Nọgidenụ Na-achọ Alaeze Ahụ na Ezi Omume Chineke
“Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—MATIU 6:33.
1, 2. Gịnị ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii mere ka ihe omume ndị dị mma n’onwe ha ghọọ, ịdọ aka ná ntị dịkwa aṅaa ka Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?
NDỊ odeakwụkwọ na ndị Farisii chọrọ ezi omume n’ụzọ nke aka ha, nke na-abụghị ụzọ nke Chineke. Ọ bụghị nanị nke ahụ, kama mgbe ha mere ihe ndị dị mma n’onwe ha, ha na-eme ka ihe ndị a ghọọ ihe omume ihu abụọ ndị a na-eme ka ndị mmadụ wee hụ ha. Ọ bụghị Chineke ka ha na-ejere ozi, kama ọ bụ oké mpako nke onwe ha. Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị megide omume ihu abụọ dị otú ahụ, sị: “Lezienụ anya ka unu ghara ime ezi omume unu n’ihu mmadụ, ka ha wee kirie unu: ma unu emeghị otú a unu enweghị ụgwọ ọrụ n’ebe Nna unu nke bi n’eluigwe nọ.”—Matiu 6:1.
2 Jehova nwere mmasị n’ebe ndị na-enye ndị ogbenye ihe nọ—ma ọ bụghị ndị ahụ na-enye ihe dị ka ndị Farisii si enye. Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị megide iṅomi ha, sị: “Ya mere, mgbe ọ bụla ị na-arụ ọrụ ebere, afụla opi n’ihu gị, ọbụna dị ka ndị ihu abụọ na-eme n’ụlọ nzukọ unu na n’ụzọ unu, ka ha wee nara otuto n’aka mmadụ. N’ezie asị m unu, Ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha.”—Matiu 6:2.
3. (a) N’uzọ dị aṅaa ka e si kwụzuo ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ụgwọ maka onyinye ihe ha? (b) Olee ụzọ ọnọdụ Jisọs n’ihe banyere inye ihe si dị iche?
3 Okwu Grik dịịrị “ha na-enwezu” (a-pe’kho) bụ okwu na-apụtakarịbu n’akwụkwọ risit azụmahia. Ojiji e jiri ya mee ihe n’Ozizi Elu Ugwu ahụ na-egosi na “ha anatawo ụgwọ ọrụ ha,” ya bụ, “ha abịanyewo aka n’akwụkwọ na-egosi na ha anatawo ụgwọ ọrụ ha: ha ejiriwo ihe ahụ ruuru ha ịnata ụgwọ ọrụ ha mee ihe, kpọmkwem dị ka à ga-asị na ha enyewo risit nke na-egosi na ha anatawo ya.” (An Expository Dictionary of New Testament Words, nke W. E. Vine dere) A na-ekwupụta onyinye a na-enye ndị ogbenye n’ihu ọha n’okporo ámá dị iche iche. A na-ama ọkwa ndị nyere onyinye n’ụlọ nzukọ dị iche iche. A na-akwanyere ndị nyere ego buru ibu ùgwù pụrụ iche site n’inye ha oche n’akụkụ ndị rabaị n’oge nnọkọ ofufe. Ha nyere ihe ka ndị mmadụ wee hụ ha; ndị mmadụ hụrụ ha, nyekwa ha otuto; n’ihi ya, ha pụrụ ịkụ stamp n’akwụkwọ risit maka ụgwọ ọrụ nke sitere n’ihe ha nyere, sị, “A Kwụzuwo Ya.” Lee nnọọ otú ọnọdụ nke Jisọs si dị iche! Nye ihe “na nzuzo: Nna gị nke na-ahụ ihe na nzuzo ga-enyeghachikwa gị.”—Matiu 6:3, 4; Ilu 19:17.
Ekpere Ndị Na-enye Chineke Obi Ụtọ
4. N’ihi gịnị ka ekpere ndị Farisii na-ekpe ji mee ka Jisọs kpọọ ha ndị ihu abụọ?
4 Jehova nwere mmasị n’ekpere ndị e kpegaara ya—ma ọ bụghị dị ka ndị Farisii si ekpe ekpere. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpekwa ekpere, unu agaghị adị ka ndị ihu abụọ ahụ: n’ihi na ọ na-atọ ha ụtọ iguzo n’ụlọ nzukọ unu na nkuku ámá unu ikpe ekpere, ka ha wee were onwe ha gosi mmadụ. N’ezie asị m unu, Ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha.” (Matiu 6:5) Ndị Farisii nwere ọtụtụ ekpere ndị a ga na-agụghachi kwa ụbọchị, n’oge dị iche iche a kara aka, n’agbanyeghị ebe ha nọ. Dị ka ụkpụrụ ozizi ihe ha si dị, ha kwesịrị ikpe ekpere ndị ahụ na nzuzo. Ma dị ka atụmatụ ha si dị, ọ na-adaba nnọọ na ha na-anọ “na nkuku ámá” nile, ebe ndị na-agafe agafe n’akụkụ anọ dum ga-ahụzu ha anya, mgbe oge hour ikpe ekpere ruru.
5. (a) Ihe omume ndị ọzọ dị aṅaa mere ka Chineke ghara ịdị na-anụ ekpere ndị Farisii? (b) Olee ihe ndị Jisọs debere n’ọnọdu mbụ n’ekpere nlereanya ya ahụ, ndị mmadụ taa hà kwenyekwara na nke ahụ?
5 Ná ngosipụta nke ịdị nsọ ụgha, ha “na-ekpekwa ogologo ekpere ka mmadụ wee hụ ha anya.” (Luk 20:47) Otu omenala a kụziri n’okwu ọnụ sịrị: “Ndị nsọ nke oge ochie na-echere otu hour tupu ha enwee ike ikpe Tefillah [ekpere] ahụ.” (Mishnah) Mgbe ahụ, a ga-ejideworị n’aka na mmadụ nile ahụzuwo omume nsọ nsọ ha, ibubo anwụọkwa ha n’ahụ n’ihi ya! Ekpere ndị ahụ adịghị arịgo elu karịa ebe isi ha dị. Jisọs kwuru ka a na-ekpe ekpere na nzuzo, n’enweghị nkwughachi okwu na-enweghị isi, o nyekwara ha ihe nlereanya dị mfe. (Matiu 6: 6-8; Jọn 14:6,14; 1 Pita 3:12) Ekpere nlereanya nke Jisọs debere ihe ndị mbụ n’ọnọdụ kwesịịrị ha: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ.” (Matiu 6:9-13) Ọ bụghị ọtụtụ mmadụ taa maara aha Chineke, ya fọdụkwa ịchọ ka e doo ya nsọ. Ha si otú a na-eme ka ọ bụrụ chi nke na-enweghị aha. Ka Alaeze Chineke bịa? Ọtụtụ ndị na-eche na ọ bịaworị, na ọ dị n’ime obi ha. Ha pụrụ ikpe ekpere ka e mee ihe ọ na-achọ, ma ihe ka ọtụtụ na-eme ihe ha onwe ha na-achọ.—Ilu 14:12.
6. N’ihi gịnị ka Jisọs ji katọọ obubuọnụ ndị Juu dị ka ihe na-abaghị uru ọ bụla?
6 Jehova na-anakwere ibu ọnụ—ma ọ bụghị n’ụzọ ahụ ndị Farisii si mee ya. Dị ka o mere n’ihe banyere inye onyinye ebere na ikpe ekpere nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, Jisọs katọkwara obubuọnụ ha dị ka ihe na-abaghị uru ọ bụla: “Mgbe ọ bụla unu na-ebu ọnụ, unu aghọla ndị na-agbarụ ihu, dị ka ndị ihu abụọ: n’ihi na ha na-emebi ihu ha, ka ha were onwe ha gosi mmadụ na ha na-ebu ọnụ. N’ezie asị m unu, Ha na-enwezu ụgwọ ọrụ ha.” (Matiu 6:16) Omenala ha kwuru na n’oge obubuọnụ, ndị Farisii ahụ agaghị asa ahụ ma ọ bụ tee onwe ha mmanụ, kama ha ga-eji ntụ kpokwasị onwe ha n’isi. Mgbe ha na-adịghị ebu ọnụ, ndị Juu na-asa ahụ ha mgbe mgbe, na-etekwa mmanụ n’ahụ ha.
7. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị isi duzie onwe ha mgbe ha na-ebu ọnụ? (b) N’ihe banyere obubuọnụ, gịnị ka Jehova chọrọ n’oge Aịsaịa?
7 N’ihe banyere obubuọnụ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Were mmanụ tee n’isi gị, saakwa ihu gị; ka ị ghara igosi mmadụ onwe gị na ị na-ebu ọnụ, kama gosi Nna gị.” (Matiu 6: 17, 18) N’oge Aịsaịa, ndị Juu daghachiri azụ na-enwe ọṅụ n’obubuọnụ ha, na-eweda mkpụrụ obi ha n’ala, na-ehudata isi ha ala, na-anọdụkwa n’ákwà mkpé na ntụ. Ma Jehova chọrọ ka ha tọhapụ ndị a na-akpagbu, nyejuo ndị nọ n’agụụ afọ, nye ndị na-enweghị ebe obibi ụlọ, gbokwasịkwa ndị gba ọtọ uwe.—Aịsaịa 58:3-7.
Kpakọba Akụ n’Eluigwe
8. Gịnị mere ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii lefuru ụzọ ha ga-esi nweta nnwapụta Chineke anya, ọ̀ bụkwa ụkpụrụ dị aṅaa nke Pọl mesịrị kwupụta ka ha lefuuru anya?
8 Ná nchụso ha na-achụso ezi omume, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii lefuuru ụzọ e si enweta nnwapụta nke Chineke anya ma lekwasị anya n’ọjịja mma nke mmadụ. Ha kwere ka omenala mmadụ rikpuo ha nke ukwuu nke na ha wezụgara Okwu Chineke e dere ede n’ụsọ. Ha tụkwasịrị obi ha n’ọnọdụ nke elu ala karịa n’akụ nke eluigwe. Ha lefuuru otu eziokwu dị mfe anya, nke otu onye bụbu onye Farisii ma mesịa ghọọ ọnye Kraịst dere mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, sị: “Ihe ọ bụla unu na-eme, na-arụnụ ọrụ site ná mkpụrụ obi unu, dị ka ùnu na-arụrụ [Jehova, NW] ọrụ, ọ bụghịkwa mmadụ; ebe unu matara na ọ bụ n’aka [Jehova, NW] ka unu ga-anata ihe nnyeghachi unu, bụ ihe nketa ahụ.”—Ndị Kọlọsi 3:23, 24.
9. Ihe dịgasị aṅaa pụrụ itinye akụ a kpadoro n’elu ala n’ihe ize ndụ, gịnịkwa ga-echebe akụ nke bụ ezie?
9 Jehova nwere mmasị ná nsọpụrụ ị na-enye ya, ọ bụghị n’ego ole i nwere n’ụlọ akụ. Ọ maara na obi gị dị n’ebe akụ gị dị. Nlá na nchara hà pụrụ irichapụ akụ gị? Ndị ohi hà pụrụ igwupu mgbidi ájá ma zuru ya? Ka ọ̀ bụ, n’oge a nke ọnọdụ akụ na ụba a na-ejighị n’aka, oké ịrị elu nke ọnụ ahịa ọ̀ pụrụ ime ka ike o nwere ịzụta ihe dalata, ka ndakpọ nke ahịa ndị ụlọ ọrụ ọ̀ pụrụ ikpochapụ ya? Oké ịrị elu e nwere n’imempụ ọ̀ ga-eme ka e zuru akụ gị? Ọ gaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na a kpadoro ha n’eluigwe. Ọ gaghị adị otú ahụ ma ọ bụrụ na anya gị—nke bụ oriọna nke na-enye ahụ gị dum ìhè—dị mfe, bụrụ nke e lekwasịrị n’Alaeze Chineke na ezi omume ya. Akụ maara otú e si apụ n’anya ngwa ngwa. “Adọgbula onwe gị n’ọrụ ịbụ ọgaranya; site ná nghọta gị haa ya aka. Ị̀ ga-atụkwasị anya gị abụọ na ya? Ọ dịghịkwa: n’ihi na akụ na-emere onwe ya nkù n’ezie, dị ka ugo ka ọ na-efesị n’eluigwe.” (Ilu 23:4, 5) Ya mere, n’ihi gịnị ka ị ga-eji kwere ka ụra chuo gị n’ihi ihe onwunwe? “Afọ ojuju nke ọgaranya adịghị ekwe ya arahụ ụra.” (Eklisiastis 5:12) Cheta ịdọ aka ná ntị Jisọs: “Unu apụghị ịbụ ohu Chineke na akụ.”—Matiu 6:19-24.
Okwukwe nke Na-achụsa Nchegbu
10. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa itinye okwukwe gị n’ebe Chineke nọ kama itinye ya n’ihe onwunwe a na-ahụ anya, ndụmọdụ dịkwa aṅaa ka Jisọs nyere?
10 Jehova chọrọ ka i nwee okwukwe n’ebe ọ nọ, ọ bụghị n’ebe ihe onwunwe a na-ahụ anya dị. “Ma a sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na ọ dị, na ọ na-egosikwa onwe ya onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Jisọs sịrị: “Ọ bụghị n’ihe o nwebigara ókè ka ndụ mmadụ dị, o sighị n’ihe o nwere pụta.” (Luk 12:15) Ọtụtụ nde naira e nwere n’ụlọ akụ agaghị eme ka akpa ume nke ọrịa ji na-arụ ọrụ nke ọma ma ọ bụ ka obi nke ike gwụworo nọgide na-akụ. Ya mere, Jisọs gara n’ihu ikwu n’Ozizi Elu Ugwu ya, sị: “N’ihi nke a ka m ji sị unu, Unu echegbula onwe unu nye ndụ unu, ihe unu ga-eri, ma ọ bụ ihe unu ga-aṅụ; echegbukwala onwe unu nye ahụ unu, ihe unu ga-eyi. Ọ́ bụghị ndụ karịrị ihe e ji azụ ya, ọ́ bụghịkwa ahụ karịrị uwe oyiyi ya?”—Matiu 6:25.
11. Olee ebe Jisos si nweta ọtụtụ n’ime ihe atụ ya, oleekwa otú o si gosipụta nke a n’Ozizi Elu Ugwu ahụ?
11 Jisọs bụ onyeọkà n’inye ihe atụ n’okwu ọnụ. Ọ na-echeta ha n’ebe ọ bụla o lere anya. Ọ hụrụ ka otu nwanyị na-edokwasị oriọna a mụnyere ọkụ n’elu ihe ndọba oriọna wee mee ka ọ ghọọ ihe atụ. Ọ hụrụ ka onye na-azụ atụrụ na-ekewa atụrụ na ewu; o wee ghọọ ihe atụ. Ọ hụrụ ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu n’ọma ahịa; o wee ghọọ ihe atụ. Otú ahụkwa ka ọ dị n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ka ọ na-ekwu okwu banyere nchegbu n’ihe mkpa anụ ahụ ọ hụrụ ihe atụ ná nnụnụ ndị na-efegharị n’ebe ahụ nakwa n’okooko osisi ndị jupụtara n’akụkụ ugwu ndị ahụ. Nnụnụ ndị ahụ hà na-akụ ihe, na-ewekwa ihe ubi? Ee e. Okooko osisi ndị ahụ hà na-akpa ákwà? Ee e. Ọ bụ Chineke mere ha; ọ na-elekọtakwa ha. Otú ọ dị, unu dị oké ọnụ ahịa karịa nnụnụ na okooko osisi. (Matiu 6:26, 28-30) O nyere Ọkpara ya n’ihi unu, ọ bụghị n’ihi ha.—Jọn 3:16.
12. (a) Ihe atụ ndị ahụ banyere nnụnụ na okooko osisi hà pụtara na ọ gaghị adị mkpa ka ndị na-eso ụzọ Jisọs rụọ ọrụ? (b) Isi ihe dị aṅaa ka Jisọs na-eme ka ọ pụta ìhè banyere ọrụ na okwukwe?
12 Ihe Jisọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya n’ebe a abụghị na ha agaghị arụ ọrụ iji chọta ihe ha ga-eri na ihe ha ga-egbokwasị n’ahụ. (Lee Eklisiastis 2:24; Ndị Efesọs 4:28; 2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12.) N’ụtụtụ ụbọchị ahụ nke oge opupu ihe ubi, nnụnụ ndị ahụ ji ọrụ n’aka na-achọgharị nri, na-achụsogharị onwe ha oké na nne, na-akpa akwụ ha, na-ekpugide àkwá ha, na-azụ ụmụ ha. Ha nọ na-arụ ọrụ, ma ọ bụ n’enweghị nchegbu ọ bụla. Okooko osisi ndị ahụ jikwa ọrụ n’aka na-agbaminye mkpọrọgwụ ha n’ime ala iji chọta nri na ihe ndị ọzọ na-azụ ha, na-emekwa ka akwụkwọ ha pulite iji nweta ìhè anyanwụ. Ha aghaghị itozu okè, gbawapụtakwa okooko osisi, gbapụtakwa mkpụrụ ha tupu ha anwụọ. Ha nọ na-arụ ọrụ, ma ọ bụ n’enweghị nchegbu ọ bụla. Chineke na-enye nnụnụ na okooko osisi ndị ahụ ihe dị ha mkpa. ‘Ọ́ gaghị enye unu onwe unu karị ihe dị unu mkpa, unu ndị okwukwe nta?’—Matiu 6:30.
13. (a) Gịnị mere o ji kwesị ekwesị na Jisọs jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ cubit mee ihe mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ịgbatịwanye ndụ mmadụ? (b) Olee ụzọ ị pụrụ isi gbatịwanye ndụ gị ọtụtụ nde maịlụ, dị ka a pụrụ ikwu ya?
13 Ya mere, nwee okwukwe. Echegbula onwe gị. Nchegbu agaghị agbanwe ihe ọ bụla. Jisọs jụrụ, sị, “Ònye n’etiti unu pụrụ ịtụkwasị otu cubit n’ogologo [ndụ, NW] ya site n’ichegbu onwe ya?” (Matiu 6:27) Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Jisọs ji jiri ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịdị ogologo nkịtị, otu cubit, tụnyere ọ̀tụ̀tụ̀ nke ogologo ndụ? Ma eleghị anya ọ bụ n’ihi na Bible na-ejikarị ogologo ndụ mmadụ tụnyere ịga njem, na-eji okwu ndị dị ka “ụzọ ndị mmehie,” “okporo ụzọ ndị ezi omume,” ‘ọnụ ụzọ dị obosara nke na-eduba n’ịla n’iyi,’ na ‘ụzọ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ.’ (Abụ Ọma 1:1; Ilu 4:18; Matiu 7:13, 14) Nchegbu banyere mkpa ndị a na-enwe kwa ụbọchị apụghị ịtụkwasị ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta ná ndụ mmadụ, ọbụna “otu cubit” dị ka a pụrụ ikwu ya. Ma e nwere ụzọ ị pụrụ isi mee ka ndụ gị dịwanye ogologo ruo ọtụtụ nde maịlụ, dị ka a pụrụ ikwu ya. Ọ bụghị site n’ichegbu onwe gị, na-asị: “Gịnị ka anyị ga-eri?” ma ọ bụ “Gịnị ka anyị ga-aṅụ?” ma ọ bụ “Gịnị ka a ga-eji gbokwasị anyị?” kama ọ bụ site n’inwe okwukwe na ime ihe Jisọs gwara anyị ka anyị mee: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya; a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị a nile.”—Matiu 6: 31-33.
Inweta Alaeze Chineke na Ezi Omume Ya
14. (a) Gịnị bụ isiokwu nke Ozizi Elu Ugwu ahụ? (b) N’ụzọ na-ezighị ezi dị aṅaa ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si chọọ Alaeze ahụ na ezi omume?
14 N’okwu mmalite dị n’Ozizi Elu Ugwu ahụ, Jisọs kwuru okwu banyere Alaeze eluigwe ahụ dị ka nke dịịrị ndị ahụ maara mkpa ime mmụọ ha. N’ahịrị okwu nke anọ, o kwuru na ndị ahụ agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị na-akpọkwa nkụ maka ya ka a ga-eme ka afọ ju ha. N’ebe a, Jisọs debere ma Alaeze ahụ ma ezi omume Jehova n’ọnọdụ mbụ. Ha bụ isiokwu Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ha bụ azịza dịịrị mkpa nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ma, ọ̀ bụ site n’ụzọ dị aṅaa ka Alaeze Chineke na ezi omume Chineke si eru mmadụ aka? Olee ụzọ anyị si anọgide na-achọ ha? Ọ bụghị n’ụzọ ahụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si chọọ ya. Ha chọrọ Alaeze ahụ na ezi omume site n’Iwu Mosis, bụ́ nke ha sịrị na ọ gụnyekọtara omenala ndị a kụziri n’okwu ọnụ, ebe ọ bụ na ha kweere na ọ bụ Chineke nyere Mosis ma Iwu ahụ e dere ede ma omenala ndị ahụ a kụziri n’okwu ọnụ n’Ugwu Saịnaị.
15. (a) Dị ka ndị Juu si kwuo, olee mgbe omenala okwu ọnụ ha malitere, oleekwa ụzọ ha si bulie ha elu karịa Iwu Mosis ahụ e dere ede? (b) Olee mgbe omenala ndị a malitere n’ezie, mmetụta dị aṅaa ka o nwekwara n’Iwu Mosis ahụ?
15 Omenala ha nke metụtara nke a sịrị: “Mosis natara Iwu ahụ [nkọwa ala peji, “Iwu ahụ E Nyere n’Okwu Ọnụ”] site na Saịnaị, o wee nye ya Joshua, Joshua wee nye ya ndị okenye, ndị okenye wee nyekwa ya Ndị Amụma; Ndị Amụma ahụ wee nyekwa ya ndị ikom nke Ụlọ Nzukọ Ukwu ahụ.” Mgbe oge na-aga, e buliri iwu ha e nyere n’okwu ọnụ elu ọbụna karịa Iwu ahụ e dere ede: “[Ọ bụrụ] na o mehie megide okwu dị n’Iwu ahụ [e dere ede], ikpe amaghị ya,” ma ọ bụrụ na “ọ tụkwasị ihe n’okwu nile nke Ndị Odeakwụkwọ [omenala ndị a kụziri n’okwu ọnụ], ikpe mara ya.” (Mishnah) Omenala ha ndị a kụziri n’okwu ọnụ amaliteghị na Saịnaị. N’eziokwu, a malitere ịchịkọta ha n’ike n’ike n’ihe dị ka narị afọ abụọ tupu Kraịst. Ha tụkwasịrị ihe n’Iwu Mosis ahụ e dere ede, wepụ ihe na ya, meekwa ka ọ ghara ịdị irè.—Tụlee Deuterọnọmi 4:2; 12:32.
16. Olee ụzọ ezi omume Chineke na-esi erute ihe a kpọrọ mmadụ aka?
16 Ezi omume Chineke anaghị abịa site n’Iwu ahụ, kama ọ bụ n’ụzọ na-emetụtaghị ya: “Site n’ọrụ nile nke iwu ọ dịghị mmadụ ọ bụla a ga-agụ n’onye ezi omume n’ihu ya: n’ihi na ọ bụ n’aka iwu ka mmazu nke mmehie sitere. Ma ugbu a e mewo ka ezi omume Chineke pụta ìhè nke na-eguzo iche n’ebe iwu dị, nke iwu ahụ na ndị amụma na-agbara ya àmà; ma ọ bụ ezi omume Chineke, site n’okwukwe e kwere na Jisọs Kraịst.” (Ndị Rom 3:20-22) Ya mere, ezi omume Chineke na-abịa site n’okwukwe e nwere na Kraịst Jisọs—nke a bụ ihe “iwu ahụ na ndị amụma na-agbara ya àmà” n’ụzọ zuru ezu. E mezuru amụma ndị ahụ banyere Mesaịa n’ahụ Jisọs. O mezukwara Iwu ahụ; e wepụrụ ya n’ụzọ site n’ịkpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ ya.—Luk 24:25-27, 44-46; Ndị Kọlọsi 2:13,14; Ndị Hibru 10:1.
17. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo, olee ụzọ ndị Juu si ghara imata ezi omume nke Chineke?
17 Ya mere, Pọl onyeozi dere banyere ọdịda ndị Juu dara n’ịchọ ezi omume, sị: “N’ihi na ana m agbara ha àmà na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị. N’ihi na, ebe ha na-amaghị ezi omume Chineke, na-achọkwa ụzọ ime ka ezi omume nke aka ha guzoo, ha edoghị onwe ha n’okpuru ezi omume Chineke. N’ihi na Kraịst bụ nsọtụ iwu iwetara onye ọ bụla nke kwere ezi omume.” (Ndị Rom 10:2-4) Pọl dekwara banyere Kraịst Jisọs, sị: “Ọnye ahụ nke na-amaghị mmehie ka o mere ka ọ bụrụ mmehie n’ọnọdụ anyị; ka anyị onwe anyị wee ghọọ ezi omume Chineke n’ime ya.”—2 Ndị Kọrint 5:21.
18. Olee ụzọ ndị Juu na-agbaso omenala, ndị ọkà ihe ọmụma Grik, na “ndị a kpọrọ,” si lee ‘Jisọs a kpọgidere n’osisi ịta ahụhụ’ anya?
18 Ndị Juu lere Mesaịa nke ga-anwụ anwụ anya dị ka ihe na-adịghị ike nke na-abụghị ihe ọ bụla. Ndị ọkà ihe ọmụma Grik kwara emo banyere Mesaịa dị otú ahụ dị ka ihe nzuzu. Ma n’agbanyeghị ihe ahụ nile, ọ bụ dị ka Pọl kwupụtara, sị: “Ebe ndị Juu na-arịọ ihe ịrịba ama dị iche iche, ndị Grik na-achọkwa amamihe: ma anyị onwe anyị na-ekwusa Kraịst, na a kpọgidere ya [n’osisi ịta ahụhụ, NW], onye bụụrụ ndị Juu ọnyà, bụụrụ kwa ndị mba ọzọ ihe nzuzu; ma ọ bụụrụ ndị a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, Kraịst, bụ́ ike nke Chineke, na amamihe nke Chineke. N’ihi na ihe nzuzu nke Chineke karịrị mmadụ nile n’amamihe; adịghị ike nke Chineke [karịkwara] mmadụ nile n’ike.” (1 Ndị Kọrint 1:22-25) Kraịst Jisọs bụ ngosipụta nke ike na amamihe Chineke, ọ bụkwa ụzọ Chineke maka ezi omume na ndụ ebighị ebi nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi. “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ: n’ihi na aha ọzọ dị iche adịghịkwa n’okpuru eluigwe, nke e nyeworo n’etiti mmadụ, nke a na-aghaghị ịzọpụta anyị n’ime ya.”—Ọrụ 4:12.
19. Gịnị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi?
19 Isiokwu na-esonụ ga-egosi na ọ bụrụ na anyị ga-agbanarị mbibi ma nweta ndụ ebighị ebi, anyị aghaghị ịnọgide na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya. A ghaghị ime nke ahụ, ọ bụghị nanị site n’ige ntị n’okwu Jisọs, kamakwa site n’ime ha eme.
Ajụjụ Ntụleghachi
◻ Gịnị ka ndị okpukpe ndị Juu mere ka onyinye ebere ha, ekpere, na obubuọnụ ha, ghọọ?
◻ Olee ebe dị ná nchebe maka ịkpakọba akụ gị?
◻ N’ihi gịnị ka anyị ga-eji zere ichegbu onwe anyị banyere mkpa anụ ahụ anyị?
◻ Nzọrọ ụgha dị aṅaa ka ndị Juu mere banyere mmalite nke omenala ha ndị a kụziri n’okwu ọnụ?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka Alaeze Chineke na ezi omume ya na-esi abịa?
[Foto dị na peeji nke 16]
Ọ na-amasị ndị Farisii iguzo n’isi nkuku okporo ụzọ na-ekpe ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha