Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 8/1 p. 23-25
  • Ndị Rom Enweta Ozi Kachasị Ozi Nile Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Rom Enweta Ozi Kachasị Ozi Nile Mma
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • PỌL NA NDỊ ROM
  • OKWUKWE NA IWU AHỤ
  • EZI OMUME SITE N’OKWUKWE
  • ỊZAGHACHI OKWU MMEGIDE
  • EZI OMUME NA NDỊ JUU ANỤ AHỤ
  • ỤKPỤRỤ NILE NKE EZI OMUME
  • MAKA NDỊ E TERE MMANỤ NA ATỤRỤ ỌZỌ
  • Ka Ezi Omume Jehova Na-atọ Gị Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • E Nwere Ozi Ọma Mmadụ Niile Kwesịrị Ịnụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gbasoo Ezi Omume?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 8/1 p. 23-25

Ndị Rom Enweta Ozi Kachasị Ozi Nile Mma

OLEE otú mmadụ nke na-eme mmehie ga-esi bụrụ onye ezi omume n’anya Chineke ma si otú ahụ nweta ndụ ebighị ebi? Ajụjụ nke a kpaliri oké nrụrịta ụka na narị afọ mbụ nke Oge Anyị. Ị̀ maara azịza ya? Ma ị̀ maara ma ọ bụ na ị maghị, ọ bụ ihe dịịrị gị ịgụ nkọwa magburu onwe ya nke Pọl onyeozi nyere banyere nsogbu ahụ n’akwụkwọ Bible bụ Ndị Rom. Ime nke ahụ ga-enyere gị aka ịghọta njikọ dị oké mkpa e nwere n’etiti okwukwe, ọrụ, ezi omume, na ndụ.

PỌL NA NDỊ ROM

Akwụkwọ Ndị Rom bụ akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Kraịst nọ na Rom n’ihe dị ka 56 O.A. Gịnị mere o ji dee akwụkwọ ozi ahụ? Ọ bụ ezie na Pọl agabeghị Rom na 56 O.A., o doro anya na ọ maara ọtụtụ ndị Kraịst n’ebe ahụ ebe ọ bụ na ọ kpọrọ ụfọdụ n’ime ha aha n’akwụkwọ ozi ya. Ọzọkwa, Pọl chọsiri ike ịga Rom iji gbaa ụmụnna ya ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ ume, o yikwara ka o mere atụmatụ ime Rom ebe ọ ga-anọ kwadoo njem ozi ala ọzọ ọ chọrọ iji gaa Spain.—Ndị Rom 1:11, 12; 15: 22-24.

Otú ọ dị, nzube bụ isi Pọl nwere iji dee akwụkwọ ozi nke a bụ iji zaa ajụjụ ahụ bụ: Olee otú ndị mmadụ ga-esi nweta ezi omume nke na-eduba ná ndụ? Azịza ya mesịrị ghọọ ozi kachasị ozi nile mma. A na-agụ ezi omume n’ihe ndabere nke okwukwe. Pọl mere ka nke a pụta ìhè ma setịpụ isiokwu nke akwụkwọ ozi ya mgbe o dere, sị: “Ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m: n’ihi na ọ bụ ike nke Chineke ruo nzọpụta nye onye ọ bụla nke kwere; onye Juu na mbụ na onye Grik kwa. N’ihi na a na-ekpughe ezi omume Chineke n’ime ya, site n’okwukwe ruo okwukwe: dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ma onye ezi omume ga-esite n’okwukwe dị ndụ.”—Ndị Rom 1: 16, 17.

OKWUKWE NA IWU AHỤ

Na narị afọ mbụ, ọ bụghị mmadụ nile kwere na a na-agụ ezi omume n’ihe ndabere nke okwukwe. Mmadụ ole na ole ndị obi siri ike nọgidere na-ekwu na a chọrọ ihe karịrị nke ahụ. Ọ̀ bụ na ọ bụghị Jehova nyere Iwu Moses ahụ? Olee otú onye ọ bụla nke na-edoghị onwe ya n’okpuru ndokwa ahụ nke sitere n’ike mmụọ nsọ ga-esi bụrụ onye ezi omume? (Lee Ndị Galetia 4: 9-11, 21; 5:2.) N’afọ 49 O.A., òtù na-achị isi nke dị na Jerusalem tụlere ajụjụ nke ịrapagidesi ike n’Iwu ahụ, ha kwubikwara na ọ dịghị mkpa na a ga-ebi ndị Jentaịl nakweere ozi ọma ahụ úgwù ma mee ka ha doo onwe ha n’okpuru nchịkwa nke Iwu ndị Juu.—Ọrụ 15:1, 2, 28, 29.

Mgbe ihe dị ka afọ asaa gasịrị, Pọl dere akwụkwọ ozi ya nye ndị Rom, na-akwado oké mkpebi ahụ. N’ezie, o mere ihe karịrị nke ahụ. Ọ bụghị nanị na Iwu ahụ adịghị mkpa nye ndị Kraịst bụ ndị Jentaịl, kamakwa a gaghị agụ ndị Juu dabeere ná nrubeisi nye ya ná ndị ezi omume iji nweta ndụ.

EZI OMUME SITE N’OKWUKWE

Mgbe ị na-agụ akwụkwọ Ndị Rom, ị ga-ahụta otú Pọl si jiri nlezianya na-ewulite okwu ya, na-eji ọtụtụ nhota okwu ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru na-akwado okwu ya nile. Mgbe ọ na-agwa ndị Juu okwu, bú ndị ọ pụrụ isiwororị ike ịnakwere ozizi ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ, o gosipụtara ịhụnanya na mmetụta. (Ndị Rom 3:1, 2; 9:1-3) Otú o sina dị, o kwuru okwu ya n’ụzọ doro nnọọ anya, jirikwa arụmụka a na-apụghị ịgbagha agbagha mee ihe.

Ná Ndị Rom isi 1 ruo isi 4, Pọl ji eziokwu ahụ bụ na mmadụ nile nwere amamikpe nke mmehie wee malite. N’ihi ya, nanị ụzọ a pụrụ isi gụọ ụmụ mmadụ ná ndị ezi omume bụ n’ihe ndabere nke okwukwe. N’eziokwu, ndị JUU gbalịrị ịbụ ndị ezi omume site n’idebe Iwu Mosis. Ma ha dara ada. N’ihi ya, Pọl ji nkwuwa okwu kwuo, sị: ‘Ndị Juu na ndị Grik, ha nile nọ n’okpuru mmehie.’ O hotara ọtụtụ akụkụ Akwụkwọ nsọ iji kwadoo eziokwu nke a ọtụtụ mmadụ na-adịghị anakwere.—Ndị Rom 3:9.

Ebe ọ bụ na “site n’ọrụ nile nke iwu ọ dịghị mmadụ ọ bụla a ga-agụ n’onye ezi omume,” olee olileanya e nwere? Chineke ga-agụ ndị mmadụ ná ndị ezi omume dị ka onyinye n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. (Ndị Rom 3:20, 24) Iji mee ka ha nweta nke a, ha aghaghị inwe okwukwe n’àjà ahụ. Ozizi nke a nke bụ na a na-agụ ndị mmadụ ná ndị ezi omume n’ihe ndabere nke okwukwe ọ̀ bụ ihe ọhụrụ? Ọ dịghị ma ọlị. A gụrụ Abraham n’onwe ya n’onye ezi omume ọbụna tupu e guzobe Iwu ahụ.—Ndị Rom 4:3.

Ebe o mesịworo ka ịdị mkpa nke okwukwe pụta ìhè, Pọl tụlere ihe ndabere nke okwukwe ndị Kraịst n’isi 5. Nke a bụ Jisọs, onye ụzọ ezi omume ya kagburu mmetụta ọjọọ nile nke mmehie Adam maka ndị nile nwere okwukwe n’ebe Ọ nọ. Otú a, ‘site n’otu ọrụ ezi omume,’ ọ bụghị site n’idebe Iwu Moses, ‘a gụrụ ụdị mmadụ nile ná ndị ezi omume ka ha nata ndụ.’—Ndị Rom 5:18.

ỊZAGHACHI OKWU MMEGIDE

Otú ọ dị, ọ bụrụ na ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu ahụ, gịnị ga-egbochi ha ịga n’ihu na-eme mmehie ma na-eburu n’uche na a ga-agụ ha ná ndị ezi omume n’agbanyeghị ihe ha na-eme, n’ihi obi ebere Chineke nke na-erughịrị mmadụ? Pọl zaghachiri okwu mmegide nke a ná Ndị Rom isi 6. Ndị Kraịst anwụwo n’ebe ụzọ mmehie nke ha na-agbaso na mbụ dị. Ndụ ọhụrụ ha n’ime Jisọs na-akwagide ha ịlụso adịghị ike nile nke anụ ahụ ha ọgụ. Ọ gbara ha ume, sị: “Ka mmehie ghara ịdị na-abụ eze n’ahụ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ.”—Ndị Rom 6:12.

Ma ọ̀ bụ na ndị Juu, ma ọ dịghị ndị ọzọ, ekwesịghị ijigide Iwu Mosis ahụ? N’isi 7, Pọl ji nlezianya kọwaa na ọ dịghị otú ahụ. Dị nnọọ ka a na-atọhapụ nwanyị nọ na di n’iwu nke di ya mgbe di ya nwụrụ, otú a ka ọnwụ Jisọs tọhapụrụ ndị Juu kwere ekwe n’ido onwe ha n’okpuru Iwu ahụ. Pọl kwuru, sị: “E sitekwara n’ahụ Kraịst mee ka unu onwe unu nwụọ n’ebe Iwu dị.”—Ndị Rom 7:4.

Nke a ọ̀ pụtara na e nwere ihe na-adịchaghị mma n’ime Iwu ahụ? Ọ dịghị ma ọlị. Iwu ahụ zuru okè. Nsogbu e nwere bụ na ndị mmadụ na-ezughị okè apụghị idebe Iwu ahụ. Pọl dere, sị, “Anyị matara na iwu ahụ bụ ihe nke mmụọ, ma mụ onwe m bụ ihe nke anụ ahụ, e rewokwa m ịnọ n’okpuru mmehie.” Mmadụ na-ezughị okè apụghị idebe Iwu zuru okè nke Chineke, ya mere a na-ama ya ikpe site na ya. Ya mere, lee nnọọ ka o si bụrụ ihe dị ebube na “ọ dịghị amamikpe ọ bụla dịịrị ndị nọ n’ime Kraịst Jisọs”! E jiriwo mmụọ nabata ndị Kraịst e tere mmanụ ịbụ ụmụ nke Chineke. Mmụọ Jehova na-enyere ha aka ịgbaso ezughị okè nile nke anụ ahụ mgba. “Ònye ga-ebo ndị Chineke họpụtara ebubo? Ọ bụ Chineke onye na-agụ ha ná ndị ezi omume.” (Ndị Rom 7:14, 8:1, 33, NW) Ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ ha n’ebe ịhụnanya Chineke dị.

EZI OMUME NA NDỊ JUU ANỤ AHỤ

Ọ bụrụ na Iwu ahụ adịkwaghị mkpa, olee ọnọdụ nke a debere mba Israel na ya? Oleekwa banyere akụkụ Akwụkwọ nsọ nile ahụ na-ekwe nkwa maka mweghachi nke Israel? A tụlere ajụjụ ndị a ná Ndị Rom isi 9 ruo 11. Akụkụ Akwụkwọ nsọ Hibru buru amụma na a ga-azọpụta nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị Israel, na Chineke ga-echekwa ihu n’ebe ndị mba ọzọ nọ. N’ikwekọ na nke a, e jighị Israel anụ ahụ mezuo amụma ndị ahụ metụtara nzọpụta nke Israel, kama ọ bụ site n’ọgbakọ ndị Kraịst, nke e ji ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị Juu anụ ahụ malite ma were ndị Jentaịl obi ha ziri ezi mejupụta ya.—Ndị Rom 10:19-21; 11:1, 5, 17-24.

ỤKPỤRỤ NILE NKE EZI OMUME

Ná Ndị Rom isi 12 ruo 15, Pọl gara n’ihu ịkọwa ụzọ ụfọdụ pụtara ìhè otú ndị Kraịst e tere mmanụ ga-esi bie ndụ kwekọrọ na ha ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “Ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ (ozi dị nsọ unu na-eje, NW) dị ka uche si dị. Unu ekwekwala ka e mee ka unu yie ajọ oge a: kama ka e nwoghaa unu site n’ime ka uche unu bụrụ ihe ọhụrụ.” (Ndị Rom 12:1, 2) Anyị kwesịrị ịtụkwasị obi n’ikike nke ezi ihe ma ghara iji ajọ ihe lụso ajọ ihe ọgụ. Onyeozi ahụ dere, sị, “Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.”—Ndị Rom 12:21.

Rom bụ ebe bụ isi nke ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’oge Pọl. Ya mere, Pọl ji amamihe nye ndị Kraịst ndụmọdụ, sị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.” (Ndị Rom 13:1) Otú ndị Kraịst si emeso ibe ha bụkwa akụkụ nke ibi ndụ kwekọrọ n’ezi omume. Pọl sịrị, “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya: n’ihi na onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu.”—Ndị Rom 13:8.

Ọzọkwa, ndị Kraịst kwesịrị ịdị na-echebara akọ na uche ndị ọzọ echiche ma ghara ịdị na-ama ha ikpe. Pọl gbara ume, sị: “Ka anyị na-agbaso ihe nile dịịrị udo, na ihe nile dịịrị iwulirịta onwe anyị elu dị ka ụlọ.” (Ndị Rom 14:19) Lee ezi ndụmọdụ nke a bụ itinye n’ọrụ n’akụkụ nile nke ndụ onye Kraịst! Ya mere, n’isi 16, Pọl ji ekele o zigaara ndị mmadụ n’otu n’otu na okwu agbamume na ndụmọdụ ikpeazụ mechie okwu.

MAKA NDỊ E TERE MMANỤ NA ATỤRỤ ỌZỌ

Isiokwu a tụlere ná Ndị Rom dị mkpa na narị afọ mbụ, ọ ka dịkwa oké mkpa n’oge a. Ezi omume na ndụ ebighị ebi bụ ihe na-akpali oké mmasị n’etiti ndị ozi nile nke Jehova. N’eziokwu, ọ bụ ọgbakọ ndị Kraịst e tere mmanụ ka e degaara akwụkwọ Ndị Rom, ma taa, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke Ndịàmà Jehova bụ ndị nke “oké ìgwè mmadụ” ahụ, na-enwekwa olileanya nke elu ala. (Mkpughe 7:9) Otú ọ dị, akwụkwọ ozi nke a nwekwara ozi dị mkpa nye ndị a. Gịnị ka ọ bụ?

Akwụkwọ Ndị Rom na-eme ka o doo anya na a na-agụ ndị Kraịst ná ndị ezi omume site n’okwukwe. Nye ndị e tere mmanụ, nke a bụ ná nzube nke ha isoro Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe. Otú ọ dị, a na-agụkwa ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ ná ndị ezi omume, kama ọ bụ dị ka ‘ndị enyi Chineke,’ dị ka a gụrụ nna ochie ahụ bụ Abraham. (Jemes 2:21-23) Ezi omume ha bụ ná nzube nke ịlanarị oké mkpagbu ahụ, ọ daberekwara n’okwukwe ha nwere n’ọbara Jisọs, dị nnọọ ka ọ dị n’ọnọdụ nke ndị e tere mmanụ. (Abụ Ọma 37:11; Jọn 10:16; Mkpughe 7:9, 14) Ya mere, ntụgharị uche Pọl ná Ndị Rom dị oké mkpa nye atụrụ ọzọ ahụ dịkwa ka ọ dị n’ebe ndị e tere mmanụ nọ. Ndụmọdụ dị mma dị n’akwụkwọ ahụ maka ibi ndụ kwekọrọ n’anyị ịbụ ndị a gụrụ ná ndị ezi omume dịkwa mkpa maka ndị Kraịst nile.

Akwụkwọ bụ The Book of Life nke Dr. Newton Marshall Hall na Dr. Irving Francis Wood haziri, na-ekwu, sị: “N’ụzọ nke ịrụ ụka na ozizi, (Ndị Rom) ruru ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ozizi Pọl nke sitere n’ike mmụọ nsọ. O dị nro, dị akọ, ma o kwusikwara okwu ike. . . . Ọmụmụ nke akwụkwọ ozi nke a onyeozi dere na-eweta ọtụtụ ezigbo nkwụghachi ụgwọ nke ya.” Gịnị mere ị gaghị agụ akwụkwọ ahụ n’onwe gị ma nwee ọṅụ n’ozi ọma’ nke dị na ya, nke bụ “ike nke Chineke ruo nzọpụta.”—Ndị Rom 1:16.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24]

“Ọ dịghị onye ọchịchị [ụwa] ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.” Nke a apụtaghị na Chineke na-etinye onye ọchịchị ọ bụla n’ọnọdụ ya. Kama ndị ọchịchị ụwa na-anọgide nanị n’ihi na Chineke kwere ka ha nọrọ. N’ọtụtụ ọnọdụ, Chineke na-ebu ụzọ hụta ma buo amụma banyere ndị ọchịchị bụ mmadụ, ha wee si otú a bụrụ “ndị Chineke doworo.”—Ndị Rom 13:1.

[Ebe E Si Nweta Foto]

Museo della Civilta. Romana, Roma Foto: MOURA

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

A gwara ndị Kraịst, sị: “Yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” Nke a pụtara na ha ga-agbasosi nzọụkwụ nile nke Jisọs ike, na-eṅomi ya site n’idebe ọdịmma nile nke ime mmụọ ọ bụghị nke anụ ahụ n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ha, si otú a ‘ghara ịdị na-ebu ụzọ echere ahụ, ime ihe na-agụ ya.’—Ndị Rom 13:14.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

Pọl gwara ndị Rom ka ha ‘were isutu ọnụ dị nsọ kelerịta onwe ha.’ Otú ọ dị, ọ naghị eguzobe n’ebe a omenala ma ọ bụ ihe omume okpukpe ọhụrụ maka ndị Kraịst. N’oge Pọl, isutu ọnụ n’egedege ihu, egbugbere ọnụ, ma ọ bụ n’aka bụ nke a na-emekarị dị ka ihe àmà nke ekele, ịhụnanya, ma ọ bụ nsọpụrụ. Ya mere, nanị ihe Pọl na-eme bụ izo aka n’omenala nke mmadụ nile maara n’oge ya.—Ndị Rom 16:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya