Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 9/15 p. 24-25
  • ‘Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịdị n’Otu na Ịdị Ọcha nke Omume Dị Oké Mkpa
  • Na-echebara Ndị Ozọ Echiche
  • Gosi Nsọpụrụ, Meekwa Ka Ihe Na-aga n’Usoro
  • Na-eme Ihe Mgbe Nile Iji Nye Chineke Otuto
  • ‘Na-anwanụ Onwe Unu, Ma Ùnu Dị n’Okwukwe Anyị’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Abanyeghị n’Ọlụlụ—Ụzọ Ọrụ Uche Mgbasasị Na-adịghị Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Ozi Abụọ E Degaara Ndị Kọrịnt
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ị̀ Na-egbukepụ Ebube Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 9/15 p. 24-25

‘Na-emenụ Ihe Nile Ka E Wee Nye Chineke Otuto’

Isi Ihe Ndị Sitere ná Ndị Kọrint nke Mbụ

OTUTO Jehovah Chineke di oké mkpa nye ndị nile na-efe ya ofufe ‘n’ime mmụọ na eziokwu.’ (Jọn 4:23, 24) Ya mere, Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst ibe ya bi na Kọrint oge ochie, sị: ‘Ma ùnu na-eri ihe, ma ùnu na-aṅụ ihe, ma ùnu na-eme ihe ọ bụla, na-emenụ ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.’ (1 Ndị Kọrint 10:31) Ime nke a chọrọ anyị n’aka ịnakwere ụzọ Jehova si na-edozi nsogbu anyị nile n’ime ụwa nke a nke na-achụso ihe onwunwe, nke na-eme omume rụrụ arụ, nke mikpukwara n’okpukpe ụgha.

Ọ dị ndị Kraịst bụ ndị Kọrint mkpa inweta enyemaka Chineke iji dozie nsogbu dị iche iche, n’ihi na ha bi n’obodo nke ihe na-agara nke ọma n’ụzọ akụ na ụba, nke jupụtakwara n’omume rụrụ arụ na okpukpe ụgha. N’ịbụ nke dị n’otu ebe ala dị warara, nke oké osimiri dị n’akụkụ ya abụọ, nke dị n’agbata mba Gris na Peloponnisos, Kọrint bụ isi obodo nke ógbè Akaịa nke ndị Rom na-achị, o nwekwara ihe e chere na o ruru 400,000 ndị bi na ya. Pọl guzobere ọgbakọ dị n’ebe ahụ n’ihe dị ka afọ 50 O.A.—Ọrụ 18:1-11.

Ndị Kọrint ahụ degaara Pọl akwụkwọ, na-ajụ ajụjụ banyere alụmdi na nwunye na iri anụ a chụworo n’àjà nye arụsị. (7:1) Ò nyere ya nsogbu n’obi n’ihi na e nwere nkewa na okwu metụtara oké omume rụrụ arụ n’etiti ha. Ọ dị ha mkpa inweta ntụziaka banyere ụzọ ziri ezi a ga-esi mee ememe Nri Anyasị Onyenwe anyị. E nwere ọbụna ihe iyi egwu nke ndapụ n’ezi ofufe, ọ dịkwa ọgbakọ ahụ mkpa inweta ndụmọdụ banyere ịhụnanya. N’ihi ihe ndị dị otú ahụ, Pọl dere akwụkwọ ozi mbụ ya sitere n’ike mmụọ nsọ nke o degaara ndị Kọrint site n’Efesọs n’ihe dị ka afọ 55 O.A. Ma anyị onwe anyị pụkwara irite uru site na ya.

Ịdị n’Otu na Ịdị Ọcha nke Omume Dị Oké Mkpa

Ọ bụrụ na anyị ‘na-eme ihe nile ka e wee nye Chineke otuto,’ anyị agaghị agbaso onye ọ bụla nke na-achọ ịkpata nkewa n’ime ọgbakọ—bụ́ otu n’ime nsogbu chere ndị Kọrint ahụ ihu. (1:1-4:21) Pọl gbara ha ume ka ha ‘na-ekwu otu ihe, ka e meekwa ka ha dị n’otu n’otu uche ahụ na n’otu izu ahụ.’ A ga-enwe ịdị n’otu ma ọ bụrụ na anyị agbasoo ndụmọdụ nke a, zụlitekwa àgwà ime mmụọ dị iche iche. Kama ịnya isi n’ime mmadụ ọ bụla nke na-emehie emehie, anyị kwesịrị icheta na ọ bụ ezie na anyị ‘na-akụ, na-akwọsakwa mmiri, ọ bụ Chineke na-eme ka ọ na-eto eto’ n’ụzọ ime mmụọ. Ndị ahụ na-anya isi na Kọrint enweghị ihe ọ bụla nke ha na-anataghị anata; ya mere, ka anyị ghara iwere onwe anyi ná ndị ka ndị kwere ekwe ibe anyị. Mmụọ obi umeala dị otú a ga-enyere anyị aka ịkwalite ịdị n’otu.

Otú ọ dị, ka ịdị n’otu wee dịgide, ndị okenye a họpụtara ahọpụta aghaghị ime ihe iji debe ọgbakọ ọcha n’ụzọ ime mmụọ. (5:1-6:20) Ebe ọ bụ na ‘ihe iko achịcha dị nta na-eko ógbè ụtụ ọka a gwọrọ agwọ dum,’ a ghaghị ịchụpụ ndị na-akwa iko na-enweghị nchegharị, ndị anyaukwu, ndị na-ekpere arụsị, ndị na-ekwutọ mmadụ, ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, n’ọgbakọ. A gaghị agbachi nkịtị ka adịghị ọcha nke omume, nke na-emerụ ụlọ nsọ Chineke, dịgide n’etiti ndị Jehova. Kama nke ahụ, ha aghaghị ime ihe ndị na-ewetara Chineke otuto.

Na-echebara Ndị Ozọ Echiche

Iji bụrụ ndị ‘na-eme ihe nile ka e wee nye Chineke otuto,’ ọ dị mkpa ka anyi tinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, n’ihe banyere alụmdi na nwunye na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. (7:1-40) Ndị e jikọrọ n’alụmdi na nwunye kwesịrị iji ezi echiche banyere di ma ọ bụ nwunye ha na-enyerịta ibe ha ihe ruuru ha n’ihe banyere mmekọahụ. Onye Kraịst lụworo di ma ọ bụ nwunye ekwesighị ikewapụ onwe ya n’ebe di ma ọ bụ nwunye ya nke na-ekweghị ekwe nọ, n’ihi na ịnọgide n’otu pụrụ inyere onye ahụ aka inweta nzọpụta. Ebe alụmdi na nwunye na-eweta nchegbu ka ukwuu, inọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye pụrụ ịbara mmadụ uru, bụ́ onye nwere ọchịchọ inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ site n’ijere Onyenwe anyị ozi n’enweghị ihe ndọpụ uche.

Ichebara ọdịmma ime mmụọ nke ndị ọzọ echiche bụ ọrụ dịịrị ndị Kraịst nile ma hà lụrụ di na nwụnye ma ọ bụ na ha alụghị. (8:1-10:33) Ya mere, e nyere ndị Kọrint ahụ ndụmọdụ ka ha ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ site n’iri ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị. Iji wee zere igbochi onye ọ bụla ịnakwere ozi ọma ahụ, ọbụna na Pọl ejighị ihe ahụ ruuru ya mee ihe, bụ́ ikike o nwere ịnara enyemaka n’ụzọ ihe onwunwe. O ‘tipụtakwara ahụ ya ọnyá, ka ọ ghara ịbụ onye a jụrụ ajụ mgbe o kwusasịịrị ndị ọzọ ozi ọma.’ Iburu ahụmahụ Israel ahụ mehiere emehie nwere n’ọzara n’obi ga-enyere anyị aka izere ikpere arụsị na ime ihe ọjọọ. Karịsịa, ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto’ ga-enyere anyị aka izere ime ka onye ọ bụla sụọ ngọngọ

Gosi Nsọpụrụ, Meekwa Ka Ihe Na-aga n’Usoro

‘Ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto’ chọrọ ka anyị na-egosi ezi nsọpụrụ. (11:1-34) Nwanyị bụ onye Kraịst na narị afọ mbụ na-egosi nsọpụrụ kwesịrị ekwesị site n’iyi ihe mkpuchi isi mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma n’ime ọgbakọ. Ndị inyom na-atụ egwu Chineke na-egosikwa nsọpụrụ dị otú ahụ taa. Karịsịa, iji zere iyi ndị Kọrint ahụ ndị ọ dị mkpa ka a gbazie ha olu, anyị nile aghaghị igosi ezi nsọpụrụ maka Nri Anyasị Onyenwe anyị.

Iji wee ‘mee ihe nile ka e wee nye Chineke otuto,’ anyị aghaghị iduzi nzukọ anyị dị iche iche n’ụzọ a haziri nke ọma. (12:1-14:40) Mgbe ndị Kraịst mbụ ahụ zukọtara, a na-eji onyinye nke mmụọ nsọ ndị dị ka ịsụ asụsụ dị iche iche na-eme ihe, na-egosikwa nsọpụrụ na ekele maka ebe e si nweta ha na nzube ha na-emezu. Ọ bụ ezie na anyị enweghi onyinye ndị a ugbu a, anyị na-ewetara Chineke otuto site n’igosipụta ịhụnanya, bụ́ nke karịchara ha nile. Anyị na-enyekwa Chineke otuto n’ihi na a na-ahazi nzukọ anyị nile nke ọma, anyị na-ejikwa nsọpụrụ na-etinye ndụmọdụ Pọl n’ọrụ, nke bụ: ‘Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.’

‘Ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto’ na-akpọku anyị ịsọpụrụ ozizi Bible na iguzosi ike n’ime mmụọ. (15:1-16:24) Ma eleghị anya, n’ịbụ ndị ọkà ihe ọmụma ndị Grik metụtara, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ dị na Kọrint sịrị: ‘Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị.’ (Tụlee Ọrụ 17:18, 23.) Ọ pụrụ ịbụ na ha nwere echiche nke ndị dapụrụ n’ezi ofufe nke bụ na a gajeghị inwe mbilite n’ọnwụ kama na ndị Kraịst dị ndụ ugbu a enwewo mbilite n’ọnwụ ihe atụ n’ụzọ ime mmụọ. (2 Timoti 2:16-18) Pọl kwadoro olileanya nke bụ ezie site n’ihota mbilite n’ọnwụ nke Jisọs, gosikwa na ndị Kraịst e tere mmanụ aghaghị ịnwụ ka e wee kpọlite ha gaa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. N’ụzọ ndị ọzọkwa, okwu ya na-enyere anyị aka izere ndapụ n’ezi ofufe ma ‘guzosie ike n’okwukwe anyị.’

Na-eme Ihe Mgbe Nile Iji Nye Chineke Otuto

Ndụmọdụ Pọl nke dị ná Ndị Kọrint nke Mbụ bara uru taa dịkwa ka ọ bara n’ime narị afọ mbụ O.A. O na-akpali Ndịàmà Jehova nke oge a ijere Chineke ozi n’ịdị n’otu dị ka ndị dị ọcha. Okwu onyeozi ahụ kwesịrị ịkpali anyị ichebara ndị ọzọ echiche, na-egosikwa nsọpụrụ kwesịrị ekwesị. Ihe Pọl kwuru pụkwara iwusi anyị ike iji guzogide ndapụ n’ezi ofufe, guzosiekwa ike n’akụkụ ezi okwukwe ahụ.

N’ezie, ọ bụ ọchịchọ sitere n’ala ala obi nke ohu Jehova ọ bụla kwesịrị ntụkwasị obi ịgọzi ya, ịkpọsa Alaeze ya, na inye aha nsọ ya otuto. (Abụ Ọma 145:1, 2, 10-13) N’eziokwu, akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ndị Kọrint na-enyere anyị aka ‘ime ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.’

[Igbe/Foto dị na peeji nke 24, 25]

NDỊ E JI N’AKA NA HA GA-ANWỤ: Ihe karịrị otu ugbo n’akwukwọ ozi ndị ahụ o degaara ndị Kọrint, Pọl zoro aka n’ịnwụ n’ọgbọ ihe nkiri. Dị ka ihe atụ, o dere, sị: ‘Ana m eche na Chineke weere anyị, bụ́ ndị ozi, gosi, dị ka ndị ikpeazụ, dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ: n’ihi na e mere anyị ihe nkiri nye ụwa na ndị mmụọ ozi na mmadụ.’ (1 Ndị Kọrint 4:9) Ọ pụrụ ịbụ na Pọl na-eche echiche banyere ndị bestiarii (ndị ikom na-alụso anụ ọhịa ọgụ) na ndị gladiator (ndị ikom na-alụso ndị ikom ndị ọzọ ọgụ). Ụfọdụ na-alụ ọgụ ka e wee kwụọ ha ụgwọ, ma a na-amanye ndị omempụ amanye ịlụ ọgụ ahụ. N’ịbụ ndị a na-ebu ụzọ kwere ka ha jiri ihe agha mee ihe, a na-emesịa gbaba ndị e ji eji ọtọ wee kpọpụta ha, n’enweghị ihe ọ bụla ha pụrụ iji chebe onwe ha, na-abụ ndị e ji n’aka na ha ga-anwụ.

N’inwe ‘ndị mmụọ ozi’ na ‘mmadụ’ (ọ bụghị nanị ‘ụwa’ nke ihe a kpọrọ mmadụ) dị ka ndị na-ekiri ha, ndị ozi ahụ yiri ndị gaje ịnwụ n’ihe nkiri ikpeazụ dị otú ahụ nke a na-awụfu ọbara na ya. Pọl kwuru na ya ‘lụrụ ọgụ megide anụ ọhịa n’Efesọs,’ ma ụfọdụ ndị na-arụ ụka na a garaghị etinyeworị onye bụ nwa amaala Rom n’ọnọdụ dị otú ahụ, wee na-ekwu na ọ na-ezo aka n’ebe ndị mmegide yiri anụ ọhịa nọ. (1 Ndị Kọrint 15:32) Ma okwu Pọl nke bụ na Chineke napụtara ya ‘n’oké ọnwụ dị otú a’ n’ógbè Esia (bụ́ ebe Efesọs dị) kwekọrọ n’ahụmahụ nke metụtara anụmanụ ndị dị adị n’ezie n’ime ọgbọ ihe nkiri karịa otú o si kwekọọ n’ịbụ mmegide nke ụmụ mmadụ.—2 Ndị Kọrint 1:8-10; 11:23; Ọrụ 19:23-41.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

LEKWASỊ ANYA N’IHE MGBATA N’ỌSỌ AHỤ: Pọl jiri akụkụ dị iche iche nke egwuregwu ndị Grik oge ochie mee ihe iji kọwaa isi ihe ndị dị oké mkpa. (1 Ndị Kọrint 9:24-27) N’ọsụsọ mpì ndị dị ka Egwuregwu Isthmus ahụ a na-enwe n’afọ abụọ ọ bụla n’ebe dị nso Kọrint, ihe mejupụtara usoro ihe omume ahụ bụ ịgba ọsọ, iti ọkpọ, na ihe omume ndị ọzọ. Mgbe ha na-akwadebe maka ịsọ mpì ndị a, ndị na-agba ọsọ na ndị na-eti ọkpọ na-egosipụta njide onwe onye, jiri ụdị ihe oriri ndị na-adịghị ebu mmadụ ibu na-akwado onwe ha, gharakwa ịṅụ mmanya ọ bụla ruo ọnwa iri. Otú ọ dị, kama ịbụ okpueze ahụ na-ere ure nke e ji ahịhịa pine ma ọ bụ ivy mee, bụ́ nke a na-enye ndị meriri n’Egwuregwu Isthmus ahụ, onye Kraịst e tere mmanụ na-agbasi mbọ ike iji nweta okpueze ahụ na-adịghị ere ure nke bụ anwụghị anwụ. Iji nweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ, ọ ghaghị ilekwasị ya anya, gosipụtakwa njide onwe onye. Otu ụkpụrụ ahụ metụtakwara Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị nwere ndụ ebighị ebi n’elu ala dị ka ihe mgbaru ọsọ ha.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya