Ị̀ ‘Chọrọ’ Inyere Ndị Ọzọ Aka?
1 Jizọs na-eche banyere ndị mmadụ n’ezie. Mgbe otu onye ekpenta rịọrọ ya ka o nyere ya aka, Jizọs matịrị aka ya, bitụ nwoke ahụ, wee sị: “Achọrọ m. Ka e mee ka ị dị ọcha.” (Mak 1:40-42) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi ṅomie àgwà Jizọs n’inyere ndị ọzọ aka?
2 Ndị Nwere Mmasị: Onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ na-ekere òkè n’inyere ndị nwere mmasị aka ịghọ ndị na-efe Jehova ofufe. Mgbe ndị ọhụrụ bịara nzukọ, kelee ha ma mata ndị ha bụ. Chọọ ụzọ isi gbaa ha ume. Jaa ha mma maka azịza ha. Jaakwa ha mma maka mgbalị ndị ha na-eme itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Nyere ha aka ịhụ ohere ndị ha nwere imeta ezi ndị enyi n’ime ọgbakọ.
3 Ndị Kwere Ekwe Ibe Anyị: O kwesịrị ka anyị nyere “ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe” aka karịsịa n’ụzọ dịgasị iche iche. (Gal. 6:10) Ọtụtụ n’ime ha na-alụso nsogbu ahụ́ ike ọgụ. Site n’ime nleta na-ewuli elu, ị pụrụ ime ka ha nwee mkpakọrịta nke dị oké mkpa, ma eleghịkwa anya nyekwa aka n’ụzọ ndị bara uru. Ụfọdụ pụrụ ịdị na-eche ihe isi ike ndị ọzọ ihu ná ndụ ha. Gosipụta nchegbu gị site n’iwepụta oge ige ha ntị na iwuli ha elu. (1 Tesa. 5:14) Ndị okenye chọkwara nkwado anyị ka ha na-arụ ọrụ ha. (Hib. 13:17) Site n’igosipụta ịdị njikere anyị na mmụọ inye aka, anyị pụrụ ‘ịghọ ndị enyemaka na-eme ka a dị ike’ nye ndị kwere ekwe ibe anyị.—Kọl. 4:11.
4 Ndị Òtù Ezinụlọ: Anyị kwesịkwara ịgbalị iṅomi ụdị inwe nchegbu ahụ Jizọs nwere maka ndị mmadụ n’ime ezinụlọ anyị. Oké nchegbu na-akwali ndị nne na nna ‘ịnọgide na-azụlite ụmụ ha n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova.’ (Efe. 6:4) Ụmụaka pụrụ ime òkè nke ha site n’ijikere’ n’egbughị oge mgbe oge ruru maka ọmụmụ ihe ezinụlọ, nzukọ ọgbakọ, ma ọ bụ ozi ubi. Ụmụaka ndị toworo eto pụrụ igosipụta ụdị ọmịiko Jizọs gosiri site n’iji ọmịiko na-enyere ndị mụrụ ha aka ịnagide ihe isi ike ndị ime agadi na-eweta. N’ụzọ ndị a na ndị ọzọ, anyị nile pụrụ “itinye nsọpụrụ Chineke n’ọrụ n’ezinụlọ nke [anyị].”—1 Tim. 5:4.
5 Mgbe anyị na-eṅomi Jizọs n’inyere ndị ọzọ aka, ọ pụrụ ịbụ na anyị ga-enwe ike ime ka nsogbu belata na ime ka ezinụlọ anyị soro ọgbakọ na-akpachikwu anya. Nke kachasị mkpa, anyị na-ewetara Jehova nsọpụrụ, “bụ́ Nna nke obi ebere.”—2 Kọr. 1:3.