Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 11/15 p. 18-23
  • Jiri Ịnọgidesi Ike n’Ihe Jeere Jehova Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ịnọgidesi Ike n’Ihe Jeere Jehova Ozi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ịnọgidesi Ike n’Ihe Pụtara
  • Ekele Maka Ihe Ndị A Mụtara
  • Nwee Ekele Maka Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst
  • Ọ Dịghị Ebe Ọzọ A Ga-aga
  • Bụrụ Onye Na-ewuli Elu
  • Guzogide Ekwensu!
  • Dabere na Chineke Site n’Ekpere
  • “Nanị Gị Na-eguzosi Ike n’Ihe”
    Bịaruo Jehova Nso
  • Lee Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Iji Iguzosi Ike n’Ihe Soro Nzukọ Jehova Na-eje Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Otú Ịhụnanya Chineke Pụrụ Iche Si Abara Anyị Uru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 11/15 p. 18-23

Jiri Ịnọgidesi Ike n’Ihe Jeere Jehova Ozi

“N’ebe onye na-anọgidesi ike n’ihe nọ ị [ Jehova] ga-eme ihe n’ụzọ ịnọgidesi ike n’ihe.”—2 SAMUEL 22:26, NW.

1. Olee otú Jehova si emeso ndị na-anọgidesi ike n’ihe nye ya?

A PỤGHỊ ịkwụghachi Jehova ụgwọ maka ihe nile ọ na-emere ndị ya. (Abụ Ọma 116:12) Lee ka onyinye ime mmụọ na nke ihe onwunwe na ebere ya dị nro si dị ebube! Eze Devid nke Israel oge ochie maara na Chineke na-emekwa ihe n’ịnọgidesi ike n’ihe n’ebe ndị na-anọgidesi ike n’ihe nye ya nọ. Devid kwuru otú ahụ n’abụ ọ haziri “n’ụbọchị Jehova napụtara ya n’ọbụ aka ndị iro ya nile na n’ọbụ aka [Eze] Sọl.”—2 Samuel 22:1.

2. Gịnị bụ isi ihe ụfọdụ e wepụtara n’abụ Devid e dekọrọ na 2 Samuel isi nke 22?

2 Devid malitere abụ ya (na-ekwekọ n’Abụ Ọma 18) site n’ito Jehova dị ka “Onye na-eme ka m gbapụ” n’azịza nye ekpere. (2 Samuel 22:2-7) Site n’ụlọ nsọ ya dị n’eluigwe, Chineke mere ihe iji gbapụta onye na-ejere ya ozi na-anọgidesi ike n’ihe site n’aka ndị iro dị ike. (Amaokwu nke 8-19) E nyeghachiri Devid ụgwọ n’ụzọ dị otú ahụ maka ịchụso ụzọ ihe ziri ezi na ụzọ nile nke Jehova. (Amaokwu nke 20-27) Ihe ọzọ e depụtara bụ ihe ndị e mere n’ume Chineke nyere. (Amaokwu nke 28-43) N’ikpeazụ, Devid zoro aka ná mgbapụta site n’aka ndị na-ahụchatakarị mmehie n’ụlọ na site n’aka ndị iro si ala ọzọ wee nye Jehova otuto dị ka ‘onye nke na-eme ka nzọpụta eze ya dị ukwuu: na-emekwara onye nke ya e tere mmanụ ebere.’ (Amaokwu nke 44-51) Jehova pụrụ ịgbapụtakwa anyị ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ụzọ ziri ezi ma na-adabere n’ebe ọ nọ maka ume.

Ihe Ịnọgidesi Ike n’Ihe Pụtara

3. Site n’echiche Akwụkwọ Nsọ, gịnị ka ịnọgidesi ike n’ihe pụtara?

3 Abụ Devid maka mgbapụta na-ekwe anyị nkwa nke a na-enye nkasi obi: “N’ebe onye na-anọgidesi ike n’ihe nọ ị [Jehova] ga-eme ihe n’ụzọ ịnọgidesi ike n’ihe.” (2 Samuel 22:26) Ọ bụ nkọwa aha Hibru bụ cha·sidhʹ na-egosipụta “onye na-anọgidesi ike n’ihe,” ma ọ bụ “onye ebere.” (Abụ Ọma 18:25, ntụaka ala ala peji nke NW) Mkpọaha ahụ bụ cheʹsedh nwere echiche nke obi ọma nke na-eji ịhụnanya na-arapagide onwe ya n’ihe ruo mgbe e mezuru nzube e nwere na ya. Jehova na-egosipụta obi ọma dị otú ahụ maka ndị na-ejere ya ozi, ọbụna dị ka ha na-egosipụta ya n’ebe ọ nọ. A kpọrọ ịnọgidesi ike n’ihe nke a bụ nke ezi omume na nke dị nsọ “ịhụnanya obi ọma” na “ịhụnanya na-eguzosi ike n’ihe.” (Jenesis 20:13; 21:23, NW) N’Akwụkwọ Nsọ Grik, “ịnọgidesi ike n’ihe” nwere echiche nke ịdị nsọ na nsọpụrụ ofufe, nke a na-egosipụta ná mkpọaha bụ́ ho·si·oʹtes na nkọwa aha bụ́ hoʹsi·os. Ịnọgidesi ike n’ihe dị otú ahụ gụnyere ikwesị ntụkwasị obi na nraranye, ọ pụtakwara ịkpọ okpukpe mkpa na iji nlezianya na-eme ihe nile Chineke chọrọ n’aka mmadụ. Ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova pụtara iji nraranye rapagide n’ebe ọ nọ nke ukwuu nke na ọ na-arụ ọrụ dị ka ihe nnyado siri ike.

4. Olee otú e si gosipụta ịnọgidesi ike n’ihe nke Jehova?

4 A na-egosi ịnọgidesi ike n’ihe nke Jehova n’ọtụtụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ihe e kpere n’ikpe megide ndị ọjọọ n’ihi ezi ịhụnanya maka ndị ya na ịnọgidesi ike n’ihe maka ikpe ziri ezi na ezi omume. (Mkpughe 15:3, 4; 16:5) Ịnọgidesi ike n’ihe nye ọgbụgba ndụ ya na Abraham kwaliri ya inwe ogologo ntachi obi n’ebe ndị Israel nọ. (2 Ndị Eze 13:23) Ndị na-anọgidesi ike n’ihe nye Chineke pụrụ ịdabere n’enyemaka ya ruo ọgwụgwụ nke ụzọ ịnọgidesi ike n’ihe ha, obi pụkwara isi ha ike na ọ ga-echeta ha. (Abụ Ọma 37:27, 28; 97:10) A gbara Jisọs ume site n’ịmara na dị ka onye isi “ịnọgidesi ike n’ihe” nke Chineke, a gaghị ahapụ mkpụrụ obi ya na Sheol.—Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:25, 27.

5. Ebe Jehova na-anọgidesi ike n’ihe, gịnị ka ọ na-achọ n’aka ndị na-ejere ya ozi, ajụjụ dị aṅaa ka a ga-atụle?

5 Ebe Jehova Chineke na-anọgidesi ike n’ihe, ọ na-achọ ịnọgidesi ike n’ihe n’aka ndị na-ejere ya ozi. (Ndị Efesọs 4:24) Dị ka ihe atụ, ndị ikom aghaghị ịdị na-anọgidesi ike n’ihe iji ruo eru maka nhọpụta dị ka ndị okenye ọgbakọ. (Taịtọs 1:8) Olee ihe ndị kwesịrị ịkwali ndị Jehova ijere ya ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe?

Ekele Maka Ihe Ndị A Mụtara

6. Olee otú anyị kwesịrị isi lee ihe Akwụkwọ Nsọ ndị anyị mụtaworo anya, gịnịkwa ka anyị kwesịrị icheta banyere ihe ọmụma dị otú ahụ?

6 Obi ekele maka ihe Akwụkwọ Nsọ ndị anyị mụtaworo kwesịrị ịkwali anyị ijere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Pọl onyeozi gbara Timoti ume, sị: “Nọgide n’ime ihe nile ị mụtara, nke e mekwara ka i kwere ha, ebe ị matara mmadụ ndị ị mụtara ha n’ọnụ ha; ebe ị makwara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:14, 15) Cheta na ihe ọmụma dị otú ahụ na-esite n’aka Chineke site ‘n’ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.’—Matiu 24:45-47.

7. Gịnị kwesịrị ịbụ mmetụta ndị okenye banyere nri ime mmụọ Chineke na-enye site n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi?

7 Karịsịa ndị okenye a họpụtara ahọpụta kwesịrị inwe obi ekele maka ihe ime mmụọ na-edozi ahụ Chineke na-enye site n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. N’ọtụtụ afọ gara aga, ndị okenye ole na ole enweghị ekele dị otú ahụ. Otu onye na-ahụ ihe na-aganụ rịbara ama na ndị ikom ndị a “na-akatọkarị isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche, ghara ịchọ ịnakwere ya dị ka . . . ụzọ eziokwu nke Chineke, na-anwa mgbe nile inwe ike n’ahụ ndị ọzọ n’ụzọ ha si eche echiche.” Otú ọ dị, ndị okenye na-anọgidesi ike n’ihe adịghị anwa mgbe ọ bụla inwe ike n’ahụ ndị ọzọ ka ha wee jụ nri ime mmụọ ọ bụla Chineke na-enye site n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.

8. Gịnị ma ọ bụrụ na anyị aghọtazughị isi ihe ụfọdụ nke Akwụkwọ Nsọ nke ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi nke nwekwara uche wepụtara?

8 Dị ka Ndịàmà Jehova raara onwe ha nye, anyị nile aghaghị ịdị na-anọgidesi ike n’ihe nye ya na nye nzukọ ya. Anyị ekwesịghị mgbe ọ bụla ọbụna iche echiche ichigharị pụọ n’ìhè dị ebube nke Chineke, na-agbaso ụzọ ndapụ n’ezi ofufe nke pụrụ iduba n’ọnwụ ime mmụọ ugbu a na mbibi mgbe e mesịrị. (Jeremaịa 17:13) Ma gịnị ma ọ bụrụ na o siiri anyị ike ịnakwere ma ọ bụ ịghọta n’ụzọ zuru ezu ụfọdụ isi ihe nke Akwụkwọ Nsọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi setịpụrụ? Mgbe ahụ ka anyị jiri obi umeala nakwere ebe anyị mụtara eziokwu ahụ ma kpee ekpere maka amamihe iji nagide ule nke a ruo mgbe ọ gwụsịrị site ná nkọwa ihe ụfọdụ e bipụtara ebipụta.—Jemes 1:5-8.

Nwee Ekele Maka Òtù Ụmụnna Ndị Kraịst

9. Olee otú 1 Jọn 1:3-6 si egosi na ndị Kraiṣt aghaghị inwe mmụọ nke mkpakọrịta?

9 Ekele sitere n’ala ala obi maka mmụọ mkpakọrịta nke dị n’ime òtù ụmụnna ndị Kraịst anyị na-enye ihe mkpali ọzọ iji jeere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. N’ezie, mmekọrịta anyị na Chineke na Kraịst apụghị ịdị mma n’ụzọ ime mmụọ ma e nweghị mmụọ nke a. Jọn onyeozi gwara ndị Kraịst e tere mmanụ, sị: “Ọ bụ ihe anyị hụworo, nụkwa, ka anyị na-akọkwara unu, ka unu onwe unu wee sokwa anyị nwekọọ [“mkpakọrịta,” Diaglott] ya: ma nnwekọ anyị bụkwa nke anyị sooro Nna anyị, sokwa Ọkpara ya Jisọs Kraịst, na-enwekọ: . . . Ọ bụrụ na anyị asị na anyị na-eso ya nwekọọ ihe, ma anyị na-ejegharị n’ọchịchịrị, anyị na-ekwu okwu ụgha, anyị adịghị emekwa eziokwu.” (1 Jọn 1:3-6) Ụkpụrụ nke a dịịrị ndị Kraịst nile, ma olileanya ha ọ̀ bụ nke eluigwe ma ọ bụ nke ụwa.

10. Ọ bụ ezie na Yuodia na Sintiki yiri ka ha nwere ihe isi ike idozi otu nsogbu dịịrị ha, olee otú Pọl si lee ndị inyom ndị a anya?

10 A chọrọ mgbalị iji jigide mmụọ nke mkpakọrịta. Dị ka ihe atụ, o yiri ka ndị inyom bụ ndị Kraịst bụ́ Yuodia na Sintiki nwere ihe isi ike n’idozi nsogbu dị n’etiti ha. N’ihi ya Pọl gbara ha ume “ka ha tụkwasị uche n’otu ihe ahụ n’ime Onyenwe anyị.” O kwukwara, sị: “Arịọkwa m gị, onye e kekọtaworo mụ na gị n’ezie n’ọrụ Chineke, nyere ndị inyom ahụ aka, n’ihi na mụ na ha gbakọsịrị mgba ike n’ozi ọma, gị na Klement, na ndị fọdụrụ mụ na ha na-arụkọ ọrụ, ndị aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ.” (Ndị Filipaị 4:2, 3) Ndị inyom ndị ahụ na-asọpụrụ Chineke esowo Pọl na ndị ọzọ gbakọọ mgba “n’ozi ọma” ahụ, obi sikwara ya ike na ha so ná ndị “aha ha dị n’akwụkwọ nke ndụ.”

11. Ọ bụrụ na onye Kraịst na-anọgidesi ike n’ihe ezute nsogbu ime mmụọ, gịnị ka ọ ga-ekwesị ekwesị iburu n’uche?

11 Ndị Kraịst adịghị eyi baajị na-egosi ọkwá mmadụ maka ihe ha nweworo ihe ùgwù ya ime ná nzukọ Jehova na otú ha siworo jeere ya ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Ọ bụrụ na ha nwere nsogbu ime mmụọ, lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe ịhụnanya na-adịghị ya ilefuru ọtụtụ afọ ha jewooro Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe anya! Ma eleghị anya, onye nke a kpọrọ “onye e kekọtaworo mụ na gị n’ezie n’ọrụ” bụ nwanna na-anọgidesi ike n’ihe nke nwere ịnụ ọkụ n’obi inyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na ị bụ onye okenye, ị̀ bụ ‘onye e kekọtaworo ya na ndị ọzọ n’ọrụ n’ezie,’ dị njikere inye aka n’ụzọ ọmịiko? Ka anyị nile na-echeta ihe ọma ndị kwere ekwe ibe anyị meworo, ọbụna dị ka Chineke na-echeta, wee jiri ịhụnanya nyere ha aka ịnagide ibu arọ ha nile.—Ndị Galetia 6:2; Ndị Hibru 6:10.

Ọ Dịghị Ebe Ọzọ A Ga-aga

12. Mgbe okwu Jisọs mere ka ‘ọtụtụ ndị na-eso ụzọ laghachi n’ihe a hapụrụ,’ olee ọnọdụ Pita weere?

12 A ga-arụgide anyị isoro nzukọ ya jeere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe ma ọ bụrụ na anyị echeta na ọ dịghị ebe ọzọ a ga-aga maka ndụ agwụ agwụ. Mgbe okwu Jisọs mere ka ‘ọtụtụ ndị na-eso ụzọ laghachi n’ihe ndị a hapụrụ,’ ọ jụrụ ndị ozi ya, sị: “Unu onwe unu na-achọkwa ịla?” Pita zaghachiri, sị: “Onyenwe anyị, ònye ka anyị ga-ejekwuru? I nwere okwu nke ndụ ebighị ebi. Ọzọ, anyị onwe anyị ekwerewo marakwa na gị onwe gị bụ Onye Nsọ ahụ nke Chineke.”—Jọn 6:66-69.

13, 14. (a) N’ihi gịnị ka okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ ji ghara inwe ihu ọma Chineke? (b) Gịnị ka otu onye bụ Onyeàmà Jehova ruo ogologo oge kwuru banyere nzukọ Chineke a na-ahụ anya?

13 A chọtaghị “okwu nke ndụ ebighị ebi” n’okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ O.A. Mmehie ya bụ isi bụ ịjụ Jisọs dị ka Mesaịa. Ọ dịghị ụdị ya ebe okpukpe ndị Juu dabeere kpam kpam n’Akụkụ Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ndị Sadusii gọnahụrụ ịdị adị nke ndị mmụọ ozi, ha ekwenyeghịkwa ná mbilite n’ọnwụ. Ọ bụ ezie na ndị Farisii ekwenyeghịrị ha n’ihe ndị a, ná mmehie ha mere ka Okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi omenala ha ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. (Matiu 15:1-11; Ọrụ 23:6-9) Omenala ndị a mere ndị Juu ohu, meekwa ka o siere ọtụtu ndị ike ịnakwere Jisọs Kraịst. (Ndị Kọlọsi 2:8) Ịnụ ọkụ n’obi maka ‘omenala nile nke ndị nna ya’ mere ka Sọl (Pọl) n’amaghị ihe ya jiri obi ọjọọ na-akpagbu ụmụ azụ Kraịst.—Ndị Galetia 1:13, 14, 23.

14 Okpukpe ndị Juu enweghị ihu ọma Chineke, ma Jehova gọziri nzukọ nke ụmụ azụ Ọkpara ya mejupụtara—“ndị obi ha na-anụrụ ọrụ ọma ọkụ.” (Taịtọs 2:14) Nzukọ ahụ ka dịkwa, banyekwara ya otu onye bụ Onyeàmà Jehova ruo ogologo oge sịrị: “Ọ bụrụ na ọ dịwo otu ihe dịkarịsịrị m mkpa, ọ bụwo ihe banyere ịnọgide nzukọ Jehova a na-ahụ anya nso. Ahụmahụ m nwere na nwata akụziworo m otú o si ghara ịdị mma ịdabere n’echiche mmadụ. Ozugbo m mesiworo uche m ike n’isi ihe ahụ, ekpebisiri m ike ịrapagide ná nzukọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. Olee ụzọ ọzọ mmadụ pụrụ isi nweta ihu ọma na ngọzi Jehova?” Ọ dịghị ebe ọzọ a ga-aga maka ihu ọma Chineke na ndụ agwụ agwụ.

15. N’ihi gịnị ka a ga-eji na-ekwenyere nzukọ Jehova a na-ahụ anya na ndị nwere ibu ọrụ na ya?

15 Obi anyị kwesịrị ịkpali anyị ikwenyere nzukọ Jehova n’ihi na anyị matara na ọ bụ nanị ya ka mmụọ ya na-eduzi, ọ na-emekwa ka a mara aha na nzube ya nile. Otú ọ dị, ndị nwere ibu ọrụ na ya ezughị okè. (Ndị Rom 5:12) Ma ‘iwe Jehova dịrị ọkụ’ megide Erọn na Miriam mgbe ha nyopụtawara mmejọ Mosis ma chezọọ na ọ bụ ya, ọ bụghị ha, ka a tụkwasịrị ibu ọrụ Chineke nyere. (Ọnụ Ọgụgụ 12:7-9) Taa, ndị Kraịst na-anọgidesi ike n’ihe na-ekwenyere “ndị na-edu ndú” n’ihi na nke ahụ bụ ihe Jehova chọrọ. (Ndị Hibru 13:7, 17, NW) Ihe àmà nke nnọgidesi ike n’ihe anyị gụnyere ịgachi nzukọ ndị Kraịst anya na ikwu okwu ndị ‘na-akpasu ndị ọzọ ịhụ n’anya na ịrụ ọrụ ọma dị iche iche.’—Ndị Hibru 10:24, 25.

Bụrụ Onye Na-ewuli Elu

16. Ọchịchọ ime gịnị maka ndị ọzọ kwesịkwara ịkwali anyị ijere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe?

16 Ọchịchọ siri ike ịdị na-ewuli ndị ọzọ elu kwesịkwara ịkwali anyị ijere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Pọl dere, sị: “Ọmụma ihe na-afụli elu, ma ịhụnanya na-ewuli elu dị ka ụlọ.” (1 Ndị Kọrint 8:1) Ebe ọ bụ na e nwere ụdị ihe ọmụma na-afụli onye nwere ya elu, Pọl aghaghị ibuwo n’uche na ịhụnanya na-ewulikwa ndị na-egosipụta àgwà dị otú ahụ elu. Otu akwụkwọ Professor Weiss na Professor English dere na-asị: “A na-ahụkwa onye nwere ikike ịhụ n’anya n’anya. Ikike ime ihe ọma na nchebara echiche n’akụkụ nile nke ndụ . . . nwere mmetụta pụtara ìhè nke mwuli elu n’onye na-egosipụta mmetụta ndị dị otú a nakwa n’onye na-anata ha, wee si otú a na-ewetara ha abụọ obi ụtọ.” Site n’igosipụta ịhụnanya, anyị na-ewuli ndị ọzọ na anyị onwe anyị elu, dị ka e gosipụtara n’okwu Jisọs bụ: “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.

17. Olee otú ịhụnanya si ewuli elu, gịnịkwa ka ọ ga-egbochi anyị ime?

17 Ná 1 Ndị Kọrint 8:1, Pọl jiri okwu Grik bụ a·gaʹpe, nke na-egosi ịhụnanya nwere ụkpụrụ, mee ihe. Ọ na-ewuli elu, n’ihi na o nwere ogologo ntachi obi na obi ọma, na-anagide ma na-edi ihe nile, ọ dịghịkwa ada mgbe ọ bụla. Ịhụnanya nke a na-achụpụ mmetụta uche nile na-ebibi ebibi, dị ka nganga na ekworo. (1 Ndị Kọrint 13:4-8) Ịhụnanya dị otú ahụ ga-egbochi anyị ime mkpesa banyere ụmụnna anyị, bụ́ ndị na-ezughị okè dị ka anyị na-ezughị. Ọ ga-egbochi anyị pụọ n’ịghọ “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke” bụ́ ndị “gbebara” n’etiti ezi ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. Ndị ikom ndị a ‘na-ajụkwa ịbụ onyenwe mmadụ, kwuluokwa ndị nọ n’ebube,’ na-apụta na ha na-ekwujọ ndị dị ka ndị nlekọta ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị nwere ebube ụfọdụ e nyere ha. (Jud 3, 4, 8) N’ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova, ka ọ ghara ịdị mgbe anyị dabara n’ọnwụnwa ime ihe ọ bụla yiri ya.

Guzogide Ekwensu!

18. Gịnị ka Setan ga-achọ ime ndị Jehova, ma n’ihi gịnị ka ọ na-apụghị ime otú ahụ?

18 Ịmara na Setan na-achọ ibibi ịdị n’otu anyị dị ka ndị Chineke kwesịrị imesiwanye mkpebisi ike anyị ijere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Ọbụna na Setan ga-achọ ịdọrọ ndị Chineke nile, ndị na-ejere Ekwensu ozi n’ụwa na-egbukwa ndị na-efe ezi ofufe mgbe ụfọdụ. Ma Chineke agaghị ekwe ka Setan hichapụ ha nile. Jisọs nwụrụ iji “mee ka onye ahụ ghara ịdị irè, bụ́ onye nwere ike nke ọnwụ, ya bụ Ekwensu.” (Ndị Hibru 2:14) A kpaworo ókèala ebe Setan na-akpa ike ókè karịsịa eri a chụpụrụ ya n’eluigwe mgbe Kraịst ghọrọ Eze na 1914. Mgbe oge Jehova rukwara, Jisọs ga-ebibi Setan na nzukọ ya.

19. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere mgbalị nile nke Setan ka akwụkwọ a nyere ọtụtụ afọ gara aga? (b) Iji zere ọnyà nile nke Setan, nlezianya dị aṅaa ka anyị kwesịrị ilezi mgbe anyị na-emeso ndị kwere ekwe ibe anyị ihe?

19 N’otu oge akwụkwọ nke a dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na Setan, bụ́ Ekwensu, pụrụ ịkpata ọgba aghara n’etiti ndị Chineke, pụrụ ime ka ha see okwu ma lụọ ọgụ n’etiti onwe ha, ma ọ bụ ka ha gosipụta ma zụlite àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị nke pụrụ iduba ná mbibi nke ịhụnanya n’etiti ìgwè ụmụnna, mgbe ahụ ọ ga-enwe ihe ịga nke ọma n’iloda ha.” (Ụlọ Nche Bekee, May 1, 1921, peji nke 134) Ka anyị ghara ikwe ka Ekwensu bibie ịdị n’otu anyị, ma eleghị anya site n’ịkpali anyị ikwujọ, ma ọ bụ ịlụso ibe anyị ọgụ. (Levitikọs 19:16) Ka Setan ghara ịghọgbu anyị mgbe ọ bụla nke na anyị ga-emerụ ndị ji ịnọgidesi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi ma ọ bụ mee ka ndụ sikwuoro ha ike. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 2:10, 11.) Kama nke ahụ, ka anyị tinye okwu ndị Pita kwuru n’ọrụ, bụ́: “Nwenụ anya udo, na-echenụ nche: onye ahụ nke na-ekuru unu gaa ikpe, bụ́ Ekwensu, dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi: ma na-eguzogidenụ ya, n’ihi na unu dị ike n’okwukwe unu.” (1 Pita 5:8, 9) Site n’iguzosi ike megide Setan, anyị pụrụ ijigide ịdị n’otu anyị a gọziri agọzi dị ka ndị Jehova.—Abụ Ọma 133:1-3.

Dabere na Chineke Site n’Ekpere

20, 21. Olee otú ịdabere na Jehova site n’ekpere si metụta ijere ya ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe?

20 Ịdabere na Chineke site n’ekpere ga-enyere anyị aka ịnọgide na-ejere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe. Mgbe anyị hụrụ na ọ na-aza ekpere anyị, a na-adọta anyị nso karị n’ebe ọ nọ. A gbara ume ịdabere na Jehova Chineke site n’ekpere mgbe Pọl onyeozi dere, sị: “Ezubere m ka ndị ikom na-ekpe ekpere n’ebe nile ọ bụla, na-achịli aka dị ọcha elu, na-eweghị iwe, na-arụghịkwa ụka.” (1 Timoti 2:8) Dị ka ihe atụ, lee ka o si dị mkpa na ndị okenye dabeere na Chineke site n’ekpere! Ngosipụta dị otú ahụ nke ịnọgidesi ike n’ihe nye Jehova mgbe a na-ezukọ ịtụle ihe ndị metụtara ọgbakọ ga-enye aka igbochi arụmụka ndị na-adịghị ebi ebi na ntiwapụ nke iwe pụrụ ibilite.

21 Ịdabere na Jehova Chineke site n’ekpere ga-enyere anyị aka ilekọta ihe ùgwù dị iche iche n’ozi ya. Otu nwoke jeere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe ruo ọtụtụ iri afọ pụrụ ikwu, sị: “Anyị iji obi anyị nakwere ọrụ ọ bụla e kenyere anyị ịrụ ná nzukọ zuru ụwa ọnụ nke Chineke, na anyị ịnọgide n’ọrụ anyị, ghara ịpụ na ya, na-eweta nnwapụta nke ihu ọma Chineke ná mgbalị anyị ji ezi obi tinye. Ọbụna ma ọ bụrụ na o yie ka ọrụ e kenyere bụ nke dị ala, ọ na-abụkarị na ọ bụrụ na e jighị ikwesị ntụkwasị obi rụzuo ya a pụghị ije ọtụtụ ozi ndị ọzọ dị oké mkpa. Ya mere ọ bụrụ na anyị nwere obi umeala ma nwee mmasị kpọmkwem n’ime ka aha Jehova dị ebube ọ bụghị nke anyị, mgbe ahụ anyị ga-ejide n’aka na mgbe nile anyị ‘ga-eguzosi ike, bụrụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Jehova ókè mgbe nile.’”—1 Ndị Kọrint 15:58.

22. Olee otú ọtụtụ ngọzi Jehova na-enye kwesịrị isi metụta ịnọgidesi ike n’ihe anyị?

22 N’agbanyeghị ihe anyị mere n’ozi Jehova, o doro anya na anyị apụghị ịkwụghachi ya ụgwọ maka ihe ọ na-emere anyị. Lee ka anyị si nọrọ ná ntụkwasị obi n’ime nzukọ Chineke, bụrụ ndị ndị enyi ya gbara gburugburu! (Jemes 2:23) Jehova ejiwo ịdị n’otu na-esite n’ịhụnanya ụmụnna nke gbara mkpọrọgwọ miri emi nke ukwuu nke na Setan onwe ya apụghị ifopụ ya gọzie anyị. Ya mere ka anyị rapagide ná Nna eluigwe anyị na-anọgidesi ike n’ihe ma soro ndị ya na-arụkọ ọrụ. Ugbu a na ruo mgbe nile ebighị ebi, ka anyị jeere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Gịnị ka ịnọgidesi ike n’ihe pụtara?

◻ Olee ihe ụfọdụ kwesịrị ịkwali anyị ijere Jehova ozi n’ịnọgidesi ike n’ihe?

◻ N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iguzogide Ekwensu?

◻ Olee otú ekpere pụrụ isi nyere anyị aka ịbụ ndị na-anọgidesi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi?

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndị na-anọgidesi ike n’ihe na-ejere Jehova ozi adịghị ekwe ka Onye Iro ha yiri ọdụm, bụ́ Ekwensu, kpasaa ịdị n’otu ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya