Ị̀ Na-echeta?
Ì nwewo mmasị ịgụ mbipụta ndị na-adịbeghị anya nke Ụlọ Nche? Ọ bụrụ otú ahụ, ị ga-ahụ ya dị ka ihe na-adọrọ mmasị icheta ihe ndị na-esonụ:
◻ Gịnị ka okwu Grik bụ́ pa·rou·siʹa nke e ji mee ihe na Matiu 24:3, 27, 37, 39 pụtara?
Akwụkwọ An Expository Dictionary of New Testament Words nke Vine dere na-asị: “PAROUSIA . . . na-apụta ma mbịarute ma isorozi nọrọ.” N’ihi ya, ọ bụghị nanị oge nke mbịarute kama ọnụnọ nke na-agbatịpụ site ná mbịarute gaa n’ihu.—8/15, peji nke 11.
◻ Olee otú e si mee “ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi” ka e nwee ike ịzọpụta “mmadụ” na narị afọ mbụ, oleekwa otú ọ ga-esi mee n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu? (Matiu 24:22)
Na 66 O.A., ndị Rom mere ka nnọchibido ha nọchibidoro Jerusalem dị mkpirikpi n’ụzọ a na-atụghị anya ya, na-enye “mmadụ” bụ́ ndị Kraịst ohere ịgbapụ. N’otu aka ahụ, anyị na-atụ anya na mwakpo na-abịanụ n’ahụ Babilọn Ukwu ahụ ga-abụ nke e mere ka ọ dị mkpirikpi n’ụzọ ụfọdụ. Otú a a ga-azọpụta ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha pụọ n’ịbụ ndị e nwere ike bibie.—8/15, peji nke 18-20.
◻ Gịnị kwesịrị ịbụ mmeghachi omume anyị ma ọ bụrụ na mmadụ amalite ikere òkè n’ihe nnọchianya nke Ememe Ncheta ahụ ma ọ bụ kwụsị ime otú ahụ?
Ọ dịghị mkpa ka ndị Kraịst ọzọ chegbuo onwe ha. Jisọs kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ onye ọzụzụ atụrụ ọma; amakwaara m atụrụ nke m.” Dị nnọọ ka e jikwa n’aka, Jehova maara ndị ọ họrọwooro n’ezie dị ka ụmụ ime mmụọ. (Jọn 10:14; Ndị Rom 8:16, 17)—8/15, peji nke 31.
◻ Gịnị bụ nzube bụ isi nke Iwu Mosis?
N’ụzọ bụ isi, ọ kụziiri ndị Israel banyere mkpa Mesaịa dị ha, bụ́ onye ga-agbapụta ha n’ọnọdụ mmehie ha. (Ndị Galetia 3:24) Iwu ahụ kụzikwara egwu na nrubeisi Chineke, o nyekwaara Israel aka ịnọpụ iche n’omume rụrụ arụ nke mba ndị gbara ha gburugburu. (Levitikọs 18:24, 25)—9/1, peji nke 9.
◻ Gịnị bụ nzube nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ? (Jeremaịa 31:31-34)
Ọ bụ iwepụta mba nke ndị eze na ndị nchụàjà iji gọzie ihe nile a kpọrọ mmadụ. (Ọpụpụ 19:6; 1 Pita 2:9; Mkpughe 5:10)—9/1, peji nke 14, 15.
◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee omume ịrịọ mgbaghara?
Ịrịọ mgbaghara pụrụ inye aka imelata ihe mgbu nke ezughị okè kpatara, ọ pụkwara idozi mmekọrịta e mebiri emebi. Mgbaghara ọ bụla anyị rịọrọ bụ ihe mmụta n’ịdị umeala n’obi ma na-azụ anyị ịmara mmetụta nke ndị ọzọ.—9/15, peji nke 24.
◻ Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị Noa ọ̀ bụ eziokwu akụkọ ihe mere eme?
Ee. A pụrụ ịchọta ihe ndekọ oge ochie ndị na-akọ banyere iju mmiri zuru ụwa ọnụ gburugburu ụwa, site na kọntinent ndị dị n’America gaa n’Australia. Mgbasa nke akụkọ a na-enyekwu nkwado n’eziokwu ahụ bụ na iju mmiri zuru ụwa ọnụ mere, dị ka a kọrọ n’ime Bible. (Jenesis 7:11-20)—9/15, peji nke 25.
◻ Gịnị ka ile ọbịa gụnyere? (Ndị Rom 12:13)
A sụgharịtara ile ọbịa site n’okwu Grik nke ihe mejupụtara ya bụ okwu abụọ bụ isi nke pụtara “ịhụnanya” na “onye a na-amabughị.” N’ihi ya, ile ọbịa pụtara n’ụzọ bụ isi “ịhụnanya maka ndị a na-amabughị.” Ma ọ gụnyere ihe gafere ịhụnanya dabeere n’ụkpụrụ, nke e gosiri n’ihi echiche nke ibu ọrụ. Ọ dabeere n’ezi mmasị, mmetụta ịhụnanya, na ọbụbụenyi.—10/1, peji nke 9.
◻ Gịnị bụ arụmụka Pọl banyere alụmdi na nwunye na alụghị di ma ọ bụ nwunye n’akwụkwọ ozi mbụ o degaara ndị Kọrint, isi nke 7?
Alụmdi na nwunye bụ nke iwu kwadoro, n’ọnọdụ ụfọdụkwa, bụrụ ihe ka mma nye ụfọdụ. Ma a pụghị ịgọnarị na alụghị di ma ọ bụ nwunye baara nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ́ onye Kraịst nke chọrọ ijere Jehova ozi n’enweghị uche mgbasasị dị ukwuu uru.—10/15, peji nke 13.
◻ Olee otú onye okenye si ‘echere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha’? (1 Timoti 5:8)
Onye okenye kwesịrị ‘ichere ndị nke aka ya ihe na-akpa ha’—nwunye ya nakwa ụmụ ya—n’ụzọ ihe onwunwe, n’ụzọ ime mmụọ, na n’ụzọ mmetụta uche.—10/15, peji nke 22.
◻ Olee otú Jehova si enye ndị ohu ya nkasi obi?
Mmụọ nsọ Chineke na-arụ ọrụ dị ka “Onye nkasi obi.” (Jọn 14:16) Ụzọ ọzọ Chineke na-esi enye nkasi obi bụ site na Bible. (Ndị Rom 15:4) Chineke maara mkpa anyị n’otu n’otu, ọ pụkwara iji anyị kasirịta ibe anyị obi, dị ka Pọl nwetara nkasi obi site n’akụkọ Taịtọs banyere ndị Kọrint. (2 Ndị Kọrint 7:11-13)—11/1, peji nke 10, 12.
◻ Gịnị ka nkọwa Pọl kọwara Jehova dị ka “Nna nke obi ebere nile,” nke a na-achọta ná 2 Ndị Kọrint 1:3, na-enye echiche ya?
Mkpọaha Grik nke a sụgharịrị “obi ebere nile” sitere n’okwu e ji egosi iru újú n’ahụhụ nke onye ọzọ. Pọl si otú a na-akọwa mmetụta dị nro nke Chineke maka onye ọ bụla n’ime ndị ohu Ya na-ekwesị ntụkwasị obi nke na-enweta mkpagbu.—11/1, peji nke 13.
◻ Gịnị ka e mezuru site n’ibu ọnụ nke ndị Israel n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-enwe kwa afọ? (Levitikọs 16:29-31; 23:27)
Ibu ọnụ kpaliri ndị Israel ịmatakwu mmehie ha na mkpa maka mgbapụta. Site na ya ha gosipụtara mwute maka mmehie ha na nchegharị n’ebe Chineke nọ.—11/15, peji nke 5.
◻ Gịnị ka iwu ahụ e nyere ndị na-eto eto bụ́: “Chetakwa Onye keworo gị,” na-enye echiche ya? (Eklisiastis 12:1)
Otu akwụkwọ na-ekwu na okwu Hibru ahụ a sụgharịrị ‘cheta’ na-enyekarị echiche nke “mmetụta ịhụnanya nke uche na ime ihe nke na-eso ncheta ihe na-agakọ.” Ya mere ịṅa ntị n’iwu a pụtara ihe karịrị nanị iche echiche banyere Jehova. Ọ gụnyere ime ihe, ime ihe na-atọ ya ụtọ.—12/1, peji nke 16.