Isi nke Iri na Ise
Nụrụ Ndụmọdụ, Nara Ịdọ Aka ná Ntị
1. (a) N’ihi gịnị ka ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị ji dị anyị nile mkpa? (b) Ajụjụ dị aṅaa ka ọ dị mkpa ka anyị chebara echiche?
“ANYỊ nile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro,” ka Bible na-ekwu na Jems 3:2. Anyị pụrụ icheta ọtụtụ mgbe anyị na-enweghị ike ịbụ ụdị mmadụ Okwu Chineke na-agba anyị ume ịbụ. Ya mere, anyị na-ekweta na ihe Bible kwuru ziri ezi mgbe ọ sịrị: “Nụrụ ndụmọdụ, narakwa ịdọ aka ná ntị, ka i wee mara ihe n’ikpeazụ gị.” (Ilu 19:20) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na anyị emeworị mgbanwe ná ndụ anyị iji mee ka ha kwekọọ n’ihe Bible na-akụzi. Ma olee otú anyị na-esi emeghachi omume ma ọ bụrụ na Onye Kraịst ibe anyị enye anyị ndụmọdụ n’otu okwu kpọmkwem?
2. Gịnị ka anyị kwesịrị ime mgbe e nyere anyị ndụmọdụ?
2 Ụfọdụ na-emeghachi omume site n’igosi na ihe ha mere ziri ezi, ibelata ịdị njọ ya, ma ọ bụ ibufere ndị ọzọ ụta. Ma ọ ka mma ịnụrụ ndụmọdụ na itinye ya n’ọrụ. (Ndị Hibru 12:11) N’ezie, ọ dịghị onye kwesịrị ịtụ anya izu okè n’aka ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ na-enye ndụmọdụ mgbe nile n’ihe ndị na-erijughị afọ ma ọ bụ n’okwu ndị Bible nyere ndị mmadụ ohere ime ihe masịrị ha. E wezụga nke ahụ, ikekwe onye ahụ na-enye ndụmọdụ atụlebeghị ihe nile merenụ, a pụkwara iji nkwanye ùgwù mee ka ọ mata ha. Ma, n’ihe na-esonụ anyị ga-atụle, ka anyị were ya na ndụmọdụ ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị e nyere kwesịrị ekwesị, bụrụ nke dabeere na Bible. Olee otú mmadụ kwesịrị isi meghachi omume?
Ihe Atụ Ndị Anyị Ga-echebara Echiche Mgbe A Na-enye Anyị Ndụmọdụ
3, 4. (a) Olee ihe dị n’ime Bible nke pụrụ inyere anyị aka ịzụlite echiche ziri ezi banyere ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị? (b) Olee otú Eze Sọl si meghachi omume na ndụmọdụ e nyere ya, gịnịkwa si na ya pụta?
3 Okwu Chineke nwere ahụmahụ dị iche iche mere eme nke ndị natara ndụmọdụ ndị ọ dị mkpa ka e nye ha. Mgbe ụfọdụ, e jikọtara ndụmọdụ ahụ na inye ahụhụ. Otu onye dị otú ahụ bụ Eze Sọl nke Izrel. O rubereghị Jehova isi n’ihe banyere mba Amalek. Ndị Amalek megidere ndị ohu Chineke, ihe Jehova kpebiri n’ikpe bụkwa na e kwesịghị ịhapụ ndị Amalek ma ọ bụ anụ ụlọ ha ndụ. Ma Eze Sọl hapụrụ eze ha na anụmanụ ha ndị kasị mma ndụ.—1 Samuel 15:1-11.
4 Jehova zipụrụ Samuel onye amụma ka ọ gaa dọọ Sọl aka ná ntị. Olee otú Sọl si meghachi omume? Ọ sịrị na ya meriri ndị Amalek ma kpebie nnọọ ịhapụ eze ha ndụ. Otú ọ dị, nke ahụ dị iche n’ihe Jehova nyere n’iwu. (1 Samuel 15:20) Sọl nwara ibufere ndị Izrel ụta maka ịhapụ anụ ụlọ ndị ahụ ndụ, na-asị: “Atụrụ m egwu ndị [Izrel], wee gee ntị olu ha.” (1 Samuel 15:24) O yiri ka o nwere mmasị karị n’ùgwù onwe ya, ọbụna na-agwa Samuel ka ọ sọpụrụ ya n’ihu ndị Izrel. (1 Samuel 15:30) N’ikpeazụ, Jehova jụrụ Sọl dị ka eze.—1 Samuel 16:1.
5. Gịnị mere Eze Ụzaịa mgbe ọ jụrụ ịnara ndụmọdụ?
5 Eze Ụzaịa nke Juda “[mekpuru] mmekpu megide Jehova, bụ́ Chineke ya; o wee baa n’ụlọukwu Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” (2 Ihe E Mere 26:16) Ma ọ bụ nanị ndị nchụàjà pụrụ isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’ụzọ iwu kwadoro. Mgbe onyeisi nchụàjà nwara igbochi Ụzaịa, eze ahụ were iwe. Gịnị mere? Bible na-ekwu, sị: “Ekpenta wara n’egedege ihu ya . . . n’ihi na Jehova etigbuwo ya. Ụzaịa, bụ́ eze, wee bụrụ onye ekpenta ruo ụbọchị ọnwụ ya.”—2 Ihe E Mere 26:19-21.
6. (a) Gịnị mere ma Sọl ma Ụzaịa ji jụ ịnara ndụmọdụ? (b) Gịnị mere anaraghị ndụmọdụ ji bụrụ nsogbu dị oké njọ taa?
6 Gịnị mere o ji siere ma Sọl ma Ụzaịa ike ịnara ndụmọdụ? Nsogbu bụ́ isi ha nwere bụ mpako, onye ọ bụla n’ime ha na-eche banyere onwe ya gabiga ókè. Ọtụtụ ndị na-ewetara onwe ha nhụsianya n’ihi àgwà a. O yiri ka ha na-eche na ịnara ndụmọdụ na-egosi na ọ dị ihe kọrọ ha ma ọ bụ na ọ na-emebi aha ha. Ma mpako bụ adịghị ike. Mpako na-eme ka mmadụ ghara ịdị na-echezi echiche echezi nke na ọ ga na-ajụ enyemaka Jehova nke na-esite n’Okwu ya na nzukọ ya. N’ihi ya, Jehova na-adọ aka ná ntị, sị: “N’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.”—Ilu 16:18; Ndị Rom 12:3.
Ịnara Ndụmọdụ
7. Olee ezi ihe ndị a pụrụ ịmụta site n’ụzọ Mozis si meghachi omume na ndụmọdụ e nyere ya?
7 Akwụkwọ Nsọ nwekwara ihe atụ ndị dị mma nke ndị naara ndụmọdụ, anyị pụkwara ịmụta ihe site na ha. Cheedị banyere Mozis, bụ́ onye nna nwunye ya nyere ndụmọdụ n’otú ọ ga-esi rụọ nnukwute ọrụ dịịrị ya. Mozis ṅara ya ntị ma tinye ya n’ọrụ ozugbo. (Ọpụpụ 18:13-24) N’agbanyeghị na Mozis nwere ikike dị ukwuu, gịnị mere o ji nara ndụmọdụ? N’ihi na ọ dị umeala n’obi. “[Mozis], dị umeala n’obi nke ukwuu, karịa mmadụ nile ndị nọ n’elu ala.” (Ọnụ Ọgụgụ 12:3) Olee otú ịdị umeala n’obi dịruru mkpa? Zefanaịa 2:3 na-egosi na ọ pụtara ndụ anyị.
8. (a) Mmehie dịgasị aṅaa ka Devid mere? (b) Olee otú Devid si meghachi omume n’ịdọ aka ná ntị Netan? (ch) Olee ihe ndị si ná mmehie Devid pụta?
8 Eze Devid so Bat-sheba kwaa iko, nwaakwa ikpuchi ya site n’ime ka e gbuo di ya, bụ́ Uraịa. Jehova zipụrụ Netan onye amụma ịga dọọ Devid aka ná ntị. O chegharịrị ma kweta ozugbo, sị: “Emehiewo m megide Jehova.” (2 Samuel 12:13) Ọ bụ ezie na Chineke nabatara nchegharị Devid, ọ gaje ịta ahụhụ ihe ndị si n’omume ọjọọ ya pụta. Jehova gwara ya na mma agha “agaghị ewezụga onwe ya n’ụlọ” ya, na a ga-ewere ndị nwunye ya nye ụmụ nwoke “ibe” ya, nakwa na nwa nwoke ahụ ọ kwatara n’iko “aghaghị ịnwụkwa.”—2 Samuel 12:10, 11, 14.
9. Gịnị ka anyị na-ekwesịghi ichefu ma ọ bụrụ na e nye anyị ndụmọdụ ma ọ bụ dọọ anyị aka ná ntị?
9 Eze Devid maara uru ịṅa ntị na ndụmọdụ dị mma bara. N’otu oge, o kelere Chineke maka onye e si n’aka ya nye ya ndụmọdụ. (1 Samuel 25:32-35) Ànyị dị otú ahụ? Ọ bụrụ na anyị dị otú ahụ, a ga-echebe anyị pụọ n’ikwu okwu na ime ọtụtụ ihe ndị a pụrụ ịkwa ụta maka ha. Ma gịnị ma ọ bụrụ na anyị adaba n’ọnọdụ ndị dugara n’anyị ịbụ ndị e nyere ndụmọdụ ma ọ bụ ọbụna dọọ aka ná ntị? Ka anyị ghara ichefu na nke a bụ ihe àmà nke ịhụnanya Jehova, n’ihi ọdịmma ebighị ebi anyị.—Ilu 3:11, 12; 4:13.
Àgwà Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Anyị Ga-azụlite
10. Olee àgwà Jizọs gosiri na ọ dị ndị ga-aba n’Alaeze ahụ mkpa?
10 Iji soro Jehova na ụmụnna anyị Ndị Kraịst na-enwe ezi mmekọrịta, ọ dị anyị mkpa ịzụlite àgwà ụfọdụ. Jizọs kwupụtara otu n’ime ha mgbe o mere ka otu nwatakịrị guzoro n’etiti ndị na-eso ụzọ ya, wee sị: “Ọ gwụla ma ùnu chigharịrị wee dịrị ka ụmụntakịrị, unu agaghị aba n’alaeze nke eluigwe ma ọlị. Ya mere, onye ọ bụla nke ga-eweda onwe ya n’ala dị ka nwatakịrị a bụ onye kasị ukwuu n’alaeze nke eluigwe.” (Matiu 18:3, 4) Ọ dị ndị na-eso ụzọ Jizọs mkpa ịzụlite àgwà ịdị umeala n’obi, ebe ha rụrịtara ụka n’etiti onwe ha banyere onye kasị ukwuu.—Luk 22:24-27.
11. (a) N’ebe ònye nọ ka anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, n’ihi gịnịkwa? (b) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, olee otú anyị ga-esi emeghachi omume mgbe e nyere anyị ndụmọdụ?
11 Pita onyeozi dere, sị: “Unu nile werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala obiọma na-erughịrị mmadụ.” (1 Pita 5:5) Anyị maara na ọ dị anyị mkpa ịdị umeala n’obi n’ihu Chineke, ma akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-egosi na ọ dịkwa anyị mkpa ịdị umeala n’obi mgbe anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-emekọ ihe. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị agaghị ajụ aro ndị kwesịrị ekwesị ndị ọzọ tụọrọ anyị kama anyị ga-amụta ihe na ha.—Ilu 12:15.
12. (a) Olee àgwà dị mkpa nke e jikọtara ya na ịdị umeala n’obi n’ụzọ chiri anya? (b) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-echegbu onwe anyị banyere mmetụta omume anyị na-enwe n’ahụ́ ndị ọzọ?
12 Ihe e jikọtara ya na ịdị umeala n’obi n’ụzọ chiri anya bụ inwe nchegbu maka ọdịmma nke ndị ọzọ. Pọl onyeozi dere, sị: “Ka onye ọ bụla nọgide na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ. . . . Ya mere, ma unu na-eri ihe ma unu na-aṅụ ihe ọṅụṅụ ma unu na-eme ihe ọ bụla ọzọ, na-emenụ ihe nile iji nye Chineke otuto. Unu abụrụla ndị Juu na ndị Grik nakwa ọgbakọ Chineke ihe na-eme ka a sụọ ngọngọ.” (1 Ndị Kọrint 10:24-33) Pọl ekwughị na anyị ga-ewezụga ihe nile na-amasị anyị n’ụsọ, kama ọ gbara anyị ume ka anyị ghara ime ihe ọ bụla nke pụrụ ime ka onye ọzọ nwee obi ike ime ihe akọ na uche ya gwara ya na ọ dị njọ.
13. Olee ihe atụ nke pụrụ igosi ma ànyị na-eme ka ọ bụrụ omume anyị itinye ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ?
13 Ị̀ na-ebute ọdịmma nke ndị ọzọ ụzọ tupu ihe ndị na-amasị gị? Anyị nile kwesịrị ịmụta ịdị na-eme nke ahụ. Ọ dị ọtụtụ ụzọ a pụrụ isi mee nke a. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere uwe na ejiji. Ihe ndị a bụ okwu metụtara ihe ndị na-amasị mmadụ bụ́ ndị na-emegideghị ụkpụrụ nduzi Akwụkwọ Nsọ banyere imeru ihe n’ókè, ịdị mma n’anya, na ịdị ọcha. Ma ọ bụrụ na ị mata na n’ihi otú e si zụlite ndị nọ n’ógbè ebe i bi, na uwe gị na ụzọ i si eji ejiji na-egbochi ndị ọzọ ige ntị n’ozi Alaeze ahụ, ị̀ ga-eme mgbanwe? N’ezie, inyere onye ọzọ aka inweta ndụ ebighị ebi dị mkpa karịa ime ihe na-atọ onwe onye ụtọ.
14. Gịnị mere o ji dị mkpa ịzụlite ịdị umeala n’obi na nchegbu maka ndị ọzọ?
14 N’ịdị umeala n’obi na n’igosi nchegbu banyere ndị ọzọ, Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya, ọbụna saa ndị na-eso ụzọ ya ụkwụ. (Jọn 13:12-15) Okwu Chineke na-ekwu banyere ya, sị: “Meenụ ka ụzọ iche echiche a dịrị n’ime unu bụ́ nke dịkwa n’ime Kraịst Jizọs, onye, ọ bụ ezie na ọ dị adị n’ọdịdị nke Chineke, na-echeghị echiche ịnara ihe n’ike, ya bụ, ka o wee hà ka Chineke. Ee e, kama o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi nke mmadụ. Ọzọkwa, mgbe ọ hụrụ onwe ya n’ọdịdị nke mmadụ, o wedara onwe ya n’ala wee rube isi ruo ọnwụ.”—Ndị Filipaị 2:5-8; Ndị Rom 15:2, 3.
Ajụla Ịdọ Aka ná Ntị Jehova
15. (a) Mgbanwe dịgasị aṅaa ka ọ dị anyị mkpa ime iji nwee àgwà na-atọ Chineke ụtọ? (b) Olee ụzọ Jehova siworo nye anyị nile ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị?
15 N’ihi na anyị nile bụ ndị mmehie, ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe n’àgwà na n’omume anyị ma ọ bụrụ na anyị ga-egosipụta àgwà nke Chineke anyị. Ọ dị anyị mkpa iyikwasị “ụdị mmadụ ọhụrụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5-14) Ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị na-enyere anyị aka ịmata ebe ndị ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe, mgbe ahụkwa, ịhụ ụzọ anyị ga-esi mee ha. Ebe bụ́ isi anyị si enweta ntụziaka dị anyị mkpa bụ na Bible n’onwe ya. (2 Timoti 3:16, 17) Akwụkwọ ndị e ji amụ Bible tinyere nzukọ dị iche iche nke nzukọ Jehova kwadebere na-enyere anyị aka itinye Okwu Chineke n’ọrụ. Ọ bụrụgodị na anyị anụwo ndụmọdụ ahụ mbụ, ànyị ga-aghọta na ọ dị anyị mkpa ma gbalịa imeziwanye ihe?
16. Olee aka Jehova na-enyere anyị n’otu n’otu?
16 N’ihi mmetụta nke sitere n’ịhụnanya, Jehova na-enyere anyị aka ná nsogbu anyị. E nyeworo ọtụtụ nde mmadụ aka site n’ọmụmụ Bible ebe obibi. Ndị mụrụ ụmụ na-enye ụmụ ha ndụmọdụ ma na-adọ ha aka ná ntị iji chebe ha pụọ n’omume ndị pụrụ ịkpata obi mgbawa. (Ilu 6:20-23) N’ime ọgbakọ, ọtụtụ mgbe, ụfọdụ ndị na-arịọ ndị ozi nwere ahụmahụ ka ha nye ha ndụmọdụ ma tụọrọ ha aro iji meziwanye ná mgbalị ndị ha na-eme n’ozi ubi. Mgbe ụfọdụ, ndị okenye pụrụ ịrịọ ibe ha ma ọ bụ ndị ọzọ nwere ahụmahụ n’ozi ka ha nye ha ndụmọdụ. Ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ na-eji Bible enyere ndị enyemaka dị mkpa aka, na-eme otú ahụ na mmụọ nke ịdị nwayọọ. Ọ bụrụ na ị na-enye ndụmọdụ, cheta ‘ilekwasị onwe gị anya, a dịghị ama ama a nwaakwa gị.’ (Ndị Galeshia 6:1, 2) Ee, ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị dị anyị nile mkpa iji na-efe onye nanị ya bụ ezi Chineke ahụ ofufe n’ịdị n’otu.
Ntụleghachi n’Ụdị Nkwurịta Okwu
• Olee otú Jehova si jiri ịhụnanya na-enyere anyị aka ịhụ ebe ndị ọ dị anyị mkpa ime mgbanwe?
• Gịnị mere o ji esiri ọtụtụ ndị ike ịnara ndụmọdụ dị mkpa ka e nye ha, oleekwa otú nke a dịruru ná njọ?
• Àgwà dịgasị aṅaa dị oké ọnụ ahịa ga-enyere anyị aka ịdị na-anara ndụmọdụ, oleekwa otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya na ha?
[Foto dị na peeji nke 142]
Ụzaịa jụrụ ndụmọdụ, e meekwa ka ekpenta bịakwasị ya
[Foto dị na peeji nke 142]
Mozis ritere uru site n’ịnara ndụmọdụ sitere n’aka Jetro