Ibi Maka Taa Ka Ọ̀ Bụ Maka Ọdịnihu Ebighị Ebi?
“Ọ bụ n’olileanya ka a zọpụtara anyị.”—NDỊ ROM 8:24.
1. Gịnị ka ndị Epikurean kụziri, oleekwa otú nkà ihe ọmụma dị otú ahụ si metụta ụfọdụ ndị Kraịst?
PỌL onyeozi degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint, sị: “Ụfọdụ n’etiti unu si aṅaa na-ekwu na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị?” (1 Ndị Kọrint 15:12) N’ụzọ doro anya, nkà ihe ọmụma na-egbu egbu nke onye amamihe ndị Gris bụ́ Epicurus egbebatawo n’etiti ndị Kraịst narị afọ mbụ ahụ. Ya mere Pọl dọọrọ uche gaa ná nkụzi ndị Epikurean, sị: “Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:32) N’ịjụ olileanya ọ bụla nke ndụ mgbe a nwụsịrị, ndị na-eso ụzọ onye ọkà ihe ọmụma ahụ kwenyere na ihe ụtọ anụ ahụ bụ nanị ihe dị mma ná ndụ ya. (Ọrụ 17:18, 32) Nkà ihe ọmụma nke ndị Epikurean bụ nke nanị maka onwe onye, na-eleda mmadụ anya, na n’ụzọ kasị ukwuu nke na-eweda n’ala.
2. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị oké ize ndụ ịsị na mbilite n’ọnwụ adịghị? (b) Olee otú Pọl si wusie okwukwe nke ndị Kraịst nọ na Kọrint ike?
2 Ọjụjụ a a jụrụ mbilite n’ọnwụ nwere ihe ndị dị ukwuu ọ na-enye echiche ya. Pọl tụgharịrị uche, sị: “Ọ bụrụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị, e meghịkwa ka Kraịst si n’ọnwụ bilie: ma ọ bụrụ na e meghị ka Kraịst si n’ọnwụ bilie, ya mere ihe anyị na-ekwusa bụ ihe efu. . . . A sị na ọ bụ nanị ná ndụ a ka anyị nweworo olileanya anyị n’ime Kraịst, anyị bụ ndị kwesịrị ebere karịa mmadụ nile.” (1 Ndị Kọrint 15:13-19) Ee, e wezụga olileanya nke ọdịnihu ebighị ebi, Iso Ụzọ Kraịst gaara abụ “ihe efu.” Ọ gaghị enwe nzube. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na n’okpuru mmetụta nke echiche a nke ndị na-ekpere arụsị, ọgbakọ ndị Kọrint abụrụwo ebe nsogbu jupụtara. (1 Ndị Kọrint 1:11; 5:1; 6:1; 11:20-22) Ya mere, Pọl zubere iwusi okwukwe ha nwere ná mbilite n’ọnwụ ike. Site n’iji ntụgharị uche dị ike, nhota Akwụkwọ Nsọ, na ihe atụ dị iche iche mee ihe, o gosipụtara n’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na olileanya mbilite n’ọnwụ abụghị akụkọ e chepụtara echepụta kama ihe e ji n’aka na ọ ga-emezu. N’ịdabere na nke a, ọ pụrụ ịgba ndị kwere ekwe ibe ya ume, sị: “Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:20-58.
“Na-echenụ Nche”
3, 4. (a) Dị ka Pita si kwuo, àgwà dị aṅaa dị ize ndụ ga-erikpu ụfọdụ na mgbe ikpeazụ? (b) Banyere gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-echetara onwe anyị?
3 Taa, ọtụtụ nwere àgwà enweghị olileanya, nke ibi ndụ maka ugbu a. (Ndị Efesọs 2:2) Ọ bụ nnọọ dị ka Pita onyeozi buru n’amụma. O kwuru banyere “ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa . . . na-asịkwa, Olee ebe nkwa nke [ọnụnọ, NW] Ya dị? n’ihi na site n’ụbọchị nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.” (2 Pita 3:3, 4) Ọ bụrụ na ndị na-efe ezi ofufe adaba n’ụdị echiche ahụ, ha pụrụ ịghọ “ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.” (2 Pita 1:8) Dị ka ihe obi ụtọ, ọ dịghị otú ahụ n’ebe ihe ka n’ọtụtụ ná ndị Chineke taa nọ.
4 Ọ dịghị njọ inwe mmasị n’ọgwụgwụ na-abịanụ nke ajọ usoro ihe a. Cheta mmasị nke ndị ozi Jisọs n’onwe ya gosiri: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị na-enyeghachi Israel alaeze?” Jisọs zaghachiri, sị: “Ọ bụghị ihe dịịrị unu ịma oge ma ọ bụ ụbọchị, nke Nna m debere n’ike nke aka Ya.” (Ọrụ 1:6, 7) Okwu ndị ahụ nwere ozi bụ isi nke o ziworo n’Ugwu Olive: “Unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa. . . . N’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:42, 44) Ọ dị anyị mkpa ịnọgide na-echetara onwe anyị banyere ndụmọdụ ahụ! A pụrụ ịnwa ụfọdụ inwe àgwà bụ, ‘Ikekwe m kwesịrị nnọọ iselatatụ aka ma jiritụ nwayọọ.’ Lee ihie ụzọ nke ahụ ga-abụ! Tụlee Jemes na Jọn, “Ụmụ égbè eluigwe.”—Mak 3:17.
5, 6. Ihe mmụta ndị dị aṅaa ka anyị pụrụ inweta site n’ihe atụ nke Jemes na Jọn?
5 Anyị maara na Jemes bụ onyeozi na-anụ ọkụ n’obi nke ukwuu. (Luk 9:51-55) Ozugbo ahụ e guzobere ọgbakọ ndị Kraịst, ọ ghaghị ikerewo òkè pụtara ìhè. Ma mgbe Jemes na-emechabeghị okenye, Herọd Agrịpa Mbụ gburu ya. (Ọrụ 12:1-3) Ànyị chere na Jemes, n’ịhụ ka ndụ ya na-agwụ n’ụzọ a na-atụghị anya ya, nwere mwute na ya anụwo ọkụ n’obi nke ukwuu, na ya arụsiwo ọrụ ike n’ozi ya? Ọ dịghị ma ọlị! N’ezie obi dị ya ụtọ na ya ejiriwo afọ ndị kasị mma ná ndụ ya dịtụ mkpụmkpụ jeere Jehova ozi. Ugbu a, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịma ma ndụ anyị o nwere ike ịgwụ n’ụzọ a na-atụghị anya ya. (Eklisiastis 9:11; tụlee Luk 12:20, 21.) Ya mere o doro anya na amamihe dị na ya idebe ịnụ ọkụ n’obi na ọrụ anyị n’ozi Jehova n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu. N’ụzọ dị otú ahụ anyị ga-ejigide aha ọma anyị n’ebe ọ nọ ma nọgide na-adị ndụ, na-enwe olileanya nke ọdịnihu ebighị ebi.—Eklisiastis 7:1.
6 E nwere ihe mmụta yiri ya nke metụtara Jọn onyeozi, bụ́ onye nọ ya mgbe Jisọs gbasiri ume ike, sị, “Na-echenụ nche.” (Matiu 25:13; Mak 13:37; Luk 21:34-36) Jọn buuru nke ahụ n’obi, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ruo ọtụtụ iri afọ. N’ezie, o yiri ka ọ bụ nanị ya fọrọ ndụ mgbe ndị ozi ndị ọzọ nile nwụsịrị. Mgbe Jọn meworo agadi nke ukwuu, nwee ike ileghachi anya azụ n’ọtụtụ iri afọ nke ọrụ ikwesị ntụkwasị obi, ò lere ya anya dị ka ihie ụzọ, ndụ nke e duhiere eduhie ma ọ bụ na-enweghị ezi nguzo? Ee e, ma ọlị! Ọ ka lepụsiri anya ike n’ọdịnihu. Mgbe Jisọs a kpọlitere n’ọnwụ sịrị, “Ee: ana m abịa ọsọ ọsọ,” Jọn zaghachiri ozugbo, “Amen: bịa, Onyenwe anyị Jisọs.” (Mkpughe 22:20) N’ezie Jọn atụkwasịghị uche na nanị ndụ ọ dị mgbe ahụ, na-achọ ‘ndụ dị otú o kwesịrị’ nke iwere ya nwayọọ, n’ụzọ dị jụụ. O kpebisiri ike ịnọgide na-eji ndụ na ume ya nile na-eje ozi, mgbe ọ bụla Onyenwe anyị pụrụ ịbịa. Gịnị banyere anyị?
Ntọala Maka Ikwere ná Ndụ Ebighị Ebi
7. (a) Olee otú olileanya nke ndụ ebighị ebi siri bụrụ nke “e kwere nkwa ya tupu mgbe ebighị ebi eruo”? (b) Olee otú Jisọs si nyekwuo ihe ọmụma banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi?
7 Jide n’aka na olileanya maka ndụ ebighị ebi abụghị nrọ ma ọ bụ echiche efu mmadụ chepụtara. Dị ka Taịtọs 1:2 na-ekwu, nsọpụrụ Chineke anyị dabeere “n’olileanya nke ndụ ebighị ebi, nke Chineke, Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha, kwere nkwa ya tupu mgbe ebighị ebi eruo.” Ọ bụ nzube mbụ nke Chineke ka mmadụ nile na-erube isi dịrị ndụ ebighị ebi. (Jenesis 1:28) Ọ dịghị ihe ọ bụla, ọbụnadị nnupụisi nke Adam na Iv, pụrụ imebi nzube a. Dị ka e dekọrọ na Jenesis 3:15, n’egbughị oge Chineke kwere nkwa otu “mkpụrụ” nke ga-edozigharị ihe ọjọọ nile dakwasịworo ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe “mkpụrụ” ma ọ bụ Mesaịa ahụ, bụ́ Jisọs, bịarutere, o mere olileanya nke ndụ ebighị ebi otu n’ime ozizi ya bụ isi. (Jọn 3:16; 6:47, 51; 10:28; 17:3) Site n’ịtọgbọ ndụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta, Kraịst nwetara ikike inye ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ebighị ebi. (Matiu 20:28) Ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, 144,000 n’ozuzu ha, ga-adị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. (Mkpughe 14:1-4) Otú a ụfọdụ ndị bụbu ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ ‘ga-eyikwasị anwụghị anwụ’!—1 Ndị Kọrint 15:53.
8. (a) Gịnị bụ “anwụghị anwụ,” n’ihi gịnịkwa ka Jehova ji enye ya 144,000 ahụ? (b) Olileanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụụrụ “atụrụ ọzọ” ahụ?
8 “Anwụghị anwụ” pụtara ihe karịrị nanị ịghara ịnwụ anwụ ma ọlị. Ọ gụnyere “ike nke ndụ na-adịghị agwụ agwụ.” (Ndị Hibru 7:16; tụlee Mkpughe 20:6.) Ma, gịnị ka Chineke na-arụzu site n’inye ụdị onyinye ahụ dị ịrịba ama? Cheta ịma aka Setan na ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke a pụrụ ịtụkwasị obi. (Job 1:9-11; 2:4, 5) Site n’inye 144,000 ahụ anwụghị anwụ, Chineke na-egosi obi ike ya kpam kpam n’ìgwè a nke zaworo ihe ịma aka Setan n’ụzọ pụtara nnọọ ìhè. Ma gịnị banyere ihe fọdụrụ n’ihe a kpọrọ mmadụ? Jisọs gwara ndị òtù mbụ nke “ìgwè atụrụ nta” a bụ́ ndị nketa Alaeze ahụ na ha ‘ga-anọkwasị n’ocheeze na-ekpe ebo iri na abụọ nke Israel ikpe.’ (Luk 12:32; 22:30) Nke a na-enye echiche nke na ndị ọzọ ga-anata ndụ ebighị ebi n’elu ala dị ka ndị Alaeze ya ga-achị. Ọ bụ ezie na e nyeghị “atụrụ ọzọ” ndị a anwụghị anwụ, ha na-anata “ndụ ebighị ebi.” (Jọn 10:16; Matiu 25:46) Ya mere ndụ ebighị ebi bụ olileanya nke ndị Kraịst nile. Ọ bụghị echiche efu kama ihe “Chineke, Onye na-apụghị ikwu okwu ụgha” kwesiri nkwa ya ike, jirikwa ọbara dị oké ọnụ ahịa nke Jisọs kwụọ ụgwọ ya.—Taịtọs 1:2.
Ọ̀ Bụ n’Ọdịnihu Dị Anya?
9, 10. Ihe ndị dị aṅaa doro anya na-egosi na anyị nọ nso ọgwụgwụ ahụ?
9 Pọl onyeozi buru amụma na “oge dị oké egwu” ga-egosi na n’ụzọ a na-apụghị ịgbagha agbagha anyị erutewo na “mgbe ikpeazụ.” Ka ọha mmadụ gbara anyị gburugburu na-adabanye n’ọnọdụ enweghị ịhụnanya, anyaukwu, imeju ọchịchọ onwe onye, na asọpụrụghị Chineke, ọ̀ bụ na anyị adịghị amata na ụbọchị Jehova maka ime ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ajọ usoro ihe ụwa nke a na-abịaru nso ngwa ngwa? Ka ime ihe ike na ịkpọasị na-arị elu, ọ̀ bụ na anyị adịghị ahụ gburugburu anyị mmezu nke okwu Pọl gara n’ihu kwuo: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ”? (2 Timoti 3:1-5, 13) Ụfọdụ pụrụ iji nchekwube tie mkpu “Udo na ntụkwasị obi,” ma atụmanya nile nke udo ga-apụ n’anya, n’ihi na “na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” A hapụbeghị anyị n’ọchịchịrị banyere ihe oge anyị pụtara. Ya mere, “ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-6.
10 Ọzọ, Bible na-egosi na mgbe ikpeazụ ahụ bụ “nwa oge.” (Mkpughe 12:12; tụlee 17:10.) N’ụzọ doro anya ihe ka ukwuu na “nwa oge” ahụ agafewo. Dị ka ihe atụ, amụma Daniel na-akọwa n’ụzọ ziri ezi obubu agha dị n’etiti “eze Ugwu” na “eze Ndịda” nke dịgideworo banye n’ime narị afọ a. (Daniel 11:5, 6) Nanị ihe fọdụrụ imezu bụ mwakpo ikpeazụ nke “eze Ugwu,” nke a kọwara na Daniel 11:44, 45.—Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1987, na November 1, 1993, maka ntụle nke amụma a.
11. (a) Ruo ókè hà aṅaa ka e mezuworo Matiu 24:14? (b) Gịnị ka okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 10:23 na-egosi?
11 E nwekwara amụma Jisọs buru na “a ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Taa, Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ha na 233 ala, ìgwè àgwàetiti, na ókèala. N’eziokwu, a ka nwere ókèala ndị a na-akpabeghị aka, eleghịkwa anya n’oge Jehova kara aka, ụzọ nke ohere ga-emeghe. (1 Ndị Kọrint 16:9) Ma, okwu Jisọs e dekọrọ na Matiu 10:23 na-akpali iche echiche: “Unu agaghị agazu obodo nile nke Israel ma ọlị, ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịa.” Ọ bụ ezie na a ga-ekwusarịrị ozi ọma ahụ n’elu ụwa dum, anyị agaghị eji ozi nke Alaeze ahụ ruo akụkụ nile nke ụwa n’onwe anyị tupu Jisọs ‘abịa’ dị ka Onye Mmezu Ikpe.
12. (a) ‘Ịka akara’ dị aṅaa ka e zoro aka na ya ná Mkpughe 7:3? (b) Gịnị ka ọnụ ọgụgụ na-adalatanụ nke ndị e tere mmanụ n’ụwa pụtara?
12 Tụlee ihe e dere ná Mkpughe 7:1, 3, nke na-ekwu na a na-ejichi “ifufe anọ” nke mbibi “ruo mgbe anyị ga-akasịwo ndị ohu Chineke anyị akara n’egedege ihu ha.” Nke a adịghị ezo aka n’ịka akara mbụ ahụ, bụ́ nke na-ewere ọnọdụ mgbe ndị 144,000 natara ọkpụkpọ òkù eluigwe. (Ndị Efesọs 1:13) Ọ na-ezo aka n’ịka akara ikpeazụ ahụ, mgbe a matara ha n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe dị ka “ndị ohu Chineke anyị” kwesịrị ntụkwasị obi, a nwapụtaworo. Ọnụ ọgụgụ nke ezi ụmụ ndị ikom e tere mmanụ nke Chineke ka nọ ndụ n’ụwa ebelatawo nke ukwuu. Ọzọkwa, n’ụzọ doro anya Bible na-ekwu na ọ bụ “n’ihi ndị a họpụtara” ka a ga-eme ka akụkụ mmalite nke mkpagbu ukwu ahụ “dị mkpirikpi.” (Matiu 24:21, 22) Ihe ka ọtụtụ n’ime ndị na-asị na ha bụ ndị e tere mmanụ emewo nnọọ agadi. Ọzọ, nke a ọ́ gaghị egosi na ọgwụgwụ ahụ dị nso?
Onye Nche nke Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
13, 14. Gịnị bụ ibu ọrụ nke òtù onye nche ahụ?
13 Ka ọ dị ugbu a, anyị ga-eme nke ọma ịṅa ntị ná nduzi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” na-enye. (Matiu 24:45) Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, “ohu” ahụ nke oge a ejiriwo ikwesị ntụkwasị obi na-eje ozi dị ka “onye nche.” (Ezikiel 3:17-21) Ụlọ Nche nke June 1, 1984, kọwara, sị: “Onye nche a na-ele ka ihe ndị na-eme n’ụwa si na-aga n’ihu ná mmezu nke amụma Bible, wee na-akpọsa ịdọ aka ná ntị nke ‘mkpagbu ukwu nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa’ nke na-eru nso, na-ekwusakwa ‘ozi ọma nke ezi ihe.’”—Matiu 24:21; Aịsaịa 52:7.
14 Cheta: Ọ bụ ọrụ onye nche ahụ ikwupụta “ihe ọ ga-ahụ.” (Aịsaịa 21:6-8) N’oge Bible onye nche ga-adọ aka ná ntị mgbe ihe pụrụ iyi egwu dị ebe dị anya nke na a mataghị ya nke ọma. (2 Ndị Eze 9:17, 18) Mgbaàmà ụgha weere ọnọdụ n’ezie laa azụ n’oge ahụ. Ma ezi onye nche agaghị eji maka ụjọ mmechuihu ghara ikwu okwu. Ọ bụrụ na ụlọ gị na-agba ọkụ, olee otú ọ ga-adị gị ma ọ bụrụ na ndị ọrụ mmenyụ ọkụ abịaghị n’ihi na ha chere na ọ pụrụ ịbụ mgbaàmà ụgha? Ee e, anyị na-atụ anya ka ndị ahụ zaghachi ngwa ngwa n’ihe àmà ọ bụla nke ihe ize ndụ! N’otu ụzọ ahụ, òtù onye nche ahụ ekwuwo okwu mgbe ọnọdụ yiri ka ọ chọrọ ka e mee otú ahụ.
15, 16. (a) N’ihi gịnị ka a na-eji eme mgbanwe nke nghọta anyị na-aghọta amụma? (b) Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’aka ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere nghọta hiere ụzọ nke ụfọdụ amụma?
15 Otú ọ dị, ka ihe na-eme, nghọta anyị na-aghọta amụma edowo anya karị. Akụkọ ihe mere eme na-egosi na ọ raka ahụ, ma ọ bụrụ na o metụla, ka a ghọta amụma Chineke n’ụzọ zuru ezu tupu ha emezuo. Chineke gwara Abram kpọmkwem oge hà aṅaa mkpụrụ ya ga-abụ “ọbịa n’ala na-abụghị nke ha,” ya bụ, afọ 400. (Jenesis 15:13) Otú ọ dị, Mosis wepụtara onwe ya dị ka onye mgbapụta mgbe oge na-erubeghị.—Ọrụ 7:23-30.
16 Tụleekwa amụma banyere Mesaịa. N’icheghachi echiche azụ o yiri ka o doro nnọọ anya na e buru amụma ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Mesaịa ahụ. (Aịsaịa 53:8-10) Ma, ndị na-eso ụzọ Jisọs aghọtaghị eziokwu a. (Matiu 16:21-23) Ha ahụghị na Daniel 7:13, 14 ga-emezu n’oge pa·rou·siʹa, ma ọ bụ “ọnụnọ,” Kraịst nke ka dị n’ihu. (Matiu 24:3, NW) Ya mere ngụkọ oge ha ji ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 2,000 ghara izi ezi mgbe ha jụrụ Jisọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ n’oge a ka Ị na-enyeghachi Israel alaeze?” (Ọrụ 1:6) Ọbụna mgbe e guzobesichara ọgbakọ ndị Kraịst ike, echiche na-ezighị ezi na atụmanya ụgha nọgidere na-esepụta isi. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1, 2) Ọ bụ ezie na ụfọdụ nwere echiche hiere ụzọ mgbe ụfọdụ, n’ụzọ ngọpụ na-adịghị ya Jehova gọziri ọrụ nke ndị ahụ kwere ekwe na narị afọ mbụ!
17. Gịnị kwesịrị ịbụ echiche anyị banyere mgbanwe anyị nke nghọta Akwụkwọ Nsọ?
17 Òtù onye nche nke taa n’otu aka ahụ emewo ka echiche ya doo anya karị site n’oge ruo n’oge. Otú ọ dị, ọ̀ dị onye ga-enwe obi abụọ na Jehova agọziwo ‘ohu a kwesịrị ka a tụkwasị ya obi’? E wezụga nke ahụ, e lee ya anya site n’ihe gbara ya gburugburu, ọ̀ bụ na ndozigharị ihe ndị e mere adịghị nnọọ nta? Nghọta anyị bụ isi nke Bible agbanwebeghị. Obi ike anyị na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ siri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ!
Ibi Maka Ọdịnihu Ebighị Ebi
18. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji zere ibi maka taa nanị?
18 Ụwa pụrụ ịsị, ‘Ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi anyị ga-anwụ,’ ma nke a agaghị abụ àgwà anyị ma ọlị. N’ihi gịnị ka ị ga-eji na-adọga n’efu maka ihe ụtọ ị pụrụ inweta ná ndụ ugbu a mgbe ị pụrụ ịrụ ọrụ maka ọdịnihu ebighị ebi? Olileanya ahụ, ma ọ̀ bụ nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe ma ọ bụ ndụ ebighị ebi n’elu ụwa, abụghị nrọ, ọ bụghị echiche efu. Ọ bụ eziokwu nke Chineke “na-apụghị ikwu okwu ụgha” kwere ná nkwa. (Taịtọs 1:2) Ihe àmà karịrị akarị na mmezu nke olileanya anyị dị nnọọ nso! “E mewo ka oge a dị mkpụmkpụ.”—1 Ndị Kọrint 7:29.
19, 20. (a) Olee otú Jehova si ele àjà anyị chụworo n’ihi Alaeze ya anya? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji na-ebi ndụ na-eburu ebighị ebi n’uche?
19 N’eziokwu, usoro ihe a adịfeworị oge ọtụtụ chere na ọ ga-adịru. Ole na ole pụrụ iche ugbu a na ọ bụrụ na ha maara nke a na mbụ, e nwere ike ha agaraghị achụworị àjà ụfọdụ. Ma mmadụ ekwesịghị ịkwa ụta imeworị nke ahụ. E kwuwerị, ịchụ àjà bụ akụkụ gbara ọkpụrụkpụ nke ịbụ onye Kraịst. Ndị Kraịst ‘na-ajụ onwe ha.’ (Matiu 16:24) Ọ dịghị mgbe anyị kwesịrị iche na mgbalị anyị ime ihe na-atọ Chineke ụtọ abụrụwo ihe efu. Jisọs kwere nkwa, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke hapụrụ ụlọ, ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom, ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom, ma ọ bụ nne, ma ọ bụ nna, ma ọ bụ ụmụ, ma ọ bụ ubi, n’ihi m, na n’ihi ozi ọma nke m, ma ọ bụghị na ọ ga-anata [otu narị] ugbu a n’oge a. . . ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi n’oge nke na-abịa.” (Mak 10:29, 30) Otu puku afọ malite ugbu a, olee uru ọrụ, ụlọ, ma ọ bụ ego gị dị n’ụlọ akụ̀ ga-aba? Ma, àjà nile ị chụworo maka Jehova ga-aba uru ruo otu nde afọ malite ugbu a—otu ijeri afọ malite ugbu a! “N’ihi na Chineke abụghị onye ajọ omume ichezọ ọrụ unu.”—Ndị Hibru 6:10.
20 Ya mere, ka anyị na-ebi ndụ na-eburu ebighị ebi n’uche, na-elegide anya anyị, ọ bụghị ‘n’ihe a na-ahụ anya, kama ihe a na-adịghị ahụ anya: n’ihi na ihe a na-ahụ anya na-adịru nwa oge; ma ihe a na-adịghị ahụ anya dị ebighị ebi.’ (2 Ndị Kọrint 4:18) Habakuk onye amụma dere, sị: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” (Habakuk 2:3) Olee otú ‘ichere’ ọgwụgwụ ahụ ga-esi emetụta ụzọ anyị si emezu ibu ọrụ onwe anyị na nke ezinụlọ anyị? Isiokwu anyị na-esonụ ga-atụle ihe ndị a.
Isi Ihe Maka Ntụleghachi
◻ Olee otú ihe yiri ịnọ ọdụ nke ọgwụgwụ usoro ihe a siworo metụta ole na ole taa?
◻ Gịnị bụ ihe ndabere maka olileanya anyị nke ndụ ebighị ebi?
◻ Olee otú anyị kwesịrị isi ele àjà ndị anyị chụworo maka ọdịmma Alaeze anya?
[Foto dị na peeji nke 15]
A ghaghị ịrụzu ọrụ nkwusa zuru ụwa ọnụ tupu ọgwụgwụ ahụ abịa