Na-agbaso Ụzọ Kachasị Mma nke Ịhụnanya
JEHOVAH CHINEKE bụ ngosipụta nke ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru na anyị kwesịrị ịhụ Chineke na onye agbata obi anyị n’anya. (Matiu 22:37-40) Ee, ọ bụ dabere n’àgwà nke a ka Chineke na-eme ihe n’ime eluigwe na ụwa nile! Ya mere, maka ndụ ebighị ebi n’ebe ọ bụla, anyị aghaghị ịgbaso ụzọ nke ịhụnanya.
Chineke gosiri ịhụnanya maka mba Israel ma mesịa jụ nzukọ ahụ n’ihi ekwesịghị ntụkwasị obi ha. Mgbe ahụ, o mere ka a mata ọgbakọ nke ndị na-eso ụzọ Jisọs dị ka nzukọ ọhụrụ Ya. N’ụzọ dị aṅaa? Site ná ngosipụta pụrụ iche nke mmụọ nsọ inye ha ike ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche na ibu amụma. Otú a, na Pentikọst nke 33 O.A., 3,000 ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu ghọrọ ndị kwere ekwe ma hapụ nzukọ ochie ahụ maka nke ọhụrụ Chineke. (Ọrụ 2:1-41) Ebe onyinye nke mmụọ nsọ ahụ bụ nke a na-enye mgbe nke ahụ gasịrị site n’aka ndị ozi Jisọs, ngosipụta ndị dị otú ahụ kwụsịrị mgbe ha nwụrụ. (Ọrụ 8:5-18; 19:1-6) Ma ná mgbe ahụ onyinye ndị ahụ egosiwo na ihu ọma Chineke dị n’ahụ Israel ime mmụọ.—Galetia 6:16.
Ọrụ ebube ndị si n’onyinye dị iche iche ndị ahụ nke mmụọ nsọ nwere abamuru. Otú ọ dị, igosi ịhụnanya ma ọ bụ nchegbu nke na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị maka ndị ọzọ dị mkpa karịa inwe onyinye dị iche iche nke mmụọ nsọ. Pọl onyeozi gosiri nke a n’akwụkwọ ozi mbụ ya nye ndị Kọrint (n’ihe dị ka 55 O.A.). N’ime ya, o kwuru okwu banyere ịhụnanya dị ka “ụzọ nke kachasị mma.” (1 Ndị Kọrint 12:31) A kọwara ụzọ ahụ na 1 Ndị Kọrint isi 13.
Ma Énweghị Ịhụnanya, Anyị Abụghị Ihe Ọ Bụla
Pọl tụgharịrị uche, sị: “A sị na eji m asụsụ dị iche iche nke mmadụ na nke ndị mmụọ ozi na-ekwu okwu, ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ọla na-ara ara, ma ọ bụ ájà ọla na-ada ụda.” (1 Ndị Kọrint 13:1) Ọ bụrụ na ịhụnanya adịghị, ọ ga-abụ ihe na-abaghị n’ihe ikwu okwu n’asụsụ mmadụ ma ọ bụ nke mmụọ ozi nke eluigwe, bụ́ nke mmụọ nsọ nyere ike ya. Pọl họọrọ ikwu mkpụrụ okwu ise na-ewuli elu karịa puku iri n’asụsụ nke ndị mmadụ na-aghọtaghị. (1 Ndị Kọrint 14:19) Onye na-adịghị ahụ n’anya ga-adị ka “ọla na-ara ara”—ngwa egwú na-eme ụ̀zụ̀, nke na-akpasu mmadụ iwe—ma ọ bụ “ájà ọla na-ada ụda” nke na-adịghị ụtọ ná ntị. Ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche n’ejighị ịhụnanya abụghị ụzọ dị mma, na-ewuli elu n’ụzọ ime mmụọ nke e ji eto Chineke ma nyere ndị ya aka. Taa, anyị na-egosi ịhụnanya site n’iji okwu na-ekwe nghọta mee ihe n’ije ozi ndị Kraịst.
Onyeozi ahụ kwuru ihe ọzọ, si: “A sịkwa na enwere m onyinye ibu amụma, matakwa ihe omimi nile na ihe ọmụma nile; a sịkwa na enwere m okwukwe nile, nke mere m ga-enwe ike ibubiga ugwu, ma enweghị m ịhụnanya, abụghị m ihe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:2) Ibu amụma n’ụzọ ọrụ ebube, nghọta pụrụ iche nke ihe omimi ndị dị nsọ, na ihe ọmụma nke mmụọ nsọ nyere pụrụ ịbara ndị ọzọ uru ma ọ bụghị ndị ahụ nwere onyinye ndị dị otú ahụ ma ọ bụrụ na ndị ahụ e nyere onyinye ahụ adịghị ahụ n’anya. Pọl jiri nghọta pụrụ iche nke ihe omimi ndị dị nsọ nyere ndị ọzọ aka, onyinye nke amamihe nyekwaara ya aka ibu amụma nlanarị nke ndị ụgbọ okpukpu ahụ metụtara. (Ọrụ 27:20-44; 1 Ndị Kọrint 4:1, 2) Ma, ọ bụrụ na o nwere ‘ihe ọmụma nile na okwukwe nile’ ma ọ dịghị ahụ n’anya, ọ gaghị abụ ihe ọ bụla n’anya Jehova.
Taa, mmụọ Jehova na-enyere Ndịàmà ya aka ịghọta amụma dị iche iche na ihe omimi ndị dị nsọ nke Bible, na-eduzikwa ha n’inye ndị ọzọ ụdị ihe ọmụma dị otú ahụ. (Joel 2:28, 29) Mmụọ nsọ na-emekwa ka e nwee okwukwe dị mkpa iji merie ihe mgbochi ndị dị ka ugwu. (Matiu 17:20) Ebe mmụọ nsọ na-eme ihe ndị a, ọ bụ ihe na-adịghị mma isite na ha chọọ otuto onwe onye. Anyị abụghị ihe ọ bụla, ọ gwụlakwa ma anyị mere ihe nile maka otuto Chineke, na-ejikwa ịhụnanya maka ya na maka ụmụ mmadụ ibe anyị.—Ndị Galetia 5:6.
Àjà nke Ịhụnanya Na-adịghị Na Ya Abaghị Uru
Pọl kwuru, sị: “A sịkwa na eweere m ihe nile m nwere zụọ ndị ogbenye, a sịkwa na araara m ahụ m nye ka e wee ree m ọkụ, ma enweghị m ịhụnanya, ọ baghịrị m uru ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:3) Ma ịhụnanya adịghị, ọ gaghị abara Pọl uru ma ọ bụrụ na o nye ihe nile o nwere iji zụọ ndị ọzọ. Chineke na-akwụ anyị ụgwọ maka ịhụnanya nke dị n’azụ onyinye anyị, ọ bụghị n’ihi uru ha a na-ahụ anya ma ọ bụ n’ihi na anyị na-achọ otuto dị ka ndị nyere ihe, dị ka ndị ụgha bụ Ananaịas na Safaịra. (Ọrụ 5:1-11) Pọl setipụrụ ezi ihe nlereanya site n’iji ịhụnanya nye onwe ya maka ozi inye aka maka ndị kwere ekwe dị na Judia.—1 Ndị Kọrint 16:1-4; 2 Ndị Kọrint 8:1-24; 9:7.
Ọbụna ịnwụ n’ihi okwukwe dị ka onye àmà nye eziokwu ahụ ma ghara inwe ịhụnanya apụtaghị ihe ọ bụla. (Ilu 25:27) Jisọs kwuru okwu banyere àjà ya ma o jighị ya mee mpako. Kama ime mpako o jiri ịhụnanya jiri ọchịchọ ya nile nye onwe ya. (Mak 10:45; Ndị Efesọs 5:2; Ndị Hibru 10:5-10) Ụmụnna ya nke ime mmụọ ‘chere ahụ ha n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ’ n’ozi Chineke ọ bụghị ịnwụ n’ihi okwukwe maka otuto onwe onye ma ọ bụghị n’ụzọ ndị na-adọrọ anya nke na-enye Jehova otuto ma gosipụta ịhụnanya ha maka ya.—Ndị Rom 12:1, 2.
Ụzọ Ụfọdụ nke Ịhụnanya Ga-eme Ka Anyị Si Mee Omume
Pọl dere, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obi ọma.” (1 Ndị Kọrint 13:4a) Nye ọtụtụ ndị, ogologo ntachi obi Chineke kemgbe mmehie Adam arụpụtawo nchegharị nke na-eduga ná nzọpụta. (2 Pita 3:9, 15) Ọ bụrụ na anyị nwere ịhụnanya, anyị ga-eji ndidi na-ezi ndị ọzọ eziokwu ahụ. Anyị ga-ezere ịbụ ndị na-etiwapụ n’iwe n’ihi mmetụta, anyị ga na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-agbaghara. (Matiu 18:21, 22) Ịhụnanya nwekwara obi ọma, anyị na-abịarukwa Chineke nso n’ihi obi ọma ya. Mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya bụ obi ọma na-egbochi anyị ịdị na-atụ anya ihe dị ukwuu n’aka ndị ọzọ karịa ka ọ na-atụ anya n’aka anyị. (Ndị Efesọs 4:32) Ọbụna ịhụnanya na-eme ka anyị nwee obi ọma n’ebe ndị na-enweghị ekele nọ.—Luk 6:35.
Pọl kwukwara, sị: “Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo; ịhụnanya adịghị anya isi, ọ dịghị afụli onwe ya elu.” (1 Ndị Kọrint 13:4b) Ekworo bụ ọrụ nke anụ ahụ nke ga-eme ka mmadụ ghara ịba n’Alaeze Chineke. (Galetia 5:19-21) Ịhụnanya na-egbochi anyị ikworo ihe onwunwe onye ọzọ ekworo ma ọ bụ ọnọdụ ọma ndị o nwere. Ọ bụrụ na o nweta ihe ùgwù ije ozi anyị nwere ọchịchọ ya, ịhụnanya ga-eme ka anyị soro ya ṅụrịa, nye ya nkwado anyị, ma kelee Chineke na a pụrụ iji ya mee ihe maka abamuru ọgbakọ.
Ebe ịhụnanya “na-adịghị anya isi,” ọ dịghị akpali anyị ịnya isi banyere ihe Chineke mere ka anyị mee n’ozi ya. Ụfọdụ ndị Kọrint nyara isi dị ka à ga-asị na onyinye ndị ahụ nke mmụọ nsọ si n’ebe ha nọ malite, ma ndị a sitere n’aka Chineke, dịkwa ka ihe ùgwù dị iche iche ná nzukọ ya nke oge a. Kama ịnya isi n’ihi ọnọdụ anyị ná nzukọ Chineke, mgbe ahụ, ka anyị kpachara anya ka anyị ghara ịda. (1 Ndị Kọrint 1:31; 4:7; 10:12) Ịhụnanya “adịghị afụli onwe ya elu,” ma ịdị mkpa onwe onye pụrụ ime ka uche nke onye na-adịghị ahụ n’anya fụlie elu. Ndị na-ahụ n’anya adịghị enwe echiche nke ịkarị ndị ọzọ ukwuu.—1 Ndị Kọrint 4:18, 19; Galetia 6:3.
Ọ dịghị Eme Ihe Na-adịghị Mma n’Anya, Achọ Ihe nke Aka Ya Nanị, Ewesa Ndị Ọzọ Iwe
Ịhụnanya ‘adịghị eme ihe na-adịghị mma n’anya, ọ dịghị achọ ihe nke aka ya, oké iwe adịghị ewe ya, ọ dịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.’ (1 Ndị Kọrint 13:5a) Ọ na-akwalite àgwà ọma, omume na-asọpụrụ Chineke, nkwanye ùgwù maka ndị ọchịchị, na àgwà dị mma ná nzukọ dị iche iche nke ndị Kraịst. (Ndị Efesọs 5:3-5; 1 Ndị Kọrint 11:17-34; 14:40; tụlee Jude 4, 8-10.) Ebe ịhụnanya na-eme ka onye ọ bụla nwee echiche nke ịbụ onye a chọrọ, dị ka akụkụ nile nke ahụ mmadụ, ọgbakọ nke na-ahụ n’anya bụ ebe udo na mgbaba. (1 Ndị Kọrint 12:22-25) Kama iji ọchịchọ nke ọdịmma onwe onye nanị ‘na-achọ ọdịmma nke aka ya,’ ịhụnanya na-eme ka anyị jiri ihe ndị ruuru anyị na-achụ àjà mgbe ụfọdụ ma gosi mmasị n’ebe ndị ọzọ na ọdịmma ha nọ. (Ndị Filipaị 2:1-4) Ịhụnanya na-eme ka anyị ‘ghọọ ihe nile n’ebe mmadụ nile nọ, ka anyị wee zọpụta ụfọdụ’ site n’ije ozi anyị.—1 Ndị Kọrint 9:22, 23.
“Oké iwe adịghị ewe” ịhụnanya. Oké iwe bụ ọrụ nke anụ ahụ na-emehie emehie, ma ịhụnanya na-eme ka anyị ‘ghara ịdị ngwa iwe iwe.’ (Jemes 1:19; Galetia 5:19, 20) Ọbụna ma ọ bụrụ na e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji wee iwe, ịhụnanya adịghị ekwe ka anyị nọgide bụrụ ndị a kpasuru iwe, si otú a na-emeghere Ekwensu ụzọ. (Ndị Efesọs 4:26, 27) Ndị okenye karịsịa aghaghị izere iwe ma ọ bụrụ na ndị kwere ekwe ibe ha adaa n’itinye aro ụfọdụ n’ọrụ.
Banyere ịhụnanya Pọl kwukwara, sị: “Ọ dịghị agụ ihe ọjọọ e mere ya.” (1 Ndị Kọrint 13:5b) Ịhụnanya adịghị edekọ ihe ọjọọ, dị ka n’akwụkwọ e ji edekọ ihe. Ọ na-ahụ ihe dị mma n’ime ndị kwere ekwe ibe anyị, ọ dịghị emegwara ihe ọjọọ e mere eme n’ezie ma ọ bụ nke e chere na e mere. (Ilu 20:22; 24:29; 25:21, 22) Ịhụnanya na-enyere anyị aka ịdị “na-agbaso ihe nile dịrị udo.” (Ndị Rom 14:19) Pọl na Banabas sere okwu wee kewaa n’ozi Chineke, ma ịhụnanya gwọtara nsogbu ahụ wee gbochie ha iburu ibe ha ihe ọjọọ n’obi.—Levitikọs 19:17, 18; Ọrụ 15:36-41.
Ọ Na-adịnyere Ezi Omume na Eziokwu
Banyere ịhụnanya, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ dịghị aṅụrị ọṅụ n’ime ajọ omume, ma ọ na-eso eziokwu ṅụrịkọọ ọṅụ.” (1 Ndị Kọrint 13:6) Ụfọdụ ndị na-enwe obi ụtọ n’ajọ omume nke na “ha adịghị arahụ ụra, ọ bụrụ na ha adịghị eme ihe ọjọọ.” (Ilu 4:16) Ma n’ọgbakọ Chineke, anyị adịghị amarịta ibe anyị aka ma ọ bụ ṅụrịa ọṅụ ma ọ bụrụ na mmehie amata mmadụ n’ọnya. (Ilu 17:5; 24:17, 18) Ọ bụrụ na e nwere ịhụnanya zuru ezu maka Chineke na ezi omume n’ọgbakọ dị na Kọrint, a garaghị ekwere ka omume rụrụ arụ dịrị n’ebe ahụ. (1 Ndị Kọrint 5:1-13) Tinyere ihe ndị ọzọ, ịhụnanya maka ezi omume ga-egbochi anyị inwe obi ụtọ n’ajọ omume ndị a na-egosi na telivishọn, sinima, ma ọ bụ n’ebe a na-eme ihe nkiri.
Ịhụnanya “na-eso eziokwu ṅụrịkọọ ọṅụ.” N’ebe a, e gosiri ọdịiche dị n’eziokwu na ajọ omume. N’ụzọ ihe àmà dị na ya, nke a pụtara na ịhụnanya na-eme ka anyị nwee obi ụtọ n’ihi ikike eziokwu ahụ na-enwe n’ahụ ndị mmadụ ime ka ha mee ezi omume. Ịhụnanya na-egbochi anyị ikwu okwu ụgha, na-enye anyị ọṅụ mgbe a nwapụtara onye ziri ezi dị ka onye ọ na-adịghị ihe ọjọọ o mere, na-emekwa ka anyị ṅụrịa ọṅụ ná mmeri nke eziokwu Chineke.—Abụ Ọma 45:4.
Ụzọ Ịhụnanya Si Emeso Ihe Nile
N’ịga n’ihu ná nkọwa ya nke ịhụnanya, Pọl dere, sị: “Ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 13:7) ‘N’ịnagide ihe nile,’ ịhụnanya na-egbochi ibu iwe n’obi ghara ịdị dị ka elu ụlọ dị mma na-egbochi mmiri ozuzo. Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ anyị ma mgbe ahụ rịọ maka mgbaghara, ịhụnanya na-eme ka anyị die mmerụ ahụ, ịgbaghara onye ahụ mejọrọ anyị kama iji ihe ndị ahụ gbaa àsị̀rị̀. N’ịhụnanya anyị na-agbalị ‘irite nwanna anyị n’uru.’—Matiu 18:15-17; Ndị Kọlọsi 3:13.
Ịhụnanya “na-ekwere ihe nile” n’Okwu Chineke, na-emekwa ka anyị nwee ekele nri ime mmụọ a na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Ọ bụ ezie na adịghị aghọgbu anyị ngwa ngwa, ịhụnanya na-egbochi anyị inwe obi nke na-adịghị ekwe ekwe, na-egbochikwa anyị inye nkọwa na-ezighị ezi banyere ebumnuche ndị kwere ekwe ibe anyị. (Eklisiastis 7:21, 22) Ịhụnanya ‘na-elekwa anya ihe nile’ e dekọrọ n’Akwụkwọ nsọ, dị ka eziokwu banyere Alaeze Chineke. N’ịbụ ndị ịhụnanya kpaliri, anyị na-enwe olileanya ma na-ekpe ekpere maka ọnọdụ dị iche iche na-eweta ule ịrụpụta ihe kachasị mma. (1 Pita 3:15) Tụkwasị ná nke a, ịhụnanya “na-enwe ntachi obi n’ihe nile,” tinyere mmehie e mere megide anyị. (Ilu 10:12) Ịhụnanya maka Chineke na-enyekwara anyị aka ịtachi obi ná mkpagbu na n’ule ndị ọzọ dị iche iche.
Pọl kwukwara, sị: “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8a) Ọ dịghị agwụsị ma ọ bụ daa dị ka Jehova na-adịghị ada. Ebe Chineke ebighị ebi anyị bụ ezi ihe atụ nke ịhụnanya, àgwà nke a agaghị akwụsị ịdị. (1 Timoti 1:17; 1 Jọn 4:16) Ịhụnanya ga-adị na-achịkwa eluigwe na ala mgbe nile. N’ihi ya ka anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka imeri àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye ma gosipụta mkpụrụ nke a nke mmụọ nsọ ya nke na-adịghị ada ada.—Luk 11:13.
Ihe Ndị Gaje Ịgabiga
N’izo aka n’ọdịnihu, Pọl dere, sị: “Ma ọ bụrụ na ibu amụma dị, a ga-eme ka ha ghara ịdị irè; ọ bụrụkwa na asụsụ dị iche iche dị, ha ga-agwụ; ọ bụrụkwa na ihe ọmụma dị, a ga-eme ka ọ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 13:8b) ‘Onyinye ibu amụma’ nyeere ndị nwere ha aka ibu amụma ndị dị ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ụdị onyinye ndị dị otú ahụ gabigara mgbe e guzobesịrị ọgbakọ ndị Kraịst dị ka nzukọ Chineke, ike ibu amụma ya agabigaghị mgbe ọ bụla, Okwu ya nwekwara amụma nile dị anyị mkpa ugbu a. Ike nke mmụọ nsọ nyere ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche kwụsịkwara, e mekwara ka ihe ọmụma pụrụ iche “ghara ịdị irè,” dị ka e buru n’amụma. (Ndị Rom 10:8-10) Ọzọkwa, ndị Chineke jupụtakwara ná mmụọ ya, na-amịpụtakwa mkpụrụ ya.
Pọl gara n’ihu, sị: “N’ihi na anyị maara ná mkpirikpi, anyị na-ebukwa amụma ná mkpirikpi: ma mgbe ọ bụla ihe nke zuru okè ga-abịa, a ga-eme ihe nke dị ná mkpirikpi ka ọ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 13:9, 10) Onyinye nke ihe ọmụma na amụma ezughị ezu. N’ụzọ doro anya, amụma dị otú ahụ akọwazughị ihe nile, onye amụma nke ọ bụla kwa ekpughezughị ọdịnihu, ghara inwe ihe ọmụma zuru okè banyere ihe o buru amụma ya. Otú ọ dị, ugbu a, nghọta nke amụma ji nke nta nke nta na-ezu. Dị ka ihe atụ, eziokwu ndị na-emezu amụma nke Bible na-emesi ya ike na Jisọs natara ike nke ịbụ eze n’elu ihe a kpọrọ mmadụ na 1914. Kemgbe ahụ, anyị anọwo ná “mgbe ọgwụgwụ,” na-enwekwa obi ụtọ nke uto na-aga n’ihu n’ihe ọmụma ime mmụọ na nghọta nke amụma Bible. (Daniel 12:4) N’ihi ya, anyị na-abịaru n’ihe ọmụma zuru okè, “ihe nke zuru okè” aghaghị ịdị nso.
Àgwà nke Kasị Ukwuu Na-anọgide
N’izo aka n’ọganihu nke ọgbakọ ahụ, Pọl dere, sị: “Mgbe m bụrịị nwa ọhụrụ, ana m ekwu dị ka nwa ọhụrụ, ana m atụkwasị uche n’ihe dị ka nwa ọhụrụ, ana m agụ ihe dị ka nwa ọhụrụ: ugbu a mgbe m ghọworo okenye, emewo m ka omume nwa ọhụrụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 13:11) Ebe nwa ọhụrụ na-eme ihe ná ndabere nke ihe ọmụma na uto anụ ahụ a kpaara ókè, a pụrụ inugharị ya ihu na azụ, dị ka à ga-asị na ọ bụ n’elu àkwà nwa ọhụrụ. Ma onye bụ nwoke etowo eto n’ụzọ anụ ahụ karịa, o nwekwara amamihe ka ukwuu, ọ naghị adịkarị mfe ịkwagharị ya. O wepụsịwo echiche, àgwà, na ụdị ime ihe ụmụaka. N’otu aka ahụ, mgbe nzukọ elu ala nke Chineke topụtasịrị site n’ịbụ nwa ọhụrụ, O kpebiri na onyinye mmụọ nsọ nke amụma, asụsụ dị iche iche, na ihe ọmụma adịghị ya mkpa. Ọ bụ ezie na ndị òtù nke ọgbakọ ahụ n’oge a, nke nọ ugbu a n’oge agadị ya, ahụghịkwa ọdịmkpa nke onyinye ndị dị otú ahụ, ha nwere obi ụtọ ijere Chineke ozi n’okpuru nduzi nke mmụọ ya.
Pọl kwukwara, sị: “N’ihi na ugbu a anyị ji enyo hụ ihe, n’ime ilu; ma mgbe ahụ anyị ga-ahụ ihu na ihu: ugbu m maara ná mkpirikpi; ma mgbe ahụ m ga-amazu dị ka a mazukwara m.” (1 Ndị Kọrint 13:12) N’oge ọgbakọ ahụ bụ nwa ọhụrụ, ọ bụghị oge Chineke ikpughe ihe ụfọdụ. N’ihi ya, ha hụrụ ihe n’inyoghị inyoghị, dị ka à ga-asị na ndị Kraịst na-ele anya n’enyo nke ihu ya na-adịghị egbukepụ n’ụzọ dị mma. (Ọrụ 1:6, 7) Ma anyị agabigawo ịhụ ihe n’inyoghi inyoghi. E nwere ihe àmà pụtara ìhè nke mmezu nke amụma na ihe dị n’akwụkwọ nsọ, n’ihi na nke a bụ oge Chineke maka mkpughe. (Abụ Ọma 97:11; Daniel 2:28) Ọ bụ ezie na Pọl maara Chineke, ihe ọmụma kasịnụ nke Jehova na mmekọrịta kasị chie anya nke ya na Ya ga-adị mgbe a ga-ebilite onyeozi ahụ n’ọnwụ gaa ná ndụ eluigwe, si otú a na-enweta ụgwọ ọrụ zuru ezu nke ụzọ ya nke ịbụ onye Kraịst.
N’imechi okwu ya nke ezi ihe atụ nke ịhụnanya, Pọl dere, sị: “Ma ugbu a ka okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a, na-anọgide; ma nke kachasị n’ihe ndị a bụ ịhụnanya.” (1 Ndị Kọrint 13:13) N’agbanyeghị na onyinye ọrụ ebube nke mmụọ nsọ adịghị, ọgbakọ ahụ na-enwe ugbu a ihe ọmụma zuru ezu karịa, nweekwa ezi ihe mere a ga-eji nwe okwukwe, olileanya, na ịhụnanya ka mma. O nwere okwukwe na a ga-agụ ihe nile nke Chineke kweworo ná nkwa dị ka ihe mezuworo emezu. (Ndị Hibru 11:1) Akụkụ dị iche iche nke okwukwe ga-agwụsị ka a na-enweta ihe ndị e buru amụma ya n’Okwu Chineke. Akụkụ dị iche iche nke olileanya ga-akwụsị mgbe anyị hụrụ ihe ndị ahụ a na-ele anya ha. Ma ịhụnanya na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, ka Ndịàmà Jehova nile nọgide n’ịgbaso ụzọ kachasị mma nke ịhụnanya.