Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 10/1 p. 29
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • ‘A Ga-eme Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Si n’Ọnwụ Bilie’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 10/1 p. 29

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị bụ baptizim n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

Mgbe Pọl onyeozi na-ede banyere mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe, o dere otu ihe na-akpali nnọọ mmasị. Na Bible Nsọ nke Union Version, anyị na-agụ, sị: “A sị na ọ dịghị otú a, gịnị ka ha ga-eme, bụ́ ndị a na-eme baptizim n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie ma ọlị, ọ̀ bụkwa gịnị mere a na-eme ha baptizim n’ọnọdụ ha?” Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society sikwa otú a sụgharịa akụkụ ihe odide a: “Ọ̀ bara uru ime ndị mmadụ baptizim n’aha ndị nwụrụ anwụ? Gịnị mere e ji mee ha baptizim ma ọ bụrụ na ha enweghị olileanya na ndị nwụrụ anwụ ga-emesị bilie dị ndụ ọzọ?”—1 Ndị Kọrint 15:29.

Pọl ọ̀ na-atụ aro n’ebe a ka e mee ndị dị ndụ baptizim n’aha ndị nwụrụ mgbe a na-emebeghị ha baptizim? Ọ pụrụ iyi otú ahụ dị ka nsụgharị ndị a na ụfọdụ ndị ọzọ nke Bible na-egosi. Otú ọ dị, inyochakwu Akwụkwọ Nsọ na asụsụ Grik mbụ Pọl ji mee ihe na-enye echiche ọzọ. Ihe Pọl bu n’uche bụ na e mere Ndị Kraịst e tere mmanụ baptizim, ma ọ bụ mikpuo ha ná mmiri, ịgbaso ụzọ ndụ nke ga-eduga ha n’ịnwụ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, dị ka Kraịst nwụrụ. Mgbe e mesịrị, a ga-akpọlite ha ịghọ ndị mmụọ dị ka ya.

Akwụkwọ Nsọ na-akwado nkọwa a. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Rom, ọ sịrị: “Ùnu amaghị na anyị nile ndị e mere baptizim baa na Kraịst Jizọs bụ ndị e mere baptizim baa n’ọnwụ ya?” (Ndị Rom 6:3) N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị, Pọl kwuru banyere ya onwe ya, na-asị: “Ikere òkè n’ahụhụ [Kraịst], na-enyefe onwe m n’aka ọnwụ yiri nke ya, iji hụ ma o nwere ụzọ m ga-esi nweta mbilite n’ọnwụ bu ụzọ site ná ndị nwụrụ anwụ.” (Ndị Filipaị 3:10, 11) Pọl na-akọwa na ndụ nke ụmụazụ Kraịst e tere mmanụ na-agụnye ụzọ ndụ nke iguzosi ike n’ezi ihe n’okpuru ule, iche ọnwụ ihu kwa ụbọchị, na imesị nwụọ dị ka ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe, nke mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe ga-esochi.

O kwesịrị ịrịba ama na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị a na ndị ọzọ bụ́ ndị kpọtụrụ ọnwụ uche kpọmkwem mgbe ha na-ekwu banyere ndị e mere baptizim na-ezo aka n’ebe ndị dị ndụ e meworo baptizim nọ ọ bụghị ndị nwụworo anwụ. Pọl gwakwara Ndị Kraịst ibe ya e tere mmanụ, sị: “E likọrọ unu na ya na baptizim ya, sitekwa n’iso ya na-enwe mmekọrịta, a kpọlitekọkwara unu site n’okwukwe unu nwere n’ịrụ ọrụ nke Chineke, onye si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya.”—Ndị Kọlọsi 2:12.

Mbuụzọ Grik bụ́ hy·perʹ nke a sụgharịrị ịbụ “n’ọnọdụ” ma ọ bụ “n’aha” n’ọtụtụ nsụgharị Bible na 1 Ndị Kọrint 15:29 pụkwara ịpụta “ka ha wee ghọọ.” N’ihi ya, n’ikwekọ n’akụkụ ndị ọzọ nke Bible, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst sụgharịrị amaokwu a n’ụzọ ziri ezi, sị: “Gịnị ka ha ga-eme bụ́ ndị a na-eme baptizim ka ha wee ghọọ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na a gajeghị ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ma ọlị, n’ihi gịnị ka a na-emekwa ha baptizim ha wee ghọọ ndị dị otú ahụ?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya