Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 7/15 p. 26
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ememe Ndị Dị Ịrịba Ama n’Akụkọ Israel
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • “Ị Ga-abụkwa Onye Na-aṅụrị Nanị Ọṅụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ememe Owuwe Ihe Ubi Hà Na-amasị Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 7/15 p. 26

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ebe ọ bụ na owuwe ihe ubi nke ọka bali na-amalite mgbe ụmụ nwoke nile nọ n’Izrel gara Ememe Achịcha Ekoghị Eko, ònye na-egbute ọka bali mbụ bụ́ nke a na-eweta n’ebe nsọ ahụ?

Iwu Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Ugboro atọ n’afọ ka a ga-ahụ ndị ikom gị nile n’ihu Jehova, bụ́ Chineke gị, n’ebe ahụ nke Ọ ga-ahọpụta; n’ememe achịcha ekoghị eko, na n’ememe nke izu asaa nke ụbọchị asaa, na n’ememe ụlọ ntu.” (Deuterọnọmi 16:16) Site n’oge Eze Solomọn gawa, ebe Chineke họpụtara bụ ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem.

A na-eme ememe nke mbụ n’ime atọ a na-eme n’afọ ná mmalite nke oge opupu ihe ubi. Ememe a a na-akpọ Ememe Achịcha Ekoghị Eko na-amalite otu ụbọchị ka Ememe Ngabiga a na-eme na Naịsan 14 gasịrị ma na-adịru abalị asaa nke na-agwụsị na Naịsan 21. Ụbọchị nke abụọ nke ememe ahụ, nke bụ́ Naịsan 16, bụ ụbọchị owuwe ihe ubi nke mbụ n’afọ na-amalite, dabere na kalenda nsọ ahụ. N’ụbọchị ahụ, nnukwu onye nchụàjà ga-ewere “ùkwù nke ihe mbụ” nke owuwe ihe ubi bali ma ‘fee ya n’ihu Jehova’ n’ebe nsọ ahụ. (Levitikọs 23:5-12) Ebe ọ bụ na a chọrọ ka ụmụ nwoke nile nọrọ n’Ememe Achịcha Ekoghị Eko ahụ, ònye na-egbute ihe ahụ e ji enye onyinye?

Ọ bụ mba ahụ dum ka e nyere iwu inye Jehova ihe mbụ ahụ e gbutere n’ubi n’oge Ememe Achịcha Ekoghị Eko. A chọghị ka onye nke ọ bụla malite owuwe ihe ubi ahụ ma weta ihe ndị mbụ o wetara n’ebe nsọ ahụ maka onwe ya. Kama nke ahụ, a chọrọ ka mba ahụ dum nyekọta onyinye ahụ ọnụ. N’ihi ya, e nwere ike ịhọpụta ndị mmadụ ma ziga ha n’ubi dị nso n’ụlọ nsọ ahụ ịga gbute ùkwù ọka bali ahụ a ga-eji mee Ememe Achịcha Ekoghị Eko. Mgbe akwụkwọ nkà ihe ọmụma bụ́ Encyclopædia Judaica na-ekwu banyere nke a, o kwuru, sị: “A na-esi n’ubi dị na Jeruselem egbute ọka bali ahụ ma ọ bụrụ na ọ chaala; ma ọ bụkwanụ e si n’ebe ọ bụla n’Izrel gbute ya. Ọ bụ ụmụ nwoke atọ ndị jicha mma na nkata na-aga egbute ya.” A ga-ewetaziri nnukwu onye nchụàjà otu ùkwù ọka bali, ya enye ya Jehova n’onyinye.

Iwu ahụ e nyere ndị Izrel ka ha na-enye Jehova ihe mbụ ha wetara n’ubi n’onyinye nyere ha ohere magburu onwe ya ikele Chineke maka ịgọzi ala ha na ihe ubi ha. (Deuterọnọmi 8:6-10) Ma e wezụgakwa nke ahụ, onyinye ahụ a na-enye mgbe a na-eme ememe bụ “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 10:1) Ọ bụ ihe dabara adaba na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ na Naịsan 16 nke afọ 33 O.A., bụ́ ụbọchị a na-enye Jehova ihe mbụ e wetara n’ubi n’onyinye. Pọl onyeozi dere banyere Jizọs, sị: “E siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ. . . . Ma onye ọ bụla n’usoro nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa ndị bụ́ ndị nke Kraịst ahụ n’oge ọnụnọ ya.” (1 Ndị Kọrint 15:20-23) Ùkwù nke ihe mbụ ahụ e wetara n’ubi nke nnukwu onye nchụàjà na-efe n’ihu Jehova na-anọchi anya Jizọs Kraịst ahụ e si n’ọnwụ kpọlite—bụ́ onye mbụ e si n’ọnwụ kpọlite ịdị ndụ ebighị ebi. Jizọs si otú ahụ meghee ụzọ maka ntọhapụ nke ụmụ mmadụ site n’aka mmehie na ọnwụ.

[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 26]

© 2003 BiblePlaces.com

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya