-
Ihe Ndị Merela Kemgbe Otu Narị Afọ Alaeze Chineke ChịwaraỤlọ Nche—2015 | Nọvemba 15
-
-
2. Mmadụ ole ka o nwere ike ịbụ na ha nọ mgbe Jizọs nyere iwu ahụ e dere na Matiu 28:19, 20? Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ?
2 Obere oge ka Jizọs si n’ọnwụ bilie, ya na ihe karịrị narị mmadụ ise, bụ́ ndị ga-emecha kwusawa Alaeze Chineke, nọkọrọ. (1 Kọr. 15:6) O nwere ike ịbụ n’oge ahụ ka o nyere iwu ka e kwusaara “ndị mba niile” ozi ọma Alaeze Chineke. Ọrụ ahụ agaghị abụ obere ọrụ.a Jizọs gwara ha na a ga-arụgide ya ruo “ọgwụgwụ usoro ihe a.” Ọ bụ ihe a na-eme ugbu a. O doro anya na i so na-ekwusa ozi ọma ahụ, sí otú ahụ na-emezu amụma ahụ.—Mat. 28:19, 20.
-
-
Ihe Ndị Merela Kemgbe Otu Narị Afọ Alaeze Chineke ChịwaraỤlọ Nche—2015 | Nọvemba 15
-
-
a O nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ndị ahụ mechara bụrụ Ndị Kraịst. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Pọl onyeozi kpọrọ ha “narị ụmụnna ise.” Ọ sịkwara: “Ọtụtụ n’ime ha ka nọ ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ.” N’ihi ya, ọ dị ka Pọl na Ndị Kraịst ndị ọzọ ma ọtụtụ n’ime ndị ahụ nọ́ mgbe Jizọs nyere iwu ahụ.
-