị ga-arụpụta ma ọ bụrụ na anyị ejiri enweghị ndidi mee ihe n’onwe anyị.—Ndị Rom 12:17-19.
7 N’abalị nke nraranye na njide ya, Jisọs mesịrị nke a ike nye ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ọnọdụ nke dị n’ala ahụ, tinyere ọnụnọ nke anụ ọhịa dị iche iche, ndị mmadụ na-ebukarị ngwa agha. Ya mere n’oge ahụ, e nwere mma agha abụọ n’etiti ndị na-eso ụzọ Jisọs. (Luk 22:38) Gịnị mere? Ha hụrụ nnọọ mgwagbu pụtara ìhè nke ikpe ziri ezi mgbe a na-ejide Jisọs n’enweghị ihe o mere. Ya mere Pita onyeozi n’oké mmetụta mịpụtara mma agha ya bipụ ntị otu n’ime ndị ikom ahụ. Ma Jisọs doghachiri ntị ahụ e bekapụrụ ma dụọkwa Pita ọdụ, sị: “Mịghachi mma gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Ọtụtụ ndị, ọbụna n’oge anyị, ka a gaara azọpụtaworị pụọ n’ọnwụ nnwụchu site n’ịgbaso ndụmọdụ a.—Ilu 24:21, 22.
Ụzọ Ziri Ezi Isi Lee Ndị Ọchịchị Ụwa Anya
8. (a) Dị ka e dere ya ná Ndị Rom 13:1, 2, ndị Kraịst kwesịrị isi aṅaa lee ndị ọchịchị ụwa anya? (b) Gịnị ka okwu ahụ bụ na “ha nọ dị ka ndị Chineke doro n’ọnọdụ ha dị iche iche” pụtara?
8 Mgbe ọ na-edegara ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, Chineke kpaliri Pọl onyeozi ịkọwa otú ha ga-esi chịkwaa onwe ha metụta ndị na-achị isi nke ụwa. O dere, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya; ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo [n’ọnọdụ ha dị iche iche, NW]. Ya mere onye na-edo onwe ya megide onye ahụ na-achị isi, ọ na-eguzogide iwu Chineke nyere: ma ndị na-eguzogide ga-anata ikpe nye onwe ha.” (Ndị Rom 13:1, 2) Nke a ọ̀ pụtara na Chineke doro ndị a na-achị achị n’ike ọchịchị? Bible zara hoo haa sị ee e! (Luk 4:5, 6; Mkpughe 13:1, 2) Ma ha na-adị adị n’ihi na o nyere ha ohere. ‘Ọnọdụ dị iche iche’ ahụ ha nwere eri mgbe bụkwa nke Chineke kpebiworo. Gịnị ka ọnọdụ ahụ bụworo?
9. Ọbụna ma ọ bụrụ na ndị isi etinye aka n’omume ọjọọ, n’ihi gịnị ka anyị ga-eji nye ha nsọpụrụ?
9 Akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ a ka kpọtụrụ uche na-asị na ọ bụ nke “dị elu.” Ya mere e kwesịghị imeso ndị ọrụ ọchịchị n’ụzọ enweghị nsọpụrụ. A gaghị elelị iwu ndị ha tiri anya. Nke a apụtaghị na ị ga-enwe nnọọ mmasị ná mmadụ ndị ahụ n’otu n’otu, ma ọ bụ nakwere ụdị ihe ọjọọ ọ bụla ha pụrụ itinye aka na ya. Ma a na-egosi ha nsọpụrụ kwesịrị ekwesị nye ha n’ihi ọkwa ha nwere.—Taịtọs 3:1, 2.
10. È kwesịrị isi aṅaa lee ịtụ ụtụ isi anya, n’ihi gịnịkwa?
10 N’ụzọ dị ukwuu, iwu ọchịchị ụwa na-arụpụta ihe dị mma. Ha na-enye aka ịhụ na udo dị ma na-enyekwa ókè ụfọdụ nke nchebe maka ndị mmadụ na ihe onwunwe ha. (Ndị Rom 13:3, 4) Ọzọkwa, ndị ọchịchị na-arụ okporo ụzọ, na-edebe mbara ọcha, na-emenyụ ọkụ, na-ahụ maka agụmakwụkwọ, na ozi ndị ọzọ ndị na-abara ndị mmadụ uru. È kwesịrị ka a kwụọ ha ụgwọ maka ozi ndị a? Ànyị kwesịrị ịtụ ụtụ isi? Ajụjụ a na-akpalikarị mmetụta ndị siri ike n’ihi ụgwọ ụtụ isi dị elu na oké iji ego ọha na eze eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. N’oge Jisọs kwa, ajụjụ nke a metụtara usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ma Jisọs ewereghị ọnọdụ nke na otú ihe si kwụrụ mere na a ga-ajụ ịtụ ya. N’ikwu banyere ego ahụ Sisa nke Rom kpụrụ, ọ sịrị: “Ya mere, nyeghachinụ Sisa ihe nke Sisa, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:17-21; Ndị Rom 13:6, 7) Ee e, Jisọs akwadoghị echiche nke onye ọ bụla imere onwe ya iwu.
11, 12. (a) Akwụkwọ nsọ ò si aṅaa gosi na e nwekwara ịbụ isi ọzọ nke a ga-atụle? (b) Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị nke ụwa enye iwu nke megidere ihe Chineke chọrọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
11 Otú ọ dị, Jisọs gosiri na “Sisa,” bụ́ òtù ọchịchị obodo, abụghị nanị ndị na-achị isi a ga-atụle. “Ndị na-achị isi” akarịghị Chineke, ha na ya ahaghịkwa. N’ụzọ megidere nke ahụ, ha bụ nnọọ ndị dị ala n’ebe ọ nọ. Ya mere, a kpaara ịchịisi ha ókè, ọ bụghị nke kasị elu. N’ihi nke a, mkpebi siri ike echewo ndị Kraịst ihu ọtụtụ mgbe. Ọ bụ mkpebi nke gị onwe gị na-aghaghị iche ihu. Mgbe ndị nọ n’ọchịchị chọrọ n’onwe ha ihe nke ruuru Chineke, gịnị ka ị ga-eme? Ọ bụrụ na ha amachibido ihe Chineke nyere n’iwu, ònye ka ị ga-erubere isi?
12 Ndị ozi Jisọs ji nsọpụrụ gwa ndị ụlọikpe ukwu dị na Jerusalem n’ụzọ siri ike, sị: “Anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa. . . . Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 4:19, 20; 5:29) Ndị ọchịchị mgbe ụfọdụ etinyewo ihe mgbochi n’ihi ọnọdụ dị ize ndụ, nke ahụ kwekwara nghọta. Ma mgbe ụfọdụ a pụrụ idokwa ihe mgbochi nke ndị ọchịchị iji megide ofufe anyị na-efe Chineke ma mee ka ọ ghara ikwe mee ịrụ ọrụ Chineke kenyere anyị. Mgbe ahụ gịnị? Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee na-asị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”
13, 14. (a) Gịnị mere anyị ga-eji kpachara anya ka anyị ghara inupụrụ ndị na-achị achị isi n’ihi echiche onwe anyị? (b) Site n’Akwụkwọ nsọ, gosipụta ihe mere ọ ga-eji dị otú ahụ.
13 Ọ bụ ezie na ime ihe bụ uche Chineke pụrụ imegide ihe “Sisa” chọrọ, nke a dị nnọọ iche pụọ n’iji aka anyị na-emebi iwu ndị anyị na-anakwereghị n’onwe anyị. Ọ bụ eziokwu na site n’ụzọ anyị si ele ihe anya n’onwe anyị, iwu ụfọdụ pụrụ iyi ihe na-adịghị mkpa ma ọ bụ nke na-ekegide mmadụ n’ụzọ na-enweghị isi. Ma nke ahụ adịghị eme ka o zie ezie ileghara iwu ndị na-emegideghị iwu nile nke Chineke anya. Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ nile erube isi nanị n’iwu ndị ha gụrụ dị ka nke ga-abara ha onwe ha uru? Ọ ga-eduba nanị n’inwe obodo na-enweghị onye ọchịchị.
14 Mgbe ụfọdụ mmadụ nwere ike iche na ya pụrụ ileghara ndị na-achị isi anya ma mee ihe dị ya mma n’ihi na o yighị ka a ga-ejide ya ma nyekwa ya ahụhụ. Ma e nwere oké ihe ize ndụ dị na nke a. Ọ bụ ezie na imebi iwu pụrụ imetụta ihe dị nta na mbụ, mmadụ ịlafere n’ataghị ahụhụ pụrụ iwusiwanye ya ike ná mmebi iwu ka ukwuu. Dị ka Eklisiastis 8:11 kwuru, sị: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.” Ma ihe mere e ji erube isi n’iwu ọ̀ bụ nanị maka ahụhụ a ga-ata n’ihi nnupụisi? Nye onye Kraịst, a ga-enwe ihe mkpali dị ike karị. Pọl onyeozi kpọrọ ya “mkpa”—ọchịchọ maka akọ na uche dị ọcha. (Ndị Rom 13:5) Onye nke e jiworo ụkpụrụ Akwụkwọ nsọ zụọ akọ na uche ya maara na ịgbaso ụzọ nke mmebi iwu ga-abụ ‘imegide ndokwa Chineke.’ N’agbanyeghị ma ndị ọzọ hà matara ihe anyị na-eme, Chineke maara, olileanya anyị maka ndụ n’ọdịnihu dabekwara na ya.—1 Pita 2:12-17.
15. (a) Gịnị ga-eduzi mmadụ n’omume ya n’ebe onye nkuzi ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ onye were ya n’ọrụ nọ? (b) N’ụzọ dị otú a, ànyị na-ezere inwe mmetụta nke mmụọ nke onye?
15 Otu ihe ahụ bụ eziokwu banyere omume onye na-eto eto n’ebe onye nkuzi ụlọ akwụkwọ ya nọ nakwa n’omume onye toro eto n’ebe onye were ya n’ọrụ nọ. Eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ ndị gbara anyị gburugburu na-eme ihe ọjọọ agaghị abụ ihe ga-ekpebiri anyị ihe anyị ga-eme. Ma ònye nkuzi ahụ ma ọ bụ onye ahụ were anyị n’ọrụ ọ̀ maara ihe anyị na-eme agaghị akpata ọdịiche ọ bụla. Ajụjụ bụ, Olee ihe bụ ihe ziri ezi? Gịnị na-atọ Chineke ụtọ? Ọzọ, ọ bụrụ na ihe a gwara anyị mee emegideghị iwu Chineke ma ọ bụ ụkpụrụ ezi omume ya, anyị ga-erube isi. Ndị nkuzi ụlọ akwụkwọ bụ n’ozuzu ha ndị nnọchianya nke ndị ọchịchị ụwa, wee si otú a bụrụ ndị ozi nke “ndị na-achị isi,” n’ihi ya o kwesịrị ka a sọpụrụ ha. Banyekwara ndị were mmadụ n’ọrụ, a pụrụ iji ụkpụrụ Bible dị na Taịtọs 2:9, 10 mee ihe, ọ bụ ezie na Pọl n’ebe ahụ na-ede banyere mmekọrịta dị iche, bụ́ nke dị n’etiti ohu na onyenwe ya. Pọl sịrị: “Na-eme ihe ga-atọ ha ezi ụtọ n’ihe nile; . . . na-egosi ezigbo ikwesị ntụkwasị obi nile; ka [i] wee chọọ ozizi nke Onye Nzọpụta anyị Chineke mma n’ihe nile.” (Taịtọs 2:9, 10) N’ụzọ dị otú a, anyị na-ezere mmetụta Setan na-enwe, onye mmụọ ya “na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye,” anyị ga-enwekwa mmekọrịta udo nke anyị na ndị mmadụ ibe anyị.—Ndị Efesọs 2:2, 3.
Ịchịisi n’Ime Ezinụlọ
16. Olee ihe a chọrọ maka ndụ ezinụlọ dị n’udo nke e depụtara na 1 Ndị Kọrint 11:3?
16 N’ime ezinụlọ bụ ebe ọzọ ịsọpụrụ ịchịisi ga-eme ka mmekọrịta udo dị. Ọtụtụ mgbe nsọpụrụ dị otú ahụ nke na-ewuli elu na-akọ ụkọ, na-ebute ndakpọ nke mmekọrịta ezinụlọ nakwa ọtụtụ mgbe nkewa nke ezinụlọ. Gịnị ka a pụrụ ime iji meziwanye ọnọdụ ahụ? Ụkpụrụ nke ịbụ isi dị ka e guzobere ya na 1 Ndị Kọrint 11:3 nwere azịza ya: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”
17. (a) Metụta ịbụ isi, gịnị bụ ọnọdụ nwoke? (b) Ezi ihe nlereanya dị aṅaa banyere ịbụ isi nke di ka Kraịst setịpụrụ?
17 Rịba ama na okwu a nke nhazi Jehova ebughị ụzọ tụọ aka n’ịbụ isi nke nwoke. Kama, ọ dọọrọ uche gaa n’eziokwu bụ na e nwere onye nke nwoke ga-elegara anya maka nduzi, onye o kwesịrị ịgbaso ihe nlereanya ya. Onye ahụ bụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ isi nke nwoke. N’otu o si emesokwa nzukọ ya, nke e ji nwanyị a na-alụ ọhụrụ tụnyere, Kraịst gosipụtara ụzọ a ga-esi nwee ihe ịga nke ọma n’ịbụ isi nke di. Ezi ihe nlereanya ya kpaliri ọchịchọ na-ekpo ọkụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe ọ na-edu ndú, kama ịbụ ọga, onye iwe ọkụ na onye na-achọkarị ihe n’aka ndị na-eso ụzọ ya, Jisọs bụ “onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi,” nke na ha chọtara izu ike nye mkpụrụ obi ha. (Matiu 11:28-30) Ò leliri ha n’ihi ihe ndị ha na-emezighị? N’ụzọ megidere nke ahụ, o jiri ịhụnanya nye ha ndụmọdụ ọbụnakwa tọgbọ ndụ ya iji sachapụ mmehie ha. (Ndị Efesọs 5:25-30) Lee aha ngọzi ọ bụụrụ ezinụlọ nwere nwoke na-agbalịsi ike ịgbaso ihe nlereanya nke a!
18. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka nwunye pụrụ isi gosi na ya na-asọpụrụ ịchịisi nke di ya? (b) Ụmụ ga-esi aṅaa gosi nsọpụrụ nye ndị mụrụ ha, n’ihi gịnịkwa?
18 Mgbe ụdị ịbụ isi ahụ dị n’ezinụlọ, ọ gaghị esiri nwanyị ike ịkwanyere di ya ùgwù. Ụmụ ga-achọkarịkwa irube isi. Ma ọ dịkwa ihe dị ukwuu nke nwunye na ụmụ pụrụ ime iji tinye ihe n’obi ụtọ nke ezinụlọ. Site na ya ịrụsi ọrụ ike n’ilekọta ezinụlọ ahụ anya na site ná mmụọ ya nke inyeaka, nwunye na-egosipụta na ya nwere “nsọpụrụ dị omimi n’ebe di ya nọ.” Nke ahụ ọ̀ bụ otú ọ dị n’ezinụlọ gị? (Ndị Efesọs 5:33, NW; Ilu 31:10-15, 27, 28) N’ebe ụmụ nọ, nrubeisi nke sitere n’obi nye nna na nne na-egosi na ha na-asọpụrụ ndị mụrụ ha, dị ka Chineke chọrọ n’aka ha. (Ndị Efesọs 6:1-3) Ọ̀ bụ na a gaghị enwe udo na mmetụta nke mmadụ ịnọ ná nchebe ka ukwuu n’ezinụlọ dị otú ahụ karịa n’ebe a na-enweghị nsọpụrụ maka ịchịisi?
19. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ bụ nanị gị n’ezinụlọ unu na-agbalị ịbụ onye Okwu Chineke na-eduzi?
19 Ị pụrụ inye aka mee ka ezinụlọ gị dị otú ahụ. Ma ndị òtù ezinụlọ gị hà họọrọ ịnakwere ụzọ Chineke ma ọ bụ na ha ahọrọghị, i nwere ike ime otú ahụ. Ndị ọzọ pụrụ imeghachi omume ọma n’ihe nlereanya ọma gị. (1 Ndị Kọrint 7:16; Taịtọs 2:6-8) A sịgodi na ha emeghị otú ahụ, ihe ị na-eme ga-eguzo dị ka ihe àmà nye izi ezi nke ụzọ Chineke, nke ahụ abụghịkwa ntakịrị ihe ma ọlị.—1 Pita 3:16, 17.
20, 21. (a) Bible ò si aṅaa na-egosi na ịchịisi nke di na nke ndị mụrụ ụmụ abụghị nke kasị elu? (b) Ya mere, mkpebi dị aṅaa pụrụ iche nwunye nke bụ onye Kraịst ma ọ bụ ụmụ bụ́ ndị kwere ekwe ihu, gịnịkwa kwesịrị ịkpali ha?
20 Buru n’uche na ndokwa nile nke ịchịisi ezinụlọ sitere n’aka Chineke. Ya mere, ndị nwoke ga-edo onwe ha n’okpuru Kraịst, ndị nwunye n’okpuru di ha ‘dị ka o kwesịrị n’ime Onyenwe anyị,’ ụmụ n’okpuru ndị mụrụ ha “n’ihi na nke a bụ ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị.” (Ndị Kọlọsi 3:18, 20; 1 Ndị Kọrint 11:3) Ya mere, a pụghị ileghara Chineke anya n’okwu a, ka à pụrụ? Nke a pụtara na ịchịisi nke onye bụ di n’ebe nwunye ya nọ, na nke ndị mụrụ ụmụ n’ebe ụmụ ha nọ, bụ nke a kpaara ókè. Nke ahụ bụ na ndị Kraiṣt bụ di ma ọ bụ nwunye na ụmụ na-edo onwe ha n’okpuru Chineke na Kraịst n’ụzọ bụ isi, na-erube isi ná ndụmọdụ ha. Nye ụfọdụ ndị bụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ bụ ndị na-ekweghị ekwe mụrụ ụmụ, nke a pụrụ iwute ha na mbụ. Ma n’ezie ọ na-arụpụta ihe dị mma nye ha, n’ihi na ọ ga-enye aka ime ka di ma ọ bụ nwunye na ụmụ kwere ekwe bụrụ ndị kwesịrị ndabere, na-enyekwa ndị mmadụ nsọpụrụ.
21 Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na di achọọ ka nwunye ya mee ihe ‘na-ekwesịghị n’ime Onyenwe anyị’? Ihe ọ ga-eme ga-egosi ma ọ̀ ‘na-atụ egwu ezi Chineke ahụ’ n’ezie ka ọ bụ na ọ dịghị. (Eklisiastis 12:13) Otú ahụ ka ọ dịkwa mgbe ụmụ ruru ogo ịghọta ma rubere Okwu Chineke isi. Ọ bụrụ na ndị mụrụ ha enweghị otú ụdị ọchịchọ ahụ nke ijere Jehova ozi, ụmụ ahụ ga-ekpebi ma hà ga-erubere Chineke isi ma ọ bụ kwenyere ndị mụrụ ha na-adịghị efe Chineke. (Matiu 10:37-39) Ma e wezuga ụgwọ ha ji Chineke dị ka ihe mbụ, ụmụ ga-edo onwe ha n’okpuru “n’ihe nile,” ọbụna ma a sị na ọ pụta ime ihe ndị na-amasịghị ha. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ụzọ omume nke a pụrụ ọbụna ịdọta ndị mụrụ ha n’ebe ndokwa Jehova maka nzọpụta dị. Ọ bụ n’ezie “ihe na-atọ ezi ụtọ n’ime Onyenwe anyị” mgbe mmasị mmadụ bụ ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova na ụzọ ezi omume ya nile, kama ịbụ nnupụisi nke mmụọ inwere onwe na-amụpụta.
N’Ọgbakọ Ndị Kraịst
22, 23. (a) Olee otú ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst si ejere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ozi? (b) Ya mere, omume dị aṅaa ka Ndị Hibru 13:17 kwuru na anyị ga-enwe n’ebe ha nọ?
22 Otu ụdị nrubeisi ahụ nye Jehova kwesịkwara ịpụta ìhè n’omume anyị n’ebe ọgbakọ ya nke ndị Kraịst na ndị na-elekọta ya nọ. Jehova enyewo ndị nlekọta ịzụ “ìgwè atụrụ” ya. Ha adịghị anata ụgwọ ọnwa ọ bụla kama ha na-enye onwe ha n’ihi ezi mmetụta ha n’ebe ụmụnna ha bụ́ ndị Kraịst nọ. (1 Pita 5:2; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:7-9) Ha na-enyere ọgbakọ aka ịrụzu ọrụ nkwusa nke ozi ọma nke Alaeze Chineke. Sitekwa n’inwe mmasị n’onye ọ bụla nọ n’ime ọgbakọ ahụ, ha na-enyere ndị a aka ịmụta otú a pụrụ isi tinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Ọzọkwa, ọ bụrụ na otu onye nọ n’ọgbakọ agbasoo ụzọ na-ezighị ezi n’amaghị ama, ha na-eme mgbalị ịgbazi ya olu. (Ndị Galetia 6:1) Ọ bụrụ na otu onye elelịa ndụmọdụ Akwụkwọ nsọ ma nọgide na-eme mmehie dị oké njọ, ndị nlekọta ga-ahụ na a chụpụrụ ya. A ga-esi otú a chebe ọgbakọ pụọ n’ike mmerụ ya.—1 Ndị Kọrint 5:12, 13.
