Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche—1999 | Mee 15
    • 6, 7. Ọ bụ ezie na ha bụ ndị na-efe Jehova Chineke ofufe, n’oge ndị dị aṅaa ka ụmụ Israel dapụrụ, n’ihi gịnịkwa?

      6 Nke a mere Israel oge ochie, dị ka Pọl gosiri. O dere, sị: “Ihe ndị a ghọrọ ihe atụ nye anyị, ka anyị wee ghara ịbụ ndị agụụ ihe ọjọọ na-agụ, dị ka agụụ ihe ọjọọ gụkwara ndị ahụ. Unu aghọkwala ndị na-ekpere arụsị, dị ka ụfọdụ n’etiti ha ghọrọ; dị ka e deworo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị Israel nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú. Ka anyị gharakwa ịkwa iko, dị ka ụfọdụ n’etiti ha kwara, wee daa nwụọ n’otu ụbọchị, [puku mmadụ iri abụọ na atọ].”—1 Ndị Kọrint 10:6-8.

      7 Pọl bu ụzọ zoo aka n’oge Israel fere nwa ehi ọlaedo ofufe n’ala ala Ugwu Saịnaị. (Ọpụpụ 32:5, 6) Nke a bụ nnupụisi kpọmkwem megide otu iwu Chineke nke ha kwetaworo na ha ga-erubere isi nanị izu ole na ole tupu mgbe ahụ. (Ọpụpụ 20:4-6; 24:3) Pọl zoziri aka n’oge Israel sooro ndị inyom Moab kpọọ isiala nye Beal. (Ọnụ Ọgụgụ 25:1-9) E ji omume imeju ọchịchọ onwe onye n’ụzọ gabigara ókè, “igwu egwú,”a mara ofufe nwa ehi. Ofufe Beal na ajọ mmekọahụ rụrụ arụ na-agakọ. (Mkpughe 2:14) Gịnị mere ụmụ Israel ji mee mmehie ndị a? N’ihi na ha kwere ka ‘agụụ ihe ọjọọ gụọ’ obi ha—ma ọ̀ bụ ikpere arụsị ahụ ma ọ bụ omume rụrụ arụ ndị ya na ha so.

      8. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Israel?

      8 Pọl gosiri na anyị kwesịrị ịmụta ihe site n’ihe omume ndị a. Mụta gịnị? Onye Kraịst agaghịdị eche echiche ịkpọ isiala nye nwa ehi ọlaedo ma ọ bụ chi ndị Moab oge ochie. Ma gịnị banyere omume rụrụ arụ ma ọ bụ imeju ọchịchọ onwe onye a na-achịkwaghị achịkwa? Ndị a juru ebe nile taa, ọ bụrụkwa na anyị ekwe ka obi anyị nwee ọchịchọ maka ha, ha ga-ekewapụ anyị n’ebe Jehova nọ. Ihe ọ ga-arụpụta ga-abụ otu ihe ahụ anyị ikpere arụsị gaara arụpụta—nkewapụ pụọ n’ebe Chineke nọ. (Tụlee Ndị Kọlọsi 3:5; Ndị Filipaị 3:19.) N’ezie, Pọl mechiri ntụle ọ na-atụle ihe omume ndị ahụ site n’ịgba ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Gbanarịnụ ikpere arụsị.”—1 Ndị Kọrint 10:14.

  • Nọgide Na-eje Ije N’ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche—1999 | Mee 15
    • a N’izo aka n’okwu Grik a sụgharịrị n’ebe a ịbụ “igwu egwú,” otu onye ọkọwa okwu na-ekwu na ọ na-ezo aka n’egwú ndị a gbara n’ememe ndị na-ekpere arụsị, ọ na-agbakwụnyekwa, sị: “A haziri ọtụtụ n’ime egwú ndị a, dị ka a maara nke ọma, iji kpalie mmetụta ndị kasị rụọ arụ.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya