Nweenụ Uche Zuru Okè—Ọgwụgwụ Dị Nso
“Ọgwụgwụ ihe nile dị nso: ya mere nweenụ uche zuru okè, nweekwanụ anya udo ka unu wee kpee ekpere.”—1 PITA 4:7.
1. (a) Mmechuihu dị aṅaa ka otu onye ndú okpukpe na ụmụ azụ ya nwetara? (b) N’ihi na e mezughị ihe ụfọdụ a tụrụ anya ha, ajụjụ ndị dị aṅaa ka a pụrụ ịjụ?
“M NATARA ọkpụkpọ òkù Chineke n’oge ekpere ikpeazụ nke abalị a. Ọ sịrị na 116,000 mmadụ ga-agbago n’eluigwe nakwa na ili nke 3.7 nde ndị kwere ekwe ga-emeghe chee ihu n’igwe.” Otú ahụ ka otu onye ndú nke chọọchị Mission for the Coming Days kwuru n’uhuruchi October 28, 1992, ụbọchị ime mpịazi dị ka ha buru n’amụma. Otú ọ dị, ka October 29 rutere, ọ dịbeghị otu onye gbagoro eluigwe, ọ dịghịkwa ili ndị nwụrụ anwụ e meghere. Kama ịbụ ndị e wepụrụ ngwa ngwa ná nnwogha gaa n’eluigwe, ndị ahụ kwenyere n’ụbọchị ọdachi na Korea hụrụ ka chi ụbọchị ọzọ bọrọ. Oge a kara aka ịbụ ụbọchị ọdachi erutewo ma gafere, ma ndị mkpọsa ọdachi nọgidere na-atụghị egwu. Gịnị ka ndị Kraịst ga-eme? Hà kwesịrị ịkwụsị ikwere na ọgwụgwụ ji oké ọsọ na-eru nso?
2. Ònye gwara ndị ozi ahụ okwu banyere ụbọchị ikpe n’ọdịnihu, ọ̀ bụkwa n’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka ha mụtara nke a?
2 Iji zaa, ka anyị chetaghachi oge Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya na-akpa nkata nzuzo. N’ebe ahụ, n’ógbè Sizaria Filipaị, n’ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galilii, na-enwe oké Ugwu Heamọn nke na-enye ndo dị ukwuu, ha nụrụ ka o kwuru n’ezoghị ọnụ na a gaje igbu ya. (Matiu 16:21) Okwu ndị ọzọ na-emetụ n’ahụ ga-esochi. Mgbe ọ kọwasịịrị ha na iso ụzọ pụtara ibi ndụ nke ịnọgide na-achụ onwe onye n’àjà, Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Nwa nke mmadụ gaje ịbịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya; mgbe ahụ ka ọ ga-enyeghachikwa onye ọ bụla dị ka omume ya si dị.” (Matiu 16:27) Jisọs kwuru banyere ọbịbịa n’ọdịnihu. Otú ọ dị, n’oge nke a ọ gaje ịbụ Onyeikpe. N’oge ahụ ihe nile ga-adabere na ma ọ̀ ga-ahụ na mmadụ ji ikwesị ntụkwasị obi na-eso ya n’azụ ma ọ bụ na ọ dịghị eme otú ahụ. Ikpe Jisọs ga-adabere n’omume, n’agbanyeghị ihe ole onye ahụ nwere ma ọ bụ ghara inwe ná ngwongwo ụwa. Ndị na-eso ụzọ ya aghaghị idebesi eziokwu a ike n’uche. (Matiu 16:25, 26) N’ihi ya, ọ bụ Jisọs Kraịst n’onwe ya gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha tụọ anya ọbịbịa ya dị ebube, ya na ikpe ya.
3. Olee otú Jisọs si nye ihe atụ maka ijide ọbịbịa ya n’ọdịnihu n’aka?
3 Ihe ọzọ Jisọs kwuru na-eme ihe atụ njide n’aka nke ọbịbịa ya n’ọdịnihu. Dị ka onye nwere ike ọ sịrị: “N’ezie asị m unu, Ụfọdụ dị n’etiti ndị guzoro n’ebe a, ndị na-agaghị edetụ ọnwụ ire ma ọlị ruo mgbe ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’alaeze ya.” (Matiu 16:28) E mezuru okwu ndị a mgbe ụbọchị isii gasịrị. Ọhụụ na-egbuke egbuke nke nnwogha Jisọs juru ndị na-eso ụzọ ya dị ya nso anya. Ha hụrụ ihu Jisọs n’ezie ka ọ na-enwu dị ka anyanwụ, na uwe ya ka ọ na-egbukepụ ọcha. Nnwogha ahụ bụ nlepere nke ebube na Alaeze Kraịst. Lee ihe na-emesi obi ike ọ bụ maka amụma nile nke Alaeze ahụ! Lee oké ihe mkpali ọ bụụrụ ndị ahụ na-eso ụzọ inwe uche zuru okè!—2 Pita 1:16-19.
Ihe Mere O Ji Dị Ngwa Inwe Uche Zuru Okè
4. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iji mụrụ anya n’ime mmụọ maka ọbịbịa ya?
4 Mgbe ihe na-erughị otu afọ gasịrị, anyị hụrụ Jisọs ka ọ na-anọdụ n’elu Ugwu Olive, ọzọ ya na ndị na-eso ụzọ ya na-akpa nkata nzuzo. Ka ha lekwasịrị obodo Jerusalem anya, ọ kọwara ihe ga-abụ ihe ịrịba ama nke ọnọdụ ya n’ọdịnihu wee dọọ aka ná ntị, sị: “Na-echenụ nche: n’ihi na unu amataghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” Ndị na-eso ụzọ ya aghaghị ịdị njikere mgbe nile n’ihi na a maghị oge ọbịbịa ya. Ha aghaghị ịdị nkwadebe maka ya mgbe nile.—Matiu 24:42.
5. Olee otú a pụrụ isi maa atụ banyere mkpa inwe anya udo?
5 N’ihe banyere otú ọ ga-esi bịa, Onyenwenụ ahụ yiri onye ohi. Ọ gara n’ihu ịsị: “Ma unu mara nke a, na ọ bụrụ na nna nwe ụlọ matararịị oge nche onye ohi ga-abịa, ọ ga na-eche nche, ọ gaghị ekwekwa ka e gwupuo ụlọ ya.” (Matiu 24:43) Onye ohi na-akpaka ụzọ adịghị ama ọkwa ịgwa onye nwe ụlọ mgbe ọ ga-abịa; ihe agha ya bụ isi bụ ime ihe na mberede. Ya mere, onye nwe ụlọ aghaghị ịdị na-eche nche mgbe nile. Otú ọ dị, nye onye Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi, inwe anya udo n’akwụsịghị akwụsị abụghị n’ihi ịtụ egwu ọ bụla. Kama, a na-akpali ya site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-atụ anya ọbịbịa Kraịst n’ebube iji webata Narị Afọ Iri nke udo.
6. N’ihi gịnị ka anyị na-aghaghị iji nwee uche zuru okè?
6 N’agbanyeghị nche nile, ọ dịghị onye ga-enwe ike ịkọta kpọmkwem ụbọchị ọ gaje ịbịa tupu oge eruo. Jisọs sịrị: “N’ihi nke a unu onwe unu bụrụkwa ndị e doziworo: n’ihi na n’oge hour nke unu na-echeghị ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Matiu 24:44) Ka a sịkwa ihe mere a ga-eji nwee uche zuru okè. Ọ bụrụ na onye Kraịst echee na n’otu ụbọchị kpọmkwem Kraịst agaghị abịa, ma eleghị anya ọ ga-abụ kpọmkwem ụbọchị ọ ga-abịa! Otú ọ dị, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwere ezi uche n’oge gara aga ejiwo obi eziokwu nwaa ibu amụma mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Ma, a nwapụtawo ịdọ aka ná ntị Jisọs ịbụ eziokwu ugboro ugboro: “Ọ dịghị onye ọ bụla matara ihe banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.”—Matiu 24:36.
7. Iji bụrụ ndị na-eso Kraịst azụ, olee otú anyị na-aghaghị isi bie ndụ anyị?
7 Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ikwubi? Na iji bụrụ ndị na-eso Kraịst n’azụ, anyị ga na-adị ndụ mgbe nile na-ekwere na ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a dị nnọọ nsọ.
8. Gịnị bụworo ihe e ji mara ndị Kraịst eri ụbọchị ndị mbụ nke Iso Ụzọ Kraịst?
8 Àgwà dị otú ahụ abụrụwo mgbe nile ihe e ji mara ndị Kraịst, dị ka ndị ọkọ akụkọ ụwa na ndị mmụta Bible chọpụtara. Dị ka ihe atụ, ndị editọ nke The Translator’s New Testament, n’okpuru okwu bụ́ “Ụbọchị” ná ndepụta ha nke okwu ndị pụrụ iche, sịrị: “Ndị Kraịst nke A[gba] Ọ[hụrụ] biri ndụ n’ịtụ anya nke Ụbọchị ahụ (ya bụ oge ahụ) mgbe a ga-eweta ụwa dị ugbu a na ihe ọjọọ na obi ọjọọ ya nile ná njedebe na mgbe Jisọs ga-alaghachite n’ụwa ikpe ihe nile a kpọrọ mmadụ ikpe, webata ọgbọ ọhụrụ nke udo ma banye n’ịbụ Onyenwenụ ya n’elu ụwa nile.” Akwụkwọ Encyclopædia Britannica rịbara ama, sị: “Mgbasa pụrụ iche ruo ụwa nile nke Iso Ụzọ Kraịst bụ nke e jikọrọ kpọmkwem ya na ịtụ anya ndị Kraịst nke oge ọgwụgwụ, n’ụdị nke ịtụ anya nlọghachi Kraịst nke dị nnọọ nso. Ịtụ anya ndị Kraịst nke oge ọgwụgwụ adịghị mgbe ọ gụnyere nanị ọchịchọ ọrụ na-adịghị ya maka ọbịbịa Alaeze Chineke.”
Ihe Inwe Uche Zuru Okè Pụtara
9. Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ Pita tụrụ anya ha banyere Mesaịa ahụ ezighị ezi, gịnị mere ọ pụrụ iji nọgide na-enwe obi ike?
9 Ihe dị ka 30 afọ mgbe mkparịta ụka enyi ahụ Jisọs so ndị na-eso ụzọ ya kasị dịrị ya nso nwee gasịrị, Pita onyeozi adaghị mbà n’ichere ka ọgwụgwụ ahụ bịa. Ọ bụ ezie na ịtụ anya mbụ nke ya na ndị na-eso ụzọ ibe ya nwere banyere Mesaịa ahụ ezighị ezi, ọ nọgidere na-enwe obi ike na ịhụnanya na ike Jehova mere ka e jide n’aka na a ga-emezu olileanya ha. (Luk 19:11; 24:21; Ọrụ 1:6; 2 Pita 3:9, 10) Ọ kọwapụtara otu isi ihe a nọgidere na-anụ n’Akwụkwọ Nsọ Grik nile mgbe ọ sịrị: “Ọgwụgwụ ihe nile dị nso.” O wee gbaa ndị Kraịst ibe ya ume, sị: “Ya mere nweenụ uche zuru okè, nweekwanụ anya udo ka unu wee kpee ekpere.”—1 Pita 4:7.
10. (a) Gịnị ka inwe uche zuru okè pụtara? (b) Gịnị ka ịhụ ihe n’ọnọdụ ha kwesịrị ekwesị n’ihe banyere uche Chineke gụnyere?
10 Inwe “uche zuru okè” apụtaghị ịdị garagara n’ụzọ ụwa si ele ihe anya. Jehova na-asị: “M ga-ala amamihe nke ndị maara ihe n’iyi, m ga-ajụkwa nghọta nke ndị nwere nghọta.” (1 Ndị Kọrint 1:19) Okwu Pita jiri mee ihe pụrụ ịpụta “inwe uche mụ anya.” E jikọrọ ịmụ anya ime mmụọ nke a na ofufe anyị. Ya mere, site n’ịkwụrụsi ike n’uche, anyị na-ahụ ihe n’ọnọdụ ha kwesịrị ekwesị n’ihe banyere uche Jehova; anyị na-aghọta ihe ndị dị mkpa na ihe ndị na-adịghị. (Matiu 6:33, 34) Ka anyị na-eche ọgwụgwụ ahụ dị nnọọ nso ihu, adịghị ebufu anyị gaa n’ụzọ ndụ ịgba ara ara; anyị adịghịkwanụ eleghara oge anyị na-ebi n’ime ya anya. (Tụlee Matiu 24:37-39.) Kama nke ahụ, e ji imeru ihe n’ókè na nhazi n’echiche, ọdịdị, na àgwà, ndị e bu ụzọ gosipuṭa n’ebe Chineke nọ (“anya udo ka unu wee kpee ekpere”) na n’ebe onye agbata obi anyị nọ (‘nwerịtanụ ịhụnanya siri ike’), na-achị anyị.—1 Pita 4:7, 8.
11. (a) Gịnị ka ‘ime ka anyị dị ọhụrụ n’uche anyị’ pụtara? (b) Olee otú ikike uche ọhụrụ ahụ si enyere anyị aka ime mkpebi?
11 Inwe uche zuru okè gụnyere anyị ịbụ ndị ‘e meworo ka ha dị ọhụrụ n’uche.’ (Ndị Efesọs 4:23) N’ihi gịnị ka a ga-eji mee ka anyị dị ọhụrụ? Ebe anyị ketaworo ezughị okè, anyị bikwa na gburugburu ebe a na-eme mmehie, ọchịchọ nke na-emegide ọnọdụ ime mmụọ na-achịkwa echiche anyị. Ikike ahụ na-anọgide na-akwara echiche na nkwali uche gaa n’ụzọ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, nke ọchịchọ onwe onye nanị. N’ihi ya, mgbe mmadụ ghọrọ onye Kraịst, ike, ma ọ bụ uche na-akpali ya, nke dị ọhụrụ dị ya mkpa, bụ́ nke ga-akwara echiche ya gaa n’ụzọ nke ziri ezi, ụzọ nke ime mmụọ, gaa n’ịdị njikere iji onwe onye achụ àjà. Otú a, mgbe e chere mmadụ nhọrọ n’ihu, dị ka ihe atụ n’agụmakwụkwọ, ọrụ aka, ọrụ ego, ntụrụndụ, oge ntụrụndụ, ụdị uwe, ma ọ bụ ihe ọ bụla ọ pụrụ ịbụ, nkwali uche mbụ ya ga-abụ ịtụle okwu ahụ site n’ụzọ ime mmụọ kama ịbụ site na nke anụ ahụ, nke ọchịchọ onwe onye nanị. Uche ọhụrụ nke a na-eme ka ọ ka mfe iji uche zuru okè na mmata nke na ọgwụgwụ ahụ dị nso kpebie okwu.
12. Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe “ezi ndụ n’ime okwukwe”?
12 Inwe uche zuru okè na-egosi na anyị nwere ahụ ike ime mmụọ. Olee otú anyị pụrụ isi “nwee ezi ndụ n’ime okwukwe”? (Taịtọs 2:2) Anyị aghaghị iji ụdị nri nke ziri ezi mejuo uche anyị. (Jeremaịa 3:15) Nri Okwu Chineke nke eziokwu nke a nọgidere na-eri nke e ji ịrụ ọrụ nke mmụọ nsọ ya na-akwado ga-enyere anyị aka ijigide nguzo ọnọdụ ime mmụọ anyị. Ya mere, inwe ọmụmụ ihe onwe onye mgbe nile, nakwa ozi ubi, ekpere, na mkpakọrịta ndị Kraịst, dị oké mkpa.
Otú Inwe Uche Zuru Okè Si Echebe Anyị
13. Olee otú inwe uche zuru okè si echebe anyị pụọ n’iji nzuzu hie ụzọ?
13 Inwe uche zuru okè pụrụ ichebe anyị pụọ n’iji nzuzu hie ụzọ, bụ́ nke pụrụ ịnapụ anyị ndụ ebighị ebi anyị. Olee otú nke a pụrụ isi kwe mee? Pọl onyeozi kwuru banyere “iwu nke uche.” Maka onye nwere ezi ahụ ike n’okwukwe, ihe nke na-amasị ya, ya bụ “iwu Chineke,” na-achịkwa iwu nke a nke uche. N’eziokwu, “iwu nke mmehie” na-alụ agha megide iwu nke uche. Otú ọ dị, onye Kraịst pụrụ inwe mmeri site n’enyemaka Jehova.—Ndị Rom 7:21-25.
14, 15. (a) Mmetụta abụọ dị aṅaa na-agba mgba ịchịkwa uche? (b) Olee otú anyị pụrụ isi merie n’agha nke uche?
14 Pọl gara n’ihu site n’igosi oké ọdịiche dị n’etiti uche anụ ahụ na-emehie emehie na-achịkwa, nke ihe o lekwasịrị anya bụ ndụ nke ịchọ imeju ọchịchọ nile nke onwe onye, na uche nke mmụọ Chineke na-achịkwa, nke ihe o lekwasịrị anya bụ ndụ iji onwe onye achụ àjà n’ijere Jehova ozi. Pọl dere ná Ndị Rom 8:5-7, sị: “Ndị dị ka anụ ahụ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke anụ ahụ; ma ndị dị ka mmụọ nsọ si chọọ na-atụkwasị uche n’ihe nke mmụọ nsọ. N’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ bụ ọnwụ; ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ bụ ndụ na udo: n’ihi na ịtụkwasị uche n’anụ ahụ, ya na Chineke dị n’iro; n’ihi na e doghị ya n’okpuru iwu Chineke, n’ihi na a pụghịkwa ido ya n’okpuru ya.”
15 Pọl, n’amaokwu nke 11, kọwazịrị otú uche nke na-ekwenyere mmụọ nsọ si enwe mmeri n’agha ahụ: “Ma ọ bụrụ na mmụọ nke onye ahụ nke mere ka Jisọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilie na-ebi n’ime unu, onye ahụ nke mere ka Kraịst Jisọs si ná ndị nwụrụ anwụ bilie ga-esitekwa n’aka mmụọ ya nke na-ebi n’ime unu mee ka ahụ unu nke pụrụ ịnwụ anwụ dị ndụ.”
16. Inwe uche zuru okè na-echebe anyị pụọ n’ihe ndọrọ ndị dị aṅaa?
16 Ya mere, site n’inwe uche zuru okè, a gaghị aghọgbu anyị site n’ihe ndọrọ dị iche iche jupụtara ebe nile nke ụwa nke a, bụ́ nke e ji ọchịchọ na-enweghị atụ nke ịchọ imeju ọchịchọ nile nke onwe onye n’ụdị ihe ụtọ nile, ihe onwunwe, na àgwà mmekọahụ na-ezighị ezi, mara. Uche anyị zuru okè ga-agwa anyị ka anyị ‘gbanarị ịkwa iko’ ma zere ihe ọdachi ndị ọ na-akpata. (1 Ndị Kọrint 6:18) Mkpali uche anyị zuru okè ga-akwagide anyị itinye ọdịmma nile nke Alaeze n’ọnọdụ mbụ, chekwaakwa echiche anyị mgbe a nwara anyị ọnwụnwa site n’inye anyị ọrụ aka e ji akpata ego nke pụrụ ime ka mmekọrịta anyị na Jehova ghara isi ike.
17. Olee otú otu nwanna nwanyị bụ onye ọsụ ụzọ si gosi uche zuru okè mgbe ibu ọrụ nke ego chere ya ihu?
17 Dị ka ihe atụ, n’otu mba ebe okpomọkụ n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, e nwere otu nwa agbọghọ nke debere ọdịmma nile nke Alaeze n’ọnọdụ mbụ n’uche. Ọ zụlitewo ịhụnanya maka ozi oge nile. Ná mba ahụ ihe ka ọtụtụ n’ọrụ a na-arụ na-ewe ụbọchị isii ruo asaa nke ọrụ oge nile. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ mahadum, nna ya, nke na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova, tụrụ ya anya ịkpata ego dị ukwuu maka ezinụlọ. Ma ebe o nwere ọchịchọ siri ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ, ọ chọtara ọrụ nwa oge wee malite ije ozi ọsụ ụzọ. Nke a kpasuru nna ya iwe, bụ́ onye yiri egwu ịtụpụsị ngwongwo ya nile n’ụzọ ámá. N’ihi ịgba chaa chaa, o ji ụgwọ dị ukwuu, ọ tụkwara anya ka ada ya kwụpụ ụgwọ ndị o ji. Nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ na-agụ akwụkwọ na mahadum, n’ihi ụgwọ ndị ahụ kwa, ego adịghị iji kwụọ ụgwọ akwụkwọ ya. Nwanne ya ahụ nke ọ tọrọ kwere nkwa na ọ bụrụ na o nyere ya aka, na ya ga-elekọta ezinụlọ ahụ mgbe o nwetara ọrụ. Obi ya kewara ekewa n’etiti ịhụnanya ya maka nwanne ya nwoke na ịhụnanya ya maka ozi ọsụ ụzọ. Mgbe o jisịrị nlezianya tụlee okwu ahụ, o kpebiri ịga n’ihu n’ọrụ ọsụ ụzọ ya ma chọọ ọrụ ọzọ. Dị ka azịza nye ekpere ya, ọ chọtara ọrụ dị mma nke ọ nọ na ya nwee ike ọ bụghị nanị inyere ezinụlọ na nwanne ya nwoke aka n’ụzọ ego kamakwa nọgide n’ihe mbụ ọ hụrụ n’anya, bụ́ ozi ọsụ ụzọ.
Chọọ Enyemaka Jehova n’Ịnọgide Na-enwe Uche Zuru Okè
18. (a) N’ihi gịnị ka ụfọdụ pụrụ iji nwee mwute n’obi? (b) Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị aṅaa pụrụ ịkasi ndị nwere mwute n’obi obi?
18 Ụfọdụ ụmụ azụ Kraịst pụrụ ịdị na-enwe ihe isi ike n’ịnọgide na-enwe uche zuru okè ha. Ndidi ha pụrụ ịdị na-ebelata n’ihi na ajọ usoro ihe ọjọọ nke a na-adịte anya karịa ka a tụrụ anya ya. Ha pụrụ inwe nkụda obi n’ihi ya. Otú ọ dị, ọgwụgwụ ahụ ga-abịa. Jehova kwere nkwa nke ahụ. (Taịtọs 1:2) Otú ahụkwa ka Paradaịs elu ụwa ya e kwere ná nkwa ga-abịa. Jehova na-eme ka e jiri nke ahụ n’aka. (Mkpughe 21:1-5) Mgbe ụwa ọhụrụ ahụ bịara, a ga-enwe “osisi nke na-enye ndụ” maka ndị nile nọgidere na-enwe uche zuru okè.—Ilu 13:12.
19. Olee otú a pụrụ isi nọgide na-enwe uche zuru okè?
19 Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe uche zuru okè? Chọọ enyemaka Jehova. (Abụ Ọma 54:4) Nọrọ ya nso. Lee ka anyị si enwe ọṅụ na Jehova na-achọ ka anyị nọrọ ya nso! “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso,” ka onye na-eso ụzọ bụ́ Jemes dere. (Jemes 4:8) Pọl sịrị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’Onyenwe anyị mgbe nile: m ga-asị ọzọ, Na-aṅụrịnụ ọṅụ. Meenụ ka mmadụ nile mara obi ọma unu. Onyenwe anyị nọ nso. Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.” (Ndị Filipaị 4:4-7) Mgbe o yikwara ka ibu arọ nile nke usoro ihe a na-anwụ anwụ hà buru oké ibu ịnọgide na-ebu ha, tụkwasị ha na Jehova, ya onwe ya ga-anagidekwa gị.—Abụ Ọma 55:22.
20. N’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịnọgide, dị ka 1 Timoti 4:10 na-ekwu?
20 Ee, ọgwụgwụ ahụ dị nso, ya mere nwee uche zuru okè! Ọ bụ ezi okwu ndụmọdụ na 1,900 afọ gara aga; ọ bụ okwu ndụmọdụ dị oké mkpa taa. Ka anyị nọgide na-eji ikike uche anyị zuru okè na-eto Jehova ka ọ nọgidere na-eduru anyị n’ụzọ na-adịghị ize ndụ banye n’ụwa ọhụrụ ya.—1 Timoti 4:10.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị bụ uche zuru okè?
◻ Gịnị mere o ji dị ngwa otú a inwe uche zuru okè?
◻ Olee otú a pụrụ isi mee ka anyị dị ọhụrụ n’ike nke uche anyị?
◻ Agha dị aṅaa nke na-adịghị agwụ agwụ ka anyị na-aghaghị ịlụ n’uche anyị?
◻ Olee otú anyị ga-esi nọgide na-enwe uche zuru okè?
[Foto dị na peeji nke 15]
Ịbịaru Chineke nso n’ekpere na-enyere anyị aka ịnọgide na-enwe uche zuru okè
[Foto dị na peeji nke 17]
Site n’inwe uche zuru okè, a gaghị eji ihe ndọrọ nile nke ụwa a ghọgbuo anyị