23 Iji gosi ekele maka ndokwa ịhụnanya nke a nke Jehova iji hụ na udo dị n’etiti ndị ya, anyị ga-aṅa ntị ná ndụmọdụ a na-ahụ ná Ndị Hibru 13:17, sị: “Na-ekwenyenụ ndị [na-edu ndú n’etiti, NW] unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaraghị unu uru.”
24, 25. (a) Olee otú ihe ndị okenye na-akụzi kwesịrị isi metụta ụzọ anyị si ele ha anya? (b) Olee mgbe, ọ̀ bụkwa n’ole ebe ka anyị ga-etinye n’ọrụ ihe a kụziiri anyị site na Bible? N’ihi gịnị?
24 Bible mesịrị ya ike na isi ihe mere ndị okenye ndị a ji kwesị nsọpụrụ bụ na ha na-akụzi “okwu Chineke.” (Ndị Hibru 13:7; 1 Timoti 5:17) Banyekwara ike nke “okwu” ahụ, Ndị Hibru 4:12, 13 na-asị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izu nile nke obi. Ọ dịghịkwa ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu ya: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya ya, bụ́ onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.”
25 Ya mere, eziokwu dị n’Okwu Chineke na-ekpughe ọdịiche dị n’ihe mmadụ pụrụ iyi ka ọ bụ na ihe ọ bụ n’ezie. Ọ bụrụ na o nwere ezi okwukwe na Chineke na ezi ọchịchọ ime ihe ga-atọ Onye Okike ya ụtọ, ebumnuche ya ga-egosipụta nnọọ “otuto Chineke” ọbụna mgbe ọ na-anọghị n’ihu ndị okenye nke ọgbakọ. (Ndị Rom 3:23) Ọ gaghị etinye aka n’omume ụfọdụ ndị akwụkwọ nsọ na-akwadoghị nanị n’ihi na o soghị ná ndị dị oké njọ a pụrụ iji chụpụ mmadụ n’ọgbakọ. Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ iwere ndụmọdụ ọ bụla nke Okwu Chineke dị ka ihe nkịtị, o kwesịrị inyocha nke ọma ihe bụ omume ya n’ezie n’ebe Chineke nọ. Ọ̀ na-achọ ịdị ka onye ahụ Abụ Ọma 14:1 kwuru banyere ya, sị: “Onye nzuzu asịwo”—ee e, ọ bụghị n’ihu ọha—kama “n’obi ya, Ọ dịghị Chineke ọ bụla dị”?
26, 27. (a) Gịnị mere o ji kwesị ekwesị iwere dị ka ihe dị mkpa “okwu nile ọ bụla” nke Jehova? (b) Ò si aṅaa metụta ndụ anyị mgbe anyị si otú a gosi nsọpụrụ maka ịchịisi?
26 Mgbe Ekwensu nwara ya, Jisọs kwupụtara: ‘Mmadụ ga-eji okwu nile ọ bụla nke na-esi n’ọnụ [Jehova] pụta wee dị ndụ.’ (Matiu 4:4) Ì kwere na “okwu nile ọ bụla” nke Jehova dị mkpa, na ọ dịghị nke a ga-eleghara anya? Irube isi n’ihe ụfọdụ nke Jehova nyere n’iwu, ma na-eme ndị ọzọ dị ka ihe ndị na-adịghị mkpa, ezughị ma ọlị. Ma ànyị ebulighị izi ezi nke ọkaaka Jehova elu anyị anọrọ n’akụkụ nke Ekwensu n’ihe iseokwu ahụ site n’imebere onwe anyị ụkpụrụ nke ihe ndị bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Obi ụtọ na-adịrị ndị ahụ na-egosipụta na ha hụrụ iwu Jehova n’anya n’eziokwu.—Abụ Ọma 119:165.
27 A dịghị amata mmadụ ndị dị otú ahụ n’ọnyà site ná mmụọ na-ekewa ekewa nke ụwa. Ha adịghịkwa etinye aka n’omume ihe ihere nke ndị wezugara ihe ịkpa ókè nke omume ọma n’ụsọ. Nsọpụrụ miri emi nye Jehova na ụzọ ezi omume ya na-eme ka ndụ ha nwee nzube. Ụdị nsọpụrụ nke a nye Jehova na ụzọ ezi omume ya na-enyere ha aka inwe ezi nsọpụrụ maka ịchịisi nke ụwa, bụ́ nke dị mkpa maka ịdị ndụ udo.
[Foto dị na peeji nke 134]
Ndị ozi Jisọs gwara ụlọikpe ukwu ahụ, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ”