Jehova Iji “Ihe Nzuzu” Mee Ihe Iji Zọpụta Ndị Kwere Ekwe
“Ebe, n’amamihe Chineke, ụwa site n’amamihe ya amaghị Chineke, Chineke hụrụ ihe dị mma site n’ihe nzuzu nke ihe a na-ekwusa iji zọpụta ndị kwere ekwe.”—1 NDỊ KỌRINT 1:21, NW.
1. N’echiche dị aṅaa ka Jehova ga-eji “ihe nzuzu” mee ihe, oleekwa ụzọ anyị si mara na ụwa, n’amamihe ya amaghị Chineke?
GỊNỊ? Jehova ọ̀ ga-eji ihe nzuzu mee ihe? Ọ dịghị otú ahụ n’ezie! Ma ọ pụrụ, ọ na-ejikwa ihe yiri ihe nzuzu n’anya ụwa na-eme ihe. Ọ na-eme otú ahụ iji wee zọpụta ndị mmadụ bụ́ ndị maara ma hụ ya n’anya. Site n’amamihe nke ụwa nwere, ụwa apụghị ịmara Chineke. Jisọs Kraịst mere ka nke a pụta ìhè mgbe o kwuru n’ekpere, sị: “Nna nke bụ onye ezi omume, ụwa amaghị gị.”—Jọn 17:25.
2. Olee ụzọ ọ pụrụ isi yie ka ụzọ nile nke Jehova na ụzọ nile nke ụwa na-agakọ ụkwụ na ụkwụ, ma olee ihe ndị bụ eziokwu banyere nke ahụ?
2 Okwu Jisọs na-egosi na ụzọ nile nke Jehova dị iche na nke ụwa. N’elu elu, ọ pụrụ iyi ka nzube Chineke na nke ụwa nke a na-agakọ ụkwụ na ụkwụ. Ọ pụrụ iyi ka nzube nile nke ụwa nke a nwere ngọzi Chineke. Dị ka ihe atụ, Bible na-ekwu na Chineke ga-eguzobe otu ọchịchị ezi omume nke ga-eweta ndụ udo, obi ụtọ, na ihe onwunwe nye ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ala. (Aịsaịa 9:6, 7; Matiu 6:10) N’otu aka ahụ, ụwa na-ekwupụta nzube nke inye ndị mmadụ udo, ihe onwunwe, na ezi ọchịchị site n’ihe a kpọrọ ọnọdụ ụwa ọhụrụ. Ma nzube Chineke na nke ụwa abụghị otu ihe. Nzube Jehova bụ iwepụ onwe ya n’ụta dị ka Ọkaaka Kasị Elu nke eluigwe na ala. Nke a ka ọ ga-eme site n’otu ọchịchị eluigwe nke ga-ekpochapụ ọchịchị nile nke elu ala. (Daniel 2:44; Mkpughe 4:11; 12:10) Ya mere, ọ dịghị ihe Chineke na ụwa nke a nwekọrọ. (Jọn 18:36; 1 Jọn 2:15-17) Nke ahụ mere Bible ji na-ekwu okwu banyere ụdị amamihe abụọ—“amamihe Chineke” na “amamihe nke ụwa.”—1 Ndị Kọrint 1:20, 21.
Ntụpọ Bụ Isi nke Amamihe Ụwa
3. Ọ bụ ezie na amamihe nke ụwa pụrụ iyi ihe dị mma, n’ihi gịnị ka ọnọdụ ụwa ọhụrụ nke mmadụ kwere nkwa ya na-agaghị eji weta afọ ojuju ma ọlị?
3 Nye ndị ahụ amamihe Chineke na-adịghị eduzi, amamihe ụwa yiri ihe mara mma. E nwere nkà ihe ọmụma ndị na-ada oké ụda bụ́ ndị na-adọrọ uche. Ọtụtụ puku ụlọ akwụkwọ agụmakwụkwọ dị elu na-enye ihe ọmụma sitere n’ihe ọtụtụ lere anya dị ka uche ndị kasị dị nkọ nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ebe ndebe akwụkwọ juru eju na-ejupụta n’ihe ọmụma ndị a mụtara amụta nke ọtụtụ narị afọ nke ahụmahụ mmadụ. Otú ọ dị, n’agbanyeghị nke a, ọnọdụ ụwa ọhụrụ nke ndị ọchịchị ụwa na-eme atụmatụ ya pụrụ ịbụ nanị ọchịchị dị n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị nwere ntụpọ mmehie, na-anwụkwa anwụ. Ya mere, ọnọdụ ahụ ga-abụ nke na-ezughị okè, nke na-emeghachi ọtụtụ omume nzuzu oge gara aga na nke na-adịghị egbo mkpa nke ihe a kpọrọ mmadụ ma ọlị.—Ndị Rom 3:10-12; 5:12.
4. Gịnị ka ọnọdụ ụwa ọhụrụ nke a na-eme atụmatụ ya jupụtara na ya, gịnịkwa na-esi na nke a apụta?
4 Atụmatụ mmadụ na-eme maka ọnọdụ ụwa ọhụrụ bụ nke jupụtara ọ bụghị nanị ná ntụpọ nke mmadụ kamakwa ná mmetụta nke ndị ajọ mmụọ e kere eke—ee, Setan bụ́ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya. Setan emewo ka uche ndị mmadụ kpuo ìsì ka ha wee ghara ikwenye ‘n’ozi ọma nke ebube nke Kraịst.’ (2 Ndị Kọrint 4:3, 4; Ndị Efesọs 6:12) Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ụwa na-adaba n’ọgba aghara dị iche iche. Ọ na-akpatara onwe ya ihe mgbu na mmerụahụ ná mgbalị ya na-eweta ọdachi nke ịchị onwe ya n’enweghị enyemaka Chineke nakwa nke ejighị uche Chineke kpọrọ ihe. (Jeremaịa 10:23; Jemes 3:15, 16) Otú a, dị ka Pọl onyeozi kwuru, “ụwa site n’amamihe ya amaghị Chineke.”—1 Ndị Kọrint 1:21.
5. Gịnị bụ ntụpọ bụ isi nke amamihe nke ụwa nke a?
5 Mgbe ahụ, gịnị bụ ntụpọ bụ isi nke amamihe ụwa nke a nwere, gụnyere atụmatụ ya maka ọnọdụ ụwa ọhụrụ? Ọ bụ na ụwa na-elelị ihe a na-apụghị inwe ihe ịga nke ọma ilelị—ọkaaka kasị elu nke Jehova Chineke. O ji mpakọ na-ajụ ịmata ọkaaka Chineke. Ụwa leziri anya na-ahapụ Jehova n’atụmatụ nile ọ na-eme ma na-adabere n’ikike na usoro ime ihe nke ya. (Tụlee Daniel 4:31-34; Jọn 18:37.) Bible na-eme ka ọ pụta ìhè na “mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ.” (Ilu 9:10; Abụ Ọma 111:10) Ma, ụwa amụtabeghị ọbụna isi ihe nke a amamihe chọrọ ha n’aka. Ya mere, n’enweghị nkwado Chineke, olee ụzọ ọ pụrụ isi nwee ihe ịga nke ọma?—Abụ Ọma 127:1.
Ikwusa Alaeze—Ihe Nzuzu ka ọ̀ bụ Ihe Bara Uru?
6, 7. (a) Ndị amamihe nke Chineke na-eduzi na-ekwusa gịnị, ma olee ụzọ ụwa si ele ha anya? (b) Ndị ụkọchukwu Krisendọm na-eme nkwusa dị ka amamihe ònye si dị, gịnịkwa na-esi na nke ahụ apụta?
6 N’aka nke ọzọ, ndị maara Chineke na-egosipụta amamihe nke Chineke ma na-ahọrọ ịbụ ndị ọ na-eduzi. Dị ka Jisọs buru n’amụma, ha na-ekwusa “ozi ọma nke a nke alaeze . . . n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Matiu 24:14; 28:19, 20) Nkwusa dị otú ahụ ọ̀ bara uru ugbu a, mgbe ụwa anyị jupụtara n’esemokwu, mmetọ, ịda ogbenye, na nhụjuanya nke ụmụ mmadụ? Nye ndị nwere amamihe nke ụwa, ime nkwusa dị otú ahụ banyere Alaeze Chineke yiri nnọọ ihe nzuzu, nke na-abaghị uru. Ha na-ele ndị nkwusa nke Alaeze Chineke anya dị ka ihe na-adọla aka elekere nke Ọchịchị azụ ma na-adọghachi ọganihu ọ na-enwe n’ebe ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị mma dị. Na nke a, ha na-enweta nkwado nke ndị ụkọchukwu Krisendọm, bụ́ ndị na-eme nkwusa kwekọrọ n’amamihe nke ụwa nke a na ndị na-adịghị akọrọ ụmụ mmadụ ihe dị ha mkpa ịmara banyere ụwa ọhụrụ Chineke na ọchịchị Alaeze ya, ọ bụ ezie na nke a bụ ozizi bụ isi nke Kraịst.—Matiu 4:17; Mak 1:14, 15.
7 Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ H. G. Wells kpọturu uche n’ọdịda nke a nke ndị ụkọchukwu Krisendọm dara. O dere, sị: “Ọ bụ ihe dị ịrịba ama bụ́ ịdị mkpa dị ukwuu nke Jisọs nyere ozizi banyere ihe ọ kpọrọ Alaeze nke Eluigwe, nakwa ọbụbụ ọ bụ ihe na-adịchaghị mkpa n’ihe omume na ozizi nke ihe ka ọtụtụ na chọọchị nile nke ndị Kristian.” Ma, ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbọ nke a ga-enweta ndụ, ha aghaghị ibu ụzọ nụ banyere Alaeze Chineke nke e guzobeworo, iji mezuokwa nke ahụ, a ga-enwe onye na-aghaghị ikwusa ozi ọma banyere ya.—Ndị Rom 10:14, 15.
8. N’ihi gịnị ka ikwusa ozi ọma nke Chineke ji bụrụ ihe kasị baa uru ime n’oge a, ma ụzọ ime ihe dị aṅaa ga-abụ nke na-enweghị abamuru na-adịgide adịgide?
8 Mgbe ahụ, ikwusa ozi ọma Chineke bụ ihe kasị baa uru ime n’oge a. Nke a dị otú ahụ n’ihi na ozi Alaeze ahụ na-enye ezi olileanya nke na-eme ka obi mmadụ jupụta n’ọṅụ ná mgbe ikpeazụ ndị a mgbe ‘oge dị oké egwu bịaworo.’ (2 Timoti 3:1-5; Ndị Rom 12:12; Taịtọs 2:13) Ọ bụ ezie na ndụ a na-adị n’ụwa nke a bụ ihe a na-ejighị n’aka na ihe dị mkpirikpi, ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke ga-abụ ruo mgbe ebighị ebi, n’ọṅụ, n’ụba, nakwa n’udo kpọmkwem n’elu ala ebe a. (Abụ Ọma 37:3, 4, 11) Dị ka Jisọs Kraịst kwuru, “uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ, ma ọ bụrụ na ọ ga-erite ụwa dum n’uru, e wee napụ ya ndụ ya? ma ọ bụ ihe mgbanwe gịnị ka mmadụ ga-eji gbanwere ndụ ya?” Ọ bụrụ na mmadụ atụfuo ikike nke ịdị ndụ n’ụwa ọhụrụ Chineke, uru gịnị ka ụwa nke a na-agabiga agabiga ga-abara ya? Ihe onwunwe nile nke onye dị otú ahụ nwere ugbu a abụwo ná nkịtị, n’efu, nakwa ihe na-agabiga agabiga.—Matiu 16:26; Eklisiastis 1:14; Mak 10:29, 30.
9. (a) Mgbe otu nwoke a kpọrọ òkù ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ Jisọs rịọrọ ka a hapụ nke ahụ ruo mgbe ọzọ, gịnị ka Jisọs dụrụ ya ọdụ ka o mee? (b) Olee ụzọ azịza nke Jisọs nyere kwesịrị isi metụta anyị?
9 Otu nwoke Jisọs kpọrọ òkù ka ọ bụrụ onye na-eso ụzọ ya sịrị: “Kwe ka m buru ụzọ jee lie nna m.” Gịnị ka Jisọs nyere ya ndụmọdụ ka o mee? Ebe ọ matara na nwoke ahụ ga-asị ka ọrụ ahụ kasị dịrị mkpa dịrị mgbe ọzọ nanị iji chere ruo mgbe ndị mụrụ ya nwụrụ, Jisọs zaghachiri, sị: “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nke ha ndị nwụrụ anwụ; ma gị onwe gị jee zisaa ozi alaeze Chineke.” (Luk 9:59, 60) Ndị na-egosipụta amamihe site n’irubere Kraịst isi apụghị izere ịrụzu ọrụ ha nke ikwusa ozi Alaeze ahụ. Amamihe Chineke na-eme ka ha mata na ụwa nke a na ndị ọchịchị ya na-eche ọdachi ihu. (1 Ndị Kọrint 2:6; 1 Jọn 2:17) Ndị na-akwado ọkaaka Chineke maara na nanị ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ dabeere na Chineke ime ihe na ịchị ọchịchị. (Zekaraịa 9:10) Ya mere, ọ bụ ezie na ndị nwere amamihe nke ụwa nke a adịghị ekwenye n’Alaeze Chineke, ha adịghị achọkwa ọchịchị eluigwe ahụ, ndị amamihe Chineke na-eduzi na-eme ihe na-eweta ezi abamuru nye ndị mmadụ ibe ha, na-akwadebe ha maka ndụ ebighị ebi n’ime ụwa ọhụrụ Jehova nke e kwere ná nkwa.—Jọn 3:16; 2 Pita 3:13.
“Ihe Nzuzu nye Ndị Na-ala n’Iyi”
10. (a) Mgbe a tọghatara Sọl nke Tasọs, ọrụ dị aṅaa ka ọ nakweere, oleekwa ụzọ o si lee ya anya? (b) Gịnị ka e ji mara ndị Grik oge ochie, ma olee ụzọ Chineke si lee amamihe ha anya?
10 Sọl nke Tasọs, bụ́ onye ghọrọ Pọl onyeozi nke Jisọs Kraịst, nakweere ọrụ nke a na-azọpụta ndụ. Ọ̀ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na mgbe Jisọs Kraịst tọghatara Sọl, O kenyere ya ọrụ ikere òkè n’ihe omume nzuzu? Pọl echeghị otú ahụ. (Ndị Filipaị 2:16) N’oge ahụ, a na-ele ndị Grik anya dị ka ndị kasị nwee ọgụgụ isi n’ụwa. Ha turu ọnụ banyere ndị ọkà ihe ọmụma na ndị amamihe ha. Ọ bụ ezie na Pọl sụrụ asụsụ Grik, ọ gbasoghị nkà ihe ọmụma na nkà mmụta Grik. N’ihi gịnị? N’ihi na amamihe dị otú ahụ nke ụwa nke a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.a Pọl chọrọ amamihe Chineke, bụ́ nke kpaliri ya ikwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Onye Nkwusa kasị ukwuu e nweworo n’oge ọ bụla, bụ́ Jisọs Kraịst, esetịpụwo ihe nlereanya, o nyewokwa ya ntụziaka ịrụ otu ọrụ ahụ.—Luk 4:43; Ọrụ 20:20, 21; 26:15-20; 1 Ndị Kọrint 9:16.
11. N’ụzọ bụ isi, gịnị ka Pọl kwuru banyere ọrụ nkwusa ya na amamihe nke ụwa?
11 Pọl kwuru nke a banyere ọrụ ya nke ime nkwusa: “Kraịst zipụrụ m . . . ije kwusaa ozi ọma, ọ bụghị site n’amamihe nke ikwu okwu, ka e wee ghara ime ka osisi ịta ahụhụ nke Kraịst bụrụ ihe na-abaghị uru. N’ihi na ikwu okwu banyere osisi ịta ahụhụ [àjà mgbapụta Jisọs] bụ ihe nzuzu nye ndị na-ala n’iyi, kama nye anyị bụ́ ndị a na-azọpụta, ọ bụ ike Chineke. N’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị: ‘M ga-eme ka amamihe nke ndị maara ihe laa n’iyi, ọgụgụ isi nke ndị nwere ọgụgụ isi ka m ga-ewezụgakwa n’akụkụ.’ Olee ebe onye amamihe nọ [dị ka onye ọkà ihe ọmụma]? Olee ebe onye odeakwụkwọ nọ? Olee ebe onye na-arụ ụka banyere usoro ihe nke a nọ? Ọ̀ bụ na Chineke emeghị ka amamihe nke ụwa bụrụ ihe nzuzu? N’ihi na ebe, n’amamihe Chineke, ụwa site n’amamihe ya amaghị Chineke, Chineke hụrụ ihe dị mma site n’ihe nzuzu nke ihe a na-ekwusa iji zọpụta ndị kwere ekwe.”—1 Ndị Kọrint 1:17-21, NW.
12. Gịnị ka Jehova na-arụzu site “n’ihe nzuzu nke ihe a na-ekwusa,” oleekwa ụzọ ndị ahụ na-achọ “amamihe ahụ nke si n’elu” si emeghachi omume?
12 N’ụzọ pụrụ iyi ihe a na-apụghị ikwere, ndị ahụ ụwa na-akpọ ndị nzuzu bụ ndị Jehova ji eme ihe dị ka ndị nkwusa ya. Ee, site n’ihe nzuzu nke ije ozi ndị nkwusa ndị a, Chineke na-azọpụta ndị kwere ekwe. Jehova na-ahazi ihe ka ndị nkwusa nke “ihe nzuzu” nke a wee ghara inye onwe ha otuto, ụmụ mmadụ ndị ọzọ apụghịkwa inye ndị ha sitere n’ọnụ ha nụ ozi ọma ahụ otuto n’ụzọ ziri ezi. Nke a dị otú ahụ ka “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, wee ghara ịnya isi n’ihu Chineke.” (1 Ndị Kọrint 1:28-31; 3:6, 7) N’eziokwu, onye nkwusa ahụ na-ekere òkè dị mkpa, ma ozi nke e ziri ya ka o jee kwusaa bụ ihe na-arụpụtara mmadụ nzọpụta ma ọ bụrụ na onye ahụ kwere na ya. Ndị chọrọ “amamihe ahụ nke si n’elu” agaghị ajụ ozi nke onye nkwusa ahụ n’ihi na o yiri ka ọ bụ onye nzuzu na onye dị ala, onye a na-akpagbu, onye na-agakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Kama nke ahụ, ndị dị umeala n’obi ga-akwanyere onye nkwusa Alaeze ùgwù dị ka onye nkwusa nke Jehova nyeworo ọrụ na onye na-abịa n’aha Chineke. Ha ga-atụkwasị oké ịdị mkpa n’ozi nke onye nkwusa ahụ na-eweta site n’okwu ọnụ na site n’akwụkwọ e biri ebi.—Jemes 3:17; 1 Ndị Tesalonaịka 2:13.
13. (a) Olee ụzọ ndị Juu na ndị Grik si lee ikwusa banyere mkpọgbu nke Kraịst anya? (b) Site n’ìgwè ndị dị aṅaa ka a na-akpọghị ọtụtụ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jisọs, n’ihi gịnịkwa?
13 N’ịga n’ihu n’ihe ọ na-atụle banyere ụzọ Chineke, Pọl sịrị: “Ma ndị Juu na-arịọ maka ihe ịrịba ama, ndị Grik na-achọkwa amamihe; ma anyị na-ekwu na a kpọgburu Kraịst, nye ndị Juu ọ bụ ihe mkpọbi ụkwụ ma nye ndị mba ọzọ ọ bụ ihe nzuzu; otú ọ dị, nye ndị a kpọrọ, ma ndị Juu ma ndị Grik, ọ bụ Kraịst, bụ́ ike nke Chineke na amamihe nke Chineke. N’ihi na ihe nzuzu nke Chineke maara ihe karịa mmadụ, ihe na-adịghị ike nke Chineke dịkwa ike karịa mmadụ. N’ihi na unu hụrụ ọkpụkpọ ọ na-akpọ unu, ụmụnna m, na ọ bụghị ọtụtụ ndị maara ihe n’ụzọ anụ ahụ ka a kpọrọ, ọ bụghị ọtụtụ ndị dị ike, ọ bụghị ọtụtụ ndị a maara aha ha; kama Chineke họọrọ ihe nzuzu nke ụwa, ka o wee mee ka ihere mee ndị maara ihe; Chineke họrọkwaara ihe ndị na-adịghị ike nke ụwa, ka o wee mee ka ihere mee ihe ndị dị ike.”—1 Ndị Kọrint 1:22-27, NW; tụlee Aịsaịa 55:8, 9.
14. (a) Ọ bụrụ na a jụọ maka akara ugo mmụta ha, gịnị ka Ndịàmà Jehova na-arụtụ aka? (b) N’ihi gịnị ka Pọl ji jụ ime ihe ga-atọ ndị Grik ụtọ site n’igosipụta amamihe ọ bụla nke ụwa?
14 Mgbe Jisọs nọ n’elu ala, ndị Juu rịọrọ ya maka ihe ịrịba ama sitere n’eluigwe. (Matiu 12:38, 39; 16:1) Ma Jisọs jụrụ inye ihe ịrịba ama ọ bụla. N’otu aka ahụ, Ndịàmà Jehova taa adịghị egosi akara ugo mmụta ọ bụla yiri ihe ịrịba ama. Kama nke ahụ, ha na-arụtụ aka n’ọrụ e nyere ha nke ikwusa ozi ọma, dị ka e dekọrọ n’amaokwu Bible ndị dị ka Aịsaịa 61:1, 2; Mak 13:10; na Mkpughe 22:17. Ndị Grik oge ochie chọrọ amamihe, agụmakwụkwọ dị elu n’ihe nke ụwa nke a. Ọ bụ ezie na Pọl gụrụ akwụkwọ n’ụzọ amamihe nke ụwa nke a, ọ jụrụ ime ihe ga-atọ ndị Grik ụtọ site n’igosipụta ya n’ụzọ ọ bụla. (Ọrụ 22:3) O kwuru okwu ma dee akwụkwọ n’asụsụ Grik nke ndị nkịtị ji enwe nkwurịta okwu, kama ịbụ n’asụsụ nkà mmụta Grik. Pọl gwara ndị Kọrint, sị: “Mgbe m bịakwutere unu, abịaghị m n’ọkà okwu ma ọ bụ n’ọkà amamihe, na-ekwusara unu àmà nke Chineke. . . . Okwu m na ihe m kwusara abụghịkwa n’okwu amamihe, ime ka mmadụ kwenye, kama ha bụ ná ngosi nke mmụọ nsọ na nke ike, ka okwukwe unu wee ghara ịdị n’amamihe mmadụ, kama n’ike nke Chineke.”—1 Ndị Kọrint 2:1-5.
15. Banyere gịnị ka Pita na-echetara ndị na-akwa emo banyere ozi ọma ahụ, oleekwa ụzọ ọnọdụ oge ugbu a si yie nke ụbọchị Noa?
15 Ná mgbe ikpeazụ ndị a, a na-echetara ndị na-akwa emo banyere ozi ọma nke ụwa ọhụrụ Chineke na-abịanụ na ịdị nso nke ọgwụgwụ nke ụwa nke a site n’ọnụ Pita onyeozi na ụwa nke ụbọchị Noa ‘lara n’iyi mgbe iju mmiri gbara ya.’ (2 Pita 3:3-7) N’ịbụ onye ọgwụgwụ ahụ ga-akpata ọdachi chere ihu, gịnị ka Noa mere? Ọtụtụ ndị lere ya anya nanị dị ka owu ụgbọ. Ma Pita na-asị na mgbe Chineke wetara Iju Mmiri n’elu ụwa oge ochie ahụ, O ‘chebere Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume.’ (2 Pita 2:5) N’amamihe ha nke ụwa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ahụ na-adịghị asọpụrụ Chineke dịrị ndụ tupu iju mmiri kwara emo banyere ihe Noa na-ekwusa ma kpọọ ya onye nzuzu, onye na-adịghị eche ezi echiche, onye na-adịghị ekwu ihe bara uru. Taa, ezi ndị Kraịst na-eche ọnọdụ yiri nke ahụ ihu, ebe ọ bụ na Jisọs ji ọgbọ anyị tụnyere nke ụbọchị Noa. Otú ọ dị, n’agbanyeghị na e nwere ndị na-akwa emo, nkwusa nke ozi ọma banyere Alaeze ahụ abụghị nanị ikwu okwu nkịtị. Dịkwa ka nkwusa ahụ nke Noa mere, ọ pụtara nzọpụta nye onye nkwusa ahụ na ndị na-aṅa ya ntị!—Matiu 24:37-39; 1 Timoti 4:16.
‘Ịghọ Ndị Nzuzu iji Ghọọ Ndị Maara Ihe’
16. Gịnị ga-eme amamihe nke ụwa nke a n’Amagedọn, oleekwa ndị ga-alanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke?
16 N’oge na-adịghị anya, n’Amagedọn, Jehova Chineke ga-eme ka “amamihe nke ndị maara ihe” laa n’iyi. Ọ ga-ewezụga “ọgụgụ isi nke ndị nwere ọgụgụ isi” n’akụkụ, bụ́ ndị na-ebu amụma banyere ụzọ ọnọdụ ụwa ọhụrụ ha ga-esi weta ọnọdụ ka mma maka ihe a kpọrọ mmadụ. “Agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ga-erechapụ arụmụka nduhie nile, nkà ihe ọmụma nile na amamihe nile nke ụwa nke a. (1 Ndị Kọrint 1:19; Mkpughe 16:14-16) Nanị ndị ga-alanarị n’agha ahụ ma nweta ndụ n’ime ụwa ọhụrụ Chineke bụ ndị ahụ na-erube isi n’ihe ụwa nke a kpọrọ ihe nzuzu—ee, ozi ọma dị ebube nke Alaeze Jehova.
17. Olee ụzọ Ndịàmà Jehova siworo ghọọ ‘ndị nzuzu,’ oleekwa ihe ndị Chineke na-ekwusa ozi ọma kpebiri ime?
17 Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị mmụọ ya na-edu, adịghị eme ihere ikwusa ihe ụwa na-akpọ ihe nzuzu. Kama ime mgbalị inwe amamihe ụwa, ha aghọwo ‘ndị nzuzu.’ N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịrụ ọrụ nkwusa Alaeze ka ha wee bụrụ ndị maara ihe, dị ka Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na ya bụ onye maara ihe n’etiti unu n’oge a, ya ghọọ onye nzuzu, ka o wee ghọọ onye maara ihe.” (1 Ndị Kọrint 3:18-20) Ndị Jehova na-ekwusa ozi ọma ahụ maara uru ịzọpụta ndụ nke ozi ha nwere bara, ha ga-anọgidekwa na-ekwusa ya n’akwụsịghị akwụsị ruo n’ọgwụgwụ nke ụwa nke a na amamihe ya n’agha Amagedọn. N’oge na-adịghị anya, Jehova Chineke ga-ewepụ ọkaaka eluigwe na ala ya n’ụta, wetakwa ndụ ebighị ebi nye ndị nile kwere ekwe ugbu a ma na-eme ihe banyere “ihe nzuzu nke ihe a na-ekwusa.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’agbanyeghị arụmụka nkà ihe ọmụma nile na nnyocha nile nke ndị amamihe Gris oge ochie, ihe odide ha dị iche iche na-egosi na ha achọtaghị ezi ihe ndabere ọ bụla maka olileanya. Ndị prọfesọ bụ́ J. R. S. Sterrett na Samuel Angus na-arụtụ aka, sị: “Ọ dịghị akwụkwọ ka nke ha nwee ịkwa arịrị na-emetụ n’obi banyere iru újú nile nke ndụ, ngabiga nke ịhụnanya, nduhie nke olileanya, na obi ọjọọ nke ọnwụ.”—Funk and Wagnalls New “Standard” Bible Dictionary, 1936, peji nke 313.
Gịnị Bụ Azịza Gị?
◻ Ụdị amamihe abụọ dị aṅaa ka e nwere?
◻ Gịnị bụ ntụpọ bụ isi nke amamihe ụwa?
◻ N’ihi gịnị ka ikwusa ozi ọma ji bụrụ ihe kasị baa uru ime?
◻ Gịnị ga-eme amamihe nile nke ụwa n’oge na-adịghị anya?
◻ N’ihi gịnị ka ihere na-adịghị eme Ndịàmà Jehova ikwusa ihe ụwa na-akpọ ihe nzuzu?
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Grik chọrọ amamihe nke ụwa, ọtụtụ mgbe ha lekwara nkwusa nke Pọl anya dị ka ihe nzuzu