N’ihi Gịnị Ka Sọl Ji Kpagbuo Ndị Kraịst?
‘N’EZIE ECHERE M NA AGHAGHỊ M ime ọtụtụ ihe megide aha Jisọs onye Nazaret. Nke m mekwara na Jerusalem: mụ onwe m mechibidoro ọtụtụ ndị nsọ n’ụlọ mkpọrọ, ebe m natara ike site n’aka ndị isi nchụàjà, mgbe e gburu ha m wee kwenye imegide ha. Esitere m n’ime ka ha hụọ ahụhụ mmehie ọtụtụ mgbe n’ụlọ nzukọ nile chọọ ụzọ ime ka ha kwuluo Chineke; ebe anya na-adịghị m mma gabiga ókè megide ha, m wee na-esogbu ha wee ruo obodo dị iche iche dị n’azụ ala anyị.’ —Ọrụ 26:9-11.
OTÚ ahụ ka Sọl onye Tasọs, bụ́ onye a makwaara dị ka Pọl onyeozi, kwuru. N’ezie, n’oge o kwuru nke a, ọ gbanwewo. N’abụghịzi onye na-emegide Iso Ụzọ Kraịst, ọ bụzi otu n’ime ndị na-akwalitesi ya ike. Ma gịnị kpaliburu Sọl ịkpagbu ndị Kraịst? N’ihi gịnị ka o ji chee na ‘ọ ghaghị ime’ ihe ndị dị otú ahụ? È nwekwara ihe a ga-amụta site n’akụkọ banyere ya?
Ịtụgbu Stifen
Sọl so n’ime ndị e dekọrọ na Bible bụ́ ndị gburu Stifen. “Ha wee tụpụ [Stifen] n’obodo, tụọkwa ya nkume: ndị àmà wee wụsa uwe ha n’ụkwụ otu nwa okorobịa a na-akpọ Sọl.” “Ma ogbugbu ya dị Sọl ezi mma.” (Ọrụ 7:58; 8:1) Gịnị dugara n’ogbugbu ahụ? Ndị Juu, gụnyere ụfọdụ ndị sitere Silisia, sooro Stifen rụrịta ụka ma ha enweghị ike iguzogide ya. E kwughị ma Sọl, onye bụkwa onye Silisia, ò so ha. Otú o sina dị, ha ji ndị àmà ụgha mee ihe ibo Stifen ebubo nkwulu ma kpụrụ ya gaa n’ihu Sanhedrin. (Ọrụ 6:9-14) Mgbakọta a, bụ́ nke onyeisi nchụàjà nọ n’isi ya, rụrụ ọrụ dị ka ụlọikpe dị elu nke ndị Juu. Dị ka ụlọikpe okpukpe kasịnụ, ndị òtù ya chekwakwara ihe ha weere dị ka ịdị ọcha nke ozizi. N’echiche ha, Stifen kwesịrị ọnwụ. O nwere anyaike ibo ha ebubo na ha edebeghị Iwu ahụ, ọ̀ kwa ya? (Ọrụ 7:53) Ha ga-egosinụ ya otú a gaara esi debe ya!
Nkwado Sọl kwadoro echiche ahụ bụ ihe ezi uche dị na ya nke si n’ihe ndị o kweere pụta. Ọ bụ onye Farisii. Ịrọ òtù a dị ike kwuru ka a na-edebesi iwu na ọdịnala ike. E weere Iso Ụzọ Kraịst dị ka ihe megidere nkwenkwe ndị ahụ, ịkụzi ụzọ ọhụrụ na-eduga ná nzọpụta site na Jisọs. Ndị Juu narị afọ mbụ tụrụ anya na Mesaịa ahụ ga-abụ Eze dị ebube bụ́ onye ga-eme ka ha nwere onwe ha pụọ n’agbụ nke ọchịchị ndị Rom ha kpọrọ asị. Na onye ahụ Sanhedrin Ukwu mara ikpe n’ebubo nkwulu, onye e mesịkwara kpọgide n’elu osisi ịta ahụhụ dị ka omempụ a kọchara akọcha nwere ike ịbụ Mesaịa ahụ bụ n’echiche ha, ihe ọhụrụ, ihe a na-anabataghị, na ihe a na-asọ oyi.
Iwu ahụ kwuru na onye a kwụbara n’osisi bụ “ihe nkọcha nke Chineke.” (Deuterọnọmi 21:22, 23; Ndị Galetia 3:13) N’echiche Sọl, “okwu ndị a dabara nnọọ adaba n’ebe Jisọs nọ,” ka Frederick F. Bruce na-ekwu. “Ọ nwụrụ ná nkọcha Chineke, n’ihi ya a pụghị iche n’echiche na ọ bụ Mesaịa ahụ, bụ́ onye ngọzi Chineke dịkwasịrị n’ọ̀tụ̀tụ̀ pụrụ iche, dị ka ọdịnala ndị Juu si dị. N’ihi ya, ịzọrọ na Jisọs bụ Mesaịa ahụ bụ nkwulu; ndị mekwara nzọrọ dị otú ahụ nke ezi uche na-adịghị na ya kwesịrị ịta ahụhụ dị ka ndị nkwulu.” Dị ka Sọl n’onwe ya mesịrị kweta, echiche nke ‘na a kpọgidere Kraịst n’elu osisi ịta ahụhụ, bụụrụ ndị Juu ọnyà.’—1 Ndị Kọrint 1:23.
Mmeghachi omume Sọl n’ebe ozizi dị otú ahụ dị bụ iji mkpebisi ike kasị ukwuu pụrụ ikwe omume, megide ya. Ọbụna a ga-eji obi ọjọọ mee ihe ná mgbalị ikpochapụ ya. O ji n’aka na nke a bụ ihe Chineke chọrọ. N’ịkọwa mmụọ ọ zụlitere, Sọl kwuru, sị: “N’akụkụ ịnụ ọkụ n’obi, ana m esogburị nzukọ Kraịst; n’akụkụ ezi omume nke dị n’ime iwu, a hụrụ na adịghị m ịta ụta.” “Ana m esogbu nzukọ Chineke nke ukwuu hie nne, mebiekwa ya: ana m agakwarị n’ihu n’ụzọ ndị Juu karịa ọtụtụ ndị ọgbọ m n’etiti mba nke m, ebe obi m na-anụbigara ozizi ahụ ọkụ ókè karị, bụ́ nke nna m hà nyere anyị n’aka idebe.”—Ndị Filipaị 3:6; Ndị Galetia 1:13, 14.
Onye Duziri Mkpagbu
Mgbe Stifen nwụsịrị, Sọl anọghịzi dị ka onye na-enye aka nkịtị ná mkpagbu kama dị ka onye na-eduzi ya. N’ihi ya, ọ ghaghị inwetaworị aha ọjọọ, ebe ọ bụ na ọbụna mgbe a tọghatasịrị ya, mgbe ọ nwara isonyere ndị na-eso ụzọ, “ha nile na-atụ egwu ya, ebe ha na-ekweghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jisọs.” (Ọ bụ anyị dere okwu ahụ n’ụdị dị iche.) Mgbe o doro anya na ọ bụ onye Kraịst n’ezie, ntọghata ya wetara ọṅụ na inye ekele n’etiti ndị na-eso ụzọ, bụ́ ndị nụrụ, ọ bụghị nanị na otu onye na-emegidebu ha enweela mgbanwe nke obi, kama na “Onye ahụ nke na-esogbu anyị n’oge gara aga, ọ na-ezi ozi ọma ugbu a nke okwukwe ahụ nke ọ na-emebi n’oge gara aga.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Ọrụ 9:26; Ndị Galetia 1:23, 24.
Damaskọs dị ihe dị ka kilomita 220—njem ụkwụ ụbọchị asaa ma ọ bụ asatọ—site na Jerusalem. Ma, “ebe ọ na-ewere ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ,” Sọl jekwuuru onyeisi nchụàjà ma rịọ ya maka akwụkwọ ozi ndị a ga-enye ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs. N’ihi gịnị? Ka Sọl wee nwee ike ịdọkpụrụ onye ọ bụla ọ chọtara nọ “n’Ụzọ a” n’agbụ bịa Jerusalem. N’inwe nkwado ndị isi, ọ ‘na-esogbu nzukọ Kraịst nke ukwuu, na-aba n’ụlọ nile n’otu n’otu, ọ na-adọkpụkwa ndị ikom na ndị inyom iji rara ha nye ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.’ Ndị ọzọ ka o ‘tiri ihe n’ụlọ nzukọ,’ o ‘kwenyekwara’ ka e gbuo ha.—Ọrụ 8:3; 9:1, 2, 14; 22:5, 19; 26:10.
N’ịtụle agụmakwụkwọ Sọl nwetara n’okpuru Gameliel na ikike ndị o nwere ugbu a, ụfọdụ ndị ọkà mmụta kweere na o nwewo ihe ịga nke ọma site n’ịbụ onye mmụta nkịtị nke Iwu ahụ gaa n’ókè nke inwe ikike ụfọdụ n’okpukpe ndị Juu. Dị ihe atụ, otu onye n’ime ha chere na Sọl pụrụ ịghọwo onye ozizi n’otu ụlọ nzukọ dị na Jerusalem. Otú ọ dị, anyị apụghị iji n’aka ihe e bu n’uche n’ịsị na Sọl ‘kwenyere’—ma ọ̀ bụ dị ka onye òtù nke ụlọikpe ma ọ bụ dị ka onye na-egosipụta nkwado agbamume ya maka ogbugbu ndị Kraịst.a
Ebe ọ bụ na site ná mmalite, ndị Kraịst nile bụ ndị Juu ma ọ bụ ndị na-eso ụzọ ndị Juu, ihe àmà na-egosi na Sọl ghọtara Iso Ụzọ Kraịst ịbụ òtù ndị si n’okpukpe ndị Juu dapụ, o lekwara ya anya dị ka ọrụ dịịrị ezigbo okpukpe ndị Juu ịgbazi ndị nọ na ya. “O yikarịghị,” ka ọkà mmụta bụ́ Arland J. Hultgren na-ekwu, “ka Pọl onye mkpagbu ọ̀ gaara emegide Iso Ụzọ Kraịst n’ihi na ọ hụrụ ya dị ka okpukpe na-abụghị okpukpe ndị Juu, nke ya na ya na-amarịta aka. Ya na ndị ọzọ aghaghị ịhụwo òtù ndị Kraịst ahụ dị ka nke ka nọ n’okpuru ịchịisi ndị Juu.” Nzube ya mgbe ahụ bụ ịmanye ndị Juu na-enupụ isi ịkwụsị nnupụisi ha ma laghachi n’okpukpe ọdịnala ndị Juu, na-eme nke ahụ n’ụzọ nile pụrụ ikwe mee. (Ọrụ 26:11) Otu ụzọ ghere oghe nye ya bụ ịtụ ha mkpọrọ. Ọzọ bụ iti ha ihe n’ụlọ nzukọ dị iche iche, bụ́ ụzọ a na-esikarị enye ahụhụ bụ́ nke a pụrụ inye n’ụlọikpe ọ bụla dị n’ógbè ahụ nke nwere ndị ọkàikpe atọ maka nnupụisi megide ọchịchị ndị rabaị.
Otú ọ dị, mpụta Jisọs pụtara n’ihu Sọl n’ụzọ Damaskọs kwụsịrị ihe ahụ nile. Na mberede, Sọl sitere n’ịbụ ajọ onye iro nke Iso Ụzọ Kraịst ghọọ onye ji ịdị uchu na-akwado ya, n’oge na-adịghịkwa nnọọ anya, ndị Juu nọ na Damaskọs nọ na-achọ igbu ya. (Ọrụ 9:1-23) N’ụzọ megidere ibe ya, dị ka onye Kraịst, Sọl gaje ịta ọtụtụ ahụhụ bụ́ nke ya onwe ya tara ndị ọzọ dị ka onye mkpagbu, nke na ọtụtụ afọ mgbe e mesịrị, ọ sịrị: “Ugbo ise ka ndị Juu pịara m otu adịghị [n’ube ụtarị iri anọ].”—2 Ndị Kọrint 11:24.
Ịnụ Ọkụ n’Obi Pụrụ Ihie Ụzọ
“Abụ m onye na-ekwulu Chineke na mbụ, bụrụkwa onye nsogbu, na onye na-eme mmadụ ihe ihere,” ka Sọl dere mgbe a tọghatasịrị ya, bụ́ mgbe a maara ya karị dị ka Pọl. “Otú ọ dị, O meere m ebere, n’ihi na emere m ya n’amaghị ama n’ime ekweghị ekwe.” (1 Timoti 1:13) Ya mere, mmadụ ịbụ onye nwere ezi nzube obi na onye dị uchu n’okpukpe ya, adịghị eme ka e jide n’aka na ọ ga-enweta nnwapụta Chineke. Sọl nụrụ ọkụ n’obi, meekwa omume dị ka akọ na uche ya si dị, ma nke ahụ emeghị ka ihe o mere zie ezi. Ịnụ ọkụ n’obi ya na-ere ka ọkụ hiere ụzọ. (Tụlee Ndị Rom 10:2, 3.) Nke ahụ kwesịrị ime ka anyị chee echiche.
Ọtụtụ ndị taa kwenyesiri ike na ihe nile Chineke na-achọ n’aka ha bụ ezi àgwà. Ma ọ̀ bụ ya? Onye ọ bụla ga-eme nke ọma ige ntị n’agbamume Pọl: “Na-anwanụ ihe nile; jidesienụ ihe ọma ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:21) Nke ahụ pụtara iwepụta oge iji nweta ezi ihe ọmụma nke Okwu eziokwu nke Chineke ma na-adịzi ndụ n’ụzọ kwekọrọ nnọọ na ya. Ọ bụrụ na anyị aghọta site n’inyocha Bible na e nwere mgbanwe ndị anyị nwere ime, mgbe ahụ anyị kwesịrị ime ha n’ụzọ nile o kwere mee n’egbughị oge. Ikekwe ole na ole n’ime anyị abụwo ndị nkwulu, ndị mkpagbu, ma ọ bụ ndị na-eme mmadụ ihe ihere ruo n’ókè Sọl bụbu. Ka o sina dị, ọ bụ nanị site n’ime omume n’ụzọ kwekọrọ n’okwukwe na ezi ihe ọmụma ka anyị pụrụ inweta ihu ọma Chineke, dị ka o nwetara.—Jọn 17:3, 17.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka akwụkwọ bụ́ The History of the Jewish People in the Age of Jesus Christ (175 B.C.–A.D. 135), nke Emil Schürer dere, si kwuo, ọ bụ ezie na Mishnah enweghị ihe ndekọ ọ bụla banyere usoro nke Sanhedrin Ukwu, ma ọ bụ Sanhedrin nke Mmadụ Iri Asaa na Otu, ji arụ ọrụ, e depụtara ndị nke Sanhedrin nta, nke nwere ndị òtù 23, n’ụzọ zuru ezu. Ndị mmụta Iwu pụrụ ịga ikpe ogbugbu ndị Sanhedrin nta na-ekpe, bụ́ ebe a na-enye ha ohere nanị maka ikwuchitere onye ahụ e boro ebubo, ọ bụghịkwa ikwugide ya. N’okwu ikpe ndị na-emetụtaghị ịda iwu na-akpata ọnwụ, ha pụrụ ime ha abụọ.