Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 1/1 p. 5-8
  • E Wepụta Ihe Okike Ndị Ọhụrụ!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Wepụta Ihe Okike Ndị Ọhụrụ!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Okike “Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”
  • Otú “Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ” Ga-esi Malite
    Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Ime Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ—Dị Ka E Buru n’Amụma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ụwa Ọhụrụ Dị Ka Nkwa Chineke Si Dị
    Nọrọ na Nche!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 1/1 p. 5-8

E Wepụta Ihe Okike Ndị Ọhụrụ!

EZE Solomọn nwere amamihe dị mgbe o kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa ihe ọhụrụ dị n’okpuru anyanwụ.” (Eklisiastis 1:9) Nke ahụ bụ eziokwu banyere ụwa nke ihe ndị a na-ahụ anya anyị bi n’ime ya, ma gịnị banyere ógbè sara mbara nke ihe ndị bụ mmụọ Jehova kere? N’ógbè ahụ, onye karịrị Solomọn ukwu, n’ezie, onye bụ nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ, ghọrọ ihe okike ọhụrụ dị ịrịba ama. Olee otú nke a si mee?

N’afọ 29 nke Oge Anyị, nwoke ahụ zuru okè, bụ́ Jisọs, wepụtara onwe ya ka Jọn mee ya baptism n’Osimiri Jọdan. “Mgbe e mere Jisọs baptism, ngwa ngwa o si ná mmiri rịgota: ma lee, e meghere eluigwe nye ya, o wee hụ mmụọ nke Chineke ka ọ na-efeda dị ka nduru, na-ebekwasịkwa ya; ma lee, olu sitere n’eluigwe, sị, Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ n’anya, onye ihe ya dị m ezi mma.” (Matiu 3:​16, 17) Otú a, nwoke ahụ bụ Kraịst Jisọs bụ nke mbụ n’ihe okike ọhụrụ, onye e tere mmanụ ime uche Chineke. E mesịa, ná ndabere nke ọnwụ ịchụàjà ya, Jisọs ghọrọ Onye Ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ n’etiti Chineke na ìgwè ụmụ mmadụ a họtara ahọta. Nke ọ bụla n’ime ndị a aghọwo “onye e kere ọhụrụ,” nke e ji mmụọ Chineke mụta inwe olileanya eluigwe, na-atụ anya isoro Jisọs chịa achị n’Alaeze eluigwe ya.​—⁠2 Ndị Kọrint 5:17; 1 Timothy 2:​5, 6; Ndị Hibru 9:15.

N’ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, a chịkọtawo ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ, e ji mmụọ mụta, gaa n’isoro Kraịst dị n’otu dị ka ezi ọgbakọ ndị Kraịst, nke bụkwa n’onwe ya ihe e kere ọhụrụ. Chineke si n’ụwa nke a kpọpụta ya maka otu nzube, dị ka Pita onyeozi kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara, ka unu wee kwusaa ịdịmma nile nke onye ahụ onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.” (1 Pita 2:9) Dị ka Kraịst Jisọs, bụ́ onye ọhụrụ mbụ Chineke kere, onye e kere ọhụrụ nke a na-esochinụ nwere ibu ọrụ bụ isi nke ikwusa ozi ọma. (Luk 4:​18, 19) N’otu n’otu, ndị so na ya, ndị ọnụ ọgụgụ ha ga-emesịa bụrụ 144,000, aghaghị ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, nke e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ.’ (Ndị Efesọs 4:24; Mkpughe 14:​1, 3) Nke a chọrọ ka ha zụlite “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” nke a kọwara ná Ndị Galetia 5:​22, 23, jirikwa ikwesị ntụkwasị obi hụ maka ọrụ nlekọta e kenyere ha.​—⁠1 Ndị Kọrint 4:2; 9:16.

Gịnị banyere ihe a e kere ọhụrụ n’oge ndị a? N’afọ 1914, dị ka ọgụgụ oge Bible na-egosi, e mezuru okwu ndị dị ná Mkpughe 11:15: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị [Jehova], na nke Kraịst ya: ọ ga-abụkwa eze ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ihe mbụ Kraịst mere dị ka onye e chiworo Eze ọhụrụ bụ ịtụda Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe gaa na gburugburu ụwa. Nke a wetara ‘ahụhụ nye ụwa,’ n’ụdị nke Agha Ụwa Mbụ ahụ na ihe isi ike ndị sochiri ya.​—⁠Mkpughe 12:​9, 12, 17.

Nke a jekwara ozi dị ka ihe ịma ọkwa nye ndị fọdụrụnụ n’onye ahụ e kere ọhụrụ n’elu ụwa na ha aghaghị ikere òkè n’imezu amụma Jisọs: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe [e guzobeworo] n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” Gịnị bụ “ọgwụgwụ” ahụ? Jisọs gara n’ihu ịkọwa: “N’ihi na mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya aka-adịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.”​—⁠Matiu 24:​3-14, 21, 22.

Mmụọ Jehova kwaliri ndị ahụ e tere mmanụ nke onye ahụ o kere ọhụrụ ịbanye n’ọrụ ná mkpọsa nkwusa kasị zuo ezu nke werewooro ọnọdụ n’elu ụwa a. Site na puku ole na ole na 1919, ọnụ ọgụgụ ndị mkpọsa ndị a na-anụ ọkụ n’obi nke Alaeze rịrị elu ruo ihe dị ka 50,000 mgbe ọ na-erule etiti afọ ndị 1930. Dị ka e buru n’amụma, “n’ụwa nile ka olu ha pụrụ jezuo, ná nsọtụ nile nke elu ụwa dum mmadụ bi ka okwu ha pụwokwara jezuo.”​—⁠Ndị Rom 10:18.

Ọ̀ ga-abụ nanị ndị fọdụrụnụ n’onye ahụ e kere ọhụrụ ka a ga-achịkọpụta maka nzọpụta? Ee e, n’ihi na amụma ekwuwo na ndị mmụọ ozi Chineke ga-ejighachi ikuku nile nke mkpagbu ukwu ahụ azụ ruo mgbe e mezuru nchịkọbata ahụ ọ bụghị nanị nke Israel ime mmụọ ga-aga eluigwe kamakwa nke ndị ọzọ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” Gịnị ga-abụ olileanya ha? Eenụ, ha “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta” n’enwetaghị mmerụ ahụ ọ bụla iji nụ ụtọ ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs!​—⁠Mkpughe 7:​1-4, 9, 14.

Dị ka ihe na-enye obi ụtọ, oké ìgwè mmadụ a, nke e si n’ihe dị ka 229 ala dị iche iche chịkọpụta, abawo ụba ruo ihe dị ka 4,500,000 Ndịàmà na-arụsi ọrụ ike. Ọtụtụ ndị ọzọ ka na-abịa, dị ka ọnụ ọgụgụ bụ 11,431,171 ndị bịara Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs n’April 17 afọ gara aga na-egosi. N’etiti ọtụtụ nde mmadụ ndị a, nanị 8,683 ndị na-ekwu na ha bụ ndị fọdụrụ n’elu ụwa n’onye ahụ e kere ọhụrụ keere òkè n’ihe nnọchianya Ememe Ncheta ndị ahụ. Ndị ahụ nọ n’ìgwè nta nke a apụghị ma ọlị nanị ha ịrụzu oké ọrụ nkwusa ahụ nke oge a. Ọtụtụ nde mejupụtara oké ìgwè mmadụ ahụ so ha ugbu a na-arụ ọrụ ụkwụ na ụkwụ n’ịrụzu ọrụ ahụ. (Zefanaịa 3:9) E wezụgakwa nke ahụ, ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ bụ́ ndị a zụrụ nke ọma na-arụ ọrụ nhazi na nke nlekọta ndị ọzọ ugbu a n’akụkụ Òtù Na-achị Isi ahụ e tere mmanụ nke Israel ime mmụọ, dị nnọọ ka ndị Netinim na-abụghị ndị Israel so ndị nchụàjà rụọ ọrụ n’idozi mgbidi Jerusalem.​—⁠Nehemaịa 3:​22-⁠26.

Okike “Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”

Lee oké ọṅụ nchịkọbata nke a na-akpata! Ọ bụ nnọọ dị ka Jehova kwuru na ọ ga-adị: “M gaje ike eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: a gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi. Ma otú ọ dị, ka obi tọọ unu ụtọ, tegharịakwanụ egwú ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ihe nke mụ onwe m na-eke: n’ihi na, lee, m na-eke Jerusalem ịbụ ihe ntegharị egwú ọṅụ, ndị ya kwa, ịbụ ihe obi ụtọ. M ga-etegharịkwa egwú ọṅụ n’ahụ Jerusalem, obi ga-atọkwa m ụtọ n’ahụ ndị m: a gaghị anụkwa olu ịkwa ákwá n’ime ya ọzọ, ma ọ bụ olu iti mkpu.” (Aịsaịa 65:​17-⁠19) N’ikpeazụ Kraịst Jisọs na 144,000 ndị a kpọlitere n’ọnwụ bụ́ ndị so n’onye ahụ e kere ọhụrụ nke e siwororịị n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ gbata n’ime narị afọ 19 ndị gafeworonụ ga-emejupụta eluigwe ọhụrụ ndị ahụ Jehova na-eke. Ọ dị ebube nke ukwuu karịa gọọmenti ọ bụla nke ụwa nke chịrị n’ime Jerusalem nkịtị, ọbụna nke oge Solomọn. Ọ gụnyere Jerusalem Ọhụrụ, obodo dị n’eluigwe, nke a kọwara n’ịma mma ya nile dị ebube ná Mkpughe isi nke 21.

Jerusalem Ọhụrụ bụ nwanyị ime mmụọ nke Kraịst na-alụ ọhụrụ, 144,000 ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, bụ́ ndị na-esonyere Onye Na-alụ Nwunye Ọhụrụ ha n’eluigwe mgbe ha nwụsịrị e wee kpọlite ha n’ọnwụ ịbụ ndị mmụọ. E sere onyinyo ha ná Mkpughe 21:​1-⁠4 ka ha “na-esi n’eluigwe rịdata, site n’ebe Chineke nọ,” ya bụ, bụrụ ndị o ji eme ihe n’iwetara ihe a kpọrọ mmadụ n’elu ụwa ebe a ngọzi dị iche iche. N’ụzọ dị otú a a na-emezu amụma ahụ bụ: “Lee, ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụ ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”

Lee ka anyị ga-esi nwee obi ekele maka okike Chineke na-eke eluigwe ọhụrụ ndị ahụ! N’adịghị ka ịchịisi ndị na-agabiga agabiga, ndị rụrụ arụ, ndị tiworo ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti ruo ogologo oge ugbu a, ndokwa ọchịchị nke a nke Chineke ga-adịgide. Onye ahụ e kere ọhụrụ na ụmụ ime mmụọ ya, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, na-ete egwú ọṅụ n’ihi nkwa ọzọ Chineke kwere: “N’ihi na dị ka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke mụ onwe m na-eme, ga na-eguzo n’ihu m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta) otú a ka mkpụrụ unu na aha unu ga-eguzo.”​—⁠Aịsaịa 66:22.

“Ụwa ọhụrụ” ahụ na-eji ụmụ ndị a nke ndị ahụ e tere mmanụ nke onye ahụ e kere ọhụrụ na-amalite. Ọ bụ òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ, ndị na-atụ egwu Chineke n’elu ụwa. Ịkpọasị, mpụ, ime ihe ike, ịrụ arụ, na omume rụrụ arụ n’etiti ọha mmadụ taa n’ezie na-emesi mkpa ọ dị ike maka ime mgbanwe kpam kpam gaa n’òtù ụwa ọhụrụ, nke na-arụ ọrụ n’okpuru nduzi nke eluigwe ọhụrụ ndị ahụ nwere obi ọma. Nke ahụ bụ ihe Jehova na-ezube. Dị nnọọ ka o kere eluigwe ọhụrụ, otú ahụ ka ọ na-eke ụwa ọhụrụ site n’ịchịkọta oké ìgwè mmadụ ahụ dị ka ndị a ga-eji malite òtù ụwa ọhụrụ dị n’udo. Òtù a ka a ga-echebe ndụ ‘site n’oké mkpagbu ahụ.’​—⁠Mkpughe 7:14.

Gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya ya mgbe oké mkpagbu ahụ gasịrị? Ka ọ na-agwa ndị ozi ya okwu, bụ́ ndị mbụ mejupụtara eluigwe ọhụrụ ahụ nke ga-achị ụwa ọhụrụ ahụ, Jisọs kwere nkwa, sị: “N’ezie asị m unu, na unu onwe unu ndị soro m, n’ịmụ ọzọ ahụ, mgbe ọ bụla Nwa nke mmadụ ga-anọkwasị n’ocheeze nke ebube ya, unu onwe unu ga-anọkwasịkwa n’ocheeze iri na abụọ.” (Matiu 19:28) Puku narị na iri anọ na anọ mmadụ dum ahụ nke Jerusalem Ọhụrụ nke a ga-eso Jisọs kere òkè n’ikpe ihe a kpọrọ mmadụ ikpe. Mgbe ahụ ịhụnanya ga-anọchi ọchịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ịkpọasị dị ka ntọala nke a ga-ewukwasị òtù ụmụ mmadụ n’elu ya. A ga-ekpochapụ nsogbu nile nke ebo, agbụrụ, na mba. Mbilite n’ọnwụ ahụ ga-eji nwayọọ weghachi ndị a hụrụ n’anya. Ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi n’ọtụtụ nde ha ga-aghọ otu ezinụlọ buru ibu, nke dị n’otu, nke e buliri elu gaa ná ndụ ebighị ebi n’ime ụwa nke e nwoghara ịghọ paradaịs.

Nke a ga-akarị nnọọ echiche ọma efu ma ọ bụ obodo a na-akọ n’akụkọ ifo. Ọ ga-abụ ihe okike na-adịgide adịgide​—⁠“dị ka nkwa ya si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha”! (2 Pita 3:13) N’ezie, nke a bụ olileanya dị ebube, nkwa magburu onwe ya site n’ọnụ onye ahụ sịrị, “Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ,” onye gbakwụnyekwara okwu ahụ na-akpali okwukwe, bụ: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi bụrụkwa eziokwu.”​—⁠Mkpughe 21:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya