-
Ò Kwesịrị Ekwesị Ka Ndị Karịst Na-ekere Òkè n’Ememe Afọ Ọhụrụ?Teta!—2002 | Jenụwarị 8
-
-
Bible na-adụ Ndị Kraịst ọdụ ‘ije ije n’ụzọ dị otú o kwesịrị, ọ bụghị n’oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya.’a (Ndị Rom 13:12-14; Ndị Galeshia 5:19-21; 1 Pita 4:3) Ebe ọ bụ na ememe Afọ Ọhụrụ na-abụkarị ndị e ji imebiga ihe ókè ndị ahụ Bible katọrọ mara, Ndị Kraịst adịghị ekere òkè na ha. Nke a apụtaghị na Ndị Kraịst bụ ndị ihe ọṅụ na-adịghị adị mma. N’ụzọ dị iche, ha maara na Bible na-agwa ndị na-efe ezi Chineke ahụ ofufe ugboro ugboro ka ha na-aṅụrị ọṅụ—e nwekwara ọtụtụ ihe kpatara ya. (Deuterọnọmi 26:10, 11; Abụ Ọma 32:11; Ilu 5:15-19; Eklisiastis 3:22; 11:9) Bible kwetakwara na ihe oriri na ihe ọṅụṅụ na-esokarị ịṅụrị ọṅụ.—Abụ Ọma 104:15; Eklisiastis 9:7a.
-
-
Ò Kwesịrị Ekwesị Ka Ndị Karịst Na-ekere Òkè n’Ememe Afọ Ọhụrụ?Teta!—2002 | Jenụwarị 8
-
-
a Aka Pọl zoro “n’oriri oké mkpọtụ na ịṅụ oké mmanya” pụrụ ịgụnyewo ndị nke a na-eme n’oge ememe Afọ Ọhụrụ, ebe ọ bụ na ha na-ewu ewu na Rom na narị afọ mbụ.
-