Iji Ịhụnanya Na-azụ Ìgwè Atụrụ Chineke
“Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu.”—1 PITA 5:2.
1, 2. Gịnị bụ àgwà bụ isi nke Jehova, oleekwa otú ọ na-esi egosipụta onwe ya?
N’IME Akwụkwọ Nsọ nile, e mere ka o doo anya na ịhụnanya bụ àgwà bụ isi nke Chineke. “Chineke bụ ịhụnanya,” ka 1 Jọn 4:8 kwuru. Ebe a na-egosipụta ịhụnanya ya n’omume, 1 Pita 5:7 sịrị na ‘ihe nile banyere unu na-emetụ Chineke n’obi.’ N’ime Bible e ji ụzọ Jehova si na-elekọta ndị ya tụnyere ụzọ onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya si elekọta atụrụ ya n’ụzọ dị nro: “Lee, Onyenwe anyị Jehova . . . ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ógwè aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.” (Aịsaịa 40:10, 11) Lee ka Devid si bụrụ onye a kasiri obi nke mere o ji nwee ike ikwu, sị: “Jehova bụ onye na-azụ m dị ka atụrụ; ọ dịghị ihe kọrọ m”!—Abụ Ọma 23:1.
2 Ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị na Bible ji atụrụ tụnyere ndị nwere ihu ọma Chineke, n’ihi na atụrụ na-achọ udo, na-anọ n’okpuru, na-erube isi nye onye na-azụ ha na-eche banyere ha. Dị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ na-ahụ n’anya, Jehova na-elekọta ndị ya yiri atụrụ n’ụzọ dị omimi. Ọ na-egosi ya site n’inye ha ihe ime mmụọ na anụ ahụ nakwa site n’iduru ha gafee “mgbe ikpeazụ” siri ike nke ụwa ọjọọ nke a baa n’ụwa ọhụrụ ezi omume ya nke na-abịanụ.—2 Timoti 3:1-5, 13; Matiu 6:31-34; 10:28-31; 2 Pita 3:13.
3. Olee otú onye ọbụ abụ ahụ si kọwaa ụzọ Jehova si elekọta atụrụ ya?
3 Rịba ama nlekọta ịhụnanya nke Jehova maka atụrụ ya: “Anya abụọ nke Jehova dị n’ahụ ndị ezi omume, ntị Ya abụọ ghekwara oghe ná mkpu ha na-etiku Ya. . . . Ndị ezi omume tiri mkpu, Jehova wee nụrụ, wee si ná mkpagbu ha nile napụta ha. Jehova nọ nso ndị obi ha tiwara etiwa, Ọ na-azọpụtakwa ndị a zọpịaworo n’ime mmụọ ha. Ha dị ọtụtụ, bụ́ ihe ọjọọ nke na-adakwasị onye ezi omume: ma n’aka ha nile ka Jehova na-anapụta ya.” (Abụ Ọma 34:15-19) Lee oké ihe nkasi obi Onye Ọzụzụ Atụrụ Eluigwe na Ala na-enye ndị ya yiri atụrụ!
Ihe Nlereanya nke Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma Ahụ
4. Gịnị bụ òkè Jisọs na-ekere n’ilekọta ìgwè atụrụ Chineke?
4 Ọkpara Chineke, bụ́ Jisọs, mụtara ihe nke ọma site n’aka Nna ya, n’ihi na Bible kpọrọ Jisọs “Onye ọzụzụ atụrụ ọma.” (Jọn 10:11-16) Ije ozi ya dị mkpa nye ìgwè atụrụ Chineke bụ nke a rịbara ama ná Mkpughe isi 7. N’amaokwu nke 9, a kpọrọ ndị ohu Chineke nke oge anyị “oké ìgwè mmadụ . . . ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” E mesịa amaokwu nke 17 ekwuo, sị: “Nwa atụrụ ahụ [Jisọs] . . . ga-azụ ha dị ka atụrụ, Ọ ga-edurukwa ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ: Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha.” Jisọs na-edu atụrụ Chineke gaa ná mmiri nke eziokwu nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3) Rịba ama na a kpọrọ Jisọs “Nwa atụrụ ahụ,” na-egosi àgwà ya onwe ya ndị yiri nke atụrụ, ebe ọ bụ ihe nlereanya bụ isi nke ịnọ n’okpuru Chineke.
5. Mmetụta dị aṅaa ka Jisọs nwere banyere ndị mmadụ?
5 N’elu ala Jisọs biri ndụ n’etiti ndị mmadụ ma hụ ọnọdụ ha kwesịrị imere ebere. Olee otú o si meghachi omume ná nsogbu ha? “O nwere ọmịiko n’ahụ ha, n’ihi na a na-esogbu ha, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Matiu 9:36) Atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha na-ata ahụhụ nke ukwuu site n’aka anụ ndị na-adọgbu ha, dịkwa ka atụrụ nwere onye na-azụ ha nke na-adịghị eche banyere ha. Ma Jisọs na-eche banyere ndị mmadụ nke ukwuu, n’ihi na ọ sịrị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. Nyaranụ yoke nke m n’olu unu, mụtakwanụ ihe n’ọnụ m; n’ihi na abụ m Onye nwayọọ na Onye wedatara Onwe ya ala n’obi: unu ga-ahụkwa izu ike nye mkpụrụ obi unu. N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”—Matiu 11:28-30.
6. Nchebara echiche dị aṅaa ka Jisọs gosiri maka ndị e wedara n’ala?
6 Amụma Bible kwuru na Jisọs ga-eji ịhụnanya na-emeso ndị mmadụ: “Jehova etewo m mmanụ . . . ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, . . . ịkasi ndị nile na-eru újú obi.” (Aịsaịa 61:1, 2; Luk 4:17-21) Ọ dịghị mgbe Jisọs ledara ndị ogbenye ma ọ bụ ndị ihe na-adịghị agara nke ọma anya. Kama nke ahụ, o mezuru ihe dị n’Aịsaịa 42:3: “Ọ gaghị akpaji amị̀ a pịara apịa, ọ gaghị emenyụkwa ogho oriọna na-enwu inyoghị inyoghị.” (Tụlee Matiu 12:17-21.) Ndị ihe ọjọọ dakwasịrị yiri amị̀ a pịara apịa, dị ka oriọna na-achọ ịnyụ anyụ n’ihi ụkọ mmanụ ọkụ. N’ịghọta ọnọdụ ha dị imere ebere, Jisọs gosiri ha ọmịiko ma nye ha ike na olileanya, na-agwọ ha n’ụzọ ime mmụọ nakwa n’anụ ahụ.—Matiu 4:23.
7. Olee ebe Jisọs duuru ndị ṅara ya ntị gaa?
7 Ndị yiri atụrụ ṅara Jisọs ntị n’ọnụ ọgụgụ bara ụba. Ozizi ya bụ ihe na-adọrọ mmasị nke na ndị na-eje ozi e zijere ijide ya kọrọ, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla mmadụ kwuru okwu dị otú a.” (Jọn 7:46) Leenụ, ndị ndú okpukpe ahụ nwere ihu abụọ mere mkpesa, sị: “Ụwa ejesowo Ya n’azụ”! (Jọn 12:19) Ma Jisọs achọghị nsọpụrụ ma ọ bụ otuto maka onwe ya. O duuru ndị mmadụ gaa n’ebe Nna ya nọ. Ọ kụziiri ha ijere Jehova ozi n’ihi ịhụnanya maka àgwà ọma Ya nile: “Hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya site n’obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, na ike gị dum, na uche gị dum.”—Luk 10:27, 28.
8. Olee otú nrubeisi ndị Chineke na-enye ya si dị iche site na nke ndị ọzọ na-enye ndị ọchịchị ụwa?
8 Jehova na-enwe otuto n’ihi na ndị ya yiri atụrụ na-akwado ọkaaka eluigwe na ala ya, ná ndabere nke ịhụnanya ha nwere n’ebe ọ nọ. Ha ji obi ha nile na-ahọrọ ijere ya ozi n’ihi ihe ha maara banyere àgwà mara mma ndị o nwere. Lee ka nke a si dị nnọọ iche n’ebe ndị ndú ụwa nke a dị, bụ́ ndị ndị nọ n’okpuru ha na-erubere isi n’ihi ụjọ, ma ọ bụ n’ịtamu ntamu, ma ọ bụ n’ihi na ha nwere nzube ụfọdụ ndị zoro ezo! A pụghị mgbe ọ bụla ikwu banyere Jehova ma ọ bụ Jisọs ihe e kwuru banyere popu nke Chọọchị Roman Katọlik: “Ọ bụ onye ọtụtụ ndị nwere mmasị n’ebe ọ nọ, onye mmadụ nile na-atụ ụjọ, onye ọ na-enweghị onye hụrụ ya n’anya.”—Vicars of Christ—The Dark Side of the Papacy, nke Peter De Rosa dere.
Ndị Ọzụzụ Atụrụ Obi Ọjọọ n’Israel
9, 10. Kọwaa ndị ndú nke Israel oge ochie na ndị nke narị afọ mbụ.
9 N’adịghị ka Jisọs, ndị ndú okpukpe nke Israel n’ụbọchị ya enweghị ịhụnanya ọ bụla maka atụrụ ahụ. Ha dị ka ndị ọchịchị n’Israel n’oge mbụ, bụ́ ndị Jehova kwuworo banyere ha, sị: “Ahụhụ dịịrị ndị ọzụzụ atụrụ na-azụ Israel ndị nọworo na-azụ onwe ha! ọ́ bụghị ìgwè ewu na atụrụ ka ndị ọzụzụ atụrụ ga-azụ? . . . Unu emeghị ka ndị ahụ ha na-adịghị ike dị ike, unu agwọghịkwa nke na-arịa ọrịa, unu ekezighịkwa ọkpụkpụ gbajiri agbaji, unu eweghachighịkwa nke a chụfuru achụfu, unu achọghịkwa nke furu efu; kama n’ike na mkpagbu ka unu zọdaworo ha.”—Ezikiel 34:2-4.
10 Dị nnọọ ka ndị ọzụzụ atụrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ, ndị ndú okpukpe ndị Juu nke narị afọ mbụ bụ ndị obi kpọrọ nkụ. (Luk 11:47-52) Iji mee ihe atụ nke a, Jisọs kwuru banyere otu onye Juu, bụ́ onye e zuworo ohi, tie ihe, ma hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma n’akụkụ ụzọ. Onye nchụàjà bụ́ onye Israel gafetara, ma mgbe ọ hụrụ onye Juu ahụ, o si n’akụkụ ụzọ nke ọzọ gabiga. Otu onye Livaị mekwara otu ihe ahụ. Mgbe ahụ otu onye na-abụghị onye Israel, onye Sameria e ledara anya, gafetara ma nwee ọmịiko n’ahụ onye ahụ e zuru ohi. O kechiri ọnyá ya, buru ya n’otu anụ ụlọ gaa n’ụlọ ndị ọbịa, ma lekọta ya. Ọ kwụrụ onye nwe ụlọ ndị ọbịa ahụ ụgwọ ma kwuo na ya ga-abịaghachi ịkwụ ihe ndị ọzọ e mefuru.—Luk 10:30-37.
11, 12. (a) Olee otú ajọ omume nke ndị ndú okpukpe si ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu n’ụbọchị Jisọs? (b) Gịnị ka ndị Rom mere ndị ndú okpukpe ahụ n’ikpeazụ?
11 Ndị ndú okpukpe nke ụbọchị Jisọs rụrụ arụ nke ukwuu nke na mgbe Jisọs mere ka Lazarọs si n’ọnwụ bilie, ndị isi nchụàjà na ndị Farisii kpọkọtara nnọkọ ikpe ha wee sị: “Gịnị ka anyị na-eme? n’ihi na Nwoke a [Jisọs] na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama. Ọ bụrụ na anyị ahapụ Ya otú a, mmadụ nile ga-ekwere na Ya: ndị Rom ga-abịakwa napụ ebe nke anyị na mba nke anyị.” (Jọn 11:47, 48) Ha echebaraghị ihe ọma Jisọs mewooro nwoke ahụ nwụrụ anwụ echiche. Ha na-eche nanị banyere ọnọdụ ha. Ya mere “site n’ụbọchị ahụ ha gbara ìzù ka ha wee gbuo [Jisọs].”—Jọn 11:53.
12 Iji gbakwụnye ihe n’ajọ omume ha, ndị isi nchụàjà mgbe ahụ “gbara ìzù ka ha wee gbuokwa Lazarọs; n’ihi na ọ bụ n’ihi ya ka ọtụtụ n’ime ndị Juu na-apụ, na-ekwerekwa na Jisọs.” (Jọn 12:10, 11) Mgbalị nile ha nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị iji chebe ọnọdụ ha kụrụ afọ n’ala, n’ihi na Jisọs agwawo ha, sị: “A na-ahapụrụ unu ụlọ unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.” (Matiu 23:38) Ná mmezu nke okwu ndị ahụ, n’ọgbọ ahụ ndị Rom bịara ma napụ ‘ebe nke ha na mba nke ha,’ nakwa ndụ ha.
Ndị Ọzụzụ Atụrụ Na-ahụ n’Anya n’Ọgbakọ Ndị Kraịst
13. Ònye ka Jehova kwere nkwa iziga ka ọ zụọ ìgwè atụrụ ya?
13 Kama ndị ọzụzụ atụrụ obi ọjọọ na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, Jehova ga-ewelite Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs, ilekọta ìgwè atụrụ Ya. O kwekwara nkwa iwelite ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru ndị na-ahụ n’anya ilekọta atụrụ ahụ: “M ga-emekwa ka ndị ọzụzụ atụrụ biliere ha, ndị ga-azụ ha: ha agaghị atụkwa egwu ọzọ.” (Jeremaịa 23:4) Ya mere, dị ka ọ dị n’ọgbakọ ndị Kraịst nke narị afọ mbụ otú ahụkwa ka ọ dị taa, a ‘na-edokwa mmadụ ndị okenye n’obodo nile.’ (Taịtọs 1:5) Ndị a bụ ndị okenye n’ụzọ ime mmụọ, bụ́ ndị nwetaworo iru eru ndị e setịpụrụ n’ime Akwụkwọ Nsọ ga ‘na-azụ ìgwè atụrụ nta Chineke.’—1 Pita 5:2; 1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:7-9.
14, 15. (a) Àgwà dị aṅaa siiri ndị na-eso ụzọ ahụ ike ịzụlite? (b) Gịnị ka Jisọs mere iji gosi ha na ndị okenye kwesịrị ịbụ ndị ohu dị obi umeala?
14 N’ilekọta atụrụ ahụ, n’ụzọ “bụ isi ihe nile” ndị okenye aghaghị ‘inwe ịhụnanya dị ike’ maka ha. (1 Pita 4:8) Ma ndị na-eso ụzọ Jisọs, n’ihi ịbụ ndị na-echegbubiga onwe ha ókè banyere ùgwù na ọkwá, aghaghị ịmụta nke a. Ya mere mgbe nne nke ndị na-eso ụzọ abụọ gwara Jisọs, sị: “Kwuo ka ụmụ m ndị ikom abụọ ndị a nọdụ, otu n’aka nri Gị, otu n’aka ekpe Gị, n’alaeze Gị,” ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ were iwe nke ukwuu. Jisọs gwara ha, sị: “Ndị bụ isi nke mba nile ọzọ na-eme ha dị ka ndị nwe ha: ndị ukwu ha na-achịkwa ha. Ọ bụghị otú a ka ọ ga-adị n’etiti unu: kama onye ọ bụla nke na-achọ ka e mee ya onye ukwu n’etiti unu, ọ ga-abụ onye na-ejere unu ozi; ọzọ, onye ọ bụla nke na-achọ ka ọ bụrụ onye isi n’etiti unu, ọ ga-abụ ohu unu.”—Matiu 20:20-28.
15 N’oge ọzọ, mgbe ndị na-eso ụzọ ya mesịrị ‘nrụrịta ụka n’ụzọ, onye ka ibe ya,’ Jisọs gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-achọ ka ọ bụrụ onye isi, ọ ga-abụ onye ikpeazụ n’etiti unu nile, na onye na-ejere unu nile ozi.” (Mak 9:34, 35) Ịdị obi umeala na ịdị njikere ije ozi aghaghị ịbụ akụkụ nke ọdịdị ha. Ma ndị ahụ na-eso ụzọ nọgidere na-enwe ihe isi ike banyere echiche ndị ahụ, n’ihi na kpọmkwem abalị ahụ tupu Jisọs anwụọ, ná nri anyasị ikpeazụ ya, “esemokwu” kpụ ọkụ n’ọnụ bilitere n’etiti ha banyere onye kasị ukwuu! Nke ahụ mere n’agbanyeghị na Jisọs egosiwo ha otú onye okenye na-aghaghị isi jeere ìgwè atụrụ ahụ ozi; o wedatawo onwe ya ala ma sachaa ụkwụ ha. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na Mụ onwe m, bụ́ Onyenwe unu na Onye ozizi unu, sara ụkwụ unu, unu onwe unu na-ejikwa ụgwọ ịsarịta ụkwụ ibe unu. N’ihi na enyewo m unu ihe nṅomi, ka unu onwe unu wee na-emekwa dị ka Mụ onwe m meere unu.”—Luk 22:24; Jọn 13:14, 15.
16. Na 1899, okwu ndị dị aṅaa ka Ụlọ Nche kwuru n’ihe metụtara àgwà kasị mkpa nke ndị okenye?
16 Ndịàmà Jehova akụziworị mgbe mgbe na ndị okenye aghaghị ịdị otú ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu narị afọ gara aga, Ụlọ Nche (Bekee) nke April 1, 1899, rịbara ama okwu Pọl ndị dị ná 1 Ndị Kọrint 13:1-8 wee kwuzie, sị: “Onyeozi ahụ rụtụrụ aka n’ụzọ pụtara ìhè na ihe ọmụma na ịbụ onye ọkà okwu abụghị ule ndị kasị mkpa, kama ịhụnanya na-abami n’obi ma na-agbasapụ ná ndụ nile a na-adị, na-akpali ma na-akpasu ahụ anyị na-anwụ anwụ ịrụ ọrụ, bụ ule ahụ n’ezie—ezi ihe nnwapụta nke mmekọrịta anyị na Chineke . . . Njimara bụ isi a ga-ele anya ya n’onye a nabatara dị ka onye na-eje ozi na chọọchị, ije ozi n’ihe ndị dị nsọ, kwesịrị ịbụ na nke mbụ mmụọ nke ịhụnanya.” O kwuru na ndị ikom na-agaghị eji ịdị obi umeala na-eje ozi site n’ịhụnanya “bụ ndị nkụzi dị ize ndụ, ma yikarịakwa ka ha ga-emebi ihe karịa imezi ihe.”—1 Ndị Kọrint 8:1.
17. Olee otú Bible si emesi àgwà ndị okenye na-aghaghị inwe ike?
17 Otú a, ndị okenye agaghị ‘eme dị ka ndị bụ isi’ nke atụrụ ahụ. (1 Pita 5:3) Kama nke ahụ, ha ga na-ebute ụzọ ‘n’inwerịta obi ọma n’ahụ ibe ha, na-enwe obi ọmịiko.’ (Ndị Efesọs 4:32) Pọl kwusiri okwu ike, sị: “Yikwasịnụ obi ebere, obi ọma, obi dị obi umeala, ịdị nwayọọ, ogologo ntachi obi . . . ma n’elu ihe ndị a nile yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.”—Ndị Kọlọsi 3:12-14.
18. (a) Ihe nlereanya ọma dị aṅaa ka Pọl setịpụrụ n’imeso atụrụ ahụ ihe? (b) N’ihi gịnị ka ndị okenye na-agaghị eji leghara mkpa nke atụrụ ahụ anya?
18 Pọl mụtara ime nke a, na-asị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nwanyị nke na-azụ nwa na-elezi ụmụ nke aka ya anya nke ọma: otú a, ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dịrị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8) N’ikwekọ na nke ahụ, ọ sịrị: “Na-agụgụnụ ndị dara mbà n’obi, na-enyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nweenụ ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) N’agbanyeghị ụdị nsogbu atụrụ ahụ pụrụ iwetara ha, ndị okenye kwesịrị icheta Ilu 21:13: “Onye na-ekwuchipụ ntị ya n’iti mkpu nke onye na-enweghị ike, ya onwe ya ga-akpọkwa mkpu, ma a gaghị aza ya.”
19. N’ihi gịnị ka ndị okenye na-ahụ n’anya ji bụrụ ngọzi, oleekwa otú atụrụ ahụ si azaghachi n’ụdị ịhụnanya ahụ?
19 Ndị okenye, bụ́ ndị na-eji ịhụnanya azụ ìgwè atụrụ ahụ bụ ngọzi nye atụrụ ahụ. Aịsaịa 32:2 buru amụma, sị: “Otu onye ga-adịkwa ka ebe izonarị ifufe, na ebe nzuzo ịpụ n’oké mmiri ozuzo; dị ka ọtụtụ iyi jupụtara ná mmiri n’ebe kpọrọ nkụ, dị ka ndò nke oké nkume dị elu n’ala nke kpatara ike ọgwụgwụ.” Anyị nwere obi ụtọ ịmara na ọtụtụ n’ime ndị okenye anyị taa na-eme ihe kwekọrọ ná nkọwa ọma ahụ nke na-enye ume ọhụrụ. Ha amụtawo itinye ụkpụrụ na-esonụ n’ọrụ: “N’akụkụ ịhụnanya unu n’ebe ụmụnna unu nọ, ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu; n’akụkụ nsọpụrụ unu, na-acharanụ ibe unu ụzọ.” (Ndị Rom 12:10) Mgbe ndị okenye gosiri ụdị ịhụnanya na obi umeala nke a, atụrụ ahụ na-azaghachi site n’inye ha “ịhụnanya . . . gabiga oké nke ukwuu hie nne n’ihi ọrụ ha.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13.
Kwanyere Iji Nnwere Onwe Ime Nhọrọ Mee Ihe Ùgwù
20. N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị iji kwanyere nnwere onwe ime nhọrọ ùgwù?
20 Jehova kere ma nye ụmụ mmadụ nnwere onwe ime nhọrọ iji na-eme mkpebi nke onwe ha. Ọ bụ ezie na ndị okenye ga-enye ndụmọdụ na ọbụna ịdọ aka ná ntị, ha agaghị eweghara ndụ ma ọ bụ okwukwe nke onye ọzọ. Pọl sịrị: “Ọ bụghị na anyị bụ ndị nwe okwukwe unu, kama anyị bụ ndị sooro unu na-arụta ọṅụ unu: n’ihi na unu ji okwukwe unu guzo.” (2 Ndị Kọrint 1:24) Ee, “mmadụ nile n’otu n’otu ga-ebu ibu nke aka ha.” (Ndị Galetia 6:5) Jehova enyewo anyị nnwere onwe dị ukwuu n’ime okere nile nke iwu na ụkpụrụ ya nile. Otú a, ndị okenye kwesịrị izere isetịpụ ụkpụrụ iwu ebe a na-emebighị ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ. Ha kwesịkwara iguzogide ọchịchọ ọ bụla nke inye echiche nke onwe ha dị ka ozizi ma ọ bụ kwe ka ùgwù onwe ha bata n’okwu mgbe mmadụ na-ekwenyeghị n’ụdị echiche ndị ahụ.—2 Ndị Kọrint 3:17; 1 Pita 2:16.
21. Gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’omume Pọl n’ebe Faịlimọn nọ?
21 Rịba ama otú Pọl, mgbe a tụrụ ya nga na Rom, si mesoo Faịlimọn, onye Kraịst nwere ohu na Kọlọsi dị n’Asia Minor. Ohu Faịlimọn a na-akpọ Ọnisimọs gbalagara Rom, ghọọ onye Kraịst, ma na-enyere Pọl aka. Pọl degaara Faịlimọn akwụkwọ, sị: “Onye mụ onwe m na-ezuberị ijide ka mụ na ya nọdụ, ka o wee na-ejere m ozi n’agbụ nke ozi ọma n’ọnọdụ gị: ma achọghị m ime ihe ọ bụla mgbe ị ka ekwenyeghị; ka ịdị mma gị wee ghara ịdị ka a ga-asị na ọ dị n’ụzọ mkpa, kama ka o wee dị n’ụzọ ọchịchọ obi gị.” (Faịlimọn 13, 14) Pọl ziteghachiri Ọnisimọs, na-agwa Faịlimọn ka o mesoo ya dị ka nwanna nwoke onye Kraịst. Pọl maara na ìgwè atụrụ ahụ abụghị nke ya; ọ bụ nke Chineke. Ọ bụghị nna ha ukwu kama ohu ha. Pọl atụghịịrị Faịlimọn ụka; ọ kwanyeere nnwere onwe ime nhọrọ ya ùgwù.
22. (a) Gịnị ka ndị okenye kwesịrị ịghọta ọnọdụ ha ịbụ? (b) Ụdị nzukọ dị aṅaa ka Jehova na-azụlite?
22 Ka nzukọ Chineke na-eto, a na-ahọpụtakwu ndị okenye. Ha, nakwa ndị okenye nwere ahụmahụ karị, aghaghị ịghọta na ọnọdụ ha bụ nke iji obi umeala eje ozi. N’ụzọ dị otú a, ka Chineke na-edu nzukọ ya na-aga n’ụwa ọhụrụ ahụ, ọ ga-anọgide na-eto dị ka ọ chọrọ—bụrụ nke a haziri nke ọma ma bụrụ nke na-adịghị eji ịhụnanya na ọmịiko chụọ àjà maka ịrụ ọrụ nke ọma. Otú a, nzukọ ya ga-aghọ nke na-adọrọwanye mmasị nke ndị yiri atụrụ, bụ́ ndị ga-ahụ n’ime ya ihe àmà na ‘Chineke na-arụ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.’ Nke ahụ bụ ihe a ga-atụ anya ya site ná nzukọ a tọrọ ntọala ya n’ịhụnanya, n’ihi na “ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.”—Ndị Rom 8:28; 1 Ndị Kọrint 13:8.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Olee otú Bible si na-akọwa nlekọta Jehova na-elekọta ndị ya?
◻ Òkè dị aṅaa ka Jisọs na-ekere n’ilekọta ìgwè atụrụ Chineke?
◻ Njimara bụ isi dị aṅaa ka ndị okenye na-aghaghị inwe?
◻ N’ihi gịnị ka ndị okenye na-aghaghị iji chebara nnwere onwe ime nhọrọ nke atụrụ ahụ echiche?
[Foto dị na peeji nke 16]
Jisọs, “Onye ọzụzụ atụrụ ọma” ahụ, gosiri ọmịiko
[Foto ndị dị na peeji nke 17]
Ndị ndú okpukpe ahụ rụrụ arụ gbara ìzù igbu Jisọs