‘A Ga-eme Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Si n’Ọnwụ Bilie’
“N’ihi na a ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’apụghị ire ure, a [ga-enwoghakwa] anyị onwe anyị.”—1 NDỊ KỌRINT 15:52.
1, 2. (a) Nkwa dị aṅaa na-akasi obi ka e nyere site n’aka Hosea onye amụma? (b) Olee otú anyị si mara na Chineke chọrọ iweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ?
ONYE ị hụrụ n’anya ọ̀ nwụnahụtụwo gị? Mgbe ahụ ị maara ihe mgbu nke ọnwụ pụrụ iweta. Otú o sina dị, ndị Kraịst na-enweta nkasi obi ná nkwa ahụ Chineke nyere site n’aka onye amụma bụ́ Hosea: “N’aka [Sheol, NW] ka M ga-esi gbapụta ha; n’aka ọnwụ ka M ga-eme ka ha si pụọ nwere onwe ha: olee ebe ajọ ọrịa gị nile nke na-efe efe dị, gị ọnwụ? Olee ebe mbipụ gị dị, gị [Sheol, NW]?”—Hosea 13:14.
2 Echiche nke ndị nwụrụ anwụ ịbịaghachi ná ndụ na-eyi ihe nzuzu nye ndị na-enwe obi abụọ. Ma Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile nwere ikike n’ezie ịrụ ọrụ ebube dị otú ahụ! Ihe bụ́ okwu n’ezie bụ ma Jehova ọ chọrọ iweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ. Nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?” Mgbe ahụ, o nyere azịza a na-emesi obi ike, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa Gị: agụụ ọrụ aka Gị ga-agụ Gị.” (Job 14:14, 15) Okwu ahụ bụ́ “agụụ” na-enye echiche ịchọsi ihe ike. (Tụlee Abụ Ọma 84:2.) Ee, Jehova na-atụsi anya mbilite n’ọnwụ ike—ọ na-agụsi ya agụụ ike ịhụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ anwụ ọzọ, bụ́ ndị dị ndụ ná ncheta ya.—Matiu 22:31, 32.
Jisọs Ewepụta Mbilite n’Ọnwụ n’Ìhè
3, 4. (a) N’ìhè dị aṅaa ka Jisọs wepụtara mbilite n’ọnwụ? (b) N’ihi gịnị ka e ji kpọlite Jisọs dị ka mmụọ, n’abụghị n’anụ ahụ?
3 Ndị ikom nwere okwukwe n’oge ochie dị ka Job nwere nanị nghọta na-ezughị ezu banyere mbilite n’ọnwụ. Ọ bụ Jisọs Kraịst wepụtara olileanya a dị ebube n’ìhè n’ụzọ zuru ezu. O gosiri òkè bụ́ isi ya onwe ya na-ekere mgbe ọ sịrị: “Onye kweere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:36) Olee ebe a ga-anụ ụtọ ndụ ahụ? Nye ihe ka n’ọtụtụ ndị ahụ nwere okwukwe, ọ ga-abụ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:11) Otú ọ dị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Atụla egwu, ìgwè atụrụ nta; n’ihi na ọ dị Nna unu ezi mma inye unu alaeze Ya.” (Luk 12:32) Alaeze Chineke dị n’eluigwe. N’ihi ya, nkwa nke a pụtara na “ìgwè atụrụ nta” aghaghị isoro Jisọs nọrọ n’eluigwe dị ka ndị mmụọ e kere eke. (Jọn 14:2, 3; 1 Pita 1:3, 4) Lee atụmanya dị ebube ọ bụ! Jisọs kpughekwuuru Jọn onyeozi na ọnụ ọgụgụ “ìgwè atụrụ nta” a ga-abụ nanị 144,000.—Mkpughe 14:1.
4 Ma, olee otú 144,000 ahụ ga-esi banye n’ebube eluigwe? Jisọs ‘sitere n’ozi ọma Ya wepụta ndụ na emebighị emebi n’ìhè.’ Site n’ọbara ya, o guzobere ‘ụzọ dị ọhụrụ dịkwa ndụ’ n’eluigwe. (2 Timoti 1:10; Ndị Hibru 10:19, 20) Nke mbụ, ọ nwụrụ, dị ka Bible buru n’amụma na ọ ga-anwụ. (Aịsaịa 53:12) Mgbe ahụ, dị ka Pita onyeozi mesịrị kpọsaa, “Jisọs nke a ka Chineke mere ka O si n’ọnwụ bilie.” (Ọrụ 2:32) Otú ọ dị, a kpọliteghị Jisọs dị ka mmadụ. O kwuworị, sị: “Nri nke Mụ onwe m ga-enyekwa bụ anụ ahụ m, n’ihi ndụ nke ụwa.” (Jọn 6:51) Iwereghachi anụ ahụ ya ga-eme ka àjà ahụ gharakwa ịdị irè. Ya mere, e mere ka Jisọs “nwụọ anwụ n’anụ ahụ Ya, ma e mere ka Ọ dị ndụ ná mmụọ Ya.” (1 Pita 3:18) Jisọs si otú a ‘chọpụta mgbapụta ebighị ebi nye anyị,’ nke pụtara “ìgwè atụrụ nta.” (Ndị Hibru 9:12) O chere uru nke ndụ mmadụ ya zuru okè n’ihu Chineke dị ka ihe mgbapụta maka ihe a kpọrọ mmadụ na-emehie emehie, 144,000 ahụ bụkwa ndị mbụ ritere uru na nke a.
5. Olileanya dị aṅaa ka e nyere ụmụazụ Jisọs nke narị afọ mbụ?
5 Jisọs agaghị abụ nanị onye a kpọlitere gaa ná ndụ eluigwe. Pọl gwara ndị Kraịst ibe ya nọ na Rom na e werewo mmụọ nsọ tee ha mmanụ ịbụ ụmụ Chineke na ndị ha na Kraịst na-eketakọ ma ọ bụrụ na ha emee ka ite mmanụ ha guzosie ike site n’ịtachi obi ruo ọgwụgwụ. (Ndị Rom 8:16, 17) Pọl kọwakwara, sị: “A sị na e jiri oyiyi ọnwụ Ya mee ka anyị na Ya tokọọ bụrụ otu ihe, a ga-ejikwa oyiyi nke mbilite n’ọnwụ Ya mee ka anyị na Ya tokọọ bụrụ otu ihe.”—Ndị Rom 6:5.
Ná Nkwado nke Olileanya Mbilite n’Ọnwụ
6. N’ihi gịnị ka e ji na-ebuso nkwenye ná mbilite n’ọnwụ agha na Kọrint, oleekwa otú Pọl onyeozi si zaghachi?
6 Mbilite n’ọnwụ bụ akụkụ nke “okwu nke mmalite” nke Iso Ụzọ Kraịst. (Ndị Hibru 6:1, 2) Otú o sina dị, a nọ na-ebuso ozizi ahụ agha na Kọrint. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ, dị ka ihe àmà na-egosi na ha bụ ndị nkà ihe ọmụma Gris metụtara, nọ na-asị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị.” (1 Ndị Kọrint 15:12) Mgbe akụkọ banyere nke a ruru Pọl onyeozi ntị, ọ kwadoro olileanya mbilite n’ọnwụ, karịsịa olileanya nke ndị Kraịst e tere mmanụ. Ka anyị nyochaa okwu Pọl dị ka e dekọrọ ha ná 1 Ndị Kọrint isi nke 15. Ọ ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị gụwo isiakwụkwọ ahụ n’ozuzu ya, dị ka a tụrụ aro ya n’isiokwu bu ụzọ.
7. (a) N’okwu dị aṅaa bụ́ isi ka Pọl lekwasịrị anya? (b) Olee ndị hụrụ Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie?
7 N’amaokwu abụọ mbụ nke 1 Ndị Kọrint isi nke 15, Pọl setịpụrụ isiokwu nke ihe ọ na-atụle: “Emee m ka unu mara, ụmụnna m, ozi ọma ahụ nke m ziri unu, nke unu natakwara, nke unu na-eguzokwa n’ime ya, nke e sitekwara [na ya] zọpụta unu, . . . ma a sị na ọ bụghị na unu kwere n’efu.” Ọ bụrụ na ndị Kọrint aghara iguzosi ike n’ozi ọma ahụ, ha anarawo eziokwu ahụ n’efu. Pọl gara n’ihu, sị: “Enyere m n’aka unu na mbụ ihe m natakwara idebe, na Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị nile, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị; na e likwara Ya; na e mewokwara ka O si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ, dị ka ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ si dị; na O mekwara ka Sifas hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị ozi iri na abụọ ahụ hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị karịrị [narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị hụ Ya anya n’otu mgbe, ndị ka n’ọnụ ọgụgụ n’etiti ndị ahụ na-anọgide ruo ugbu a, ma ụfọdụ adawo n’ụra ọnwụ; e mesịa O mere ka Jemes hụ Ya anya; e mesịa O mere ka ndị ozi nile hụ Ya anya; ma n’ikpeazụ ha nile, dị ka nwa a mụkworo amụkwo, O mere ka mụ onwe m hụkwa Ya anya.”—1 Ndị Kọrint 15:3-8.
8, 9. (a) Olee otú nkwenye ná mbilite n’ọnwụ dịruru mkpa? (b) N’oge dị aṅaa ka o yiri ka Jisọs mere ka “ndị karịrị [narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị” hụ ya anya?
8 Nye ndị ahụ nabataworo ozi ọma ahụ, nkwenye ná mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ ihe a na-aghaghị ime. E nwere ọtụtụ ndị ji anya ha hụ ihe merenụ iji kwadoo na “Kraịst nwụrụ n’ihi mmehie anyị nile” nakwa na e mewo ka o si n’ọnwụ bilie. Otu bụ Sifas, ma ọ bụ Pita, dị ka a ka mara ya. Mgbe Pita gọnahụsịrị Jisọs n’abalị nke nraranye na njide Jisọs, ọ ghaghị ịbụworị onye a kasiri obi nke ukwuu site na Jisọs ime ka ọ hụ ya anya. “Ndị ozi iri na abụọ ahụ,” ndị ozi ahụ dị ka otu ìgwè, bụkwa ndị Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie letara—ahụmahụ obi abụọ na-adịghị ya na o nyeere ha aka imeri egwu ha ma ghọọ ndị àmà nwere anya ike nye mbilite n’ọnwụ Jisọs.—Jọn 20:19-23; Ọrụ 2:32.
9 Kraịst mekwara ka ìgwè ka ukwuu hụ ya anya, “ndị karịrị [narị mmadụ ise] n’etiti ụmụnna anyị.” Ebe ọ bụ nanị na Galili ka o nwere ụmụazụ dị ukwuu otú ahụ, nke a pụrụ ịbụ n’oge ahụ a kọwara na Matiu 28:16-20, mgbe Jisọs nyere iwu ka e mee ndị na-eso ụzọ. Lee akaebe dị ike ndị a pụrụ ịgba! Ụfọdụ ka dị ndụ na 55 O.A., mgbe Pọl dere akwụkwọ ozi mbụ a nye ndị Kọrint. Otú ọ dị, rịba ama na e kwuru banyere ndị ahụ nwụworonụ dị ka ndị ‘daworo n’ụra ọnwụ.’ A kpọlitebeghị ha ịnata ụgwọ ọrụ eluigwe ha.
10. (a) Mmetụta dị aṅaa ka nzukọ ikpeazụ Jisọs so ndị na-eso ụzọ ya nwee nwere? (b) Olee otú Jisọs si mee ka Pọl hụ ya anya “dị ka nwa a mụkworo amụkwo”?
10 Onye ọzọ pụtara ìhè ji anya ya hụ mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ Jemes, nwa Josef na nne Jisọs, bụ́ Meri. Tupu mbilite n’ọnwụ ahụ, ihe àmà na-egosi na Jemes abụbeghị onye kwere ekwe. (Jọn 7:5) Ma mgbe Jisọs mesịrị ka ọ hụ ya anya, Jemes ghọrọ onye kwere ekwe, ikekwe kerekwa òkè n’ịtọghata ụmụnne ya ndị ọzọ. (Ọrụ 1:13, 14) Ná nzukọ ikpeazụ nke ya na ndị na-eso ụzọ ya, n’oge ahụ ọ rịgooro n’eluigwe, Jisọs nyere ha ọrụ ‘ịbụ ndị àmà ruo ebe ụwa sọtụrụ.’ (Ọrụ 1:6-11) E mesịa, o mere ka Sọl nke Tasọs hụ ya anya, bụ́ onye na-akpagbu ndị Kraịst. (Ọrụ 22:6-8) Jisọs mere ka Sọl hụ ya anya “dị ka nwa a mụkworo amụkwo.” Ọ dị ka a ga-asị na a kpọliteworị Sọl n’ọnwụ gaa ná ndụ nke mmụọ, o nweekwa ike ịhụ Onyenwe anyị ahụ e mere ka ọ dị ebube ọtụtụ narị afọ tupu oge mbilite n’ọnwụ ahụ ga-ewere ọnọdụ. Ahụmahụ a kwụsịrị Sọl ozugbo n’ọrụ mmegide igbu ọchụ ya n’ebe ọgbakọ ndị Kraịst dị ma kpata mgbanwe dị ịrịba ama. (Ọrụ 9:3-9, 17-19) Sọl ghọrọ Pọl onyeozi, otu n’ime ndị nkwado bụ́ isi nke okwukwe ndị Kraịst.—1 Ndị Kọrint 15:9, 10.
Okwukwe ná Mbilite n’Ọnwụ Dị Oké Mkpa
11. Olee otú Pọl si kpughee echiche ụgha dị n’ịsị, ‘Mbilite n’ọnwụ adịghị’?
11 Ya mere mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ eziokwu a gbaara akaebe nke ọma. “Ma ọ bụrụ na a na-ekwusa na e mewo ka Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,” ka Pọl na-arụ ụka ya, “ụfọdụ n’etiti unu si aṅaa na-ekwu na mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ adịghị?” (1 Ndị Kọrint 15:12) Ọ bụghị nanị na ndị dị otú ahụ nọ na-enwe obi abụọ ma ọ bụ ajụjụ onwe onye banyere mbilite n’ọnwụ kama ha nọ na-ekwupụta na ha ekweghị na ya. Ya mere Pọl kpughere echiche ụgha ha. Ọ na-ekwu na ọ bụrụ na e mebeghị ka Kraịst si n’ọnwụ bilie, ozi ndị Kraịst bụ ụgha, na ndị ahụ gbara akaebe banyere mbilite n’ọnwụ Kraịst bụ “ndị àmà ụgha nke Chineke.” Ọ bụrụ na e mebeghị ka Kraịst bilie, ọ dịghị ụgwọ mgbapụta a kwụworo Chineke; ndị Kraịst ‘na-anọ ná mmehie nile ha ugbu a.’ (1 Ndị Kọrint 15:13-19; Ndị Rom 3:23, 24; Ndị Hibru 9:11-14) Ndị Kraịst ‘daworo n’ụra ọnwụ,’ ụfọdụ bụ́ ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha, alawo n’iyi n’enweghị ezigbo olileanya. Lee ọnọdụ dị imere ebere ndị Kraịst gaara anọ n’ime ya ma ọ bụrụ na ndụ nke a bụ nanị nke ha pụrụ ịtụ anya ya! Nhụjuanya ha nile ga-abụ nnọọ ná nkịtị.
12. (a) Gịnị ka ịkpọ Kraịst “mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ” na-enye echiche ya? (b) Olee otú Kraịst si mee ka mbilite n’ọnwụ kwe omume?
12 Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ. Pọl na-aga n’ihu, sị: “E mewo ka Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.” Ọzọkwa, ọ bụ “mkpụrụ mbụ nke ndị daworo n’ụra ọnwụ.” (1 Ndị Kọrint 15:20) Mgbe ndị Israel ji nrubeisi nye Jehova mkpụrụ mbụ nke ihe ndị ha rụpụtara, Jehova ji owuwe ihe ubi buru ibu gọzie ha. (Ọpụpụ 22:29, 30; 23:19; Ilu 3:9, 10) Site n’ịkpọ Kraịst “mkpụrụ mbụ,” Pọl na-enye echiche na a ga-enwekwu owuwe ihe ubi nke ndị nwụrụ anwụ a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie gaa ná ndụ eluigwe. “Ebe ọnwụ sitere n’aka mmadụ,” ka Pọl na-ekwu, “mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ sitekwara n’aka mmadụ. N’ihi na dị ka ọnwụ dịịrị mmadụ nile n’ime Adam, ọ bụkwa otú a ka a ga-eme ka mmadụ nile dị ndụ n’ime Kraịst ahụ.” (1 Ndị Kọrint 15:21, 22) Jisọs mere ka mbilite n’ọnwụ kwe omume site n’inyefe ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta, na-emeghere ihe a kpọrọ mmadụ ụzọ ịbụ ndị a tọhapụrụ pụọ n’ịbụ ohu mmehie na ọnwụ.—Ndị Galetia 1:4; 1 Pita 1:18, 19.a
13. (a) Olee mgbe mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe ga-ewere ọnọdụ? (b) Olee otú o si bụrụ na ụfọdụ n’ime ndị e tere mmanụ adịghị ‘ada n’ụra ọnwụ’?
13 Pọl na-aga n’ihu, sị: “Ma mmadụ nile n’otu n’otu n’usoro nke aka ha: Kraịst, dị ka mkpụrụ mbụ; e mesịa ndị nke Kraịst, [n’ọnụnọ, NW] Ya.” (1 Ndị Kọrint 15:23) E mere ka Kraịst si n’ọnwụ bilie na 33 O.A. Otú ọ dị, ụmụazụ ya e tere mmanụ—“ndị nke Kraịst”—aghaghị ichere ruo nwa oge mgbe Jisọs malitesịrị ọnụnọ ya dị ka eze, bụ́ nke amụma Bible na-egosi na o mere na 1914. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:14-16; Mkpughe 11:18) Gịnị banyere ndị ahụ ga-anọ ndụ n’oge ọnụnọ ahụ? Pọl na-ekwu, sị: “Lee, agwa m unu ihe omimi: Ọ bụghị anyị nile ga-ada n’ụra ọnwụ, ma a [ga-enwogha] anyị nile, n’oge dịkarịsịrị nta, n’otu ntabi anya, mgbe a ga-afụ opi ikpeazụ: n’ihi na a ga-afụ opi, a ga-emekwa ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie n’apụghị ire ure, a [ga-enwoghakwa] anyị onwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 15:51, 52) N’ụzọ doro anya, ọ bụghị ndị nile e tere mmanụ na-arahụ ụra n’ime ili na-echere mbilite n’ọnwụ. A na-enwogha ndị nwụrụ n’oge ọnụnọ Kraịst ozugbo.—Mkpughe 14:13.
14. Olee otú e si eme ndị e tere mmanụ “baptism ná nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ”?
14 “Ma ọ́ bụghị otú ahụ,” ka Pọl na-ajụ, “gịnị ka ha ga-eme bụ́ ndị a na-eme baptism ná nzube nke ịbụ ndị nwụrụ anwụ? Ọ bụrụ na a gaghị eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie ma ọlị, n’ihi gịnịkwa ka e ji eme ha baptism ná nzube nke ịdị otú ahụ? N’ihi gịnịkwa ka anyị ji anọ n’ihe ize ndụ n’oge hour nile?” (1 Ndị Kọrint 15:29, 30, NW) Pọl adịghị ekwu na e mere ndị dị ndụ baptism n’ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, dị ka ụfọdụ nsụgharị Bible na-eme ka o yie. E kwuwerị, baptism na ịbụ onye na-eso ụzọ nke ndị Kraịst nwere njikọ, mkpụrụ obi nile nwụrụ anwụ apụghịkwa ịbụ ndị na-eso ụzọ. (Jọn 4:1) Kama nke ahụ, Pọl nọ na-ekwu banyere ndị Kraịst dị ndụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha, dị ka Pọl n’onwe ya, nọ “n’ihe ize ndụ n’oge hour nile.” E mere ndị Kraịst e tere mmanụ ‘baptism ịba n’ọnwụ Kraịst.’ (Ndị Rom 6:3) Kemgbe otite mmanụ ha, a na-eme ha “baptism,” dị ka a pụrụ isi kwuo ya, baa n’ụzọ nke ga-eduga n’ọnwụ dị ka nke Kraịst. (Mak 10:35-40) Ha ga-anwụ na-enwe olileanya nke mbilite n’ọnwụ dị ebube gaa n’eluigwe.—1 Ndị Kọrint 6:14; Ndị Filipaị 3:10, 11.
15. Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka Pọl pụrụ inweworị, oleekwa otú okwukwe ná mbilite n’ọnwụ si kere òkè n’idi ha?
15 Pọl na-akọwa ugbu a na ya onwe ya echewo ihe ize ndụ ihu ruo n’ókè nke na ọ pụrụ ịsị: “Ana m anwụ kwa ụbọchị.” Ka ụfọdụ ghara ibo ya ebubo ikwubiga okwu ókè, Pọl bu ụzọ kwuo, sị: “Eji m ịnya isi ahụ n’ahụ unu, ụmụnna m, nke m na-anya n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wee kwusie ike.” The Jerusalem Bible si otú a asụgharị amaokwu a: “Ana m eche ọnwụ ihu kwa ụbọchị, ụmụnna m, apụkwara m ịṅụrụ ya iyi site n’ọnụ m ji unu eme n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.” Dị ka ihe atụ nke ihe ize ndụ ndị o chere ihu, n’amaokwu nke 32, Pọl na-ekwu banyere ‘ịlụ ọgụ megide anụ ọhịa n’Efesọs.’ Ndị Rom na-egbukarị ndị omekome site n’ịtụbanyere ha anụ ọhịa n’ọgbọ egwuregwu. Ọ bụrụ na Pọl lụsoro anụ ọhịa nkịtị ọgụ, ọ pụrụ ịbụ site nanị n’enyemaka Jehova ka ọ lanarịrị. N’enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ, ịhọrọ ụzọ ndụ nke kpughere ya nye ihe ize ndụ dị otú ahụ gaara abụ nzuzu n’ezie. N’enweghị olileanya nke ndụ n’ọdịnihu, idi ihe isi ike na àjà ndị ya na ijere Chineke ozi na-agakọ agaghị aba oké uru. “Ọ bụrụ na e meghị ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie,” ka Pọl na-ekwu, “ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”—1 Ndị Kọrint 15:31, 32; lee 2 Ndị Kọrint 1:8, 9; 11:23-27.
16. (a) Olee ebe okwu ahụ bụ́ “ka anyị rie ṅụọkwa, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ” pụrụ isiworị malite? (b) Gịnị bụgasị ihe ize ndụ dị n’ịnabata echiche a?
16 Pọl pụrụ ihotaworị Aịsaịa 22:13, nke na-akọwa omume ikwere n’akara aka nke ndị na-enupụ isi bi na Jerusalem. Ma ọ bụ ọ pụrụ ibuworị nkwenkwe ndị Epikurean n’uche, bụ́ ndị ledara olileanya ọ bụla nke ndụ mgbe a nwụsịrị anya ma kwere na ihe ụtọ anụ ahụ bụ ihe kasị baa uru ná ndụ. Otú ọ bụla o si dị, nkà ihe ọmụma bụ́ ‘ka e rie ṅụọkwa’ adịghị asọpụrụ Chineke. N’ihi ya, Pọl dọrọ aka ná ntị: “Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Iso ndị ahụ jụrụ mbilite n’ọnwụ na-akpakọ pụrụ ịbụ nsí. Mkpakọrịta dị otú ahụ pụrụ ikereworị òkè ná nsogbu ndị Pọl na-aghaghị idozi n’ọgbakọ ndị Kọrint, dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, nkewa, ịgba akwụkwọ n’ụlọikpe, na enweghị nkwanye ùgwù maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.—1 Ndị Kọrint 1:11; 5:1; 6:1; 11:20-22.
17. (a) Agbamume dị aṅaa ka Pọl nyere ndị Kọrint? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa fọdụrụ ka a zaa?
17 N’ihi ya Pọl nyere ndị Kọrint agbamume ọma a: “Sinụ n’ụra mmanya teta n’ụzọ ezi omume, unu emehiekwala; n’ihi na ụfọdụ na-enwe amaghị ihe banyere Chineke: ana m ekwu nke a ka m mee unu ihere n’ihu.” (1 Ndị Kọrint 15:34) Echiche na-ezighị ezi banyere mbilite n’ọnwụ dugara ụfọdụ n’ụra mmanya ime mmụọ, dị ka a ga-asị na ha ṅụbigara mmanya ókè. Ọ dị ha mkpa iteta, inwe anya doro edo. Ọ dịkwa ndị Kraịst e tere mmanụ taa mkpa ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, na-abụghị ndị echiche inwe obi abụọ nke ụwa na-emetụta. Ha aghaghị ijigidesi olileanya nke mbilite n’ọnwụ ha gaa n’eluigwe ike. Ma ajụjụ ka fọdụrụ—nye ndị Kọrint n’oge ahụ nakwa nye anyị ugbu a. Dị ka ihe atụ, n’ụdị dị aṅaa ka a na-akpọli 144,000 ahụ gaa n’eluigwe? Gịnịkwa banyere ọtụtụ nde ndị ọzọ ka nọ n’ili, bụ́kwa ndị na-enweghị olileanya eluigwe? Gịnị ka mbilite n’ọnwụ ga-apụtara ndị dị otú ahụ? N’isiokwu anyị na-esonụ, anyị ga-atụle ihe ndị ọzọ fọdụrụnụ Pọl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee mbipụta Ụlọ Nche nke February 15, 1991, maka ntụle banyere ihe mgbapụta ahụ.
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ìhè dị aṅaa ka Jisọs wepụtara mbilite n’ọnwụ?
◻ Olee ndị bụ ụfọdụ ji anya ha hụ mbilite n’ọnwụ Kraịst?
◻ N’ihi gịnị ka e ji maa ozizi mbilite n’ọnwụ aka, gịnịkwa bụ nzaghachi Pọl?
◻ N’ihi gịnị ka okwukwe ná mbilite n’ọnwụ ji dị ndị Kraịst e tere mmanụ oké mkpa?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ada Jaịrọs ghọrọ ihe àmà na mbilite n’ọnwụ ga-ekwe omume
[Foto dị na peeji nke 16, 17]
Ọ bụrụ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ adịghị, ogbugbu e gburu ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi n’ihi okwukwe ha agaghị aba uru