Gịnị Mere A Ga-eji Gbaa Àmà Ihe Ọjọọ?
“ONYE na-agba okwu n’anwụ na-aghọ onye iro ndị mmadụ,” ka ụfọdụ na-ekwu n’Ọdịda Anyanwụ Africa. Nke ahụ bụ ihe mere Olu mgbe o boro deede ya ebubo na o dinara nwanne ya nwanyị. “Ị bụ onye ụgha!” ka nwanne ya nwoke tiri ná mkpu. O wee tizie Olu eti eti, chụpụ ya n’ụlọ ezinụlọ ha, ma suo uwe Olu nile ọkụ. Ndị obodo dụnyeere deede ya úkwù. N’abụkwaghị onye a nabatara n’obodo, Olu pụrụ. Ọ bụ nanị mgbe a chọpụtara na nwa agbọghọ ahụ dị ime ka ndị mmadụ matara na Olu kwuru eziokwu. Nwanne ya nwoke kwetara, a nabataghachikwara Olu. Ihe gaara adịwo nnọọ iche. A gaara egbu Olu.
O doro anya na o yighị ka ndị na-ahụghị Jehova n’anya ga-enwe mmasị na a gbara mmejọ ha n’anwụ. Àgwà ụmụ mmadụ na-eme mmehie bụ iguzogide ịdọ aka ná ntị ma wesoo onye ọ bụla na-enye ya iwe. (Tụlee Jọn 7:7.) Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ na-agba duu ka okwute mgbe a bịara n’ikpughe ihe ọjọọ ndị ọzọ mere nye ndị nwere ikike inye ha mgbazi.
Ịghọta Abamuru nke Ịdọ Aka ná Ntị
Otú ọ dị, n’etiti ndị Jehova, e nwere àgwà dị iche n’ebe ịdọ aka ná ntị dị. Ndị ikom na ndị inyom na-asọpụrụ Chineke na-aghọta nke ukwuu ndokwa Jehova meworo iji nyere ndị mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ ndị Kraịst aka. Ha na-aghọta inye ahụhụ dị otú ahụ dị ka ngosipụta nke ebere ịhụnanya ya.—Ndị Hibru 12:6-11.
A pụrụ iji otu ihe mere ná ndụ Eze Devid gosipụta nke a. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye ezi omume site n’oge ọ bụ nwata, e nwere oge mgbe ọ dabara ná mmehie dị oké njọ. Nke mbụ, o dinara nwunye mmadụ. E mesịa, ná mgbalị ikpuchi mmehie ya, ọ kpara nkata ka e gbuo di nwanyị ahụ. Ma Jehova kpughere mmehie Devid nye Netan onye amụma, bụ́ onye ji obi ike jiri okwu ahụ jekwuru Devid. N’iji otu ihe atụ dị ike mee ihe, Netan jụrụ Devid ihe e kwesịrị ime nwoke bara ọgaranya nke nwere ọtụtụ atụrụ ma were, gbuokwa nanị nwa atụrụ, otu anụ dị oké ọnụ ahịa e ji mere enyi, nke otu onye ogbenye nwere iji lee enyi ya ọbịa. A kpasuru Devid, onye bụbu onye ọzụzụ atụrụ, iwe na ọnụma. Ọ sịrị: “Onye kwesịrị ọnwụ ka nwoke ahụ bụ nke na-eme ihe a.” Mgbe ahụ Netan wee kwuo na ihe atụ ahụ bụ banyere Devid, na-asị: “Gị onwe gị ka nwoke ahụ bụ.”—2 Samuel 12:1-7.
Devid ewesoghị Netan iwe; ọ gbalịghịkwa ịzọrọ onwe ya ma ọ bụ malite ibogwara ebubo. Kama nke ahụ, mba Netan kwaliri akọ na uche ya nke ukwuu. N’inwe mwute dị ukwuu, Devid kwupụtara, sị: “Emehiewo m megide Jehova.”—2 Samuel 12:13.
Mkpughe Netan kpughere mmehie Devid, nke ịdọ aka ná ntị kwekọrọ n’ụzọ Chineke sochiri, rụpụtara ihe ọma. Ọ bụ ezie na e gbochighị Devid inweta ihe ndị mmehie ya rụpụtara, o chegharịrị ma bụrụ onye ya na Jehova dịghachiri ná mma. Olee otú ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ dị Devid? O dere, sị: “Ka onye ezi omume tigbuo m, ọ ga-abụ ebere; ya baakwara m mba, ọ ga-abụ mmanụ isi; ekwela ka isi m sị ee e.”—Abụ Ọma 141:5.
N’ụbọchị anyị kwa, ndị ohu Jehova, ọbụna ndị kwesịworo ntụkwasị obi ruo ọtụtụ afọ, pụrụ itinye aka ná mmehie dị oké njọ. Ịghọta na ndị okenye pụrụ inye aka, ndị ka n’ọnụ ọgụgụ na-ebute ụzọ n’ijekwuru ha maka enyemaka. (Jemes 5:13-16) Ma mgbe ụfọdụ onye mere ihe ọjọọ pụrụ ịgbalị ikpuchi mmehie ya, dị ka Eze Devid mere. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị amara banyere mmehie dị oké njọ n’ọgbakọ?
Ibu Ọrụ Ònye Ka Ọ Bụ?
Mgbe ndị okenye matara banyere mmehie dị oké njọ, ha na-agakwuru onye ahụ mere ya iji nye enyemaka na mgbazi dị mkpa. Ọ bụ ibu ọrụ ndị okenye ikpe ndị dị otú ahụ nọ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst ikpe. N’iche ọnọdụ ime mmụọ ya nche, ha na-enye aka, na-adụkwa onye ọ bụla na-ewere nzọụkwụ amamihe na-adịghị ya ma ọ bụ nke na-ezighị ezi ọdụ.—1 Ndị Kọrint 5:12, 13; 2 Timoti 4:2; 1 Pita 5:1, 2.
Gịnị ma ọ bụrụ na ị bụghị okenye, i wee mara banyere mmehie dị oké njọ nke onye Kraịst ọzọ meworo? A na-achọta ụkpụrụ nduzi n’Iwu Jehova nyere mba Israel. Iwu ahụ kwuru na ọ bụrụ na mmadụ abụrụ onye àmà nke omume isi n’ezi ofufe dapụ, ịgba ịchịisi mgba okpuru, igbu ọchụ, ma ọ bụ mpụ ọ bụla ọzọ jọgburu onwe ya, ọ bụ ibu ọrụ ya ịkọ ya na ịgba akaebe ihe ọ maara. Levitikọs 5:1 na-ekwu, sị: “Mgbe mmadụ ga-emehie, site n’ịnụ olu ọgbụgba iyi, mgbe ya onwe ya bụ onye àmà, ma ọ bụ na ọ hụwo ma ọ bụ na ọ mawo, ọ bụrụ na o gosighị ya, ọ ga-ebukwa ajọ omume ya.”—Tụlee Deuterọnọmi 13:6-8; Esta 6:2; Ilu 29:24.
Ọ bụ ezie na ha anọghị n’okpuru Iwu Mosis, ụkpụrụ ndị na-achịkwa ya pụrụ iduzi ndị Kraịst taa. (Abụ Ọma 19:7, 8) Ya mere ọ bụrụ na ị mata banyere mmehie dị oké njọ onye Kraịst ibe gị mere, gịnị ka i kwesịrị ime?
Ime Ihe Banyere Okwu Ahụ
Nke mbụ, ọ dị mkpa na e nwere ezi ihe mere a ga-eji kwere na mmehie dị oké njọ ewerewo ọnọdụ n’ezie. “Abụla onye àmà megide mmadụ ibe gị n’efu,” ka nwoke amamihe ahụ kwuru. “Ị̀ ga-ejikwa egbugbere ọnụ abụọ rafuo?”—Ilu 24:28.
Ị pụrụ ikpebi ịgakwuru ndị okenye n’onwe gị. Ọ dịghị njọ ime otú ahụ. Otú ọ dị, dị ka ọ na-adịkarị, ụzọ kasị egosi ịhụnanya bụ ịgakwuru onye ahụ mere ya. Ikekwe ihe ndị mere adịghị otú ha yiri ka ha dị. Ma ọ bụ ikekwe ndị okenye anọworị na-eme ihe banyere ọnọdụ ahụ. Soro onye ahụ tụlee okwu ahụ n’ụzọ dị nro. Ọ bụrụ na a ka nwere ihe mere a ga-eji kwere na e mewo ihe dị oké njọ, gbaa ya ume ịgakwuru ndị okenye maka enyemaka, kọwaakwa amamihe dị n’ime otú ahụ. Agwala ndị ọzọ banyere okwu ahụ, n’ihi na nke ahụ ga-abụ ịgba asịrị.
Ọ bụrụ na onye ahụ agwaghị ndị okenye n’ime oge ezi uche dị na ya, mgbe ahụ i kwesịrị. Otu onye okenye ma ọ bụ abụọ ga-esoro onye ahụ a na-ebo ebubo tụlee okwu ahụ. Ọ dị ndị okenye mkpa ‘ịjụ ase, gwuo ala ya, jụta nke ọma’ iji hụ ma e mewo ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na e mewo, ha ga-ahụ maka okwu ahụ dị ka ụkpụrụ nduzi Akwụkwọ Nsọ si dị.—Deuterọnọmi 13:12-14.
Ọ dịkarịa ala a chọrọ ndị àmà abụọ iji nwapụta ebubo ihe ọjọọ. (Jọn 8:17; Ndị Hibru 10:28) Ọ bụrụ na onye ahụ agọọ ebubo ahụ, ọ bụrụkwa na ọ bụ nanị akaebe gị ka e nwere, a ga-ahapụ okwu ahụ n’aka Jehova. (1 Timoti 5:19, 24, 25) A na-eme nke a n’ịmara na ihe nile “gba ọtọ” nye Jehova nakwa na ọ bụrụ na onye ahụ mere ihe ọjọọ ahụ, n’ikpeazụ mmehie ya ‘ga-achọpụta’ ya.—Ndị Hibru 4:13; Ọnụ Ọgụgụ 32:23.
Ma were ya na onye ahụ gọrọ ebubo ahụ, ị bụrụkwa nanị onye àmà e nwere megide ya. Ị̀ pụrụ ịbụzi onye a ga-eboghachi ebubo nke nkwutọ? Ee e, ọ gwụla ma ị gbawo asịrị nye ndị okwu ahụ na-emetụtaghị. Ọ bụghị nkwutọ ịkọrọ ndị nwere ikike na ibu ọrụ ịhụ maka na idozi okwu dị iche iche ọnọdụ ndị metụtara ọgbakọ. N’eziokwu, o kwekọrọ n’ọchịchọ anyị ime mgbe nile ihe ziri ezi ma kwesị ekwesị.—Tụlee Luk 1:74, 75.
Ime Ka Ịdị Nsọ Dịgide n’Ime Ọgbakọ
Otu ihe mere a ga-eji gbaa àmà ihe ọjọọ bụ na ọ na-arụ ọrụ ichebe ịdị ọcha nke ọgbakọ. Jehova bụ Chineke dị ọcha, Chineke dị nsọ. Ọ chọrọ ka ndị nile na-efe ya ofufe dị ọcha n’ime mmụọ na n’omume. Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Dị ka ụmụ nke ịṅa ntị, unu emekwala onwe unu ka unu dị ka agụụ ihe ọjọọ ahụ si dị, bụ́ nke gụrụ unu na mbụ n’amaghị ihe unu: kama dị ka Onye kpọrọ unu dị nsọ, unu onwe unu, ghọọkwanụ ndị dị nsọ n’ibi obi nile dị iche iche; n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Unu ga-adị nsọ; n’ihi na nsọ ka Mụ onwe m dị.” (1 Pita 1:14-16) Mmadụ ndị na-eme omume na-adịghị ọcha ma ọ bụ ihe ọjọọ pụrụ iweta mmetọ na iwe Jehova n’isi ọgbakọ dum ọ gwụla ma e mere ihe iji gbazie ha ma ọ bụ wepụ ha.—Tụlee Joshua, isi nke 7.
Akwụkwọ ozi ndị Pọl onyeozi degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint na-egosi otú ịgba àmà ihe ọjọọ siri mee ihe iji mee ka ndị Chineke nọ n’ebe ahụ dị ọcha. N’akwụkwọ ozi mbụ ya, Pọl dere, sị: “A na-anụ nnọọ na ịkwa iko dị n’etiti unu, aha ịkwa iko nke na-adịghịkwa ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ, nke mere na otu onye n’etiti unu nwere nwunye nna ya.”—1 Ndị Kọrint 5:1.
Bible agwaghị anyị onye onyeozi ahụ natara akụkọ a n’ọnụ ya. Ọ pụrụ ịbụ na Pọl nụrụ banyere ọnọdụ ahụ n’ọnụ Stefanas, Fọtụnetọs, na Akaịkọs, ndị meworo njem site na Kọrint gaa Efesọs ebe Pọl nọ. Pọl anatawokwa akwụkwọ ozi njụta ihe ọmụma site n’aka ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint. N’agbanyeghị ebe o si nweta ya, ozugbo ndị àmà a pụrụ ịtụkwasị obi kọwooro Pọl ọnọdụ ahụ, o nweziri ike inye ntụziaka n’okwu ahụ. “Wepụnụ ajọ onye ahụ n’etiti onwe unu,” ka o dere. A chụpụrụ nwoke ahụ n’ọgbakọ.—1 Ndị Kọrint 5:13; 16:17, 18.
Ntụziaka Pọl ọ̀ rụpụtara ezi ihe? N’ezie ọ rụpụtara! O doro anya na onye ahụ mere ihe ọjọọ ghọtaghachiri onwe ya. N’akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ndị Kọrint, Pọl gbara ọgbakọ ahụ ume ‘iwere amara gbaghara ya kasiekwa nwoke ahụ chegharịrị obi.’ (2 Ndị Kọrint 2:6-8) Ịgba àmà ihe ọjọọ ahụ si otú ahụ duga n’ime ihe mere ka ọgbakọ dị ọcha ma weghachi onye ahụ mebiworo mmekọrịta ya n’ebe Chineke nọ n’ihu ọma Chineke.
Anyị na-achọta ihe nlereanya ọzọ n’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ọgbakọ ndị Kraịst dị na Kọrint. N’oge nke a onyeozi ahụ kpọrọ aha ndị akaebe mere ka a mara okwu ahụ. O dere, sị: “Ndị ezinụlọ Kloi gosiri m ihe banyere unu, ụmụnna m, na esemokwu dị n’etiti unu.” (1 Ndị Kọrint 1:11) Pọl maara na esemokwu a, gụnyere inye ndị mmadụ nsọpụrụ gabigara ókè, akpatawo àgwà ịkpa ókè nke yiri egwu ibibi ịdị n’otu nke ọgbakọ ahụ. Ya mere, n’ihi nsọpụrụ dị omimi maka ọdịmma ime mmụọ nke ndị kwere ekwe ibe ya n’ebe ahụ, Pọl mere ihe ngwa ngwa ma degara ọgbakọ ahụ ndụmọdụ na-enye mgbazi.
Taa, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ụmụnna ndị ikom na ndị inyom n’ọgbakọ dị gburugburu ụwa aghaghị ichebe ịdị ọcha ime mmụọ nke ọgbakọ site ná ndị mmadụ n’otu n’otu ịnọgide ná nguzo a nwapụtara anwapụta n’ihu Chineke. Ụfọdụ na-ata ahụhụ iji mee otú ahụ; ọbụna na ndị ọzọ anwụwo iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. N’ezie, ịkwado ma ọ bụ ikpuchi ihe ọjọọ ga-egosi enweghị ekele maka mgbalị a nile.
Enyemaka Maka Ndị Mere Ihe Ọjọọ
Gịnị mere ụfọdụ ndị dabaworo ná mmehie dị oké njọ ji ala azụ ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ? Ọ na-abụkarị n’ihi na ha amataghị abamuru nke ịgakwuru ndị okenye. Ụfọdụ na-eche n’ụzọ na-ezighị ezi na ọ bụrụ na ha emee nkwupụta, a ga-ekpughe mmehie ha nye ọgbakọ dum. Ndị ọzọ na-aghọgbu onwe ha n’ihe banyere ịdị oké njọ nke ụzọ ha. Ndị ọzọkwa na-eche na ha pụrụ ime mgbanwe n’onwe ha n’enweghị enyemaka ndị okenye.
Ma ndị dị otú ahụ mere ihe ọjọọ nwere mkpa enyemaka ịhụnanya site n’aka ndị okenye ọgbakọ. Jemes dere, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị: ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilie; ọ bụrụkwa na o mehieworo, a ga-agbaghara ya mmehie ahụ.”—Jemes 5:14, 15.
Lee ndokwa magburu onwe ya ọ bụ iji nyere ndị mere ihe ọjọọ aka inwetaghachi ọnọdụ ime mmụọ ha! Site n’itinye ndụmọdụ na-akụjụ mmụọ nke sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ na site n’ikpe ekpere maka ha, ndị okenye pụrụ inyere ndị na-arịa ọrịa n’ụzọ ime mmụọ aka isite n’ụzọ ọjọọ ha pụta. N’ihi ya, kama inwe echiche ikpe ọmụma, ndị nwere nchegharị na-enwekarị mmetụta nke ahụ iru ala na ahụ efe mgbe ha na ndị okenye na-ahụ n’anya nọkọrọ. Otu nwa okorobịa sitere Ọdịda Anyanwụ Africa akwawo iko ma kpuchie mmehie ya ruo ọnwa ụfọdụ. Mgbe mmehie ya pụtasịrị ìhè, ọ gwara ndị okenye, sị: “A sị nnọọ na e nwebuwo onye jụrụ ajụjụ banyere mkpakọrịta mụ na nwa agbọghọ ahụ! Ọ bụ nnọọ ihe ahụ efe ịgba ihe a n’anwụ.”—Tụlee Abụ Ọma 32:3-5.
Ngosipụta nke Ịhụnanya Nwere Ụkpụrụ
Ndị ohu Chineke e mere baptism “esitewo n’ọnwụ baa ná ndụ.” (1 Jọn 3:14) Ma ọ bụrụ na ha mere mmehie dị oké njọ, ha alaghachiwo n’ụzọ nke ọnwụ. Ọ bụrụ na e nyereghị ha aka, ha pụrụ ịghọ ndị obi ha mere etili n’ime ihe ọjọọ, n’achọghị ichegharị ma laghachi n’ofufe ezi Chineke ahụ.—Ndị Hibru 10:26-29.
Ịgba àmà ihe ọjọọ bụ ngosipụta nke ezi nchegbu maka onye ahụ mere ihe ọjọọ. Jemes dere, sị: “Ụmụnna m, a sị na onye ọ bụla n’etiti unu si n’eziokwu jehie, ma otu onye wee mee ka o chigharịa; ka ọ mara na onye meworo ka onye mmehie si ná njehie nke ụzọ ya chigharịa ga-azọpụta mkpụrụ obi n’ọnwụ, ọ ga-ekpuchikwa ọtụtụ mmehie.”—Jemes 5:19, 20.
Ya mere, gịnịzi mere a ga-eji gbaa àmà ihe ọjọọ? N’ihi na ọ na-arụpụta ihe ọma. N’ezie, ịgba àmà ihe ọjọọ bụ ngosipụta nke ịhụnanya ndị Kraịst nwere ụkpụrụ e nwere n’ebe Chineke nọ, n’ebe ọgbakọ nọ, na n’ebe onye ahụ mere ihe ọjọọ nọ. Ka onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ji iguzosi ike n’ihe na-akwalite ụkpụrụ ezi omume nke Chineke, Jehova ga-agọzi ọgbakọ ahụ dum n’ụba. Pọl onyeozi dere, sị: “[Jehova] ga-emekwa ka unu guzosie ike ruo ọgwụgwụ ihe nile, bụrụ ndị a na-apụghị ibo ebubo n’ụbọchị Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.”—1 Ndị Kọrint 1:8.
[Foto dị na peeji nke 26]
Ọ na-egosi ịhụnanya ịgba Onyeàmà mere mmehie ume ịgwa ndị okenye
[Foto dị na peeji nke 28]
Ndị okenye na-enye aka iweghachi onye mere mmehie n’ihu ọma Chineke