Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 2/15 p. 13-18
  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnara Ihụnanya Jisọs n’Ụzọ Ziri Ezi
  • Ihe Jisọs Chọrọ Ka Anyị Mee
  • Gbasoo Ihe Nlereanya Jisọs
  • Ndị A Zụrụ Ịgba Àmà nke Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • “Onye Unu Hụrụ n’Anya, Ọ Bụ Ezie na Unu Ahụghị Ya Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Jiri Ịhụnanya Na-akụzi Ihe Ka Jizọs
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • “Ịmara Ịhụnanya nke Kraịst Ahụ”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 2/15 p. 13-18

Ị̀ Ga-anara Ịhụnanya Jisọs?

“Ịhụnanya Kraịst na-arụgide anyị.”—2 NDỊ KỌRỊNT 5:14.

1. Olee otú a pụrụ isi kọwaa ịhụnanya Jisọs?

N’EZIE, lee ka ịhụnanya Jisọs sị dị ukwu! Mgbe anyị na-atụle otú o si taa ahụhụ na-enweghị atụ ka ọ na-enye ihe mgbapụta, bụ́ nanị ihe ga-eme ka anyị nwee ndụ ebighi ebi, n’ezie a na-akpali obi anyị inye ya ekele! Jehova Chineke na Jisọs Kraịst n’onwe ya weere nzọụkwụ bụ ụzọ. Ha bu ụzọ hụ anyị n’anya, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie. (Ndị Rom 5:6-8; 1 Jọn 4:9-11) Ịmara “ihụnanya Kraịst,” ka Pọl onyeozi dere, “karịrị ọmụma nke ukwuu hie nne.” (Ndị Efesọs 3:19) N’ezie, ịhụnanya Jisọs dị elu nke ukwuu karịa ihe ọmụma nkịtị e bu n’isi. Ọ karịrị ihe ọ bụla ọzọ nke ụmụ mmadụ hụtụworo ma ọ bụ nwee ahụmahụ banyere ya.

2. Gịnị bụ ihe na-apụghị igbochi Jisọs ihụ anyị n’anya?

2 N’idegara ndị Kraịst nọ na Rom akwụkwọ, Pọl jụrụ, sị: “Ònye ga-ekewapụ anyị n’ihụnanya nke Kraịst? Ọ̀ bụ mkpagbu, ma ọ bụ oké mkpa, ma ọ bụ nsogbu, ma ọ bụ oké ụnwụ, ma ọ bụ ịgba ọtọ, ma ọ bụ ize ndụ, ma ọ bụ mma agha?” O nweghị otu n’ime ihe ndị ahụ nke ga-egbochi Jisọs ihụ anyị n’anya. “E mewo ka m kwenye,” ka Pọl gara n’ihu na-ekwu, “na ọnwụ, ma ọ bụ ndụ, ma ọ bụ ndị mmụọ ozi, ma ọ bụ ịbụ isi dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị ugbu a, ma ọ bụ ihe gaje ịdị, ma ọ bụ ike dị iche iche, ma ọ bụ ihe dị elu ma ọ bụ ihe dị omimi, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e kere eke, agaghị apụ ikewapụ anyị n’ihụnaya Chineke, nke dị n’ime Kraịst Jisọs Onyenwe anyị.”—Ndị Rom 8:35-39.

3. Gịnị nanị pụrụ ime ka Jisọs na Nna ya hapụ anyị?

3 Ịhụnanya nke Jehova Chineke na Jisọs nwere n’ebe ị nọ siri ike ruo otú a. E nwere nanị otu ihe pụrụ ime ka ha kwụsị ịhụ gị n’anya, nke ahụ bụkwa gị onwe gị ilezi anya jụ ịhụnanya ha site n’ịjụ ime ihe ha chọrọ. Otu onye amụma Chineke n’otu mgbe kọwaara onye eze Juda, sị: “Jehova nọnyeere unu mgbe unu nọnyere Ya; ọ bụrụ kwa na unu achọ ya, ọ ga-eme ka unu chọta ya; ma ọ bụrụ na unu ahapụ ya, ọ ga-ahapụ unu.” (2 Ihe Emere 15:2) Ònye n’ime anyị ga-achọ ikewapụ onwe anyị n’ebe ezi ndị enyi dị otú a, nwere obi ebere dị ka Jehova Chineke na Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst nọ?

Ịnara Ihụnanya Jisọs n’Ụzọ Ziri Ezi

4, 5. (a) Olee otú ịhụnanya Jisọs kwesịrị isi metụta mmekọrịta anyị na mmadụ ibe anyị? (b) Olee ndị ọzọ e kwesịrị ịkpali anyị ịhụ n’anya n’ihi ịhụnanya nke Jisọs n’ebe anyị nọ?

4 Olee otú i si enwe mmetụta n’onwe gị banyere ịhụnanya a na-akparaghị ókè nke Jisọs nwere n’ebe ị nọ? Olee otú i kwesịrị ịdị? Otú ọ dị, Jisọs gosịrị otú ngosipụta ya nke ịhụnanya kwesịrị isi metụta mmekọrịta anyị na mmadụ ibe anyị. Mgbe o jisịrị obi umeala jeere ndị na-eso ụzọ ya ozi site n’ịsa ha ụkwụ, Jisọs sịrị: “N’ihi na enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka mụ onwe m meere unu.” Ọ gbakwụnyekwara, sị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya; dị ka m hụrụ unu n’anya, ka unu onwe unu hụritakwa ibe unu n’anya.” (Jọn 13:15, 34) Ndị na-eso ụzọ ya mụtara ihe, a kpalikwara ha ịgbalị ime dị ka o mere. “N’ime nke a ka anyị mawooro ịhụnanya,” ka Jọn onyeozi dere, “n’ihi na ya onwe ya tọgbọrọ ndụ ya n’ihi anyị: anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ ndụ anyị n’ihi ụmụ nna anyị.”—1 Jọn 3:16.

5 Ma, anyị agaghị emezu nzube nke ndụ na ije ọzi Jisọs ma ọ bụrụ na ihe nlereanya ya kpaliri anyị nanị ịhụ n’anya na ijere ọdịmma nke mmadụ ibe anyị ozi. Ịhụnanya Jisọs ò kwesịghị ịkpalikwu ịhụ ya n’anya n’otu aka ahụ ma karịsịa ịhụ Nna ya n’anya, bụ́ onye ziri ya ihe nile ọ maara? Ị̀ ga-anara ịhụnanya Kraịst ma jeere Nna ya ozi dị ka o mere?—Ndị Efesọs 5:1, 2; 1 Pita 1:8, 9.

6. Olee otú ịhụnanya Jisọs n’ebe ọ nọ si metụta Pọl onyeozi?

6 Tụlee ihe banyere Sọl, bụ́ onye e mesịrị mara dị ka Pọl. N’otu mgbe o sogburu Jisọs, “na-ewere ịba mba na ogbugbu kuo ume megide ndị na-eso ụzọ.” (Ọrụ 9:1-5; Matiu 25:37-40) Mgbe Pọl bịara mara Jisọs n’ezie, o nwere obi ekele nke ukwuu n’ihi ịnata mgbaghara nke na ọ bụghị nanị na ọ dị njikere ịta ahụhụ n’ihi Jisọs kama ọ dịkwa njikere ịnwụ maka ya. “A kpọgburu mụ na Kraịst,” ka o dere. “Ọ bụghịkwa mụ onwe m na-adị ndụ . . . N’ezie, ndụ m na-adị ugbu a n’anụ ahụ m bụ site n’okwukwe nke e nwere n’ebe Ọkpara Chineke nọ, bụ́ onye hụrụ m n’anya ma nyefee onwe ya n’ihi m.”—Ndị Galetia 2:20, New World Translation.

7. Gịnị ka ịhụnanya Jisọs kwesịrị ịkpali anyị ime?

7 Lee nnọọ ụdị ike mkpali n’ime ndụ anyị ịhụnanya Jisọs nwere n’ebe anyị nọ kwesịrị ịbụ! “N’ihi na ịhụnanya Jisọs na-arụgide anyị,” ka Pọl degaara ndị Kọrint, ‘ka anyị wee ghara ịdịrị onwe anyị, kama ka anyị dịrị onye ahụ ndụ, bụ́ onye nwụrụ n’ọnọdụ anyị, e meekwa ka o si n’ọnwụ bilie.’ (2 Ndị Kọrint 5:14, 15) N’ezie, inwe obi ekele n’ebe Jisọs nọ maka inyefe ndụ ya n’ihi anyị kwesịrị ikpali anyị ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. Nanị n’ụzọ dị otú a ka anyị pụrụ igosipụta na anyị hụrụ ya n’anya n’ezie. “Ọ bụrụ na unu na-ahụ m n’anya, unu ga-edebe ihe nile m nyere n’iwu,” ka Jisọs kwuru. “Onye nwere ihe m nyere n’iwu, nke na-edebekwa ha, ọ bụ onye ahụ na-ahụ m n’anya.”—Jọn 14:15, 21; tụlee 1 Jọn 2:3-5.

8. Olee otú ịhụnanya Jisọs siworo metụta ndụ nke ọtụtụ ndị ajọ omume?

8 Ka ha mụtasịrị ihe Jisọs nyere n’iwu, ndị na-akwa iko, ndị na-akwa iko, bụ́ ndị lụworo di ma ọ bụ nwunye, ndị na-edina ụdị onwe ha, ndị ohi, ndị na-aṅụbiga mmanya oké, nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe na Kọrint oge ochie naara ịhụnanya Jisọs site n’ịhapụ àgwà ndị ahụ. Pọl dere banyere ha, sị: “Unu sachara onwe unu, . . . a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 6:9-11) N’otu aka ahụ, ịhụnanya Jisọs akpaliwo ọtụtụ ndị taa ime mgbanwe pụtara ìhè na ndụ ha. “A hụrụ ezi mmeri nile nke Iso Ụzọ Kraịst n’ime ka ndị ahụ na-ekwupụta na ha kwenyere n’ozizi ya bụrụ ndị ezi mmadụ,” ka onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ John Lord dere. “Anyị nwere ihe àmà nke ndụ ha a na-apụghị ịta ụta, nke omume ọma ha a na-apụghị ịkalu, nke ịbụ ezi ụmụ amala ha, na àgwà ọma ndị Kraịst ha.” Lee ka ozizi Jisọs si bụrụ nke dị iche!

9. Gịnị ka ịṅa Jisọs ntị gụnyere?

9 N’ezie, ọ dịghị ihe ọmụmụ mmadụ pụrụ ịmụ taa nke ga-adị mkpa karịa nke ndụ na ije ozi Jisọs Kraịst. “Na-elegide Jisọs anya,” ka Pọl onyeozi kwuru. “N’ihi na, tụgharịanụ uche n’onye ahụ.” (Hibru 12:2, 3) N’oge nnwogha nke Jisọs, Chineke n’onwe ya nyere iwu banyere Ọkpara ya, sị: “Nụrụnụ okwu ya.” (Matiu 17:5) Otú ọ dị, e kwesịrị imesi ya ike na ige Jisọs nti gụnyere ihe karịrị nanị ịnụ ihe ọ na-ekwu. Ọ pụtara ịgbaso ntụziaka ya, ee, iṅomi ya site n’ime ihe o mere n’ụzọ o sikwa mee ya. Anyị na-anara ịhụnanya Jisọs site n’iwere ya dị ka ihe nlereanya anyị, site n’ịgbaso nzọụkwụ ya.

Ihe Jisọs Chọrọ Ka Anyị Mee

10. Olee ndị ka Jisọs nyere ọzụzụ, ọ bụkwa n’ihi nzube dị aṅaa?

10 Ọrụ Chineke nyere Jisọs bụ ikwusa banyere Alaeze Nna ya, o nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ ịrụ ụdị ọrụ ahụ. “Ka anyị gaa ebe ọzọ,” ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya mbụ, “ka m kwusaakwa n’ebe ahụ; n’ihi na ọ bụ ime nke a ka m pụtara.” (Mak 1:38; Luk 4:43) E mesịa, mgbe ọ nyesịrị ndị ozi 12 ọzụzụ zuru ezu, Jisọs nyere ha iwu, sị: “Mgbe unu na-aga, na-ekwusanụ, sị, Alaeze eluigwe dị nso.” (Matiu 10:7) Ọnwa ụfọdụ ka nke a gasịrị, mgbe ọ zụsịrị 70 ndị ọzọ, o zipụrụ ha na-enye ha iwu, sị: “Sịkwanụ ha, Alaeze Chineke di unu nso.” (Luk 10:9) N’ụzọ pụtara ìhè, Jisọs chọrọ ka ndị na-eso ụzọ ya bụrụ ndị nkwusa na ndị ozizi.

11. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị na-eso ụzọ Jisọs ga-esi rụọ ọrụ karịrị nke ọ rụrụ? (b) Gịnị mere ndị na-eso ụzọ ahụ mgbe e gbusịrị Jisọs?

11 Jisọs nọgidere na-enye ndị na-eso ụzọ ya ọzụzụ maka ọrụ a. N’anyasị ikpeazụ tupu ọnwụ ya, o ji okwu ndị a gbaa ha ume, sị: “Onye na-ekwere na mụ, ọrụ mụ onwe m na-arụ ka onye ahụ ga-arụkwa; ọrụ ka ndị a ukwuu ka ọ ga-arụkwa.” (Jọn 14:12) Ọrụ nke ụmụ azụ ya ga-adị ukwuu karịa nke ya n’ihi na n’ije ozi ha, ha ga-eru ndị mmadụ ka ukwuu n’ebe sara mbara karịa nakwa n’ogologo oge ka ukwuu. Ma, mgbe e gbusịrị Jisọs, ụjọ ekweghị ndị na-eso ụzọ ya mee ihe ọ bụla. Ha malitere izo onwe ha ma ghara ịrụ ọrụ ahụ o nyere ha ọzụzụ ka ha rụọ. Ọbụna na ụfọdụ laghachiri n’ọrụ ịkụ azụ. Otú ọ dị, n’ụzọ a na-agaghị echefu echefu, ọ kụnyere n’ime asaa ndị a ihe ọ chọrọ ka ha, dị ka ndị na-eso ụzọ ya, na-eme.

12. (a) Ọrụ ebube dị aṅaa ka Jisọs rụrụ n’Osimiri Galili? (b) Gịnị, ka ihe àmà na-egosi na Jisọs bu n’uche mgbe ọ jụrụ Pita ma ọ hụrụ Ya n’anya “karịa ndị a”?

12 Jisọs yikwasịrị ahụ mmadụ wee pụta n’Osimiri Galili. Ndị ozi asaa ahụ nọ n’ime ụgbọ ma ha enweghị ike igbute azụ ọ bụla n’abali ahụ nile. Jisọs guzooro n’ụsọ osimiri ahụ wee sị: “Wụnyenụ ihe unu ji egbu azụ n’akụkụ aka nri nke ụgbọ, unu ga-ahụkwa.” Mgbe ụ̀gbụ́ ahụ jupụtara n’azụ n’ụzọ ọrụ ebube ruo n’ókè nke ịgbawa, ndị ahụ nọ n’ime ụgbọ ahụ matara na ọ bụ Jisọs guzo n’ụsọ osimiri ahụ, ha wee gaa ngwa ngwa n’ebe ọ nọ na-eche. Mgbe o nyesịrị ha nri ụtụtụ, Jisọs, onye o yiri ka ọ na-ele ọtụtụ azụ ndị ahụ e gburu anya, jụrụ Pita, sị: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya karịa ndị a?” (Jọn 21:1-15) O doro anya na Jisọs bu n’uche ikwu, Ị̀ na-arapagidesi ike n’ọrụ igbu azụ a karịa n’ọrụ nkwusa nke m kwadoworo gị ịrụ?

13. Olee otú Jisọs si kụnyesie ya ike n’ime ndị na-eso ụzọ ya otú ha kwesịrị isi nara ịhụnanya ya?

13 Pita zaghachiri, sị: “Ee, Onyenwe anyị; gị onwe gị matara na ị bụ enyi m.” Jisọs zara: “Na-enye ụmụ atụrụ m nri.” Na nke ugbo abụọ ya Jisọs jụrụ: “Saịmọn, nwa Jọn, ị̀ hụrụ m n’anya?” Ọzọkwa Pita zaghachiri, nke ihe ịrụ ụka na-adịghị ya na o mere ya n’obi siri ike karị, sị: “Ee, Onyenwe anyị; gị onwe gị matara na ị bụ enyi m.” Ọzọ, Jisọs nyere iwu, sị: “Na-azụ atụrụ m.” Nke ugbo atọ Jisọs jụrụ: “Saịmọn, nwa Jọn, àbụ m enyi gị?” O wutere nnọọ Pita nke ugbu a. Nanị ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ, ọ gọnarịwo ịmata onye Jisọs bụ ugbo atọ, ya mere ọ pụrụ icheworị ma Jisọs ò nwere obi abụọ banyere ikwesị ntụkwasị obi ya. Ya mere, na nke ugbo atọ ya, Pita zaghachiri, eleghị anya n’ụda olu arịrịọ, na-asị: “Onyenwe anyị, gị onwe gị matara ihe nile; gị onwe gi maara na ị bụ enyi m.” Jisọs zaghachiri n’ụzọ dị mfe, sị: “Na-enye atụrụ m nri.” (Jọn 21:15-17) À pụrụ inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ihe Jisọs chọrọ ka Pita na ndị òtù ya mee? Lee ka o si kụnye n’ime ha n’ụzọ siri ike—nakwa n’ime onye ọ bụla ga-abụ onye na-eso ụzọ ya taa—na ọ bụrụ na ha hụrụ ya n’anya, ha ga-ekere òkè n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ!

14. N’oge ndị ọzọ, olee otú Jisọs si gosi ndị na-eso ụzọ ya otú ha kwesịrị isi nara ịhụnanya ya?

14 Ụbọchị ole na ole mgbe mkparịta ụka ahụ e nwere n’ụsọ osimiri gasịrị, Jisọs pụtara n’otu ugwu na Galili ma gwa mgbakọ obi ụtọ nke ihe ruru 500 ndị na-eso ụzọ, sị: “Ya mere, gaanụ, mee [“ndị nke,” NW] mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . na-ezi ha ka ha debe ihe nile ka ha hà, bụ́ nke m nyere unu n’iwu.” (Matiu 28:19, 20; 1 Ndị Kọrint 15:6) Cheedị echiche banyere ya! Ndị ikom, ndị inyom, ụmụaka, ha nile natachara otu ọrụ ahụ. Ma mgbe e mesịrị, nwa mgbe nta tupu ọ rịgoo n’eluigwe, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-abụkwa ndịàmà m . . . ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Mgbe ndụmọdụ ndị a nile gasịrị, ọ bụghị ihe iju anya, na ka ọtụtụ afọ gasịrị, Pita sịri: “[Jisọs] wee nye anyị iwu ka anyị kwusara ndị Juu [“ụmụ mmadụ,” NW], ka anyị kwusiekwa ike.”—Ọrụ 10:42.

15. Banyere gịnị ka a na-apụghị inwe ihe ịrụ ụka?

15 A pụghị inwe ihe mgbagwoju anya ọ bụla banyere otú anyị kwesịrị isi nara ịhụnanya Jisọs. Dị ka ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe nile m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m . . . Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu eme ihe mụ onwe m na-enye unu n’iwu.” (Jọn 15:10-14) Ajụjụ bụ, Ị̀ ga-egosi obi ekele maka ịhụnanya Jisọs site n’irube isi n’iwu nke ikere oké n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ? N’ezie, nke a pụrụ isiri gị ike n’ihi ihe ụfọdụ. Ma ọ dịghịkwara Jisọs mfe. Tụlee mgbanwe dị iche iche a chọrọ ya n’aka.

Gbasoo Ihe Nlereanya Jisọs

16. Ihe nlereanya dị aṅaa nke dị ebube ka Jisọs nyere?

16 Ọkpara Chineke ọ mụrụ nanị ya nwere ọnọdụ dị elu nke ebube eluigwe ka nke ndị mmụọ ozi nile elu. Ọ bụ ọgaranya n’ezie! Ma o ji obi ya nile mee onwe ya ihe efu, a mụrụ ya dị ka onye òtù nke ezinụlọ dara ogbenye, o tokwara n’etiti ụmụ mmadụ ndị na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. O mere nke a n’ihi anyị, dị ka Pọl onyeozi kọwara, sị: “N’ihi na unu maara amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na, ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ ghọrọ ogbenye n’ihi unu, ka unu onwe unu wee were ogbenye ya ghọọ ndị ọgaranya.” (2 Ndi Kọrint 8:9; Ndị Filipaị 2:5-8) Lee ihe nlereanya nke ahụ bụ! Lee ụdị ngosipụta ịhụnanya nke ahụ bụ! Ọ dịtụbeghị onye jụrụ onwe ya ma ọ bụ taa ahụhụ karịa n’ihi ndị ọzọ. O nweghịkwa onye ọ bụla meworo ka ndị ọzọ nwee ike inweta akụ ka ukwuu, ee, ndụ ebighị ebi n’izu okè!

17. Ụzọ dị aṅaa ka e setipụrụ anyị n’ihu, gịnị ga-abụkwa ihe ga-esi n’ịgbaso ya pụta?

17 Anyị pụrụ ịgbaso ihe nlereanya Jisọs ma baara ndị ọzọ uru n’ụzọ dịkwa otú ahụ. Jisọs, nọgidere mgbe mgbe na-agwa ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mak 2:14; Luk 9:59; 18:22) N’ezie, Pita dere, sị: “N’ihi na a kpọrọ unu ime nke a; n’ihi na Kraịst hụkwara ahụhụ n’ihi unu, na-ahapụrụ unu ihe nlereanya, ka unu wee soo ije ụkwụ ya nile.” (1 Pita 2:21) Ị̀ ga-anara ịhụnanya Kraịst ọbụna ma ọ bụrụ na ọ pụta ịta ahụhụ iji jeere Nna ya ozi dị ka o mere? Lee ihe abamuru ụdị ụzọ ahụ pụrụ ịbụrụ ndị ọzọ! N’ezie, site n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, site n’itinye ozizi ndị ọ natara n’aka Nna ya n’ọrụ n’ụzọ zuru ezu, “ị ga-azọpụta onwe gị zọpụtakwa ndị na-anụ olu gi.”—1 Timoti 4:16.

18. (a) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Jisọs setịpụrụ banyere omume ya n’ebe ndị mmadụ nọ? (b) Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume n’ụdị onye Jisọs bụ?

18 Iji nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ kasị mma, anyị aghaghịkwa inwe mmetụta banyere ha otú ahụ Jisọs mere. Otu amụma kwuru banyere ya, sị: “Ọ ga-emere onye na-enweghị ike na ogbenye ebere.” (Abụ Ọma 72:13) Ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ịchọpụta na Jisọs nwere ‘ịhụnanya’ maka ndị ahụ ọ gwara okwu nakwa na ọ chọrọ inyere ha aka n’ezie. (Mak 1:40-42; 10:21) “Mgbe ọ hụrụ ìgwè mmadụ,” ka Bible kwuru, “o nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Ọbụna ndị na-eme oké ajọ omume hụtara ịhụnanya ya wee bụrụ ndị adọtara n’ebe ọ nọ. Site n’ụda olu ya, ụzọ o si akpa àgwà, na ụzọ o si ezi ihe, e mere ka ha tụsara ahụ. Dị ka ihe si na nke a pụta, ọbụna ndị ọna ụtụ na ndị akwụna a na-akọcha chọrọ ịhụ ya.—Matiu 9:9-13; Luk 7:36-38; 19:1-10.

19. Olee otú Pọl si ṅomie Jisọs, gịnịkwa ka anyị ime otu ihe ahụ ga-arụpụta?

19 Ndị na-eso ụzọ Jisọs nke narị afọ mbụ gbasoro ihe nlereanya ịhụnanya ya. Pọl degaara ụfọdụ ndị ọ kwusaara ozi akwụkwọ, sị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma . . . Dị ka nna si emere ụmụ nke aka ya, na-arịọ unu, na-akasịkwa unu obi, na-agwasikwa unu okwu ike.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7-11) Ị̀ na-enwe otu ụdị mmasị ahụ ziri ezi maka ndị nọ n’okeala gị dị ka ndị mụrụ ụmụ na-ahụ n’anya na-enwe n’ebe ụmụ ha hụrụ n’anya nọ? Igosipụta ụdị mmasị ahụ n’ụda olu gị, ngosipụta ihu gị, na omume gị ga-eme ka ozi Alaeze bụrụ nke na-adọrọ adọrọ nye ndị yiri atụrụ.

20, 21. Olee ihe atụ ụfọdụ nke oge a nke ndị gbasoro ihe nlereanya ịhụnanya nke Jisọs?

20 N’otu ụbọchị oyi na Spain, Ndịàmà abụọ zutere otu nwanyị meworo agadi nke na-eji osisi mkpa abụ aga ije, bụ́ onye ụlọ ya na-ajụfe oyi oké n’ihi na nkụ ya agwụwo. Ọ na-eche ka nwa ya nwoke lọta ọrụ ma gbujite ọzọ. Ndịàmà ahụ gbujitere nkụ ahụ, ha hapụkwaara ya ụfọdụ magazin ka ọ gụọ. Mgbe nwa ya nwoke lọtara, obi tọrọ ya ụtọ n’ihi mmasị ịhụnanya Ndịàmà ahụ nwere n’ebe nne ya nọ nke na ọ gụrụ akwụkwọ ahụ, malite ịmụ Bible, mee baptism, ma banye n’ije ozi ọsụ ụzọ n’oge na-adịghị anya.

21 Na Australia otu nwoke na nwunye ya kọwaara Ndịàmà bịara n’ụlọ ha na ha enweghị ego inye ezinụlọ ha nri. Di na nwunye Ndịàmà ahụ pụrụ wee zụọ ụfọdụ ihe e ji e si nri, zụọkwa ihe ndị na-atọ bịrịbịrị maka ụmụaka. Ndị ahụ mụrụ ụmụ malitere ibe akwa, na-ekwu na ha nọ n’oké ihe isi ike nke na ha na-atụle igbu onwe ha. Ha abụọ malitere ịmụ Bible, nwunye ya mekwara baptism n’oge na-adịbeghị anya. Otu nwanyị na United States bụ́ onye kpọrọ Ndịàmà Jehova asị kọrọ mgbe ọ zutere otu onye, sị: “N’ezie e chetaghị m ihe anyị kwuru okwu banyere ya, ma ihe m chetara bụ obi ọma o nwere n’ebe m nọ, nakwa otú o si bụrụ onye na-anabata mmadụ nke ọma na onye dị umeala. E nwere m mmasị n’ebe ọ nọ dị ka mmadụ. A hụrụ m ọbụbụenyi ya n’anya ruokwa taa.”

22. Mgbe a tụlesịrị ndụ Jisọs, gịnị bụ nkwubi okwu anyị banyere ya?

22 Mgbe anyị na-anara ịhụnanya Jisọs site n’ịrụ ọrụ ọ rụrụ n’ụzọ o si rụọ ya, lee ụdị ngọzi dị ukwuu anyị ga-enweta! Ịdị ukwuu Jisọs pụtara ìhè ma hibiga nne ókè. A na-akpali anyị ikwughachi okwu nke onye ọchịchị Rom bụ Pọntiọs Paịlet: “Lee, nwoke ahụ!” Ee, n’ezie, “Nwoke ahụ,” nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ.—Jọn 19:5.

Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?

◻ Ruo ókè ha aṅaa ka ịhụnanya Jisọs dị ukwuu?

◻ Ole ndị ka ịhụnanya Jisọs kwesịrị ime ka anyị hụ n’anya, gịnịkwa ka ịhụnanya ya ga-arụgide anyị ime?

◻ Ọrụ dị aṅaa ka Jisọs chọrọ ka anyị rụọ?

◻ Olee otú Jisọs si bụrụ ọgaranya, n’ihi gịnịkwa mere o ji ghọọ ogbenye?

◻ Olee otú anyị kwesịrị isi ṅomie Jisọs n’ụzọ o si jeere ndị mmadụ ozi?

[Foto dị na peeji nke 15]

Jisọs setipụrụ ihe nlereanya nke igosi ịhụnanya

[Foto dị na peeji nke 17]

Jisọs gosipụtara n’ụzọ siri ike otú ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị isi gosi ịhụnanya n’ebe ọ nọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya