Ndị E Doro Iche Ịbụ Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto n’Ụwa Nile
“Toonụ Ja. Toonụ, unu ndị ohu Jehova, toonụ aha Jehova.”—ABỤ ỌMA 113:1.
1, 2. (a) N’ikwekọ n’Abụ Ọma 113:1-3, ònye ruru eru ịnara otuto anyị ji ikpo ọkụ enye? (b) Olee ajụjụ kwesịrị ka a jụọ?
JEHOVA CHINEKE bụ Onye Okike Ukwu nke eluigwe na ala, Eze Eluigwe na Ala ruo mgbe nile ebighị ebi. O ruru nnọọ eru ịnara otuto anyị ji ikpo ọkụ na-enye. Nke a mere Abụ Ọma 113:1-3 ji enye anyị iwu, sị: “Toonụ Ja. Toonụ, unu ndị ohu Jehova, toonụ aha Jehova. Ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi site n’ugbu a wee ruo mgbe ebighị ebi. Site n’ọwụwa anyanwụ ruo ọdịda ya aha Jehova ga-abụ ihe a na-eto eto.”
2 Dị ka Ndịàmà Chineke, anyị na-aṅụrị ọṅụ ime nke a. Lee ka o si bụrụ ihe na-akpali akpali na n’isi nso Jehova Chineke ga-eme ka abụ otuto a na-enye ọṅụ nke anyị na-abụ taa jupụta ụwa dum! (Abụ Ọma 22:27) À na-anụ olu gị n’oké ìgwè ndị ukwe a zuru ụwa ọnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, lee ka ọ na-aghaghị isi nye gị obi ụtọ ịbụ onye e doro iche n’ụwa a ọṅụ na-adịghị, nke na-adịghị n’otu!
3. (a) Gịnị na-edo ndị Jehova iche? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si edo anyị iche?
3 Anyị ito Jehova n’ịdị n’otu na-eme n’ezie ka anyị bụrụ ndị pụrụ iche. Anyị na-ekwu okwu ma na-ezi ihe n’otu olu, na-ejikwa otu ụzọ ahụ na-ekwupụta ‘ịba ụba nke ịdị mma Jehova.’ (Abụ Ọma 145:7) Ee, dị ka ndị Jehova raara onwe ha nye, a na-edo anyị iche maka ozi nke Chineke anyị, bụ́ Jehova. Chineke gwara ndị ya raara onwe ha nye n’oge ochie, bụ́ Israel, ka ha doo onwe ha iche pụọ ná mba ndị gbara ha gburugburu, bụrụkwa ndị omume nke mba ndị ahụ na-etetọghị. (Ọpụpụ 34:12-16) O nyere ndị ya iwu iji nyere ha aka ime nke a. N’otu aka ahụ taa, Jehova enyewo anyị Okwu Nsọ ya, bụ́ Bible. Ntụziaka ya na-egosi anyị otú anyị pụrụ isi doo onwe anyị iche pụọ n’ụwa a. (2 Ndị Kọrint 6:17; 2 Timoti 3:16, 17) A dịghị edo anyị iche site n’ịnọpụ iche n’ebe obibi ndị mọnk na nke ndị nọn, dị ka ndị mọnk na ndị nọn nke Babilọn Ukwu ahụ na-eme. N’ịgbaso ihe ilereanya Jisọs Kraịst, anyị bụ ndị na-eto Jehova n’ihu ọha.
Iṅomi Onye Kasị Enye Jehova Otuto
4. Olee otú Jisọs si setịpụ ihe ilereanya n’ito Jehova?
4 Ọ dịghị mgbe Jisọs wezụgara onwe ya ná nzube ya bụ́ ito Jehova. Nke a dokwara ya iche pụọ n’ụwa. N’ụlọ nzukọ na n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem, o toro aha nsọ Chineke. Ma ọ̀ bụ n’elu ugwu ma ọ bụ n’ụsọ oké osimiri, n’ebe ọ bụla ìgwè mmadụ gbakọtara, Jisọs kwusara eziokwu Jehova n’ihu ọha. O kwupụtara, sị: “Ekele m Gị, Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa.” (Matiu 11:25) Ọbụna mgbe a na-ekpe ya ikpe n’ihu Pọntiọs Paịlet, Jisọs gbara àmà, sị: “A mụwo Mụ onwe m ime ihe a, abịawokwa m n’ime ụwa ime ihe a, ka M wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Jisọs ghọtara ịdị mkpa nke ọrụ ya. N’ebe ọ bụla ọ nọ, Jisọs gbaara Jehova àmà ma too ya n’ihu ọha.
5. Ònye ka Abụ Ọma 22:22 dịịrị, gịnịkwa kwesịrị ịbụ àgwà anyị?
5 N’Abụ Ọma 22:22, anyị na-achọta okwu amụma a banyere Onye Kasị Enye Jehova Otuto: “Aga m akọrọ ụmụnne m aha Gị: n’etiti mkpọkọta Gị ka m ga-eto Gị.” Ná Ndị Hibru 2:11, 12 kwa, Pọl onyeozi ji amaokwu ndị a mee ihe banyere Onyenwe anyị Jisọs na banyere ndị Jehova Chineke doworo nsọ maka ebube eluigwe. Dị ka ya, ihere adịghị eme ha ito aha Jehova n’etiti mkpọkọta ya. Ànyị na-enwe otu echiche uche nke a mgbe anyị na-aga nzukọ ọgbakọ anyị? Òkè anyị ji ikpo ọkụ ekere ná nzukọ, ma n’uche ma n’olu okwu, na-eto Jehova. Ma iji ọṅụ enye otuto anyị ọ̀ na-ejedebe n’ebe ahụ?
6. Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa otu ndị hụrụ ìhè n’anya si enye Chineke otuto?
6 Dị ka Matiu 5:14-16 si kwuo, Onyenwe anyị Jisọs nyekwara ụmụazụ ya ọrụ ime ka ìhè ha nwuo ka ndị ọzọ wee too Jehova. Ọ sịrị: “Unu onwe unu bụ ìhè nke ụwa. . . . Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ihu mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, wee too Nna unu Nke bi n’eluigwe.” Ndị hụrụ ìhè ahụ n’anya na-ewetara Chineke otuto. Hà na-eme nke a nanị site n’ikwu na ime ihe ọma, ihe ndị na-akwalite ọdịmma ndị mmadụ? Ee e, kama nke ahụ ha na-eme ya site n’inye Jehova otuto n’ịdị n’otu. Ee, ndị hụrụ ìhè n’anya na-arara onwe ha nye Chineke ma na-aghọ ndị ji ọṅụ na-enye ya otuto. Ì werewo nzọụkwụ obi ụtọ nke a?
Ọṅụ Site n’Ito Jehova
7. N’ihi gịnị ka ndị na-enye Jehova otuto ji enwe ọṅụ dị ukwuu, oleekwa ọṅụ ha nwere na Pentikọst 33 O.A.?
7 N’ihi gịnị ka ndị na-eto Jehova ji enwe ọṅụ dị ukwuu? N’ihi na ọṅụ bụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ná Ndị Galetia 5:22, e depụtara ya ozugbo e depụtasịrị ịhụnanya. Ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ gosipụtara mkpụrụ a nke mmụọ Jehova. Leenụ, n’ụbọchị Pentikọst 33 O.A., mgbe Chineke wụkwasịrị mmụọ ya n’elu ihe dị ka 120 n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs, ha nile malitere ito Jehova n’asụsụ dị iche iche. Ndị Juu na-atụ egwu Chineke ndị si ọtụtụ mba bịa Jerusalem ‘nwere ijuanya, ibobo nwụkwara ha n’ahụ.’ Ha ji oké olu kwuo, sị: “Anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere oké ọrụ nile nke Chineke.” (Ọrụ 2:1-11) Gịnị ka iji ọtụtụ asụsụ nye Jehova otuto nke a dị ebube rụpụtara? Ihe dị ka ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu 3,000 naara ozi ọma Alaeze ahụ banyere Mesaịa ahụ. E mere ha baptism, ha natara mmụọ nsọ, jirikwa ịnụ ọkụ gbakwụnye olu ha dị ka ndị ji ọṅụ enye Jehova otuto. (Ọrụ 2:37-42) Lee ngọzi nke ahụ bụ!
8. Mgbe Pentikọst gasịrị, gịnị ka ndị Kraịst mere iji tụkwasị ihe n’ọṅụ ha?
8 Ihe ndekọ ahụ na-aga n’ihu, sị: “Ha jikwa otu obi na-anọgidesi ike n’ụlọ ukwu Chineke kwa ụbọchị, ha na-anyawakwa achịcha n’ụlọ ha, wee nara ihe oriri ha n’obi ụtọ na obi nke aghụghọ na-adịghị ya, ha na-eto Chineke, ihe ha na-atọkwa ndị Juu dum ụtọ. Onyenwe anyị na-atụkwasịkwara ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.” (Ọrụ 2:46, 47) Ọ̀ bụ nanị mkpakọrịta ha na irikọ ihe oriri ọnụ mere ka ha nwee oké ọṅụ? Ee e, ọṅụ bụ isi ha nwere sitere n’ito Jehova Chineke kwa ụbọchị. Ọṅụ ha dịwanyekwara ukwuu mgbe ha hụrụ ka ọtụtụ puku na-anakwere ozi nzọpụta ha. Ọ dịkwa otú ahụ nye anyị taa.
Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto ná Mba Nile
9. (a) Ole mgbe, ọ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka Chineke si malite inye ndị nke mba nile ohere ịnụ ozi ọma ya? (b) N’ihi gịnị ka e ji wụkwasị Kọniliọs na ndị enyi ya mmụọ nsọ tupu baptism ha?
9 Jehova achọghị ka ọrụ inye ìhè nke ndị ohu ya bụrụ nke a kpaara ókè ịbụ nanị n’otu mba. N’ihi ya, na-amalite na 36 O.A., o nyere ndị nke mba nile ohere ịnụ ozi ọma ya. Ná ntụzi Chineke, Pita gara n’ụlọ otu onye Jentaịl bụ́ onyeisi usuu ndị agha na Sizarịa. N’ebe ahụ ọ hụrụ ka Kọniliọs na ezigbo ndị enyi na ezinụlọ ya zukọrọ. Ka ha gere ntị nke ọma n’okwu Pita, ha gosipụtara okwukwe n’ebe Jisọs nọ n’obi ha. Olee otú anyị si mara? N’ihi na mmụọ Chineke bịakwasịrị ndị Jentaịl ahụ kwere ekwe. Dị ka ọ na-adịkarị, a na-enye onyinye nke mmụọ Chineke nanị mgbe baptism gasịrị, ma n’oge ahụ Jehova gosiri na ya nwapụtara ndị a na-abụghị ndị Juu tupu e mikpuo ha n’ime mmiri. A sị na Jehova emeghị nke ahụ, Pita agaraghị enwe ike ijide n’aka na Chineke na-anakwere ndị Jentaịl ugbu a dị ka ndị ohu Ya nakwa na ha ruru eru maka baptism ime mmiri.—Ọrụ 10:34, 35, 47, 48.
10. Olee otú e siri buo ya n’amụma site n’oge ochie na ndị nke mba nile ga-eto Jehova?
10 Site n’oge ochie, Jehova buru amụma na ndị nke mba nile ga-eto ya. Ọ ga-enwe ndị ji ọṅụ enye otuto n’ala nile. Iji nwapụta nke a, Pọl onyeozi hotara amụma ndị sitere n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ gwara ọgbakọ ndị Kraịst ahụ nke ndị mba dị iche iche mejupụtara na Rom, sị: “Na-akpọbatanụ ibe unu, dị ka Kraịst anyị kpọbatakwara unu, ka e wee nye Chineke otuto. N’ihi na asị m na e mewo Kraịst ka Ọ bụrụ onye na-ejere obibi úgwù ozi n’ihi eziokwu Chineke, ka O wee mee ka nkwa nile e kwere nna anyị ha guzosie ike, ka ndị mba ọzọ wee nyekwa Chineke otuto n’ihi ebere Ya; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ [n’Abụ Ọma 18:49], sị, N’ihi nke a ka M ga-ekwupụta Gị n’etiti mba nile, aha Gị ka m ga-abụkukwa abụ ọma. Ọzọkwa [na Deuterọnọmi 32:43] Ọ sị, Unu mba ọzọ, soronụ ndị Ya nwee obi ụtọ. Ọzọkwa, [n’Abụ Ọma 117:1] Toonụ Onyenwe anyị, unu mba nile; ka ndị nile dị iche iche na-ajakwa Ya.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ndị Rom 15:7-11.
11. Olee otú Chineke siworo nyere ndị nke mba nile aka ịmụta eziokwu ya, gịnịkwa siworo na ya pụta?
11 Ndị mmadụ apụghị inye Jehova otuto n’ịdị n’otu ọ gwụla ma hà tụkwasịrị olileanya ha na Jisọs Kraịst, bụ́ onye Chineke họpụtaworo ịchị isi n’elu ndị nke mba nile. Iji nyere ha aka ịghọta eziokwu Ya nke na-eduba ná ndụ agwụghị agwụ, Chineke eguzobewo usoro izi ihe zuru mba nile. Ọ na-enye nduzi site n’aka òtù ohu ya kwesịrị ka a tụkwasị ya obi. (Matiu 24:45-47) Gịnị si na ya pụta? Ihe karịrị nde olu ise na-aṅụrị ọṅụ na-abụ abụ otuto Jehova n’ihe karịrị ala 230. Ọtụtụ nde ọzọ na-egosi mmasị n’ime otu ihe ahụ. Lee ole bịara Ememe Ncheta na 1996: 12,921,933. Ọ dị ịtụnanya!
E Buo Amụma Oké Ìgwè nke Ndị Ji Ọṅụ Enye Otuto
12. Ọhụụ dị aṅaa na-akpali akpali ka Pọl onyeozi hụrụ, gịnịkwa bụ eziokwu a na-ahụ anya dịnụ banyere ya?
12 N’ọhụụ, Jọn onyeozi hụrụ “oké ìgwè mmadụ” si ná mba nile pụta. (Mkpughe 7:9) Gịnị bụ isiokwu nke otuto nke oké ìgwè mmadụ a so ihe fọdụrụ e tere mmanụ nke Chineke na-abụ n’abụ? Jọn na-agwa anyị, sị: “Nzọpụta dịịrị Chineke anyị, Onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa atụrụ ahụ.” (Mkpughe 7:10) E ji obi ike akpọsa nke a n’akụkụ nile nke ụwa. N’ifegharị igu nkwụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, anyị ji ịdị n’otu na-eto Chineke dị ka Eze Eluigwe na Ala ma jiri ọṅụ na-ekwupụta n’ihu eluigwe na ala na ‘nzọpụta anyị dịịrị’ ya na Ọkpara ya, bụ́ Nwa Atụrụ ahụ, Jisọs Kraịst. Oo, lee mkpali Jọn onyeozi nwere n’ịhụ ọhụụ a na-akpali akpali nke oké ìgwè mmadụ ahụ! Leekwa mkpali anyị na-enwe taa n’ịhụ, ọbụnakwa ịbụ akụkụ nke, eziokwu a na-ahụ anya nke ihe Jọn hụrụ!
13. Gịnị na-edo ndị Jehova iche pụọ n’ụwa?
13 Dị ka ndị ohu Jehova, anyị ji nganga na-aza aha ya. (Aịsaịa 43:10, 12) Anyị ịbụ Ndịàmà nke Jehova na-eme ka anyị dị iche n’ebe ụwa nke a dị. Lee ọṅụ ọ bụ ịza aha pụrụ iche nke Chineke na inwe ịrụ ọrụ nsọ ya dị ka nzube anyị ná ndụ! Nzube ukwu Jehova nke ime ka aha nsọ ya dị nsọ na iwepụ ọbụbụeze eluigwe na ala ya n’ụta site n’Alaeze ahụ emewo ka ndụ anyị nwee nzube. O nyewokwara anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ banyere aha na Alaeze ya. O mewo nke a n’ụzọ atọ.
Ndị E Nyere Eziokwu ahụ n’Aka
14, 15. (a) Olee otú ụzọ Chineke siworo nyere anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ banyere aha na Alaeze ya? (b) Olee otú Alaeze e guzobere na 1914 O.A. si dị iche n’ebe nke ahụ a kwaturu na 607 T.O.A. dị?
14 Nke mbụ, Jehova enyewo ndị ya eziokwu ahụ n’aka. Mkpughe kasị akpali akpali bụ na Alaeze ya malitere ịchị na 1914. (Mkpughe 12:10) Ọchịchị eluigwe a dị iche n’alaeze ihe atụ ahụ dị na Jerusalem, bụ́ ebe ndị eze si n’eriri Devid nọkwasịburu. A kwaturu alaeze ahụ, malitekwa na 607 T.O.A., e tinyere Jerusalem kpam kpam n’okpuru ịchịisi ike ụwa ndị Jentaịl. Alaeze ọhụrụ nke Jehova guzobere na 1914 bụ ike eluigwe nke na-agaghị adị n’okpuru onye ọ bụla ma ọlị ma e wezụga Jehova, a gaghịkwa emebi ya. (Daniel 2:44) Ọzọ, ịchịisi ya dị iche. N’ụzọ dị aṅaa? Mkpughe 11:15 na-aza, sị: “Oké olu wee daa n’eluigwe, ha wee sị, Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị, na nke Kraịst Ya: Ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.
15 “Alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst Ya” na-achị isi n’elu ụwa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ngosipụta ọhụrụ a nke ọbụbụeze Jehova, nke na-agụnye Ọkpara ya bụ́ Mesaịa na ụmụnna Jisọs dị 144,000, ndị a kpọliteworo ihe ka ọtụtụ n’ime ha ugbu a gaa n’ebube eluigwe, abụghị nanị ihe gbasara nkà mmụta—nchepụta ozizi nke ụmụ akwụkwọ nwere ike ịchọ ịkparịta. Ee e, Alaeze eluigwe nke a bụ ọchịchị n’ezie. Olileanya obi ụtọ anyị nke ịdị ndụ ebighị ebi n’izu òkè dị ka ihe ịchịisi ya ga-arụpụta na-enyekwa anyị ihe zuru ezu mere anyị ga-eji nọgide na-aṅụrị ọṅụ. Ịbụ ndị e nyere eziokwu dị otú ahụ nke Okwu Jehova n’aka na-akwali anyị mgbe nile ikwu ihe ọma banyere ya. (Abụ Ọma 56:10) Ị̀ na-eme nke a n’ụzọ chiri anya site n’ịgwa onye ọ bụla na Alaeze Mesaịa nke Chineke na-achị ugbu a n’eluigwe?
Ndị A Na-enyere Aka Site na Mmụọ Nsọ na Òtù Ụmụnna Zuru Ụwa Ọnụ
16, 17. Olee ụzọ nke abụọ na nke atọ nke Chineke siworo nyere anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ?
16 Ụzọ nke abụọ Chineke siworo nyere anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ bụ site n’inye anyị mmụọ nsọ ya, bụ́ nke na-enyere anyị aka ịmịpụta mkpụrụ ọma ya ná ndụ anyị ma nweta nnwapụta ya. (Ndị Galetia 5:22, 23) Ọzọkwa, Pọl degaara ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Anyị onwe anyị [natara] . . . Mmụọ Nke sitere na Chineke; ka anyị wee mata ihe nile Chineke weere amara nye anyị.” (1 Ndị Kọrint 2:12) Site n’anyị ikwenyere mmụọ Jehova, anyị nile pụrụ ugbu a ịmata na ịghọta ihe ọma dị ugbu a ndị o werewooro amara nye anyị—nkwa, iwu, ụkpụrụ ya, na ihe ndị ọzọ.—Tụlee Matiu 13:11.
17 N’ihe banyere ụzọ nke atọ Chineke si enyere anyị aka, anyị nwere òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ na ndokwa ọma Jehova mere ná nzukọ ya maka ofufe. Pita onyeozi kwuru banyere ya mgbe ọ gbara anyị ume ‘ịhụ òtù ndị bụ́ ụmụnna n’anya.’ (1 Pita 2:17) Ezinụlọ ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị zuru ụwa ọnụ nke na-ahụ n’anya na-enyere anyị aka iji oké ọṅụ nke obi jeere Jehova ozi, dị ka Abụ Ọma 100:2 na-enye iwu: “Werenụ ọṅụ fee Jehova ofufe: werenụ iti mkpu ọṅụ bịa n’ihu Ya.” Amaokwu nke 4 na-agakwa n’ihu na-asị: “Werenụ ekele baa n’ọnụ ụzọ ama Ya nile, werenụ otuto baa n’ogige Ya nile: keleenụ Ya, gọziekwanụ aha Ya.” Ya mere ma ànyị na-eme nkwusa n’ihu ọha ma ọ bụ na-eje nzukọ anyị, anyị pụrụ inwe ọṅụ. Lee udo na ịnọ ná ntụkwasị obi anyị nwetaworo n’ogige ọma nke ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova!
Jirinụ Ọṅụ Too Jehova!
18. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji na-aṅụrị ọṅụ n’ito Jehova n’agbanyeghị mkpagbu ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ na-adakwasị anyị?
18 N’agbanyeghị ọnọdụ ndị siri ike, mkpagbu, ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ pụrụ ịdakwasị anyị, ka anyị ṅụrịa ọṅụ na anyị nọ n’ụlọ ofufe nke Jehova. (Aịsaịa 2:2, 3) Cheta na ọṅụ bụ ọdịdị nke obi. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị bụ́ ndị Kraịst oge mbụ jiri ọṅụ nye Jehova otuto n’agbanyeghị ọtụtụ ihe isi ike na mfu ha nwere. (Ndị Hibru 10:34) Ndị kwere ekwe ibe anyị taa dị nnọọ ka ha.—Matiu 5:10-12.
19. (a) Iwu ndị dị aṅaa e nyere ugboro ugboro na-akwali anyị ito Jehova? (b) Ndụ agwụghị agwụ anyị na-adabere na gịnị, gịnịkwa bụ mkpebisi ike anyị?
19 Anyị nile ndị na-ejere Jehova ozi nwere obi ụtọ irube isi n’iwu Bible nyere ka e too ya. Ugboro ugboro akwụkwọ Mkpughe na-akwụsịtụ otuto Chineke iji gbakwụnye okwu bụ́ “Haleluya [Toonụ Ja! NW].” (Mkpughe 19:1-6) N’amaokwu isii nile ahụ nke Abụ Ọma 150, a na-agwa anyị ugboro 13 ka anyị too Jehova. Nke a bụ òkù zuru eluigwe na ala a na-akpọ ihe nile e kere eke isonye n’iji ọṅụ na-abụ otuto Jehova. Ndụ agwụghị agwụ anyị na-adabere n’anyị isonye n’oké ukwe Haleluya nke a! Ee, nanị ndị nyere Jehova otuto n’akwụsịghị akwụsị ga-adị ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, anyị ekpebisiwo ike ịrapagidesi ike n’ọgbakọ ya na-eguzosi ike n’ihe nke zuru ụwa ọnụ ka ọgwụgwụ na-abịaru nso. Mgbe ahụ, anyị pụrụ inwe olileanya ịhụ ka okwu ndị e ji mechie Abụ Ọma 150 mezuru n’ụzọ zuru ezu: “Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Ja. Toonụ Ja.”
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị mere ka ndị Jehova pụọ iche?
◻ N’ihi gịnị ka ndị ohu Jehova ji aṅụrị ọṅụ nke ukwuu?
◻ Gịnị na-edo anyị iche pụọ n’ebe ụwa dị?
◻ N’ụzọ atọ dị aṅaa ka Chineke nyewooro anyị aka inwe ọnọdụ ná nzube ya dị nsọ?
[Foto dị na peeji nke 17]
N’ebe ọ bụla ọ nọ, Jisọs gbaara Jehova àmà ma too ya n’ihu ọha