Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • fy isi 13 p. 153-162
  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa
  • Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NWEE EZI UCHE
  • KPARỊTA ESEMOKWU
  • ỊKWỤ ỤGWỌ ALỤMDI NA NWUNYE
  • IHE NDABERE BIBLE MAKA ỊGBA ALỤKWAGHỊM
  • IHE NDABERE MAKA NKEWA
  • ỤZỌ E SI ZỌPỤTA ALỤMDI NA NWUNYE TISARA ETISA
  • Otú Di na Nwunye Bụ́ Ndị Kraịst Ga-esi Na-ebi n’Udo
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Na-ele Alụmdi na Nwunye Anya Dị Ka Ihe Dị Nsọ?
    Teta!—2004
  • Na-akwanyere “Ihe Chineke Kekọtara” Ùgwù
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2018
  • Gbalịsie Ike Ka Gị Na Di Gị Ma Ọ bụ Nwunye Gị Ghara Itisa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
fy isi 13 p. 153-162

ISI NKE IRI NA ATỌ

Ọ Bụrụ na Alụmdi na Nwunye Na-achọ Itisa

1, 2. Mgbe alụmdi na nwunye nọ ná nrụgide, ajụjụ dị aṅaa ka e kwesịrị ịjụ?

NA 1988 otu nwanyị Itali aha ya bụ Lucia nwere oké ịda mba n’obi.a Mgbe afọ iri gasịrị alụmdi na nwunye ya na-abịaru njedebe. Ọtụtụ mgbe ọ gbalịwo ime ka ya na di ya dịghachi ná mma, ma o nweghị nnọọ isi. Ya mere o kewapụrụ n’ihi ekwekọghị ekwekọ ma na-eche ihu ugbu a ịzụlite ụmụ ada abụọ nanị ya. Ileghachi anya azụ n’oge ahụ, Lucia na-echeta: “O doro m anya na ọ dịghị ihe pụrụ ịzọpụta alụmdi na nwunye anyị.”

2 Ọ bụrụ na ị na-enwe nsogbu alụmdi na nwunye, ị pụrụ ịghọta ọnọdụ Lucia. Alụmdi na nwunye gị pụrụ ịnọ ná nsogbu, ị pụkwara ịdị na-eche ma à ka pụrụ ịzọpụta ya. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, ị ga-ahụ na ọ bụ ihe enyemaka ịtụle ajụjụ a: Àgbasowo m okwu ndụmọdụ ọma nile Chineke nyeworo n’ime Bible iji nye aka ime ka alụmdi na nwunye gaa nke ọma?—Abụ Ọma 119:105.

3. Ọ bụ ezie na ịgba alụkwaghịm na-ewuzi ewu, mmeghachi omume dị aṅaa ka a kọrọ n’etiti ọtụtụ ndị gbara alụkwaghịm na ezinụlọ ha?

3 Mgbe ọnọdụ tara akpụ n’etiti di na nwunye, ịtọsa alụmdi na nwunye ahụ pụrụ iyi ụzọ kasị mfe isi mee ihe. Ma, ọ bụ ezie na ọtụtụ mba enwewo ịrị elu dị egwu n’ezinụlọ ndị tisara etisa, ihe ọmụmụ ndị ọhụrụ na-egosi na pasent dị ukwuu nke ndị ikom na ndị inyom gbara alụkwaghịm na-akwa ụta maka ntisa ahụ. Ụfọdụ na-enwe nsogbu ahụ ike ka ukwuu, ma n’anụ ahụ ma n’uche, karịa ndị nọgidere n’alụmdi na nwunye ha. Mgbagwoju anya na enweghị obi ụtọ nke ụmụ nke ndị gbara alụkwaghịm na-adịgidekarị ruo ọtụtụ afọ. Nne na nna na ndị enyi ezinụlọ ahụ tisara etisa na-atakwa ahụhụ. Gịnịkwa banyere ụzọ Chineke, Onye Mmalite nke alụmdi na nwunye, si ele ọnọdụ ahụ anya?

4. Olee otú e kwesịrị isi dozie nsogbu dị iche iche n’ezinụlọ?

4 Dị ka a rịbara ama n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ, Chineke zubere na alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ nkekọ na-adịru ogologo ndụ dum. (Jenesis 2:24) Mgbe ahụ, n’ihi gịnị ka ọtụtụ alụmdi na nwunye ji na-etisa? O nwere ike ọ gaghị eme n’otu ntabi anya. A na-enwekarị ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị. Nsogbu ndị dị nta n’alụmdi na nwunye pụrụ ịnọ na-ebuwanye ibu ruo mgbe ha yiri ihe a na-apụghị imeri emeri. Ma ọ bụrụ na e doziri nsogbu ndị a ngwa ngwa site n’enyemaka Bible, a pụrụ igbochi ọtụtụ ntisa alụmdi na nwunye.

NWEE EZI UCHE

5. Olee ọnọdụ bụ ezie e kwesịrị iche ihu n’alụmdi na nwunye ọ bụla?

5 Otu ihe na-eduba mgbe ụfọdụ ná nsogbu bụ atụmanya ezi uche na-adịghị ya nke otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ahụ nọ n’alụmdi na nwunye pụrụ inwe. Akwụkwọ ọgụgụ ịhụnanya, magazin ndị a ma ama, usoro ihe omume telivishọn, na sinima pụrụ ime ka e nwee olileanya na nrọ ndị na-apụghị ime eme. Mgbe nrọ ndị a na-emezughị, ọ pụrụ ịdị mmadụ ka a ghọgburu ya, ọ ghara inwe afọ ojuju, ọbụna nwee obi ilu. Ma, olee otú mmadụ abụọ na-ezughị okè pụrụ isi chọta obi ụtọ n’alụmdi na nwunye? Ọ na-ewe ọrụ iji nweta mmekọrịta na-aga nke ọma.

6. (a) Echiche ziri ezi dị aṅaa banyere alụmdi na nwunye ka Bible na-enye? (b) Olee ihe ụfọdụ na-akpata esemokwu n’alụmdi na nwunye?

6 Bible dị irè. Ọ na-akwado ọṅụ nke alụmdi na nwunye, ma ọ na-adọkwa aka ná ntị na ndị lụrụ “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ ha.” (1 Ndị Kọrint 7:28) Dị ka a rịbawororịị ama, ma di ma nwunye ezughị okè, ha na-adabakwa ná mmehie. Ọdịdị uche na mmetụta uche na nzụlite nke onye nke ọ bụla dị iche. Di na nwunye na-ese okwu mgbe ụfọdụ banyere ego, ụmụ, na ndị ọgọ. Oge na-ezughị ezu imekọ ihe ọnụ na nsogbu mmekọahụ pụkwara ịbụ isi iyi nke esemokwu.b Ọ na-ewe oge idozi okwu dịgasị otú ahụ, ma obi sie gị ike! Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị di na nwunye na-enwe ike iche nsogbu ndị dị otú ahụ ihu ma wepụta ihe ngwọta e kwekọrịtara ọnụ.

KPARỊTA ESEMOKWU

Foto dị na peeji nke 154

Dozie nsogbu ngwa ngwa. Ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu

7, 8. Ọ bụrụ na e nwere mmejọ ma ọ bụ nghọtahie n’etiti di na nwunye, olee ụzọ Akwụkwọ Nsọ isi dozie ha?

7 Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịnọgide jụụ mgbe ha na-akparịta mkpasu iwe, nghọtahie, ma ọ bụ ọdịda onwe onye. Kama ikwu n’ụzọ kwụ ọtọ sị: “Ọ dị m ka a ghọtahiere m,” di ma ọ bụ nwunye pụrụ inwe oké mmetụta uche ma mee ka okwu ahụ gabiga otú ọ dị. Ọtụtụ ga-asị: “Ị na-echere nanị onwe gị,” ma ọ bụ, “Ị hụghị m n’anya.” N’achọghị ịbanye n’arụmụka, onye nke ọzọ pụrụ ịjụ ịzaghachi.

8 Ụzọ ka mma ịgbaso bụ ịṅa ntị na ndụmọdụ Bible bụ́: “Unu emehiela mgbe unu na-ewe iwe: ekwela anyanwụ daa ná mkpasu iwe unu.” (Ndị Efesọs 4:26) Otu di na nwunye na-enwe obi ụtọ, mgbe ha na-eru ememe 60 afọ nke agbamakwụkwọ ha, ka a jụrụ isi ihe dị n’alụmdi na nwunye ha na-aga nke ọma. Di ahụ kwuru, sị: “Anyị mụtara ịhapụ ịlakpu ụra n’edozighị esemokwu anyị, n’agbanyeghị otú ha si dị nta.”

9. (a) Gịnị ka a kọwara n’Akwụkwọ Nsọ dị ka akụkụ dị mkpa nke nkwurịta okwu? (b) Gịnị na-adị di na nwunye mkpa ime ọtụtụ mgbe, ọbụna ma a sị na nke a na-ewe obi ike na obi umeala?

9 Mgbe di na nwunye sere okwu, ọ dị onye nke ọ bụla mkpa ‘ịnụ ihe ọsọ ọsọ, ghara ịdị ngwa ikwu okwu, gharakwa ịdị ngwa iwe iwe.’ (Jemes 1:19) Mgbe e gesịrị ntị nke ọma, ha abụọ pụrụ ịhụ mkpa ịrịọ mgbaghara. (Jemes 5:16) Iji obi eziokwu sị, “Ndo maka imejọ gị,” na-ewe obi umeala na obi ike. Ma idozi esemokwu nile n’ụzọ a ga-eme ihe dị ukwuu n’inyere di na nwunye aka ọ bụghị nanị idozi nsogbu ha kamakwa iwulite ikpo ọkụ na ịdị nso nke ga-eme ka ha nwetakwuo ihe ụtọ n’ịnọnyere ibe ha.

ỊKWỤ ỤGWỌ ALỤMDI NA NWUNYE

10. Olee ihe nchebe Pọl tụụrụ ndị Kraịst na Kọrint aro ya nke pụrụ imetụta onye Kraịst taa?

10 Mgbe Pọl onyeozi degaara ndị Kọrint akwụkwọ, ọ tụrụ aro alụmdi na nwunye “n’ihi ịkwa iko nile.” (1 Ndị Kọrint 7:2) Ụwa taa dị njọ ka, ma ọ bụ ọbụna karịa, Kọrint oge ochie. Isiokwu omume rụrụ arụ ndị ụwa na-asaghepụ ọnụ na-akparịta, ụzọ na-adịghị mma ha si eji ejiji, na akụkọ ndị na-akpali akpali a na-ewepụta na magazin na akwụkwọ, na TV, na na sinima, ha nile jikọrọ aka na-akpalite agụụ mmekọahụ iwu na-akwadoghị. Nye ndị Kọrint bi n’ọnọdụ yiri nke ahụ, Pọl onyeozi sịrị: “Ịlụ di na nwunye ka ire ọkụ n’agụụ ahụ mma.”—1 Ndị Kọrint 7:9.

11, 12. (a) Gịnị ka di na nwunye ji ibe ha ụgwọ ya, ná mmụọ dị aṅaa ka e kwesịkwara ịkwụ ya? (b) Olee otú e kwesịrị isi dozie ọnọdụ ahụ ma ọ bụrụ na a gaje ịhapụtụ ụgwọ alụmdi na nwunye ahụ ruo nwa oge?

11 Ya mere, Bible na-enye ndị Kraịst lụrụ di na nwunye iwu, sị: “Ka di kwụghachi nwunye ya ụgwọ o ji ya: otú a kwa ka nwunye kwụghachikwa di ya ụgwọ o ji ya.” (1 Ndị Kọrint 7:3) Rịba ama na ihe e mesiri ike bụ inye ihe—ọ bụghị ịnara ihe. Ịdị nso anụ ahụ n’alụmdi na nwunye na-eju afọ n’ezie nanị ma onye nke ọ bụla na-echegbu banyere ọdịmma onye nke ọzọ. Dị ka ihe atụ, Bible na-enye ndị bụ di iwu imeso nwunye ha “n’ụzọ ihe ọmụma.” (1 Pita 3:7) Nke a bụ nnọọ eziokwu n’inye na ịnara ụgwọ alụmdi na nwunye. Ọ bụrụ na e mesoghị nwunye n’ụzọ dị nro, ọ pụrụ isiri ya ike ịnụ ụtọ akụkụ a nke alụmdi na nwunye.

12 E nwere oge mgbe ọ pụrụ ịdị di na nwunye mkpa ịnapụ onwe ha ụgwọ alụmdi na nwunye. Nke a pụrụ ịbụ eziokwu banyere nwunye n’oge ụfọdụ kpọmkwem n’ime ọnwa ma ọ bụ mgbe oké ike gwụrụ ya. (Tụlee Levitikọs 18:19.) Ọ pụrụ ịbụ eziokwu banyere di mgbe ọ na-eche nsogbu siri ike n’ụlọ ọrụ ihu ma ọ bụ bụrụ onye ike gwụkasịrị ahụ ná mmetụta uche. A na-ahụ maka oge ndị ahụ nke nkwụsịtụ nwa oge n’ịkwụ ụgwọ alụmdi na nwunye n’ụzọ kasị mma ma ọ bụrụ na mmadụ abụọ ahụ ejiri obi eziokwu tụlee ọnọdụ ahụ ma nwee “otu olu.” (1 Ndị Kọrint 7:5) Nke a ga-egbochi nke ọ bụla n’ime ha ịmaga ná nkwubi okwu na-ezighị ezi. Ma, ọ bụrụ na nwunye akpachara anya na-awọ ya di ya ma ọ bụ di amara ụma na-ajụ ịkwụ ụgwọ alụmdi na nwunye n’ụzọ ịhụnanya, a pụrụ ikpughepụ onye nke ọzọ ahụ nye ọnwụnwa. N’ọnọdụ dị otú ahụ, nsogbu pụrụ ibilite n’alụmdi na nwunye.

13. Olee otú ndị Kraịst pụrụ isi rụọ ọrụ iji debe echiche ha ọcha?

13 Dị ka ndị Kraịst nile, ndị di na nwunye na-ejere Chineke ozi aghaghị izere ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ, bụ́ ndị pụrụ ime ka e nwee ọchịchọ ndị na-adịghị ọcha na ndị na-ekwekọghị n’okike. (Ndị Kọlọsi 3:5) Ha aghaghịkwa iche echiche na omume ha nche mgbe ha na-emeso ndị nile na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ha ihe. Jisọs doro aka ná ntị, sị: “Nwoke ọ bụla nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ọ kwasịwo ya iko n’obi ya ugbu a.” (Matiu 5:28) Site n’itinye ndụmọdụ Bible banyere mmekọahụ n’ọrụ, ndị di na nwunye kwesịrị inwe ike izere ịdaba n’ọnwụnwa na ịkwa iko. Ha pụrụ ịnọgide na-enwe ịnọ nso na-atọ ụtọ n’alụmdi na nwunye ebe e ji mmekọahụ kpọrọ ihe dị ka onyinye ọma sitere n’aka Onye Mmalite alụmdi na nwunye, bụ́ Jehova.—Ilu 5:15-19.

IHE NDABERE BIBLE MAKA ỊGBA ALỤKWAGHỊM

14. Ọnọdụ dị aṅaa dị mwute na-apụta mgbe ụfọdụ? N’ihi gịnị?

14 Ọ bụ ihe obi ụtọ na n’ọtụtụ alụmdi na nwunye ndị Kraịst, a pụrụ idozi nsogbu ọ bụla bilitere. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ naghị adị otú ahụ. N’ihi na ụmụ mmadụ ezughị okè ma biri n’ụwa mmehie nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan, alụmdi na nwunye ụfọdụ na-eru ebe ọ ga-ekewa. (1 Jọn 5:19) Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi chee ọnọdụ dị otú ahụ siri ike ihu?

15. Olee nanị ndabere Akwụkwọ Nsọ e nwere maka ịgba alụkwaghịm nke na-enye ohere nlụgharị? (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ jiworo kpebie megide ịgba di ma ọ bụ nwunye na-ekwesịghị ntụkwasị obi alụkwaghịm?

15 Dị ka e kwuru n’Isi nke 2 nke akwụkwọ a, ịkwa iko bụ nanị ihe ndabere Akwụkwọ Nsọ maka ịgba alụkwaghịm na-enye ohere maka nlụgharị.c (Matiu 19:9) Ọ bụrụ na i nwere ihe nnwapụta doro anya na di ma ọ bụ nwunye gị abụwo onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi, mgbe ahụ ị na-eche mkpebi siri ike ihu. Ị̀ ga-anọgide n’alụmdi na nwunye ahụ ka ị̀ ga-agba alụkwaghịm? Ọ dịghị iwu e tiri. Ụfọdụ ndị Kraịst agbagharawo kpam kpam di ma ọ bụ nwunye nke chegharịrịnụ n’ezie, alụmdi na nwunye ahụ e chebere agawokwa nke ọma. Ndị ọzọ ekpebiwo megide ịgba alụkwaghịm n’ihi ụmụaka.

16. (a) Olee ihe ụfọdụ kpaliworo ụfọdụ ịgba di ma ọ bụ nwunye ha mehierenụ alụkwaghịm? (b) Mgbe di ma ọ bụ nwunye aka ya dị ọcha mere mkpebi ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ ịhapụ ịgba, n’ihi gịnị ka ọ na-adịghị onye kwesịrị ịkatọ mkpebi onye ahụ?

16 N’aka nke ọzọ, omume mmehie ahụ pụrụ ịkpatawo ntụrụ ime ma ọ bụ ọrịa a na-ebufe ná mmekọahụ. Ma ọ bụ ikekwe ọ pụrụ ịdị mkpa ichebe ụmụaka pụọ n’aka nne ma ọ bụ nna na-emetọ emetọ n’ụzọ mmekọahụ. O doro anya na e nwere ihe dị ukwuu ịtụle tupu e mee mkpebi. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ị mata banyere ekwesịghị ntụkwasị obi nke di ma ọ bụ nwunye gị ma mesịa maliteghachi iso ya nwee mmekọahụ, i si otú ahụ egosi na ị gbagharawo di ma ọ bụ nwunye gị na ị chọkwara ịnọgide n’alụmdi na nwunye ahụ. Ihe ndabere maka ịgba alụkwaghịm nke na-enye ohere Akwụkwọ Nsọ ịlụgharị adịkwaghị. Ọ dịghị onye kwesịrị ịbụ onye na-etinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ya ma na-agbalị ịgwa gị ihe ị ga-ekpebi, ọ dịghịkwa onye kwesịrị ịkatọ mkpebi gị mgbe i mere ya. Ị gaje iburu ihe ndị sitere n’ihe i kpebiri. “Mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.”—Ndị Galetia 6:5.

IHE NDABERE MAKA NKEWA

17. Ma e nweghị ịkwa iko, olee ókè Akwụkwọ Nsọ kpaara nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm?

17 È nwere ọnọdụ ndị pụrụ ịkwado nkewa ma ọ bụ ma eleghị anya ịgba di ma ọ bụ nwunye alụkwaghịm ọbụna ma onye ahụ akwabeghị iko? Ee, ma n’ọnọdụ dị otú ahụ, onye Kraịst enwereghị onwe ya ịchọrọ onye ọzọ na-eburu nlụgharị n’uche. (Matiu 5:32) Bible, ọ bụ ezie na o nyere ohere maka nkewa dị otú ahụ, setịpụrụ na onye nke na-ekewapụ kwesịrị ‘ịnọgide n’enweghị di; ma o meghị otú a, ka e mee ka ya na di ya dị n’otu.’ (1 Ndị Kọrint 7:11) Olee ọnọdụ ụfọdụ jọgburu onwe ha pụrụ ime ka nkewa yie ihe amamihe dị na ya?

18, 19. Olee ọnọdụ ụfọdụ gabigara ókè nke pụrụ iduba di ma ọ bụ nwunye ịtụle amamihe nke nkewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm nke iwu kwadoro, ọ bụ ezie na nlụgharị agaghị ekwe omume?

18 Ezinụlọ pụrụ ịghọ nke ọ na-enweghị ka ọ hà ya n’ihi umengwụ na àgwà ọjọọ nke di.d Ọ pụrụ ịgbafusi ihe ezinụlọ na-akpata na chaa chaa ma ọ bụ jiri ya na-akwado iri ahụ nke ọgwụ ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya. Bible na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebughị ụzọ cheere . . . ndị ezinụlọ nke aka ya, ọ gọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.” (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na nwoke dị otú ahụ ajụ ịgbanwe ụzọ ya, ikekwe ọbụna na-akwụ ụgwọ àgwà ọjọọ ya site n’iwere ego nwunye ya na-arụta, nwunye ahụ pụrụ ịhọrọ ichebe ọdịmma ya na nke ụmụ ya site n’inweta nkewa nke iwu kwadoro.

19 A pụkwara ịtụle ime ihe usoro iwu dị otú ahụ ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-emeso onye nke ọzọ ihe ike gabiga ókè, ikekwe na-eti onye ahụ ihe ruo n’ókè nke na ahụ ike na ọbụna ndụ nọ n’ihe ize ndụ. Tụkwasịkwa, ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-anwa ugboro ugboro ịmanye di ma ọ bụ nwunye imebi iwu Chineke n’ụzọ ụfọdụ, onye nke a na-eyi egwu pụrụ ịtụle nkewa, karịsịa ma ọ bụrụ na okwu eruo n’ókè nke na ndụ ime mmụọ nọ n’ihe ize ndụ. Onye nke nọ n’ihe ize ndụ pụrụ ikpebi na nanị ụzọ e nwere isi ‘kwenyere Chineke karịa mmadụ’ bụ inweta nkewa nke iwu kwadoro.—Ọrụ 5:29.

20. (a) N’ọnọdụ nke ntisa ezinụlọ, gịnị ka ndị enyi tozuru okè na ndị okenye pụrụ inye, gịnịkwa ka ha na-ekwesịghị inye? (b) Ndị di na nwunye ekwesịghị iji aha Bible kpọtụgasịrị nkewa na ịgba alụkwaghịm dị ka ihe ngọpụ ime gịnị?

20 N’ọnọdụ nile nke itibiga di ma ọ bụ nwunye ihe ókè, ọ dịghị onye kwesịrị ịrụgide onye nke aka ya dị ọcha ikewapụ ma ọ bụ iso onye nke ọzọ nọgide. Ọ bụ ezie na ndị enyi tozuru okè na ndị okenye pụrụ inye nkwado na ndụmọdụ dabeere na Bible, ndị a apụghị ịma ihe nile na-aga n’etiti di na nwunye. Nanị Jehova pụrụ ịhụ nke ahụ. N’ezie, nwunye bụ́ onye Kraịst agaghị na-asọpụrụ ndokwa alụmdi na nwunye nke Chineke ma o jiri ihe ngọpụ na-enweghị isi hapụ alụmdi na nwunye. Ma ọ bụrụ na ọnọdụ dịbigara ize ndụ ókè adịgide, ọ dịghị onye kwesịrị ịkatọ ya ma ọ họrọ ikewapụ. A pụrụ ikwu otu ihe ahụ kpọmkwem banyere di bụ́ onye Kraịst nke na-achọ nkewa. “Anyị nile ga-eguzo n’ihu oche ikpe Chineke.”—Ndị Rom 14:10.

ỤZỌ E SI ZỌPỤTA ALỤMDI NA NWUNYE TISARA ETISA

21. Olee ahụmahụ na-egosi na ndụmọdụ Bible maka alụmdi na nwunye dị irè?

21 Ọnwa atọ mgbe Lucia, nke a kpọtụrụ aha na mbụ, kewapụsịrị n’ebe di ya nọ, o zutere Ndịàmà Jehova ma malite iso ha na-amụ Bible. “N’oké ijuanya nye m,” ka ọ na-akọwa, “Bible nyere ihe ngwọta ndị dị irè maka nsogbu m. Mgbe nanị otu izu nke ọmụmụ ihe gasịrị, m chọrọ ozugbo iso di m birikwa. Taa apụrụ m ikwu na Jehova maara ụzọ isi zọpụta alụmdi na nwunye ndị nọ n’ọgba aghara n’ihi na nkụzi ya na-enyere ndị di na nwunye aka ịmụta ụzọ isi were ibe ha n’onye dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụghị eziokwu, dị ka ụfọdụ na-ekwu, na Ndịàmà Jehova na-ekewa ezinụlọ. N’ọnọdụ nke m, kpọmkwem ihe megidere nke ahụ mere.” Lucia mụtara itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ya.

22. Na gịnị ka ndị di na nwunye nile kwesịrị inwe obi ike?

22 Ọnọdụ Lucia apụghị iche. Alụmdi na nwunye kwesịrị ịbụ ngọzi, ọ bụghị ibu arọ. N’ihi nke ahụ, Jehova ewepụtawo isi iyi kachasị mma nke ndụmọdụ alụmdi na nwunye e detụworo—Okwu ya dị oké ọnụ ahịa. Bible pụrụ ime ka “onye na-enweghị uche mara ihe.” (Abụ Ọma 19:7-11) Ọ zọpụtawo ọtụtụ alụmdi na nwunye na-achọ itisa, o mewokwa ka ọtụtụ ndị ọzọ nwere nsogbu ndị siri ike ka mma. Ka ndị di na nwunye nile nwee obi ike zuru ezu na ndụmọdụ alụmdi na nwunye Jehova Chineke na-enye. Ọ dị irè n’ezie!

a A gbanwewo aha ya.

b A tụlere ụfọdụ n’ime akụkụ ndị a n’isiakwụkwọ ndị bu ụzọ.

c Okwu Bible a sụgharịrị “ịkwa iko” gụnyere ịkwa iko di na nwunye, ndina ụdị onwe, ndina anụmanụ, na ihe ndị ọzọ megidere iwu a kpachara anya mee nke metụtara iji akụkụ ahụ mmekọahụ eme ihe.

d Nke a agụnyeghị ọnọdụ ebe di, ọ bụ ezie na o bu ezi ihe n’uche, enweghị ike igbo mkpa ezinụlọ ya n’ihi ihe ndị karịrị ya ike, dị ka ọrịa ma ọ bụ ụkọ nke ohere ọrụ.

OLEE OTÚ ỤKPỤRỤ BIBLE NDỊ A PỤRỤ ISI . . . NYE AKA IZERE NTISA NKE ALỤMDI NA NWUNYE?

Alụmdi na nwunye bụ isi iyi nke ma ọṅụ ma mkpagbu.—Ilu 5:18, 19; 1 Ndị Kọrint 7:28.

E kwesịrị idozi esemokwu ozugbo.—Ndị Efesọs 4:26.

Ná mkparịta ụka, ige ntị dị mkpa dịkwa ka ikwu okwu.—Jemes 1:19.

E kwesịrị ịkwụ ụgwọ alụmdi na nwunye ná mmụọ nke achọghị ọdịmma onwe onye nanị na ịdị nro.—1 Ndị Kọrint 7:3-5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya