-
Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
Olee Ihe Baịbụl Kwuru Gbasara Mmanya Na-aba n’Anya?
N’ụwa niile, o nwere otú dị iche iche ndị mmadụ si ele mmanya na-aba n’anya anya. Ụfọdụ na-aṅụ mmanya ma ha na ndị enyi ha nọkọọ. Ndị ọzọ anaghịdị emetụ mmanya ọnụ. O nwekwara ndị nke bụ kama ọ ga-adọrọ n’ite, ka ọ dọrọ n’afọ. Olee ihe Baịbụl kwuru gbasara mmanya na-aba n’anya?
1. Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ dị njọ?
Baịbụl ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị njọ. Kama, mgbe ọ na-ekwu gbasara ọtụtụ ihe dị mma Chineke nyere ụmụ mmadụ, ọ sịrị na ‘mmanya na-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ.’ (Abụ Ọma 104:14, 15) Ụfọdụ ndị nwoke na ndị nwaanyị e kwuru okwu ha na Baịbụl, ndị ji obi ha niile fee Chineke, ṅụtụchara mmanya.—1 Timoti 5:23.
2. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere ndị kpebiri ịna-aṅụ mmanya na-aba n’anya?
Jehova achọghị ka anyị bụrụ ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ oké mmanya. (Ndị Galeshia 5:21) Baịbụl kwuru, sị: “Esola ná ndị na-aṅụ oké mmanya.” (Ilu 23:20) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị kpebiri ịna-aṅụ mmanya, ọ bụrụgodị mgbe anyị nọ naanị anyị, anyị ekwesịghị ịṅụ ya ruo nke na isi agaghịzi akpakọ anyị ọnụ, anyị ana-ekwugheri ekwugheri, na-emegheri emegheri ma ọ bụkwanụ merụọ onwe anyị ahụ́. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike ịkwụsị ịṅụ mmanya mgbe anyị na-aṅụhibeghị ya nne, anyị kwesịrị ịkwụsịcha ịṅụ mmanya.
3. Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma a bịa n’ihe ha kpebiri gbasara mmanya na-aba n’anya?
Ọ dịịrị onye ọ bụla n’ime anyị ikpebi ma ọ̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ na ọ gaghị na-aṅụ. Anyị ekwesịghị ịna-akatọ onye ọ bụla kpebiri na ya ga na-aṅụtụ mmanya. Anyị ekwesịghịkwa ime ka onye na-achọghị ịna-aṅụ gbanwee obi ya. (Ndị Rom 14:10) Anyị nwere ike kpebie na anyị agaghị aṅụ mmanya ma ọ bụrụ na ịṅụ ya ga-akpatara ndị ọzọ nsogbu. (Gụọ Ndị Rom 14:21.) Anyị “na-achọ ihe ga-abara onye ọzọ uru, ọ bụghị ihe ga-abara naanị [anyịnwa] uru.”—Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:23, 24.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ikpebi ma ị̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya nakwa ebe ị ga-aṅụru kwụsị ma ọ bụrụ na i kpebiri ịna-aṅụ ya. Chọpụtakwa ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike.
4. Kpebie ma ị̀ ga na-aṅụ mmanya
Olee otú Jizọs si lee ịṅụ mmanya na-aba n’anya anya? Ihe ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a bụ ileba anya n’ọrụ ebube mbụ Jizọs rụrụ. Gụọnụ Jọn 2:1-11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị ka anyị chọpụtara n’ọrụ ebube a Jizọs rụrụ gbasara otú o si lee mmanya na-aba n’anya na ndị na-aṅụ ya anya?
Ebe ọ bụ na Jizọs ekwughị na ịṅụ mmanya na-aba n’anya dị njọ, olee otú Onye Kraịst kwesịrị isi na-ele onye kpebiri na ya ga na-aṅụ mmanya anya?
Ọ bụ eziokwu na o nweghị iwu Onye Kraịst dara ma o kpebie na ya ga na-aṅụ mmanya, ma ọ pụtaghị na ọ ga na-aṅụzi ya otú ọ bụla o si masị ya nakwa mgbe ọ bụla ọ masịrị ya. Gụọnụ Ilu 22:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ihe ndị e depụtara ebe a, ka unu hụ ihe ndị nwere ike inyere mmadụ aka ịma mgbe ọ na-ekwesịghị ịṅụ mmanya na-aba n’anya:
Mgbe mmadụ na-aga ịkwọ ụgbọala ma ọ bụ mgbe ọ na-aga ịkpa aka n’ígwè e ji arụ ọrụ.
Mgbe mmadụ dị ime.
Mgbe dọkịta gwara mmadụ ka ọ ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya.
Mgbe ọ na-esiri mmadụ ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị.
Mgbe iwu obodo machiri ịṅụ mmanya na-aba n’anya.
Mgbe onye ya na mmadụ nọ bụ onye kwụsịrị ịṅụ mmanya n’oge gara aga maka na ọ na-esiri ya ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị.
Ì kwesịrị inye ndị bịara oriri agbamakwụkwọ gị ma ọ bụ oriri ọzọ ị kpọrọ mmanya na-aba n’anya? Unu chọọ ịhụ ihe ga-enyere mmadụ aka ịma ihe ọ ga-eme, kpọnyenụ VIDIO a.
Gụọnụ Ndị Rom 13:13 na 1 Ndị Kọrịnt 10:31, 32. Unu gụchaa nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Olee otú ime ihe ebe a kwuru ga-esi nyere gị aka ikpebi ihe ga-atọ Jehova ụtọ?
Onye Kraịst ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya ma ọ̀ bụ na ọ gaghị na-aṅụ. Ọ bụrụgodị na ọ na-aṅụ mmanya mgbe ụfọdụ, o nwere ike kpebie na ya agaghị aṅụ n’oge ndị ọzọ
5. Kpebie ebe ị ga-aṅụru kwụsị
Ọ bụrụ na i kpebiri na ị ga na-aṅụ mmanya na-aba n’anya, chetakwa na ọ bụ eziokwu na Jehova ekwughị na anyị ekwesịghị ịna-aṅụ mmanya, mana o kwuru na anyị ekwesịghị ịṅụ oké mmanya. Ọ̀ bụ maka gịnị? Gụọnụ Hosia 4:11, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nwere ike ime ma mmadụ na-aṅụ oké mmanya?
Gịnị ga-enyere anyị aka izere ịṅụ oké mmanya? Anyị kwesịrị ịma ebe anyị ga-aṅụru mmanya kwụsị ma ọ bụ mmanya ole isi anyị ga-ebuli. Gụọnụ Ilu 11:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere o ji dị mma ka i kpebie ebe ị ga-aṅụru mmanya kwụsị?
6. Ihe ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya
Chọpụta ihe nyeere otu nwoke aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Na vidio a anyị lere, olee otú Dmitry si akpa àgwà ma ọ ṅụọ mmanya?
Ịkwụsị ịṅụ mmanya ọ̀ dịịrị ya mfe?
Olee otú o sizi mechaa kwụsị ịṅụ oké mmanya?
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 6:10, 11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú ịṅụ oké mmanya dịruru njọ?
Gịnị na-egosi na onye na-aṅụ oké mmanya nwere ike ịgbanwe?
Gụọnụ Matiu 5:30. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Mmadụ igbupụ aka ya Jizọs ji maa atụ ebe a na-egosi na anyị ga-agbasi mbọ ike hapụ ihe ụfọdụ anyị na-eme ka anyị wee mee ihe Jehova chọrọ. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na ịkwụsị ịṅụ oké mmanya na-esiri gị ike?a
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na gị na ndị na-aṅụ oké mmanya na-akpa?
MMADỤ NWERE IKE ỊJỤ GỊ ma ịṅụ mmanya ọ̀ dị njọ.
Gịnị ka ị ga-aza onye ahụ?
NCHỊKỌTA
Jehova kere mmanya ka ọ na-eme anyị obi ụtọ, ma ọ chọghị ka anyị bụrụ ndị aṅụrụma ma ọ bụ ndị na-aṅụ oké mmanya.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịṅụ mmanya na-aba n’anya?
Olee nsogbu ndị nwere ike ịbịara anyị ma anyị na-aṅụ oké mmanya?
Olee otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma a bịa n’ihe ha kpebiri gbasara mmanya na-aba n’anya?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ikpebi ihe dị mma gbasara mmanya na-aba n’anya?
Chọpụta ihe ndị i nwere ike ime ga-enyere gị aka ịkwụsị ịṅụ oké mmanya.
“Ile Mmanya Na-aba n’Anya anya Otú Kwesịrị Ekwesị” (Ụlọ Nche, Jenụwarị 1, 2010)
Onye Kraịst ò kwesịrị iso buru mmanya n’aka na-agọ ọfọ ogologo ndụ na ahụ́ isi ike?
“Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” (Ụlọ Nche, Febụwarị 15, 2007)
Gụọ isiokwu bụ́ “Abụbu m udu mmanya na-anaghị eju eju” ka ị chọpụta otú otu nwoke si kwụsị ịṅụ oké mmanya.
a Onye ọ na-abụ, ọ bụrụ na ọ́ ṅụghị mmanya ahụ́ agaghị eru ya ala kwesịrị ịga hụ dọkịta ka o nyere ya aka. Ọtụtụ ndị dọkịta na-ekwu na onye ọ bụla ọ na-esiri ike ịma ebe ọ ga-aṅụru mmanya kwụsị kwesịrị ịkwụsịcha ịṅụ mmanya.
-
-
Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị EchicheNa-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
-
-
ISI NKE 52
Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịna-echebara Ákwà Anyị na Ejiji Anyị Echiche
Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ụdị ákwà na-amasị ya iyi na otú na-adị ya mma isi eji ejiji. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe dị iche iche Baịbụl kwuru gbasara iyi ákwà na iji ejiji, anyị ga na-eji ụdị ejiji na-amasị ma anyịnwa ma Jehova. Ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru.
1. Olee ihe ndị Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịma ụdị ákwà anyị ga na-eyi na otú anyị kwesịrị isi na-eji ejiji?
Anyị kwesịrị ịna-eji ‘ejiji dị mma, nke na-egosi na anyị na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma.’ Anyị kwesịkwara ịna-adị ọcha, si otú ahụ gosi na anyị “na-efe Chineke.” (1 Timoti 2:9, 10) Ka anyị leba anya n’ihe anọ Baịbụl kwuru: (1) Ejiji anyị kwesịrị ‘ịdị mma.’ Ọ̀ kwa ị chọpụtala na onye ọ bụla n’ime anyị na-eji ụdị ejiji na-amasị ya abịa ọmụmụ ihe anyị? N’agbanyeghị ya, ma ụdị ákwà anyị na-eyi ma ụdị isi anyị na-eme ma ọ bu nke anyị na-akpụ na-egosi na anyị na-asọpụrụ Chineke anyị na-efe. (2) Anyị kwesịrị ‘ịna-emeru ihe n’ókè.’ Ihe ọ pụtara bụ na anyị agaghị na-eji ejiji ga-eme ka ndị ọzọ chewe gbasara mmekọahụ ma ọ bụkwanụ mee ka ha na-agba anyị nkiri. (3) Anyị kwesịrị ‘ịna-ele ihe anya otú dị mma.’ Anyị na-egosi na anyị na-ele ihe anya otú dị mma ma ọ bụrụ na anyị anaghị amalite iji ejiji ọ bụla anyị hụrụ naanị maka na ọ na-ewu ewu. (4) Ejiji anyị kwesịrị igosi mgbe niile na anyị “na-efe Chineke.” Ọ ga-egosi ndị ọzọ na ọ bụ ezi Chineke ka anyị na-efe.—1 Ndị Kọrịnt 10:31.
2. Gịnị mere anyị kwesịrị iji cheta ụmụnna anyị mgbe anyị na-ekpebi ụdị ejiji anyị ga-eji?
Ọ bụ eziokwu na anyị nweere onwe anyị iji ejiji ọ bụla masịrị anyị, ma anyị kwesịrị ịchọpụta ma ụdị ejiji anyị chọrọ iji ọ̀ ga-enye ndị ọzọ nsogbu n’obi. Anyị na-eme ike anyị niile ka anyị ghara ime ihe ga-ewute onye ọ bụla. Kama ime ihe ga-ewute mmadụ, “anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi [anyị] ma na-emere ya ihe dị mma, ka e wee gbaa ya ume.”—Gụọ Ndị Rom 15:1, 2.
3. Olee otú ejiji anyị nwere ike isi mee ka ndị ọzọ chọwa ife Jehova?
Ọ bụ eziokwu na anyị na-eji ejiji dị mma mgbe niile, ma mgbe anyị na-akacha eji ejiji dị mma bụ mgbe anyị na-aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma. Anyị achọghị ka ejiji anyị mee ka ndị mmadụ ghara ịnụ ozi ọma dị mkpa anyị na-ezi ha. Ihe anyị chọrọ bụ ka o mee ka ha chọọ ịbịa soro anyị fewe Jehova nakwa ka ọ “na-achọ ozizi Onye Nzọpụta anyị . . . mma.”—Taịtọs 2:10.
MỤTAKWUO IHE
Chọpụta otú anyị ga-esi amata ma ụdị ákwà anyị na-eyi na otú anyị si eji ejiji hà ga-egosi ndị ọzọ na anyị bụ Ndị Kraịst.
Ejiji anyị nwere ike igosi ma ànyị na-akwanyere ndị ọrụ gọọmentị ùgwù. N’agbanyeghị na Jehova ma ihe dị anyị n’obi, ejiji anyị kwesịkwara igosi na anyị na-akwanyere ya ùgwù
4. Anyị na-egosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù ma anyị na-eji ejiji dị mma
Olee ihe kacha mkpa mere anyị ji echebara ejiji anyị echiche? Gụọnụ Abụ Ọma 47:2. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Olee otú anyị ga-esi na-eji ejiji ma anyị na-echeta mgbe niile na anyị na-anọchite anya Jehova?
Ì chere na anyị kwesịrị ichebara ụdị ejiji anyị na-eji aga ọmụmụ ihe ma ọ bụ ozi ọma echiche? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
5. Otú anyị ga-esi ama ụdị ákwà anyị kwesịrị ịna-eyi na ụdị ejiji anyị kwesịrị ịna-eji
Ma ákwà anyị yi ọ̀ dị oké ọnụ ma ọ bụ na ọ dịghị, o kwesịrị ịdị ọcha ma kwesị ekwesị maka ebe anyị yi ya gaa. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:24 na 1 Timoti 2:9, 10. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ihe mere na anyị ekwesịghị ịna-eyi ákwà ndị . . .
na-adịghị ọcha ma ọ bụ ndị na-ekwesịghị ekwesị maka ihe a bịara.
na-atapara n’ahụ́, ndị na-ahụ ụzọ, ma ọ bụ ndị na-eme ka ndị ọzọ chewe gbasara mmekọahụ.
Ọ bụ eziokwu na iwu ejighị Ndị Kraịst idebe Iwu Mosis, anyị nwere ike isi na ya mata otú Jehova si ele ihe anya. Gụọnụ Diuterọnọmi 22:5. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:
Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịna-eyi ákwà na-eme ka ụmụ nwoke yie ụmụ nwaanyị ma ọ bụ nke na-eme ka ụmụ nwaanyị yie ụmụ nwoke?
Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 10:32, 33 na 1 Jọn 2:15, 16. Unu gụchaa ha, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:
Gịnị mere anyị kwesịrị iji chọpụta ma otú anyị si eji ejiji ọ̀ na-ewute ụfọdụ ndị agbata obi anyị ma ọ bụ ndị ọgbakọ anyị?
Olee ụdị ákwà ndị mmadụ na-eyi ma ọ bụ ụdị ejiji ha na-eji n’ebe i bi?
Ì chere na e nwere ụdị ejiji ha na-eji Onye Kraịst na-ekwesịghị ịna-eji? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
N’agbanyeghị na e nwere ụzọ dịgasị iche iche anyị nwere ike isi jie ejiji, ejiji anyị ka nwere ike ịdị Jehova mma
ỤFỌDỤ NA-ASỊ na ha nweere onwe ha iyi ihe ọ bụla masịrị ha.
Ì kwetara ihe a ha na-ekwu? Gịnị mere i ji zaa ihe ị zara?
NCHỊKỌTA
Ọ bụrụ na anyị ana-eji ejiji dị mma, anyị na-akwanyere Jehova na ndị ọzọ ùgwù.
Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ
Gịnị mere Jehova ejighị ụdị ákwà anyị na-eyi na otú anyị si eji ejiji egwu egwu?
Olee ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru ndị ga-enyere anyị aka ịma ejiji dị mma anyị kwesịrị ịna-eji?
Olee otú ndị mmadụ nwere ike isi na-ele ofufe anyị na-efe Jehova anya n’ihi otú anyị si eji ejiji?
IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA
Chọpụta otú ndị ọzọ nwere ike isi na-ele gị anya n’ihi ụdị ejiji ị na-eji.
Chọpụta ihe mere o ji dị mma ka i chee ihe dị n’igbu egbugbu echee tupu gị egbuo egbugbu.
“Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Igbu Egbugbu?” (Isiokwu gbara n’Ịntanet)
Chọpụta ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru nwere ike inyere anyị aka ịma ụdị ákwà anyị kwesịrị ịna-eyi.
“Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?” (Ụlọ Nche, Septemba 2016)
Chọpụta otú otu nwaanyị chọrọ ife Chineke si malite ile ndị ọzọ anya otú dị mma n’agbanyeghị ụdị ejiji na-amasị ha iji?
“Uwe na Ejiji Bụụrụ M Ihe Mgbochi” (Teta!, Disemba 22, 2003)
-